Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/15 p. 13-18
  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Jehova Ziworo Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Jehova Ziworo Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbụ Ndị E Ziri Ihe Banyere Ọbara
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbụ Ndị E Ziri Ihe
  • Ndị Mụrụ Ụmụ —Na-ezinụ Ihe Nke Ọma
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/15 p. 13-18

Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Jehova Ziworo Ihe

“Zi m ụzọ gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.”—ABỤ ỌMA 86:11.

1, 2. Gịnị na-akpali Ndịàmà Jehova ịjụ ịnara mmịnye ọbara?

“MA ELEGHỊ anya, Ndịàmà Jehova ziri ezi n’ịjụ iji ihe ndị e si n’ọbara mepụta na-eme ihe, n’ihi na ọ bụ eziokwu na a pụrụ isite n’ọbara a mịnyere amịnye bufee ọtụtụ ihe ndị na-akpata ọrịa.”—Akwụkwọ nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike ndị French a na-ebipụta kwa ụbọchị, bụ́ Le Quotidien du Médecin, December 15, 1987.

2 Ụfọdụ n’ime ndị gụrụ okwu ahụ pụrụ icheworịị na ọ bụ ihe ndaba nkịtị na Ndịàmà Jehova na-ajụ mmịnye ọbara ogologo oge tupu ọ ghọọ ihe a mazuru ebe nile, bụ́ otú o si bụrụ ihe ize ndụ, nke pụrụ ọbụna ịkpata ọnwụ. Ma ebe Ndịàmà Jehova guzo n’ihe metụtara ọbara abụghị ihe ndapụta efu, ọ bụghịkwa ụkpụrụ nke ndị nọ n’otu òtù nke na-adịghị ka ibe ha guzobere, bụ́ echiche nke gbanyere mkpọrọgwụ n’egwu nke bụ na ọbara bụ ihe dị ize ndụ. Kama nke ahụ, Ndịàmà ahụ na-ajụ ịnara ọbara n’ihi mkpebi siri ike ha mere ịnọgide na-ejegharị ná nrubeisi n’ihu Onye Ozizi Ukwu ha—bụ́ Chineke.

3. (a) Mmetụta dị aṅaa ka Devid nwere banyere ịdabere n’ebe Jehova nọ? (b) Gịnị ka Devid tụrụ anya inweta n’ihi ịtụkwasị Chineke obi?

3 Eze Devid, bụ́ onye nwere mmetụta nke ndabere ya n’ebe Chineke nọ, kpebisiri ike ịbụ onye o ziri ihe nakwa ‘ijegharị n’eziokwu ya.’ (Abụ Ọma 86:11) N’otu oge, a tụụrụ Devid aro na ọ bụrụ na o zere ịghọ onye ikpe ọbara mara n’anya Chineke, ‘mkpụrụ obi ya pụrụ ịbụ nke a fụchiri n’akpa nke ndụ nke Jehova ji.’ (1 Samuel 25:21, 22, 25, 29) Dị ka ụmụ mmadụ na-afụchi ihe ndị bara uru iji chebe ma chekwaa ha, otú ahụ ka Chineke pụrụ ichebe, chekwaakwa ndụ Devid. N’ịnara ezi ndụmọdụ ahụ, Devid achọghị ụzọ iji zọpụta onwe ya site ná mgbalị ndị o mere n’onwe ya, kama ọ tụkwasịrị Onye ahụ nke ndụ ya dabeere n’aka ya obi, sị: “Ị ga-eme ka m mara ụzọ ndụ: ojuju afọ ọṅụ dị n’ihu gị; ee! ụtọ dị iche iche dị n’aka nri gị ebighị ebi.”—Abụ Ọma 16:11.

