Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 1/8 p. 18-21
  • Ihe Dị Ụmụ Ọhụrụ Mkpa na Ihe Ha Chọrọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Dị Ụmụ Ọhụrụ Mkpa na Ihe Ha Chọrọ
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nchegbu A Na-enwe Banyere Mmekọrịta Chiri Anya n’Etiti Nwa Ọhụrụ na Nne Ya
  • “Gwa M Okwu!”
  • “Leenụ M Anya!”
  • ‘M̀ Gaghị Emebi Nwa Ahụ?’
  • Ònye Ka Ọ Dịịrị Ilekọta Nwa Ọhụrụ?
  • Otú Ụmụaka Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Inye Ụmụaka Ihe Dị Ha Mkpa
    Teta!—2004
  • Oge A Kacha Amụta Ihe Ngwa Ngwa
    Teta!—2011
  • Otú Ụmụ Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Teta!—2004
g04 1/8 p. 18-21

Ihe Dị Ụmụ Ọhụrụ Mkpa na Ihe Ha Chọrọ

MALITE n’oge a mụrụ nwatakịrị, ọ dị ya mkpa ịbụ onye e ji ụzọ dị nro na-elekọta anya, gụnyere iji nwayọọ na-adịda ya aka ma na-emetụ ya ahụ́. Ụfọdụ ndị dọkịta kweere na awa 12 mbụ a mụrụ nwatakịrị dị oké mkpa. Ha na-ekwu na ihe kasị dị nne na nwa ọhụrụ ya mkpa nakwa ihe ha kasị chọọ ozugbo a mụsịrị nwa “abụghị ụra ma ọ bụ ihe oriri, kama ọ bụ ndịda aka na imetụ ahụ́ na ilerịta ibe ha anya ma gee ibe ha ntị.”a

N’ụzọ ebumpụta ụwa, ndị nne na nna na-amatị aka jide nwa ha, kuru ya, na-adịda ya aka, ma kugide ya n’ahụ́. N’aka nke ya, nwa ahụ na ndị mụrụ ya na-enwe mmekọrịta chiri anya, ọ na-emeghachikwa omume ná nlekọta ndị mụrụ ya na-enye ya. Mmekọrịta a na-esi nnọọ ike nke na ike adịghị agwụ nne na nna ịchụ ihe dị iche iche n’àjà iji lekọta nwa ọhụrụ ha.

N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na nwa ọhụrụ adịghị enweta mmekọrịta ịhụnanya nke ndị mụrụ ya, ike pụrụ nnọọ ịgwụ ya, o wee nwụọ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị dọkịta kweere na ọ dị mkpa ikunye nwanyị mụrụ nwa nwa ahụ ozugbo ọ mụpụtara ya. Ha na-atụ aro na, ọ dịkarịa ala, e kwesịrị ikwe ka nne kuru nwa ọhụrụ ya ruo agbata minit 30 na 60 ozugbo ọ mụsịrị ya.

N’agbanyeghị otú e si na-ekwusi okwu ike banyere nne na nwa ọhụrụ ya ịdị na-anọkọ, ime nke a ozugbo a mụrụ nwa ahụ pụrụ isi ike, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwedị omume, n’ụlọ ọgwụ ụfọdụ. Mgbe mgbe, a na-ekupụ nwa ọhụrụ n’ebe nne ya nọ n’ihi na o nwere ike ibunye nwa ahụ ọrịa. Otú ọ dị, ihe àmà ụfọdụ na-egosi na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ibute ọrịa ndị na-egbu egbu pụrụ ibelata n’ezie ma ọ bụrụ na ụmụ ọhụrụ na ndị nne ha anọrọ. N’ihi ya, a na-enwenyewazi ọtụtụ ụlọ ọgwụ ndị na-ekwe ka nne kuru nwa ya ruo ogologo oge ozugbo ọ mụrụ ya.

Nchegbu A Na-enwe Banyere Mmekọrịta Chiri Anya n’Etiti Nwa Ọhụrụ na Nne Ya

Ndị nne ụfọdụ adịghị enwe mmetụta ịhụnanya n’ahụ́ nwa ha ozugbo ha mụpụtara ya. N’ihi ya, ha na-eche, sị, ‘Ọ̀ ga-esiri m ike ime ka mụ na nwa m nwee mmekọrịta chiri anya?’ N’eziokwu, ọ bụghị ndị nne nile na-ahụ nwa ha n’anya ozugbo ha mụrụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mkpa inwewa nchegbu.

Ọ bụrụgodị na nne enweghị mmetụta na-ekpo ọkụ n’ahụ́ nwa ya ozugbo ọ mụrụ ya, ka oge na-aga, ọ pụrụ inwe ya n’ụzọ zuru ezu. “Ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla a na-enwe n’oge a na-amụ nwa nke na-ekpebi ma gị na nwa gị ọ̀ ga-enwe mmekọrịta dị mma ma ọ bụ na unu agaghị enwe,” ka otu nne ma nke a na-akọ na-ekwu. Otú o sina dị, ọ bụrụ na ị dị ime ma na-enwe nchegbu ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya isoro onye ọkachamara n’ihe banyere ịmụ nwa, bụ́ onye na-adị ele gị ahụ́, kwurịta okwu tupu ị mụọ nwa. Gwa ya hoo haa ihe bụ́ ọchịchọ gị banyere mgbe ị chọrọ iku nwa ọhụrụ gị na ogologo oge ị chọrọ ikuru ya.

“Gwa M Okwu!”

O yiri ka è nwere oge mgbe ụmụ ọhụrụ na-aka eme nke ọma n’ihe ụfọdụ kpọmkwem. Oge ahụ anaghịzi adị mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Dị ka ihe atụ, ụbụrụ nwa ọhụrụ na-amụta asụsụ, ọbụna ihe karịrị otu asụsụ, n’ụzọ dị mfe. Ma oge a kasị amụta asụsụ ngwa ngwa yiri ka ọ̀ na-amalite ịgwụ mgbe nwa ahụ dị ihe dị ka afọ ise.

Mgbe nwatakịrị nọ n’agbata afọ 12 ruo 14, ịmụta asụsụ pụrụ ịbụrụ ya oké ihe ịma aka. Dị ka ọkà n’ihe banyere ahụ́ ụmụaka na akwara ozi bụ́ Peter Huttenlocher si kwuo, ọ bụ mgbe ahụ ka “ọdịdị na ọnụ ọgụgụ nke ebe ozi si e si n’otu akwara agafe n’ọzọ n’akụkụ ụbụrụ ndị na-eme ka mmadụ nwee ike ịmụta asụsụ, na-ebelata.” N’ụzọ doro anya, afọ ole na ole ndị mbụ nke ndụ bụ oge dị oké mkpa iji mụta asụsụ!

Olee otú ụmụ ọhụrụ si amụta ikwu okwu, bụ́ nke dị nnọọ mkpa n’oge nile ha na-eto eto n’ụzọ ihe ọmụma? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ site ná nkwurịta okwu ha na ndị mụrụ ha na-enwe. Ụmụ ọhụrụ na-emeghachikarị omume banyere olu ụmụ mmadụ. “Nwa ọhụrụ . . . na-eṅomi olu nne ya,” ka Barry Arons nke nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà na Ụzụ nke Massachusetts, na-ekwu. Otú ọ dị, n’ụzọ na-akpali mmasị, ụmụ ọhụrụ adịghị eṅomi ụda nile ha nụrụ. Dị ka Arons si kwuo, nwa ọhụrụ “adịghị amụta ụda kwịkị kwịkị nke ihe ndina ya na-eme mgbe nne ya na-ekwu okwu.”

Ndị nne na nna si n’ọdịbendị dịgasị iche iche na-eji otu ụdị olu agwa ụmụ ọhụrụ ha okwu. Ka nne ma ọ bụ nna ji ịhụnanya na-agwa nwa ọhụrụ ya okwu, obi nwa ahụ na-amalite ịkụsi ike. E kweere na nke a na-enye aka eme ka nwa ahụ na-aghọta ngwa ngwa, njikọ dị n’etiti okwu na ihe okwu ahụ na-ezo aka na ya. N’ekwughị ihe ọ bụla, nwa ahụ na-akpọ nne ma ọ bụ nna ya, sị: “Gwa m okwu!”

“Leenụ M Anya!”

A chọpụtawo na n’ime afọ mbụ ma ọ bụ ihe yiri ya, nwa ọhụrụ na onye na-elekọta ya, nke na-abụkarị nne ya, na-enwe mmekọrịta ịhụnanya. Mgbe mmekọrịta na-ekpo ọkụ nke nne na nwa ọhụrụ ya na-enwe mere ka ahụ́ ruo nwa ahụ ala, nwa ahụ na-eme nke ọma ná mmekọrịta ya na ndị ọzọ karịa ụmụaka ndị mụrụ ha na-adịghị egosi mmekọrịta na-ekpo ọkụ. E kweere na mmekọrịta dị otú ahụ kwesịrị ịdị n’etiti nwatakịrị na nne ya mgbe nwa ahụ na-erule afọ atọ.

Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na e leghara nwa ọhụrụ anya n’oge a dị oké mkpa, bụ́ mgbe uche ya dị nnọọ nkọ n’ịmụta ihe n’aka ndị gbara ya gburugburu? Martha Farrell Erickson, bụ́ onye nyochara ndị nne 267 na ụmụ ha ruo ihe karịrị afọ 20, kwupụtara echiche a, sị: “Nleghara anya na-eji nnọọ nke nta nke nta anọgide na-egbu mmụọ nwa ọhụrụ ruo mgbe [nwa ahụ] na-agachaghịzi enwe ọchịchọ nke isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe ma ọ bụ nke ịmata ihe ndị na-aga n’ụwa.”

Ná mgbalị ya inye ihe atụ iji gosi ihe bụ́ echiche ya banyere mmetụta ọjọọ ileghara nwatakịrị anya n’ụzọ mmetụta uche na-enwe, Dr. Bruce Perry nke ụlọ ọgwụ Texas Children’s Hospital na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị gwa m ka m họrọ n’etiti ịgbajisị ọkpụkpụ nile dị n’ahụ́ nwa dị ọnwa 6 na ileghara mkpa ya anya n’ụzọ mmetụta uche ruo ọnwa abụọ, aga m asị na ahụ́ ga-aka adị ya mma ma ọ bụrụ na ị gbajisịa ọkpụkpụ nile dị ya n’ahụ́.” N’ihi gịnị? N’echiche Perry, “ọkpụkpụ pụrụ iruchi, ma, ọ bụrụ na e tinyeghị ihe ọmụma dị mkpa n’ụbụrụ nwatakịrị ruo ọnwa abụọ, ụbụrụ ya ga-agbaghasị agbaghasị ná ndụ ya nile.” Ọ bụghị mmadụ nile kweere na ọnọdụ ahụ bụ nke a na-agaghị emekwatali. Ma, nchọpụta ndị ọkà mmụta sayensị mere na-egosi na nwatakịrị ịnọ ebe ahụ́ na-eru ya ala dị oké mkpa iji mee ka uche ya na-eto eto.

“N’igbu ya nkenke,” ka akwụkwọ bụ́ Infants na-ekwu, “[ụmụ ọhụrụ] dị njikere ịhụ n’anya na ị bụ ndị a hụrụ n’anya.” Mgbe nwa ọhụrụ na-ebe ákwá, mgbe mgbe, ihe ahụ ọ na-eme bụ ịrịọ nne na nna ya, sị: “Leenụ m anya!” Ọ dị mkpa ka nne na nna ahụ jiri obiọma lebara ya anya. Site ná mmekọrịta ndị dị otú ahụ, nwa ahụ na-abịa mata na ya nwere ikike nke ime ka ndị ọzọ mara mkpa ya. Ọ na-amụta iso ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta.

‘M̀ Gaghị Emebi Nwa Ahụ?’

‘Ọ bụrụ na m na-elebara nwatakịrị anya mgbe ọ bụla o bere ákwá, m̀ gaghị emebi ya?’ ka ị pụrụ ịjụ. Ma eleghị anya, ị pụrụ. E nwere echiche dịgasị nnọọ iche iche banyere ajụjụ a. Ebe ọ bụ na nwa nke ọ bụla dị iche, ndị nne na nna aghaghị ikpebi ụzọ kasị dị irè isi na-elebara mkpa ya anya. Otú ọ dị, nnyocha ụfọdụ e mere na nso nso a na-egosi na mgbe agụụ na-agụ nwa ọhụrụ, mgbe ahụ́ na-erughị ya ala, ma ọ bụ mgbe iwe na-ewe ya, ahụ́ ya na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ nke na-eme ka e nwee nrụgide. Ọ na-egosipụta ahụ́ erughị ala ya site n’ibe ákwá. A sịrị na mgbe nne ma ọ bụ nna mere ihe site n’igbo mkpa nwa ọhụrụ, ọ na-amalite ime ka ụbụrụ nwa ọhụrụ ahụ nwee usoro mkpụrụ ndụ ndị na-enyere nwa ahụ aka ịmụta igbo mkpa ya. Ọzọkwa, dị ka Dr. Megan Gunnar si kwuo, ahụ́ nwa ọhụrụ e lekọtara anya nke ọma adịchaghị emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ cortisol, bụ́ nke na-eme ka e nwee nrụgide. Ọbụnakwa mgbe iwe were ya, nrụgide ọ na-enwe na-aka akwụsị ngwa ngwa.

“N’ezie,” ka Erickson na-ekwu, “ụmụaka ndị a na-egbo mkpa ha ngwa ngwa mgbe nile, karịsịa n’ime ọnwa 6 ruo ọnwa 8 ndị mbụ nke ndụ ha, adịghị eberu ákwá ka ndị nke e leghaara anya.” Ọ dịkwa mkpa ịdị na-eme mgbanwe n’ụzọ i si elebara mkpa nwa gị anya. Ọ bụrụ na ị na-esi nnọọ otu ụzọ elebara mkpa ya anya mgbe ọ bụla, dị ka site n’inye ya nri ma ọ bụ ijide ya aka, ị pụrụ n’ezie imebi nwa ahụ. Mgbe ụfọdụ, nanị ikwu ihe na-egosi na ị ma na ọ na-ebe ákwá pụrụ izu. Ma ọ bụkwanụ iru ya nso ma takwụnyere ya ihe ná ntị pụrụ ịdị irè. N’aka nke ọzọ, ịdịda ya aka n’azụ ma ọ bụ n’afọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe ahụ́ ya chọrọ.

“Ọrụ nwa ọhụrụ bụ ibe ákwá.” Otú ahụ ka e si ekwu ya n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Ibe ákwá bụ ụzọ bụ́ isi nwa ọhụrụ si ekwu ihe ọ chọrọ. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na a na-eleghara gị anya mgbe ọ bụla ị rịọrọ ka e meere gị ihe? Ya mere, oleezi otú obi ga-adị nwa gị, bụ́ onye ike ya bụ onye na-elekọta ya, ma ọ bụrụ na onye ahụ na-elekọta ya na-eleghara ya anya mgbe ọ bụla ọ chọrọ ka o lebara ya anya? Otú ọ dị, ònye kwesịrị ilebara ya anya mgbe ọ na-ebe ákwá?

Ònye Ka Ọ Dịịrị Ilekọta Nwa Ọhụrụ?

Ịgụ ọnụ e mere na United States n’oge na-adịbeghị anya kpughere na pasent 54 nke ụmụaka ndị a mụrụ ọhụrụ ruo ná ndị nke rurula afọ 8 ma ọ bụ 9 bụ ndị ndị na-abụghị nne ma ọ bụ nna ha na-elekọta mgbe nile n’ụzọ ụfọdụ. Ọ pụrụ ịdị ọtụtụ ndị nne na nna mkpa ka ha abụọ na-arụcha ọrụ iji na-akpata ego ga-ezuru ha igbo mkpa ezinụlọ ha. Ọtụtụ ndị nne na-enwetakwa oge ezumike n’ebe ọrụ maka ọmụgwọ, ma ọ bụrụ na o kwe mee, iji lekọta nwa ọhụrụ ha ruo izu ma ọ bụ ọnwa ole na ole. Ma olee onye ga na-elekọta nwa ahụ mgbe nke ahụ gasịrị?

N’ezie, ọ dịghị iwu ọ bụla a kapịrị ọnụ nke na-achịkwa mkpebi ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ọ dị mma icheta na nwa ahụ ka bụ onye na-apụghị ịzọ onwe ya n’oge a dị oké mkpa nke ndụ ya. Ọ dị nne na nna mkpa ichebara nke a echiche nke ọma. Mgbe ha na-ekpebi ihe ha ga-eme, ha aghaghị iji nlezianya tụlee nhọrọ ndị e nwere.

“Ọ na-edowanye anya na ikwe ka ọbụna ụlọ ọrụ kasị mara nke a na-akọ n’ilekọta ụmụaka zụlitere anyị ụmụ anyị, adịghị anọchi anya oge dị ụmụaka mkpa iji soro nne na nna ha nọkọọ,” ka Dr. Joseph Zanga, nke so n’Òtù America Na-ahụ Maka Ọrịa Ụmụaka na-ekwu. Ụfọdụ ndị ọkachamara ekwupụtawo nchegbu na ụmụ ọhụrụ ndị nọ n’ebe a na-elekọta ụmụaka n’ụbọchị na ndị na-elekọta ha adịghị akpachi anya otú ahụ́ ụmụaka ahụ chọrọ.

Ụfọdụ ndị nne na-arụ ọrụ, n’ịmara mkpa ndị bụ́ isi nke nwa ha, ekpebiwo na ha ga na-anọ n’ụlọ kama ikwe ka ndị ọzọ zụlitere ha ụmụ ha n’ụzọ mmetụta uche. Otu nwanyị kwuru, sị: “A gọziwo m site n’ime ka m nwee ụdị afọ ojuju nke m kweere n’ezie na m pụghị inweta site n’ịrụ ọrụ ọ bụla ọzọ.” N’ezie, ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba adịghị ekwe ka ndị nne nile na-eme nhọrọ ndị dị otú ahụ. Ọtụtụ ndị nne na nna adịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime karịa ịkpọga nwa ha n’ebe a na-elekọta ụmụaka n’ụbọchị, n’ihi ya, ha na-etinyekwu mgbalị n’ilebara nwa ha anya nakwa n’igosi ya mmetụta ịhụnanya mgbe ha na ya nọkọrọ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ ha enwechaghị nhọrọ n’akụkụ a, ha na-emekwa mgbalị dị ịrịba ama n’ịzụlite ụmụ ha—ọ na-arụpụtakwa ezi ihe.

Ịzụlite ụmụ pụrụ ịbụ ọrụ na-enye ọṅụ na obi ụtọ dị ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ọrụ na-eweta ihe ịma aka ma na-achọ ihe dị ukwuu n’aka mmadụ. Olee otú ị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’usoro isiokwu a, Teta! na-ekwu echiche nke ụfọdụ ndị ọkachamara a na-akwanyere ùgwù n’ihe banyere ilekọta ụmụaka, ebe ọ bụ na nchọpụta ndị dị ka ndị a pụrụ ịbara ndị nne na nna uru ma nye ha ihe ọmụma. Ka o sina dị, a ghaghị ikweta na, mgbe mgbe, a pụrụ ịgbanwe ma dezigharịa echiche ndị dị otú ahụ ka oge na-aga, n’adịghị ka ụkpụrụ Bible bụ́ nke Teta! na-akwado n’alaghị azụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

Ụmụ Ọhụrụ Ndị Na-adịghị Egosipụta Mmetụta Ha

Ụfọdụ ndị dọkịta nọ na Japan na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ụmụ ọhụrụ ndị na-adịghị ebe ákwá ma ọ bụ na-amụmụ ọnụ ọchị na-arịwanye elu. Ọkà n’ọrịa ụmụaka bụ́ Satoshi Yanagisawa na-akpọ ha ụmụ ọhụrụ ndị na-adịghị egosipụta mmetụta ha. N’ihi gịnị ka ụmụ ọhụrụ ahụ na-eji akwụsị igosipụta mmetụta ha? Ụfọdụ ndị dọkịta kweere na ihe na-akpata ọnọdụ ahụ bụ na ndị nne na nna adịghị emetụ ụmụ ọhụrụ ha ahụ́. A na-akpọ nke ahụ ọnọdụ enweghị enyemaka nke a manyere nwatakịrị ịnọ na ya. Otu nkọwa na-enye echiche na mgbe a nọgidere na-eleghara mkpa nwa ọhụrụ nwere maka nkwurịta okwu anya ma ọ bụ na-aghọtahie ya, nwa ahụ na-emesị kwụsị ịgbalị iso ndị ọzọ na-ekwurịta okwu.

Ọ bụrụ na a dịghị elebara nwa ọhụrụ anya nke ọma n’oge kwesịrị ekwesị, akụkụ ụbụrụ ya nke na-eme ka ọ na-enwe mmetụta ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ nwere ike ghara ito eto, ka Dr. Bruce Perry, bụ́ onyeisi ndị ọkà n’ọrịa uche n’ụlọ ọgwụ Texas Children’s Hospital na-enye echiche ya. N’ọnọdụ ebe e leghaara mmetụta nwatakịrị anya gabiga ókè, ikike ya nke inwe mmetụta ọmịiko pụrụ ịnwụ pịị. Dr. Perry kweere na n’ọnọdụ ụfọdụ, ahụmahụ dị otú ahụ mmadụ nwere mgbe ọ ka dị nnọọ obere pụrụ ime ka ọ malite iji ihe ndị na-eri ahụ́ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ mee ka ọ na-eme ihe ike mgbe ọ nọ n’oge uto.

[Foto dị na peeji nke 21]

Mmekọrịta dị n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa ya na-esikwu ike ka ha na-ekwurịta okwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya