Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/09 p. 32
  • ‘Igbe Naanị Jehova Ga-emegheli’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Igbe Naanị Jehova Ga-emegheli’
  • Teta!—2009
Teta!—2009
g 10/09 p. 32

‘Igbe Naanị Jehova Ga-emegheli’

◼ N’afọ 2007, papa ụmụaka abụọ, bụ́ Erika onye dị afọ isii na Mattia onye dị afọ anọ, nwụrụ. Ma olileanya ụmụaka a nwere ná mbilite n’ọnwụ emeela ka ụfụ ọnwụ ahụ na-afụ ha kwụsịtụ.—Ọrụ 24:15.

Ọ na-atọ Erika ụtọ ịkọrọ ndị ọzọ olileanya ahụ o nwere, karịchaa n’ụlọ akwụkwọ ha dị n’obodo Sicily. Dị ka ihe atụ, mgbe enyi Erika aha ya bụ Beatrice kwuru na papa Erika nọzi n’eluigwe, Erika gwara ya na ọ bụghị ihe Baịbụl kwuru. Beatrice jụrụ ya, sị: “Oleezi ebe ọ nọ?”

Erika zara ya, sị: “Ọ nọ n’ili.” Ozugbo o kwuru nke a, Beatrice jụrụ ya otú ili na-adị.

Erika gwara ya, sị: “Ọ dị ka igbe a na-emeghe emeghe, na-emechikwa emechi. Ma, e mechihaala igbe a, o nweghị mmadụ ga-emegheli ya. Ọ bụ naanị Jehova ga-emegheli ya ma ụwa ọhụrụ bịa.”

Erika gwaziri enyi ya na aha Chineke bụ Jehova, gwakwa ya na ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, na ọrịa agaghị adịzi, nakwa na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Erika gwaziri Beatrice ka ọ jụọ mama ya ma ọ̀ ga-ekwe ka ya nye ya otu akwụkwọ kọwara ihe ndị a niile.

Mgbe Beatrice gwara Erika na mama ya ekwela ka ya nara akwụkwọ ahụ, Erika nyeziri ya akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Erika ka na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl, o nyekwala onye nkụzi ha ụdị akwụkwọ ahụ o nyere enyi ya nwaanyị.

Ọ bụ eziokwu na ọnwụ papa ha ka na-ewute Erika na nwanne ya nwoke, olileanya ha nwere ná mbilite n’ọnwụ na-eme ka obi na-adị ha mma. Ụmụaka ndị a na-ekele Jehova, bụ́ Chineke nke nkasi obi niile, otú ọtụtụ ndị ọzọ n’ụwa niile na-eme.—Matiu 21:16; 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

I nwere ike inweta akwụkwọ a nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peeji 256, nke peeji ya hacha ka peeji magazin a. Naanị ihe ị ga-eme bụ idejupụta akụkụ peeji a e nwere ike ịdọkapụta adọkapụta ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ zite ya n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko bịanụ mụwara m Baịbụl n’ụlọ m n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya