Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ Na-adịghị Achọ Ọbara
1 Ka Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ na-akpọtụrụ ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ n’ihi Ndịàmà Jehova nọ na Nigeria iji mee ka ha mara banyere usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ na-adịghị achọ ọbara, ọtụtụ ndị dọkịta na ndị na-awa ahụ dị njikere ugbu a ịgwọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ejighị mmịnye ọbara. Anyị na-enwe obi ekele n’ezie maka ngọzi nke a sitere n’aka Jehova. E nwere ihe karịrị ndị ọkà ahụ ike 800 na-ekwenye ekwenye n’ụdị a na Nigeria.
2 Mgbe ya na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ zukọsịrị, otu dọkịta na Kaduna kwuru banyere usoro ihe omume ahụ: “Echiche ọma. Ndị òtù unu iji kaadị Advance Medical Directive emewo ka ihe kara anyị nile [onye ọrịa/onye dọkịta] mfe nke ukwuu.” Dọkịta ọzọ si Rivers State sịrị: “Mgbalị maka mkpọsa inye ihe ọmụma ahụ banyere [ejighị] ọbara eme ihe n’ịgwọ ndị ọrịa n’ụlọ ọgwụ anyị masịrị m.” Site n’Ogun State otu dọkịta sịrị: “Usoro ihe omume ahụ na-enye ihe ọmụma nke ukwuu. Jidenụ ka unu ji. Ndewonụ.” Site na Kwara State dọkịta ọzọ sịrị: “O ruuru onye ọrịa ọ bụla ikpebi ihe ọ chọrọ dị ka ụdị ọgwụgwọ kasị mma, ọ bụkwa ọrụ dibịa ọ bụla nwere ezi uche ịtụle ọnọdụ ọjọọ nke onye ọrịa ya ma mee ihe nile o nwere ike ime iji mee ka onye ọrịa ahụ dịrị ndụ n’emebighị nguzo okpukpe ya.” Okwu ndị a na-agba anyị ume, ọ́ bụghị ya?
3 Otú ọ dị, ndị òtù Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ na-eweghachi ozi mgbe nile site n’ọnụ ndị dọkịta na ndị nọọsụ. Ha na-ekwu na ndị dọkịta na-eme mkpesa na anyị adịghị agwa ha ná mkpọtụrụ ma ọ bụ ọgwụgwọ nke mbụ na onye ọrịa bụ Onyeàmà nakwa na a gaghị eji ọbara mee ihe n’ọgwụgwọ ahụ ma ọ bụ n’iwa ahụ. Ndị ọzọ na-ekwu na anyị adịghị eweta kaadị Advance Medical Directive/Release anyị iji kọwaa onwe anyị dị ka Ndịàmà, nke ga-eme ka ha ghara inye anyị ọbara n’amaghị ama. Ụfọdụ ụlọ ọgwụ na-emekwa mkpesa na anyị adịghị aga ụlọ ọgwụ ngwa ngwa dị ka o kwesịrị. Anyị na-echere ruo mgbe nsogbu ahụ siri ike ọgwụgwọ. Ụmụnna, e lebaara isi ihe ndị a nile anya nke ọma n’akwụkwọ ozi anyị nke February 1, 1995, nye ọgbakọ nile nakwa n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke August 1994. Anyị na-akpatara onwe anyị na ụlọ ọgwụ nsogbu mgbe anyị na-agbasoghị ụkpụrụ ndị e setịpụrụ. Anyị na-adọrọ uche unu gaa n’okwu ndị a ọzọ iji ‘kpalie unu n’ichetara unu.’—2 Pita 3:1.
4 Ozugbo i chere ihe iseokwu ọbara ihu n’ụlọ ọgwụ, ngwa ngwa ahụ kpọtụrụ ndị okenye ọgbakọ unu, ha onwe ha ga-emekwa ka Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ mara. Ha ga-enyere gị aka n’isoro dọkịta gị kparịta banyere ihe a ga-eme n’ejighị ọbara mee ihe.