Ndị Nne Ahụ́ Gbasiri Ike, Na-amụ Ụmụ Ahụ́ Gbasiri Ike
AHỤ́ gbasiri nwa ọhụrụ nne ya ku n’aka ike, obi dịkwa nwa ahụ ụtọ. Aṅụrị jukwara nna nwa ahụ obi. Ebe ọ bụ na kwa afọ, ọtụtụ ndị nne na-amụ nwa ha n’udo, a naghị ewerezi ịmụ nwa ka oké ihe. A sị ka e kwuwe, ọ bụ otú Chineke mere ka e si na-amụ nwa, n’ihi ya, mmadụ ekwesịghị ichegbuwe onwe ya.
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nne na-amụ nwa n’enweghị nsogbu, ma ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị otú ahụ. N’ihi nke a, ọ bụrụ na nwaanyị adịrị ime, di na nwunye maara ihe na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji hụ na nwaanyị ahụ enweghị nsogbu n’afọ ime ahụ nakwa mgbe ọ ga-amụ nwa. Dị ka ihe atụ, ha na-achọpụta ihe ndị nwere ike ịkpatara nwaanyị nsogbu mgbe ọ dị ime ma ọ bụ mgbe ọ na-amụ nwa, ha na-achọkwa ezigbo ụlọ ọgwụ ga-elekọta nwaanyị ahụ mgbe ọ dị ime, ha na-emekwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị mkpa iji hụ na nwaanyị ahụ enweghị nsogbu ma mgbe ime na-eme ya ma mgbe ọ na-amụ nwa. Ka anyị lebazie anya n’ihe ndị a ha kwesịrị ime otu otu.
Ihe Ndị Na-akpatara Nwaanyị Nsogbu Mgbe Ọ Na-amụ Nwa
Ọ bụrụ na e lekọtaghị nwaanyị anya nke ọma mgbe ọ dị ime, ọ ga-akpatara ma ya ma nwa ya nsogbu mgbe ọ na-amụ nwa ahụ. Dọkịta Chung Kam-lau, bụ́ ọkà n’ọrịa ụmụaka n’otu ụlọ ọgwụ dị na Họng Kọng, kwuru na ọ bụrụ na ‘nwaanyị dị ime agaghị ụlọ ọgwụ mgbe ọ dị ime, o nwere ike ime ka nwaanyị ahụ nwee nnukwu nsogbu.’ O kwukwara na “ọtụtụ n’ime ndị nne a na-agaghị ụlọ ọgwụ mgbe ha dị ime na-atụ anya na ụmụ ha ga-ebu ibu, ahụ́ agbasiekwa ha ike, ma ọ bụghịnụ otú ihe nracha si amị.”
N’otu akwụkwọ ụmụ nwaanyị ndị dọkịta nọ n’Amerịka dere, ha kwuru banyere nsogbu ndị nne nwere ike inwe, sị, “Ihe na-egbukarị ụmụ nwaanyị mgbe ha na-amụ nwa” bụ nnukwu ọbara ịgbapụ ha n’ahụ́, nwa anọzighị anọzi mgbe a na-amụ ya, ọrịa e si ná nje bute, na oké ọbara mgbali elu. Akwụkwọ ahụ kwukwara na e nweela ụzọ ndị dị mma a ma ama e si agwọ ọrịa ndị a, ọtụtụ mgbe kwa, ‘ọ dịghị mkpa na a ga-enwe ngwá ọrụ ndị bụ́ ọkpọka tupu a gwọọ onye ọrịa n’oge a.’
Ọ bụrụ na ụmụ nwaanyị dị ime na-aga ụlọ ọgwụ ebe a ga-elekọta ha, ọ ga-enyere ọtụtụ ụmụ ọhụrụ aka. Magazin bụ́ UN Chronicle kwuru na “e nwere ike igbochi ọnwụ ụmụ ọhụrụ abụọ n’ime ụmụ ọhụrụ atọ na-anwụnụ ma ọ bụrụ na ndị nne niile na ụmụ ọhụrụ ha” na-aga ezigbo ụlọ ọgwụ, bụ́ ebe e nwere ike ịgwọ mmadụ, ọ bụrụgodị na ha enweghị ngwá ọrụ ndị bụ́ ọkpọka.” Ma dị ka otu akwụkwọ kwuru, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị nne anaghị aga ụlọ ọgwụ mgbe ha dị ime, ha anaghịkwa ama ihe ha kwesịrị ime.
Otú Kacha Mma Isi Lekọta Nwaanyị Dị Ime na Nwa Ya
Magazin bụ́ UN Chronicle kwuru, sị: “Ndị nne ahụ́ gbasiri ike na-amụ ụmụ ahụ́ gbasiri ike.” Magazin ahụ kwukwara na ọ bụrụ na nwaanyị agaghị ụlọ ọgwụ otú kwesịrịnụ ma ọ bụ gharadị ịga aga mgbe ọ dị ime, mgbe ọ chọrọ ịmụ nwa, na mgbe ọ mụchara nwa, a gaghị elebara nwa ya anya otú kwesịrịnụ.
N’obodo ụfọdụ, o nwere ike isiri nwaanyị dị ime ike inweta ebe a ga-elekọta ya otú kwesịrịnụ. O nwere ike ụlọ ọgwụ dịịrị ya ezigbo anya, ma ọ bụ ya abụrụ na o nweghị ego ọ ga-eji gaa ụlọ ọgwụ. Ma ọ bụrụ na o kwere mee, nwaanyị dị ime kwesịrị ịgbalị hụ na ya gara ebe ndị ọrụ ahụ́ ike maara nke a na-akọ ga-elebara ya anya. Nke a dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ kwetara ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ na ndụ mmadụ, ma nke nwa e bu n’afọ, bụ ihe dị nsọ.—Ọpụpụ 21:22, 23;a Diuterọnọmi 22:8.
Ọ̀ pụtaziri na nwaanyị dị ime ga na-ahụ dọkịta kwa izu? Mba, ọ dịchaghị mkpa. N’ihe banyere nsogbu ụfọdụ ndị nne na-enwe mgbe ha dị ime na mgbe ha na-amụ nwa, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike “chọpụtara na ụmụ nwaanyị ndị gara hụ dọkịta naanị ugboro anọ mgbe ha dị ime” enwekebeghị nsogbu “dị nnọọ ka ndị nke gara hụ dọkịta ihe ruru ugboro iri na abụọ ma ọ bụ karịa.”
Ihe Ndị Dọkịta Nwere Ike Ime
Iji hụ na nne na nwa o bu n’afọ enweghị nsogbu ọ bụla, ndị dọkịta, karịchaa ndị bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara afọ ime na ịmụ nwa, na-eme ihe ndị a na-esonụ:
◼ Ha na-achọpụta ọrịa ndị nwaanyị ahụ rịatụrụla ma mee nnyocha iji mara ma ò nwere nsogbu ọrịa ndị ahụ nwere ike ịkpatara ya n’ọdịnihu, ha na-agbalịkwa igbochi nsogbu ọ bụla o nwere ike ibutere nne ahụ na nwa o bu n’afọ.
◼ Ha nwere ike ịmịrị ọbara ma ọ bụ gwa ya ka ọ nyụta mamịrị a ga-eji mee nnyocha iji mara ma ọbara ọ̀ kọrọ ya n’ahụ́, ma ò nwere ọrịa ndị e si ná nje ebute, ma è nwere ihe ndị dị na ọbara ya nke nwere ike ibutere nwa o bu n’afọ ọrịa, nakwa ma ò nwere ọrịa ndị o bu. Ụfọdụ n’ime ọrịa ndị ha ga-achọpụta ma nwaanyị ahụ ò bu bụ ọrịa shuga, ọrịa na-adị ka ákpàtà, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na ọrịa akụrụ, bụ́ nke nwere ike ịkpatara ya ọbara mgbali elu.
◼ Mgbe ọ dị mkpa nakwa ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ekwe, ha na-agwa ya ka ọ gbaa ọgwụ mgbochi maka ọrịa ndị dị ka oké ahụ́ ọkụ, ọrịa tetanus, nakwa ọgwụ mgbochi ga-eme ka ihe ndị si na ọbara ya ghara ibunye nwa o bu n’afọ ọrịa.
◼ Ha nwere ike ịgwa ya ka ọ na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ vitamin ndị na-edozi ahụ́, karịchaa, nke a na-akpọ fọlik asid.
Ọ bụrụ na ndị dọkịta achọpụta nsogbu nwaanyị ọ bụla dị ime nwere ike inwe ma mee ihe ndị dị mkpa iji gbochie ha—ma ọ bụ nyere nwaanyị ahụ aka igbochi ya—ha na-enye aka hụ na ahụ́ ga-esi nne ahụ na nwa o bu n’afọ ike.
Otú E Si Ebelata Nsogbu Nwaanyị Na-enwe Mgbe Ime Na-eme Ya Nakwa Mgbe Ọ Na-amụ Nwa
Jọị Pumapi, onye bụ́bu osote onyeisi nke Òtù Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike Ezinụlọ na Ahụ́ Ike Obodo ná Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike, kwuru, sị: “Nwaanyị dị ime kacha anọ n’ihe ize ndụ oge ime na-eme ya na oge ọ na-amụ nwa.” Gịnị ka e nwere ike ime iji hụ na enweghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịta isi nwaanyị dị ime n’oge a? N’eziokwu, ihe ndị e kwesịrị ime esighị ike omume, ma nwaanyị ahụ kwesịrị ibido n’oge mewe ha.b Ndị nke a kacha mkpa bụ ndị na-anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara n’ihi na Baịbụl akwadoghị ya ma ọ bụ ndị na-anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara n’ihi na ha achọghị ibute ọrịa ndị a na-esi n’ọbara ebute.—Ọrụ 15:20, 28, 29.
Nwaanyị dị ime kwesịrị ime ihe niile o nwere ike ime iji hụ na onye ọrụ ahụ́ ike ọ na-aga na nke ya, ma ọ̀ bụ dọkịta ma ọ bụ nwaanyị na-aghọ nwa, bụ aka ochie n’otú e si eji ọgwụ ndị ahụ e ji edochi anya ọbara agwọ mmadụ. Ọ ga-adịkwa mma ma nwaanyị dị ime na di ya buru ụzọ mata ma ndị ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ndị ọrụ ahụ́ ike nọ n’ebe ahụ a na-amụ nwa hà ga-ekwekwa gwọọ nwaanyị ahụ n’amịnyeghị ya ọbara.c Lee ajụjụ abụọ dị mma unu nwere ike ịjụ dọkịta. Nke mbụ: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọbara karịrị akarị agbapụ nwaanyị ma ọ bụ nwa ya n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ ma e nwee nsogbu ndị ọzọ dapụtaranụ? Nke abụọ: Ọ bụrụ na ị nọghị nso mgbe ime mewere nwaanyị a, olee ndokwa ndị ọzọ i merela iji hụ na e mere ihe nwaanyị a dị ime chọrọ?
N’eziokwu, nwaanyị maara ihe kwesịrị ịgwa dọkịta ya ka o lee ya ahụ́ ma chọpụta ma ọbara ya ọ̀ harukwara otú o kwesịrị tupu ime emewe ya. Dọkịta n’onwe ya nwere ike ịgwa nwaanyị ahụ dị ime ka ọ na-aṅụ ọgwụ a na-akpọ fọlik asid na ọgwụ ndị ọzọ na-enye aka eme ka mmadụ nwekwuo ọbara.
E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ dọkịta ahụ ga-elebara anya. Dị ka ihe atụ, n’oge ndị nwaanyị ahụ dị ime bịara ụlọ ọgwụ, ò nwere ọrịa ọ chọpụtara na e kwesịrị ilebara anya? Ọ̀ dị mkpa ka nwaanyị ahụ ghara ịna-akwụkarị ọtọ? Ọ̀ dị mkpa ka ọ na-ezukwu ike? Ọ̀ ga-adị mma ma o nwetakwuo ahụ́ ma ọ bụ ka ọ tatụkwuo ahụ́ ma ọ bụkwanụ ka ọ na-emegakwu ahụ́? Ọ̀ dị mkpa ka ọ na-adịkwu ọcha, nke gụnyere ịhụ na ezé ya na ọnụ ya dị ọcha?
Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ọ bụrụ na nwaanyị dị ime ebute ọrịa n’agbụ̀ ya, o nwere ike ịkpatara ya ọrịa nke nwere ike ime ka ihe ọdụdọ dọwa ya, ma ọ bụ kpatara ya ọbara mgbali elu, oké isi ọwụwa, na akụkụ ahụ́ ụfọdụ ịza aza (nke ihe na-akpata ya bụ mmiri ịgbakọju n’ebe ụfọdụ n’ahụ́).d Ọrịa ndị a nwere ike ime ka nwaanyị mụọ nwa mgbe oge na-erubeghị, o sokwa n’otu ihe kacha egbu nwaanyị dị ime na nwa ya, karịchaa ná mba ndị ka na-emepe emepe.
N’ezie, dọkịta anya ruru ala agaghị eleghara ọrịa ọ bụla ọ chọpụtara n’ahụ́ nwaanyị dị ime anya. Ọ bụrụkwa na e nwee ka ime si mewe ya mgbe oge na-erubeghị, o kwesịrị ime ngwa ngwa nye ya àkwà n’ụlọ ọgwụ iji hụ na a zọrọ ndụ ya na nke nwa ya.
Onyeisi Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ụmụ Nwaanyị Ịmụ Nwa n’Udo nke Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike bụ́ Kasi Monirul Islam, kwuru, sị: “Ụmụ nwaanyị na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ iji nye ndị ọzọ ndụ.” Ma ọ bụrụ na ndị ụlọ ọgwụ elekọta ha anya nke ọma mgbe ha dị ime, mgbe ha na-amụ nwa, na ozugbo ha mụchara nwa, e nwere ike igbochi ọtụtụ nsogbu ndị nwere ike ịpụta, ma ọ bụdị gbochie ọnwụ. Nke ka mkpa bụ, gbalịa hụ na ahụ́ dị gị mma. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụta nwa ahụ́ gbasiri ike, i kwesịrị ịgbalịsi ike hụ na ahụ́ gbasiri gịnwa ike.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe okwu Hibru e si na ya sụgharịta amaokwu a na-ekwu bụ ma nwaanyị ahụ ma ọ bụ nwa o bu n’afọ nwụọ.
b Gụọ igbe bụ́ “Ihe Ndị I Kwesịrị Ime Mgbe Ị Dị Ime.”
c Tupu nwaanyị dị ime agawa ụlọ ọgwụ, di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova nwere ike ime ka Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Ndịàmà Jehova na Ndị Ụlọ Ọgwụ mara na nwaanyị ahụ na-aga ịmụ nwa. Ndị so na kọmitii a na-aga n’ụlọ ọgwụ dị iche iche na-akọwara ndị dọkịta ụzọ ndị ha nwere ike isi gwọọ Ndịàmà n’amịnyeghị ha ọbara. Ihe ọzọkwa bụ na ndị kọmitii a nwere ike inyere onye ọrịa aka ịchọta dọkịta ga-ekwe gwọọ ya n’amịnyeghị ya ọbara, nakwa onye bụ́ aka ochie n’ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara.
d Ọ bụ eziokwu na a ka ga-eme nnyocha iji chọpụta ma ọrịa agbụ̀ ọ na-akpata ọrịa ndị a e kwuru, ọ dị ezigbo mkpa na nwaanyị dị ime ga na-elebara ezé ya na agbụ̀ ya anya nke ọma.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
Dị ka e kwuru n’otu akwụkwọ e bipụtara n’Ọktoba 2007, otu nwaanyị na-anwụ n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nkeji ọ bụla—nke a pụtara na ụmụ nwaanyị narị puku ise na puku iri atọ na isii na-anwụ kwa afọ n’ihi nsogbu ndị ha na afọ ime so.—O si n’aka Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Ndị Bi n’Ụwa
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
“Kwa afọ, ihe karịrị nde ụmụ ọhụrụ atọ na-anwụ n’ime afọ tupu a mụpụta ha, ihe karịkwara nde ụmụ ọhụrụ anọ na-anwụ n’ime ụbọchị iri abụọ na asatọ a mụchara ha.”—O si na magazin bụ́ UN Chronicle
[Igbe dị na peeji nke 4]
IHE NDỊ I KWESỊRỊ IME MGBE Ị DỊ IME
1. Lezie anya chọta nwaanyị na-aghọ nwa n’ụlọ ọgwụ, dọkịta, ma ọ bụ ụlọ ọgwụ ebe a ga-elekọta gị anya nke ọma.
2. Hụ na ị na-agachi anya na nke dọkịta gị ma ọ bụ na nke nwaanyị na-aghọ nwa n’ụlọ ọgwụ ka gị na ya nwee ike ịghọ enyi ma nwee ike ịtụkwasị ibe unu obi.
3. Na-elebara onwe gị anya nke ọma. Ọ bụrụ na o kwe mee, na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ ndị na-edozi ahụ́ a na-enye ndị dị ime, ma agakwala zụrụ ọgwụ ọ bụla ma ọ bụrụ na dọkịta gị agwaghị gị mee otú ahụ. Ọ ka mma izere mmanya ọ bụla na-aba n’anya. Otu òtù na-ahụ maka ịṅụ oké mmanya kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ụmụ ọhụrụ ndị nne ha na-aṅụ oké mmanya ka ọ na-aka enye nsogbu, o dochabeghị anya ma ọ̀ dị mma nwaanyị ịṅụtụdị mmanya na-aba n’anya mgbe ọ dị ime.”
4. Ọ bụrụ na ime emewe gị mgbe oge na-erubeghị (nke bụ́ tupu ime gị eruo izu iri atọ na asaa), gaa hụ dọkịta ma ọ bụ gaa ụlọ ọgwụ ebe a na-ahụ maka ndị dị ime ozugbo. E lebara gị anya ozugbo, o nwere ike ime ka ị ghara ịmụ nwa gị mgbe oge ya na-erubeghị, gbochiekwa nsogbu ndị ọzọ nwere ike ịdapụta.e
5. Detuo ihe ọ bụla i kpebiri banyere otú ị chọrọ ka e si gwọọ gị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ dị mma idejupụta kaadị DPA ma ọ bụ kaadị ọzọ iwu kwadoro ka a na-edejupụta ná mba ha tupu ha agawa ịmụ nwa.
6. Ị mụchaa nwa, na-elebakwara onwe gị na nwa gị anya, karịchaa ma ọ bụrụ na ị mụrụ nwa ahụ mgbe oge na-erubeghị. Ị chọpụtahaala nsogbu ọ bụla, gaa hụ dọkịta na-elekọta ụmụaka ozugbo.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
e A na-amịnyekarị ụmụ a mụrụ mgbe oge na-erubeghị ọbara ma ọ bụrụ na ọbara kọrọ ha n’ahụ́, n’ihi na ahụ́ ha anaghị emepụtali ọbara otú o kwesịrị.