Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
1 “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ.” (Abụ Ọma 127:3) Ọ bụrụ na unu nwere ihe nketa dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa site n’aka Jehova, unu, dị ka nne na nna nwere ibu ọrụ obi ụtọ, ọ bụ ezie na o siri ike, ịzụ, ilekọta, na ichebe ụmụ unu. Dị ka ihe atụ, ùnu ewerewo nzọụkwụ ọ bụla ezi uche dị na ya iji chebe ụmụ unu pụọ ná mmịnye ọbara? Olee otú ụmụ unu ga-esi meghachi omume ma ọ bụrụ na ọnọdụ mmịnye ọbara na-eche ha ihu? Ùnu atụlewo dị ka ezinụlọ ihe unu pụrụ ime iji mee ihe n’ụzọ dị irè banyere ọnọdụ mberede nke yiri ka a ga-eji mmịnye ọbara mee ihe?
2 Ịkwadebe ụmụ gị maka ọnọdụ ndị dị otú ahụ ekwesịghị ịkpata nchegbu ma ọ bụ nchekasị na-ekwesịghị ekwesị. Unu apụghị ịtụ anya ma kwadebe maka ọnọdụ ihe ndapụta ọ bụla ná ndụ, ma e nwere ọtụtụ ihe unu, dị ka ndị mụrụ ụmụ, pụrụ ime tupu oge eruo iji chebe ụmụ unu pụọ ná mmịnye ọbara. Ileghara ibu ọrụ ndị a anya pụrụ ime ka a mịnye nwa unu ọbara mgbe ọ na-enweta nlekọta ahụ ike. Gịnị ka a pụrụ ime?
3 Nkwenye Siri Ike Dị Mkpa: E kwesịrị ichebara otú nkwenye i nwere n’ebe iwu Chineke banyere ọbara dị siruru ike echiche. Ị̀ na-akụziri ụmụ gị irubere Jehova isi n’okwu a, dị ka i si akụziri ha iwu ya banyere ime ihe n’eziokwu, nnọpụiche, na akụkụ ndị ọzọ nke ndụ? Ànyị na-eche echiche n’ezie n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Chineke nyere na Deuterọnọmi 12:23: “Nanị, dị ike ka ị ghara iri ọbara”? Amaokwu nke 25 na-agbakwụnye, sị: “Erila ya; ka o wee dịrị gị mma, dịkwara ụmụ gị ga-anọchi gị, mgbe ị ga-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova.” Onye dọkịta pụrụ ịzọrọ na ọbara ga-eme ka ‘ihe dị mma’ maka nwa gị na-arịa ọrịa, ma ị ghaghị ikpebisi ike tupu ọnọdụ mberede ebilite na gị na ụmụ gị ga-ajụ ọbara, na-ewere mmekọrịta unu na Jehova dị ka ihe dị elu karịa mgbatị ọ bụla e kwuru na a ga-agbatị ndụ, bụ́ nke ga-agụnye imebi iwu Chineke. Ọ na-agụnye inwe ihu ọma Chineke ugbu a na ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu!
4 Ee, Ndịàmà Jehova nwere mmasị ná ndụ. Ha achọghị ịnwụ. Ha chọrọ ịdị ndụ ka ha wee nwee ike ito Jehova na ime uche ya. Nke ahụ bụ otu ihe mere ha ji aga ụlọ ọgwụ ma na-akpọga ụmụ ha ebe ahụ maka ọgwụgwọ. Ha na-agwa ndị dibịa ka ha gwọọ ha, mgbe a gwakwara ha na ọbara bụ ụkpụrụ e nwere ma ọ bụ usoro ọgwụgwọ ahụ ike a ga-eji mee ihe, ha na-ekwu ka e jiri usoro ọgwụgwọ ọzọ na-adịghị achọ ọbara mee ihe. E nwere ọtụtụ ihe n’ọnọdụ ọbara. Ndị dibịa nwere ahụmahụ ji ha eme ihe. Usoro ọgwụgwọ ọzọ dị otú ahụ abụghị ọgwụ dibịa adịgboroja kama ihe mejupụtara ya bụ ọgwụgwọ ọrịa na usoro ahụ ike dị mma ndị e depụtara n’akwụkwọ ahụ ike ndị a ma ama. Ọtụtụ puku dibịa gburugburu ụwa na-enye anyị nkwado n’inye nlekọta ahụ ike dị mma n’ejighị ọbara eme ihe, ọ bụ ezie na ọ ka bụ nsogbu mgbe ụfọdụ ịchọta ndị dibịa ga-agwọ ụmụaka Ndịàmà n’ejighị ọbara eme ihe.
5 Ịchọta Dọkịta Na-ekwenye Ekwenye: Ndị dibịa nwere ọtụtụ ihe na-echegbu ha banyere ịgwọ ndị ọrịa, mgbe ị gwakwara ha ka ha gwọọ nwa gị n’ejighị ọbara, nke a na-amụba ihe ịma aka ahụ. Ndị dibịa ụfọdụ ga-ekwere ịgwọ ndị meworo okenye ma na-akwanyere ọchịchọ ha ùgwù n’okwu ọbara ọ bụrụhaala na e dejupụtara fọm ntọhapụ a na-anakwere. N’otu aka ahụ, ụfọdụ pụrụ ikwere ịgwọ ụmụaka gosipụtaworo na ha bụ ụmụaka tozuru okè, ebe ọ bụ na ụlọikpe ụfọdụ aghọtawo na ụmụaka tozuru okè nwere ikike ime nhọrọ nlekọta ahụ ike nke ha. (Lee Ụlọ Nche, June 15, 1991, peji nke 16-17, maka ntụle nke ihe nwatakịrị tozuru okè pụtara.) Ma, ndị dibịa pụrụ ịla azụ n’ịgwọ obere ụmụaka, karịsịa ụmụ ọhụrụ, ọ gwụla ma e nyere ha ikike inye ọbara. N’ezie, ọ bụ nnọọ ndị dibịa ole na ole ga-enye mmesi obi ike dị 100 pasent na ha agaghị eji ọbara mee ihe n’ọnọdụ ọ bụla mgbe ha na-agwọ nwatakịrị. N’ihi ihe ndị metụtara ọrụ ahụ ike na okwu iwu, ihe ka ọtụtụ ná ndị dọkịta chere na ha apụghị inye mmesi obi ike dị otú ahụ. Ka o sina dị, ọnụ ọgụgụ na-arị elu chọrọ inye ụmụ Ndịàmà Jehova nlekọta ma na-eme ihe nile ha chere na ha pụrụ ime n’ịkwanyere ọchịchọ anyị banyere ọbara ùgwù.
6 N’ihi nke a, gịnị ma ọ bụrụ na, n’ọchịchọ ị na-achọ dọkịta kwesịrị ekwesị maka nwa gị, i wee chọta otu nke na-ekwenyere Ndịàmà Jehova nke ọma, na onye jiworo usoro na-agụnyeghị ọbara gwọọ Ndịàmà n’oge gara aga, ma o chere na iwu ekweghị ka o nye gị mmesi obi ike zuru ezu na a gaghị eji ọbara mee ihe? Ma, ọ na-emesi gị obi ike na ya chere na nsogbu agaghị adị n’oge nke a kwa. Ị pụrụ ikpebi na nke a bụ nhọrọ kasị mma nye gị. N’okpuru ọnọdụ ndị a, i nwere ike ikpebi na ị pụrụ inye ikike ịga n’ihu. Otú ọ dị, mee ka o doo anya nke ọma na n’inye ikike maka ọgwụgwọ ahụ ike nke nwa gị, ị dịghị enye ikike maka mmịnye ọbara. Ịgbaso ụzọ a ga-abụ ibu ọrụ ị ga-eburịrị, a gaghịkwa ele mkpebi gị anya dị ka mmebi okwukwe.
7 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị pụrụ ịchọta usoro ọgwụgwọ ọzọ ezi uche dị na ya nke ga-ebelatakwu ma ọ bụ wepụ kpam kpam nsogbu nke iji ọbara mee ihe, mgbe ahụ o yiri ka ị ga-agbaso ụzọ na-adịchaghị ize ndụ. A ga-atụ anya na ị ga-eme ezi mgbalị iji chọta dibịa ma ọ bụ dọkịta na-awa ahụ nke ga-akasị onye ọ bụla ọzọ kwere ịghara inye ọbara. Nchebe kasị mma bụ ịtụ anya nsogbu. Mee mgbalị nile ịchọta dọkịta na-ekwenye ekwenye tupu oge eruo. N’ebe o kwere omume, agala ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ na-adịghị enye nkwado nso.
8 N’ala ụfọdụ ihe ọzọ pụrụ ikpebi ma a ga-amịnye ọbara bụ otú a ga-esi kwụọ ụgwọ nlekọta ụlọ ọgwụ. N’ebe ndị mụrụ ụmụ nwere inshọransị ahụ ike ma ọ bụ nchebe ndị ọzọ na-enye ohere maka ịchọta dọkịta nke ha chọrọ, ọ pụrụ ịka mfe ichebe ụmụaka pụọ n’aka ndị dibịa ma ọ bụ ndị ọrụ ụlọ ọgwụ na-adịghị ekwenye ekwenye. Nchebe zuru ezu n’ụzọ ego na-ekpebikarị ụdị ozi na nkwado ezinụlọ na-anata site n’aka ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ dị iche iche. Ọzọ, ma ụlọ ọgwụ ma ọ bụ dibịa ọ̀ dị njikere ikwe ka a kpọga nwatakịrị n’ụlọ ọgwụ ọzọ ga-adaberekarị n’ikike ndị mụrụ ya nwere ịkwụ ụgwọ nlekọta ahụ ike. Ndị na-agakwa ịghọ nne, ọ dị mkpa ka unu lekọta ahụ ike unu n’oge unu dị ime! Nke a ga-eme ihe dị ukwuu n’igbochi ịmụ nwa n’oge erughị eru na nsogbu ndị ha na ya na-agakọ, ebe ọ bụ na ọgwụgwọ bụ isi maka ụmụ ọhụrụ a mụrụ n’oge erughị eru na nsogbu ha na-agụnyekarị ọbara.
9 Mgbe ụfọdụ ndị dibịa na-eme mkpesa na Ndịàmà Jehova adịghị ekwu na ha achọghị ọbara ruo mgbe oge fọrọ nnọọ nke nta. Nke a ekwesịghị ịdị otú ahụ ma ọlị. Otu n’ime ihe mbụ nne na nna bụ́ Ndịàmà kwesịrị ime mgbe ha na-aga ụlọ ọgwụ ma ọ bụ mgbe ha na-agakwuru onye dibịa bụ ikwu ihe bụ nguzo ha banyere ọbara. Ọ bụrụ na ọ gụnyere ịwa ahụ, kwuo na ị ga-achọ ibu ụzọ soro dibịa na-ahụ maka ịkụnwụ ahụ kparịta. Dọkịta ahụ na-awa ahụ pụrụ inwe ike inyere gị aka n’ime nke a. E kwesịrị iji nlezianya nyochaa fọm nnabata. I nwere ikike ịkagbu ihe ọ bụla ị na-achọghị. Iji wepụ obi abụọ ọ bụla, denye n’ụzọ doro anya na fọm nnabata ahụ na n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe na ahụ ike, a chọghị ma ọ bụ na a dịghị anabata ọbara n’ọnọdụ ọ bụla.
10 Enyemaka Si ná Nzukọ Jehova: Ndokwa ndị dị aṅaa ka nzukọ Jehova meworo iji nyere gị aka ichebe nwa gị n’ebe ọbara dị? Ha dị ọtụtụ. Society ebipụtawo ọtụtụ ihe iji zie anyị ihe banyere ọbara na usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ na-agụnyeghị ọbara. Ị mụwo broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? na akwụkwọ ndị ọzọ n’isiokwu a. I nwekwara ụmụnna gị nwoke na ụmụnna nwanyị n’ọgbakọ gị ndị pụrụ inye gị nkwado na enyemaka dị ukwuu. Mgbe e nwere nsogbu, ndị okenye pụrụ iwere ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị idokwa maka iche nche hour 24 n’ụlọ ọgwụ, nke ga-akasị mma ma ọ bụrụ onye okenye na nne ma ọ bụ nna onye ọrịa ahụ ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ ọzọ nọ nso. A na-enyekarị mmịnye ọbara mgbe ndị ikwu na ndị enyi nile laworo ụlọ ihi ụra abalị.
11 Na United States, e nwere ihe karịrị otu narị Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ n’obodo ukwu ndị bụ isi. Na Nigeria, anyị nwere 42 ugbu a. E kenyere ọgbakọ nke ọ bụla otu kọmitii nke ụmụnna e nyere ọzụzụ dị njikere inye aka mejupụtara. Kpọtụrụ ha, site n’aka ndị okenye gị, mgbe e nwere mkpa ha. E kwesịghị ịkpọ ha banyere obere nsogbu, ma echerela ruo ogologo oge tupu ị kpọọ ma ọ bụrụ na a chọpụtara na nsogbu siri ike pụrụ ịdị na-ebilite. Ọtụtụ mgbe ha pụrụ inye aha ndị dibịa na-ekwenye ekwenye na aro banyere usoro ọzọ. N’ebe ọ dị mkpa ma kwesị ekwesị, ụmụnna ndị a na-edokwa ịnọ n’ebe ahụ ma nye aka n’ịhụ maka nsogbu ahụ. Biko cheta na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ enweghị ike inye enyemaka ego.
12 Ọ bụghị nzube nne na nna bụ́ Ndịàmà ‘igbu ụmụ ha n’ihi okwukwe.’ Ọ bụrụ nzube ha, gịnị mere ha ga-eji kpọga ụmụaka ahụ n’ụlọ ọgwụ ná mmalite? N’ụzọ dị iche, nne na nna bụ́ Ndịàmà ji ọchịchọ obi na-achọ ọgwụgwọ ahụ ike maka ụmụ ha. Ha hụrụ ụmụ ha n’anya, chọọkwa ka ha nwee ezi ahụ ike. Ma ha kwenyere na ha nwere ọrụ Chineke nyere ha ime ezi nhọrọ n’ụdị ọgwụgwọ ahụ ike kasị mma maka ụmụ ha. Ha chọrọ ka a hụ maka nsogbu ahụ ike ụmụ ha n’ejighị ọbara. Ọ bụghị nanị na nlekọta dị otú ahụ e ji eme ihe n’ọnọdụ ọbara ka mma, dịkwa nchebe karị, ma nke kasịnụ, ọ na-eme ka ụmụ ha nwee ihu ọma nke Onye Na-enye Ndụ ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke.
13 N’agbanyeghị abamuru nke ọgwụgwọ ahụ ike nke na-agụnyeghị ọbara, ọtụtụ dọkịta na-ele usoro ọgwụgwọ e ji mmịnye ọbara enye anya dị ka usoro ahụ ike bụ isi nke pụrụ ịdị mkpa ma ọ bụ ọbụna na-azọpụta ndụ n’ọnọdụ ụfọdụ. N’ihi ya, mgbe nne na nna bụ́ Ndịàmà jụrụ mmịnye ọbara e kwuru ka e nye, nsogbu pụrụ ibilite. N’ozuzu ha, ndị dọkịta apụghị inye ụmụaka ọgwụgwọ n’ụzọ iwu kwadoro ma ọ bụrụ na nne na nna ekwenyeghị. Ịmara nke a na-eme ka ịdị mkpa nke ịchọta dọkịta na-ekwenye ekwenye pụta ìhè. Soro ya rụọ ọrụ, sitekwa n’enyemaka sitere n’aka ndị òtù Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ gị, nyere ya aka iji usoro ọgwụgwọ na-agụnyeghị ọbara mee ihe banyere nsogbu ahụ ike nwa gị ma ọ bụ kpọga nwa gị na nke dọkịta ma ọ bụ ụlọ ọgwụ nke ga-enye ụdị ọgwụgwọ ahụ.
14 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na dọkịta ma ọ bụ ụlọ ọgwụ ajụọ gị ihe mere i ji ajụ mmịnye ọbara “na-azọpụta ndụ” maka nwa gị? Ọ bụ ezie na echiche mbụ gị pụrụ ịbụ ịkọwa nkweta gị ná mbilite n’ọnwụ na ikwupụta okwukwe gị siri ike na Chineke ga-akpọghachite nwa gị ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, azịza dị otú ahụ nanị nwere ike ghara ime ihe karịrị ime ka ha kwenye na ị bụ onye na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè.
15 Ihe ọ dị ha mkpa ịmara bụ na, ọ bụ ezie na ị na-ajụ ọbara n’ihi nkweta okpukpe ndị miri emi, ị dịghị ajụ nlekọta ahụ ike. Ọ dị ha mkpa ịhụ na unu abụghị nne na nna na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe ma ọ bụ nke na-emetọ ụmụaka, kama nke ahụ, nne na nna na-ahụ n’anya ndị chọrọ ka a gwọọ nwa ha. I kwenyeghị ma ọlị na uru a na-ekwu na ọbara bara karịrị oké ihe ize ndụ na nsogbu ọ pụrụ ịkpata, karịsịa mgbe e nwere ụzọ ndị ọzọ nke nlekọta ahụ ike na-ebughị ihe ize ndụ ndị a.
16 Na-adabere n’ọnọdụ dịnụ, ị pụrụ ime ka ha mara na ọ bụ otu dọkịta chere na ọbara dị mkpa, ma ndị dọkịta dịgasị iche iche n’ụzọ ha si eme ihe, na ohere nke ịchọta dọkịta ga-eji usoro ọgwụgwọ na-agụnyeghị ọbara lekọta nwa gị ga-amasị gị. Site n’enyemaka Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ, ọ pụrụ ịbụ na ị chọtawo dọkịta dị otú ahụ nke ga-agwọ nwa gị n’ejighị ọbara. O yikarịrị ka kọmitii mmekọrịta ahụ ga-enwe ike inye ha ihe odide ahụ ike ndị na-egosi otú a pụrụ isi gwọọ nsogbu ahụ ike nwa gị n’ejighị ọbara mee ihe.
17 Ha maara banyere ọtụtụ ihe ize ndụ nke ọbara, tinyere ọrịa AIDS, ịba ọcha n’anya, na ọtụtụ ihe ọghọm ọzọ. Ị pụrụ ichetara ha ihe ndị a, ị pụkwara ime ka ha mara na gị, dị ka nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst, ga-ele iji ọbara onye ọzọ mee ihe ná mgbalị ijigide ndụ anya dị ka oké mmebi nke iwu Chineke nakwa na a ga-ele ịmịnye nwa gị ọbara n’ike anya dị ka ihe ya na ndina n’ike bụ otu ihe ahụ. Gị na nwa gị (ma ọ bụrụ na o toruwo ogo inwe ihe ndị o kwere na ha) pụrụ ịkọwa oké ịkpọasị unu nwere maka mwakpo dị otú ahụ, nweekwa ike ịrịọ ha ka ha ghara ịmịnye ọbara kama ka ha jiri ọgwụgwọ ahụ ike a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ ọbara mee ihe maka nwa gị.
18 N’imeso ndị na-achọ ịmịnye ọbara n’ike ihe, ọ dị mkpa na ọ dịghị mgbe i nyere ihe àmà ọ bụla nke akwụsighị ike ná nkwenye gị. Mgbe ụfọdụ ndị ọrụ ụlọ ọgwụ na-ajụ ndị mụrụ ụmụ ma hà ga-enwe ihe isi ike ọ bụla “inyefe” ha ibu ọrụ nke ikpebi ịmịnye ọbara, na-eche na nke a ga-eme ka ọ dịrị ndị nne na nna ahụ mfe karị ịghara inwe nsogbu akọ na uche. Ma e kwesịrị ime ka o doo ndị nile o metụtara anya na unu, dị ka nne na nna, nwere ibu ọrụ nke ịnọgide na-eme ihe nile unu pụrụ ime iji zere mmịnye ọbara. Nke a bụ ibu ọrụ Chineke nyere unu. A pụghị inyefe ya onye ọzọ.
19 Ya mere, n’ịgwa ndị dọkịta okwu, i kwesịrị ịdị njikere ịkọwapụta nguzo gị n’ụzọ doro anya na n’ụzọ na-eme ka e kwenye. Nọgide na-arịọ dibịa ahụ ka ọ ghara ịmịnye ọbara ma na-akwado usoro ọgwụgwọ ọzọ. Nọgide na-ekwu ka o nwee ọchịchọ icheba echiche n’ihe odide ahụ ike na ndụmọdụ nke ndị dọkịta ọ bụla dị njikere ka a kpọtụrụ ha banyere nsogbu ahụ ike iji zere ọbara. Ugboro ugboro, dọkịta a matara na ọ dịghị ekwe ekwe esiwo n’ọnụ ụlọ ịwa ahụ pụta ma jiri ịnya isi kwupụta na ya ejighị ọbara mee ihe. Ya mere, adala mbà ma ọlị, ihe ọ sọrọ ya bụrụ!—Lee mbipụta Ụlọ Nche nke June 15, 1991, “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ.”
20 “Onye nwere uche n’okwu Chineke ga-achọta ezi ihe: ọzọ, onye na-atụkwasị Jehova obi, onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ.” (Ilu 16:20) Nne na nna, meenụ nkwadebe ndị kwesịrị ekwesị tupu oge eruo iji chebe nwa unu pụọ ná mmịnye ọbara na-emetọ emetọ n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 22:3) Ụmụ, nakwerenụ ọzụzụ ndị mụrụ unu na-enye n’ime nkwadebe ndị a ma tinyenụ ha n’obi unu. Dị ka ezinụlọ, “dị ike ka ị ghara iri ọbara . . . ka o wee dịrị gị mma” n’ihi na unu nwere ngọzi na nnwapụta Jehova.—Deut. 12:23-25.