4. N’ihi gịnị ka Devid ji chọọ ka Jehova zie ya ihe?

4 Site n’inwe àgwà dị otú ahụ, Devid echeghị na ya ga-eme nhọrọ n’onwe ya banyere iwu Chineke ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ndị ọ dị mkpa ka e rubere ha isi. Àgwà ya bụ: “Jehova, zi m ụzọ gị; durukwa m n’okporo ụzọ dị larịị.” “Zi m ụzọ gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị. M ga-eji obi m nile kelee gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke.” (Abụ Ọma 27:11; 86:11, 12) Mgbe ụfọdụ, ije ije n’eziokwu n’ihu Chineke pụrụ iyi ihe na-adịghị enyecha ntụsara ahụ ma ọ bụ bụrụ nke ga-achọ iji ihe dị ukwuu chụọ àjà, ma Devid chọrọ ka e zie ya ihe n’ụzọ nke ziri ezi, ka o jegharịakwa n’ime ya.

Ịbụ Ndị E Ziri Ihe Banyere Ọbara

5. Gịnị ka Devid ga-amataworị banyere echiche Chineke metụta ọbara?

5 Ọ bụ ihe kwesịrị ka anyị rịba ya ama na site na mgbe ọ dị na nwata gaa n’ihu, Devid abụwo onye a kụziiri echiche Chineke banyere ọbara, bụ́ echiche nke na-abụghị ihe omimi metụtara okpukpe. Mgbe a na-agụrụ ndị ahụ Iwu ahụ, Devid ga-anụworị nke a: “Ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị: mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụ àjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha: n’ihi na ọbara ka ọ bụ nke na-ekpuchi mmehie n’ime mkpụrụ obi. N’ihi nke a ka m sịrị ụmụ Israel, Ọ dịghị mmadụ ọ bụla n’etiti unu ga-eri ọbara, ọbịa kwa, nke nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ọ gaghị eri ọbara.”—Levitikọs 17:11, 12; Deuterọnọmi 4:10; 31:11.

6. Olee ụzọ o si bụrụ na ọ nọgidere na-adị mkpa ka a na-ezi ndị ohu Chineke ihe banyere ọbara?

6 Ruo ogologo mgbe Chineke nọgidere jiri Israel na-eme ihe ị ka ndị nke ya a kpọkọtara n’otu, ọ dị mkpa ka e zie ndị chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ ihe banyere ọbara. E si otú a zie ọgbọ dị iche iche nke ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ndị Israel ihe. Ma ozizi ihe dị otú ahụ ọ̀ ga-anọgide na-aga n’ihu mgbe Chineke nakweresịrị ọgbakọ ndị Kraịst, na-eme ka ha ghọọ “Israel nke Chineke”? (Ndị Galetia 6:16) Ee, n’ezie, otú ahụ ka ọ dị. Echiche Chineke banyere ọbara agbanweghị. (Malakaị 3:6) Ọnọdụ ya nke e kwupụtaworo banyere ịghara iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị adị tupu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ amalite ịdị irè, ọ nọgidekwara na-adị irè mgbe e mesịrị ka Iwu ahụ kwụsị ịdị irè.—Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 15:28, 29.

7. N’ihi gịnị ka ịbụ ndị Chineke ziri ihe banyere ọbara ji dị anyị mkpa?

7 Ịkwanyere ọbara ùgwù bụ isi ihe dị n’Iso Ụzọ Kraịst. Ụfọdụ ndị pụrụ ịjụ, sị, ‘Nke ahụ ọ́ bụghị ikwu okwu karịa otú ihe dị n’ezie?’ Ma, gịnị bụ isi ihe dị n’Iso Ụzọ Kraịst ma ọ́ bụghị àjà Jisọs? Pọl onyeozi dekwara, sị: “Anyị sitere n’ọbara [Jisọs] nwee mgbapụta anyị n’ime ya, bụ́ mgbaghara nke ndahie nile anyị, dị ka akụ nke amara ya si dị.” (Ndị Efesọs 1:7) Nsụgharị The Inspired Letters, nke Frank C. Laubach sụgharịrị dere amaokwu a otú a, sị: “Ọbara Kraịst kwụrụ ụgwọ isi anyị, ugbu a anyị bụkwa nke Ya.”

8. N’ụzọ dị aṅaa ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ si dabere n’ọbara maka ndụ?

8 Ndị nile nwere olileanya ịlanarị “oké mkpagbu” ahụ nke na-abịanụ nakwa irite uru ngọzi dị iche iche nke Chineke n’elu ala nke bụ paradaịs dabeere n’ọbara Jisọs nke a wụfuru. Mkpughe 7:9-14 na-akọwa ha, na-ekwukwa banyere ihe ha mewororịị eme, sị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.” Rịba ama ụdị asụsụ e ji mee ihe n’ebe a. Ọ naghị ekwu na ndị a a zọpụtara gabiga mkpagbu ahụ ‘anarawo Jisọs’ ma ọ bụ ‘etinyewo okwukwe na ya,’ ọ bụ ezie na ihe ndị ahụ bụ ihe ndi dị mkpa n’ezie. Ọ gakwuru n’ihu wee sị na ha ‘sara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara [Jisọs].’ Nke ahụ bụ n’ihi na ọbara ya nwere ike nke mgbapụta.

9. N’ihi gịnị ka irubere Jehova isi banyere ọbara ji bụrụ ihe dị oké mkpa?

9 Inwe ekele maka abamuru nke a na-enyere Ndịàmà Jehova aka ikpebisi ike ịghara iji ọbara mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọbụna ma a sị na onye ọkà n’ịgwọ ọrịa ji obi eziokwu kwuo na mmịnye ọbara dị mkpa. Ọ pụrụ iche na uru ndị a pụrụ irite site ná mmịnye ọbara karịrị ihe ize ndụ ahụ ike ndị dị n’ọbara ahụ n’onwe ya. Ma onye Kraịst apụghị ilefuru anya ihe ize ndụ nke dị ukwuu ọbụna karị, bụ́ ihe ize ndụ nke ịtụfu nkwado Chineke site n’ikwenyere iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’otu oge, Pọl kwuru banyere ndị ahụ, bụ́ ndị “weere ọchịchọ obi na-anọ ná mmehie mgbe [ha] nataworo mmazu nke eziokwu.” N’ihi gịnị ka mmehie ọ bụla dị otú ahụ ji dị njọ nke ukwuu? Ọ bụ n’ihi na onye dị otú ahụ “bụ onye nke zọworo Ọkpara Chineke ụkwụ, onye gụwokwara ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ nke e ji doo ya nsọ, n’ihe e merụrụ emerụ.”—Ndị Hibru 9:16-24; 10:26-29.

Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbụ Ndị E Ziri Ihe

10. N’ihi gịnị ka anyị ji kpebisie ike izere ọbara?

10 Anyị, bụ́ ndị maara uru àjà mgbapụta Jisọs na-elezi anya ka anyị ghara ịdị na-eme mmehie, na-ajụ abamuru na-azọpụta ndụ nke ọbara ya. Mgbe anyị chebaworo echiche n’okwu ahụ, anyị na-aghọta na inwe ekele nye Chineke maka ndụ kwesịrị ịkpali anyị ịjụ imebi nke ọ bụla n’ime iwu ezi omume ya nile, bụ́ ndị anyị nwere obi ike na e bu ọdịmma anyị n’obi wee nye ha—ọdịmma anyị kasị mma ndị na-adịte anya. (Deuterọnọmi 6:24; Ilu 14:27; Eklisiastis 8:12) Ma, gịnị banyere ụmụ anyị?

11-13. Echiche dị aṅaa nke hiere ụzọ banyere ụmụ ha na ọbara ka ụfọdụ ndị Kraịst mụrụ ụmụ nwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

11 Mgbe ụmụ anyị ka bụ ndị e ku n’aka ma ọ bụ ndị bụ ụmụntakịrị nke ukwuu nke na ha apụghị ịghọta ihe ọ bụla, Jehova Chineke pụrụ ile ha anya dị ka ndị dị ọcha, ndị a na-anarakwa nke ọma n’ihe ndabere nke nrara anyị raara onwe anyị nye ya. (1 Ndị Kọrint 7:14) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ ezie na ka ọ dị ugbu a, ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ ndị Kraịst aghọtabeghị ihe, ma mee nhọrọ banyere irubere iwu Chineke banyere ọbara isi. Otú ọ dị, ànyị na-eme ihe nile anyị pụrụ ime iji zie ha ihe n’okwu nke a dị mkpa? Ndị Kraịst mụrụ ụmụ kwesịrị ịtụlesi nke ahụ ike, n’ihi na o yiri ka ụfọdụ ndị Kraịst mụrụ ụmụ nwere àgwà na-ezichaghị ezi banyere ụmụ ha n’ihe metụtara ọbara. O yiri ka ụfọdụ ndị na-eche na ha enweghị ike dị ukwuu n’ezie ikpebi ma à ga-amịnye ụmụ ha ọbara ma ọ bụ na a gaghị amịnye ha. N’ihi gịnị ka e ji nwee echiche nke a hiere ụzọ?

12 Ọtụtụ mba nwere iwu ma ọ bụ ụlọ ọrụ gọọmenti ndị na-echebe ụmụntakịrị ndị e lefuuru anya ma ọ bụ ndị a na-emekpọ ọnụ. Ọ bụghị nlefuru anya ma ọ bụ mmekpọ ọnụ ka a na-eme ụmụ Ndịàmà Jehova mgbe ndị mụrụ ha kpebiri ịjụ ka e nye nwa ha nwoke ma ọ bụ nwanyị ha hụrụ n’anya ọbara, na-arịọ n’otu mgbe ahụ ka e jiri usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ ndị nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike ọgbara ọhụrụ pụrụ inye wee mee ihe. Ọbụna n’ile ya anya n’ụzọ metụtara ọgwụ na ahụ ike, nke a abụghị nlefuru anya ma ọ bụ mmekpọ ọnụ, n’iburu n’uche ihe ize ndụ ndị a maara na ha dị n’iji mmịnye ọbara agwọ ọrịa. Ọ bụ iji ihe ruuru mmadụ mee ihe, bụ́ ịtụle ihe ize ndụ dịnụ ma họrọ ụdị ọgwụgwọ mmadụ chọrọ.a Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị ọrụ ụlọ ọgwụ echigharịkwuruwo iwu iji chọọ ka e nye ha ikike ịmanye ndị mmadụ amanye ịnara mmịnye ọbara.

13 Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ, bụ́ ndị maara na ọ pụrụ ịdịrị ndị ọrụ ụlọ ọgwụ mfe inweta nkwado ụlọ ikpe maka ịmịnye nwata ọbara, pụrụ iche na okwu ahụ adịghịzi ha n’aka, na ọ dịghị ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime ma ọ bụ ihe ọ dị mkpa ka ha mee. Lee nnọọ ka echiche ahụ si bụrụ nke hiere ụzọ!—Ilu 22:3.

14. Olee ụzọ e si zie Devid na Timoti ihe mgbe ha bụ ndị na-eto eto?

14 Anyị ekwuwo na e ziri Devid ihe banyere ụzọ nke Chineke site na mgbe ọ na-eto eto gaa n’ihu. Nke ahụ kwadebere ya ile ndụ anya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke nakwa ịmara na ọbara nọchiri anya ndụ. (Tụlee 2 Samuel 23:14-17.) E ziri Timoti ihe banyere echiche nke Chineke ‘site n’oge ọ dị na nwa ọhụrụ.’ (2 Timoti 3:14, 15) Ọ̀ bụ na i kwenyeghị na ọbụna mgbe Devid na Timoti na-erubeghị ihe e weere n’oge a dị ka afọ ndụ iwu na-ele mmadụ anya na o toruwo ogo mmadụ, na ha aghaghị inweworị ike ịkọwa onwe ha nke ọma n’ihe ndị metụtara uche Chineke? N’otu aka ahụ, ogologo oge tupu ha etoruo ogo mmadụ, ndị Kraịst na-eto eto taa kwesịrị ịbụ ndị e ziworo ihe n’ụzọ nke Chineke.

15, 16. (a) Echiche dị aṅaa ka a maliteworo inwe n’ebe ụfọdụ banyere ihe ruuru ụmụntakịrị? (b) Gịnị dujere n’otu nwata ịbụ onye e nyere ọbara?

15 N’ebe ụfọdụ, a na-enye ndị ahụ a na-akpọ ụmụntakịrị ndị tozuworo okè ikike yiri nke a na-enye ndị toruworo ogo mmadụ. N’ịdabere n’afọ ndụ ma ọ bụ n’iche echiche dị ka ndị tozuworo okè, ma ọ bụkwanụ na ha abụọ, a pụrụ ile onye na-eto eto anya dị ka onye tozuworo okè ruo n’ókè ime mkpebi nke onwe ya n’ihe banyere nlekọta ahụ ike. Ọbụna n’ebe nke a na-abụghị ihe iwu kwuru, ndị ọkà ikpe ma ọ bụ ndị ọrụ obodo pụrụ ịkwado echiche nke onye na-eto eto, bụ́ onye pụrụ ikwupụta nke ọma mkpebi siri ike o nwere n’ihe banyere ọbara. N’ụzọ megidere nke ahụ, mgbe onye na-eto eto na-apụghị ịkọwa ihe ndị o kwenyere na ha nke ọma, nakwa n’ụzọ gosiri ntozu okè, ndị ụlọ ikpe pụrụ iche na ha kwesịrị ikpebi ihe kasị mma ime, dị ka ọ ga-adị n’ihe banyere nwa ọhụrụ.

16 Otu nwa okorobịa amụwo Bible n’ụzọ na-echighị anya ruo ọtụtụ afọ ma o meghị baptism. N’agbanyeghị na ọ fọdụrụ nanị izu asaa ka o ruo afọ ndụ mgbe ọ ga-enweta “ikike ịjụ ịnara ọgwụgwọ n’onwe ya,” otu ụlọ ọgwụ nke na-agwọ ya ọrịa cancer gbalịrị inweta nkwado ụlọ ikpe iji mịnye ya ọbara n’ụzọ megidere ọchịchọ ya na nke ndị mụrụ ya. Ọkà ikpe ahụ nke ji ezi akọ na uche na-eme ihe jụrụ ya ajụjụ banyere nkwenkwe ya n’ihe metụtara ọbara wee jụọ ajụjụ ụfọdụ ndị bụ isi, dị ka aha akwụkwọ ise mbụ dị na Bible. Nwa okoro ahụ apụghị ịkpọtụ ha aha ma ọ bụkwanụ nye ihe àmà doro anya nke na-egosi na ọ ghọtara ihe mere o ji na-ajụ ịnara ọbara. Ọ bụ ihe mwute na ọkà ikpe ahụ nyere ike ka a mịnye ya ọbara, na-ekwu, sị: “Ọjụjụ ọ jụrụ ịnara mmịnye ọbara adabereghị ná nghọta tozuru okè nke nkwenkwe okpukpe ndị o nwere n’onwe ya.”

17. Ọnọdụ dị aṅaa ka otu nwa agbọghọ dị afọ 14 weere n’ihe banyere inye ya ọbara, gịnịkwa si na ya pụta?

17 Ọnọdụ pụrụ ịdị iche n’ihe banyere obere nwa nke e ziri ihe nke ọma n’ụzọ nile nke Chineke, onye na-ejegharịkwa n’eziokwu Ya. Otu onye Kraịst bụ nwata nwere otu ụdị ọrịa cancer ahụ nke a na-adịghị ahụkebe ụdị ya. Nwa agbọghọ nta ahụ na ndị mụrụ ya ghọtara, nakwerekwa ka otu onye ọkachamara nọ n’otu ụlọ ọgwụ a ma ama jiri ụdị ọgwụgwọ a hazigharịrị ahazigharị nke iji mmiri ọgwụ dị iche iche agwọ ọrịa na-elekọta ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, e wejere okwu ahụ n’ụlọ ikpe. Onye ọkà ikpe ahụ dere, sị: “D.P. gbara akaebe na ya ga-eguzogide mmịnye ọbara n’ụzọ ọ bụla ọ pụrụ iji mee ya. O lere mmịnye ọbara anya dị ka mwakwasị a na-awakwasị ahụ ya n’ike, jirikwa ya tụnyere idina mmadụ n’ike. Ọ rịọrọ Ụlọ Ikpe ahụ ka ha kwanyere nhọrọ o mere ùgwù ma hapụ ya ka ọ gaa n’ihu [n’ụlọ ọgwụ ahụ] n’enweghị mmịnye ọbara Ụlọ Ikpe nyere ike ka e mee.” Ọzụzụ ndị Kraịst nyeere ya aka n’oge ihe isi ike nke a.—Lee igbe.

18. (a) Olee nguzo siri ike nke otu nwa agbọghọ na-arịa ọrịa weere n’ihe banyere ịnara ọbara? (b) Gịnị ka onye ọkà ikpe kpebiri banyere ọgwụgwọ ya?

18 A nọ na-agwọ otu nwa agbọghọ dị afọ 12 ọrịa metụtara mkpụrụ ndụ ndị dị n’ọbara bụ leukemia. Otu ụlọ ọrụ na-elekọta ọdịmma ụmụaka weere okwu ahụ gaa n’ụlọ ikpe ka e wee mịnye ya ọbara ná mmanye. Onye ọkà ikpe ahụ kwubiri, sị: “L. agwawo ụlọ ikpe nke a n’ụzọ doro anya na ọ bụrụ na a nwaa anwaa ịmịnye ya ọbara, na ya ga-eji ike nile o nwere lụsoo mmịnye ọbara ahụ ọgụ. O kwuwo, ekwekwara m ihe o kwuru, na ya ga-eti mkpu, lụọkwa ọgụ, na ya ga-efopụ ihe ahụ e ji amịnye ọbara n’aka ya, gbalịakwa ịwụfu ọbara ahụ dị n’ime akpa ahụ e kokwasịrị n’elu àkwà ya. Agaghị m enye iwu ọ bụla nke ga-eme ka nwata nke a nwee ụdị ahụmahụ ahụ . . . N’ihe banyere onye ọrịa nke a, usoro ọgwụgwọ ahụ ụlọ ọgwụ nke a chọrọ iji mee ihe na-elebara ọrịa ahụ anya nanị n’ụzọ anụ ahụ. Ọ naghị elebara mkpa mmetụta nke nwa agbọghọ nke a nakwa nkwenkwe okpukpe ya anya.”

Ndị Mụrụ Ụmụ —Na-ezinụ Ihe Nke Ọma

19. Ibu ọrụ dị aṅaa nke pụrụ iche ka ndị mụrụ ụmụ na-aghaghị ibu n’ebe ụmụ ha nọ?

19 Ahụmahụ ndị dị otú ahụ nwere ihe mmụta dị ike nye ndị mụrụ ụmụ ndị chọrọ ka ndị nile nọ n’ezinụlọ ha na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Chineke n’ihe banyere ọbara. Otu n’ime ihe mere Abraham ji bụrụ enyi Chineke bụ na Ọ maara na nna ochie ahụ ‘ga-enye ụmụ ya na ụlọ ya, ndị ga-anọchi ya, iwu, ka ha wee debe ụzọ Jehova, ime ezi omume.’ (Jenesis 18:19) Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ịbụ eziokwu banyere ndị Kraịst mụrụ ụmụ taa? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-akụziri ụmụ gị ndị ị hụrụ n’anya ka ha na-eje ije n’ụzọ nke Jehova ka ha wee nwee ike ‘ịdị njikere mgbe nile inye onye ọ bụla nke jụrụ ha ajụjụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka olileanya ahụ nke dị n’ime ha, jirikwa obi dị umeala na nsọpụrụ dị omimi na-eme nke a’?—1 Pita 3:15.

20. Gịnị bụ isi ihe anyị ga-achọ ka ụmụ anyị mara, kwerekwa banyere ọbara? (Daniel 1:3-14)

20 Ọ bụ ezie na ọ ga-abụ ihe dị mma ka e mee ka ụmụ anyị mara banyere ihe ize ndụ nke ọrịa na ihe ize ndụ ndị ọzọ na-esite ná mmịnye ọbara, ịkụziri ụmụ anyị ihe n’iwu Chineke nke zuru okè banyere ọbara apụtaghị n’ụzọ bụ isi ịgbalị ime ka ha na-atụ ọbara egwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ọkà ikpe ajụọ nwa agbọghọ nta ihe mere na ọ chọghị ka e nye ya ọbara, azịza ya wee bụrụ na o chere na ọbara bụ ihe ize ndụ ma ọ bụ ihe na-atụ egwu, mmetụta dị aṅaa ka nke a pụrụ inwe? Onye ọkà ikpe ahụ pụrụ ikwubi na ọ bụ nanị etozughị okè na ịtụbiga egwu ókè na-eme ya, dị nnọọ ka ọ pụrụ ịtụ egwu ịwa ahụ iji wepụ appendix nke na ọ ga-ebe ákwá, megidekwa ịwa ahụ nke a, nke ọbụna ndị mụrụ ya chere na ọ bụ ihe kasị mma maka ya. Karịa nke ahụ, anyị hotara tupu ugbu a na isi ihe mere ndị Kraịst na-eji ajụ mmịnye ọbara abụghị na ọbara bụ ihe e merụrụ emerụ, kama na ọ bu ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke anyị na Onye Na-enye anyị Ndụ. Ụmụ anyị kwesịrị ịmara nke ahụ, marakwa na ihe ize ndụ ahụ ike ndị pụrụ isi n’ọbara bịa na-enyekwu anyị nkwado maka nguzo anyị n’ihe banyere okpukpe.

21. (a) Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịmụta banyere ụmụ ha na ụzọ Bible si ele ọbara anya? (b) Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi nyere ụmụ ha aka n’ihe banyere ọbara?

21 Ọbụrụ na i nwere ụmụ, ì ji n’aka na ha kwenyere n’ọnọdụ ahụ dabeere na Bible n’ihe banyere mmịnye ọbara, na ha pụrụ ịkọwakwa ya? Hà kwenyere n’ezie na ọnọdụ nke a bụ uche Chineke? Ò doro ha anya na imebi iwu Chineke ga-abụ ihe dị oké njọ nke na ọ pụrụ itinye olileanya onye Kraịst maka ndụ ebighị ebi n’ihe ize ndụ? Ndị mụrụ ụmụ, bụ́ ndị nwere amamihe ga-eso ụmụ ha tụleghachi okwu ndị a, ma hà ka bụ ụmụntakịrị ma ọ bụ na ọ fọrọ nke nta ka ha toruo ogo mmadụ. Ndị mụrụ ụmụ pụrụ iso ụmụ ha nwee ndokwa nke ịmụgharị ihe omume, ebe nke ọ bụla n’ime ndị ntorobịa ahụ ga-eche ajụjụ ndị onye ọkà ikpe ma ọ bụ onye ọrụ ụlọ ọgwụ pụrụ ịjụ ya. Ihe mgbaru ọsọ e bu n’uche abụghị ime ka nwata ahụ kwughachi ihe ma ọ bụ zaa azịza ndị e buru n’isi. Ihe ka mkpa bụ ka ha mara ihe ha kwenyere na ha, na ihe mere ha ji kwenye na ha. Otú ọ dị, ná nnọkọ ikpe, ndị mụrụ ụmụ ma ọ bụ ndị ọzọ pụrụ ikwupụta ihe banyere ihe ize ndụ dị iche iche nke ọbara na ụdị ihe ndị ọzọ dịnụ a pụrụ ime. Ma ihe onye ọkà ikpe ma ọ bụ onye ọrụ ga-achọkarị ịmata site n’iso ụmụ anyị kwurịta okwu bụ ma hà ji ntozu okè ghọta ọnọdụ ha na ihe ndị a na-eche ha n’ihu ịhọrọ, nakwa ma hà nwere nghọta n’onwe ha, bụrụkwa ndị kwenyesiri ike n’ihe ha na-ekwu.—Tụlee 2 Ndị Eze 5:1-4.

22. Olee ihe na-adịgide adịgide nke pụrụ isi n’anyị ịbụ ndị Chineke ziworo ihe banyere ọbara pụta?

22 Ọ dị mkpa ka anyị nile ghọta nke ọma, guzosiekwa ike n’echiche Chineke banyere ọbara. Mkpughe 1:5 na-akọwa Kraịst dị ka ‘onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya, onye tọpụkwara anyị ná mmehie nile anyị site n’ọbara ya.’ Ọ bụ nanị site n’ịnakwere uru nke ọbara Jisọs ka anyị pụrụ inweta mgbaghara zuru ezu nke na-adịgidekwa adịgide maka mmehie anyị nile. Ndị Rom 5:9 kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Ya mere nke karịrị hie nne, ebe a gụsịrị anyị ná ndị ezi omume ugbu a n’ime ọbara ya, a ga-azọpụta anyị n’iwe Chineke site n’aka ya.” Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe amamihe ka anyị na ụmụ anyị bụrụ ndị Jehova ziworo ihe n’okwu nke a, ka anyị kpebisiekwa ike ijegharị n’ụzọ ya ruo mgbe ebighị ebi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee How Can Blood Save Your Life?, peji 21-22, 28-31, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Isi Ihe Ndị A Ga-ezi Ihe Banyere Ha

◻ Echiche dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ịbụ ndị Jehova ziri ihe?

◻ N’ihi gịnị ka irubere iwu Chineke isi n’ihe banyere ọbara ji dị oké mkpa?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka ndị na-eto eto nwee ike ịkọwa nke ọma nakwa n’ụzọ guzosiri ike echiche ha nwere banyere ọbara?

◻ Olee ụzọ ndị Kraịst mụrụ ụmụ pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịbụ ndị e ziri ihe nke ọma banyere iwu Jehova metụta ọbara?

[Igbe dị na peeji nke 17]

A KPALIRI MMASỊ ỤLỌ IKPE AHỤ

Gịnị ka mkpebi ụlọ ikpe ahụ kwuru banyere D.P., onye e hotara na paragraf 17?

“A kpaliri mmasị Ụlọ Ikpe ahụ n’ihi ezi ọgụgụ isi, atụghị egwu, nkwanye ùgwù, na ikwusi okwu ike nke nwata nke a dị afọ 14-1/2. Nchọpụta a chọpụtara na o nwere ụdị ọrịa cancer na-egbu egbu pụrụ irikpuworịị ya . . . Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ onye na-eto eto nke nwere ntozu okè bịara n’Ụlọ Ikpe ịgba akaebe. O yiri ka ò lekwasịrị nnọọ anya nke ọma n’ihe isi ike nke na-eche ya ihu. O jezuru nnọkọ nile nke inye ndụmọdụ, kwere n’atụmatụ e mere maka ịgwọ ya ọrịa, wulitekwa ụkpụrụ echiche nwere njikọ n’ihe banyere otú ya onwe ya, dị ka mmadụ, ga-esi chee ihe ịma aka nke a metụtara ahụ ike ihu, ọ bịakwara n’Ụlọ Ikpe na-eji arịrịọ ahụ na-emetụ n’obi nke bụ: sọpụrụnụ mkpebi m . . .

“Tụkwasị ná ntozu okè ya, D.P. ekwupụtawo ihe nkwado zuru ezu maka mkpebi ya nke mere na Ụlọ Ikpe ahụ ga-asọpụrụ ya. N’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ echiche, n’ụzọ omume, nakwa n’ụzọ mmetụta, a ga-emerụ ya ahụ site n’atụmatụ ịgwọ ọrịa nke gụnyere mmịnye ọbara. Ụlọ Ikpe nke a ga-asọpụrụ nhọrọ o mere maka atụmatụ ịgwọ ọrịa.”

[Foto dị na peeji nke 16]

Onye ọkà ikpe ma ọ bụ onye nlekọta ụlọ ọgwụ pụrụ ịchọ ịmata ihe nwata onye Kraịst kweere n’ezie, na ihe mere o ji kwere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya