Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/97 p. 6
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-atụnye Ụtụ n’Ime Ka E Nwee Akụkọ Ziri Ezi?
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Nyere Onye Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Gị Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ị̀ Bụ Onye Nkwusa Alaeze Oge Nile?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 1/97 p. 6

Igbe Ajụjụ

◼ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nye akụkọ ozi ubi anyị n’oge ugbo abụọ kwa ọnwa?

Anyị nile na-enwe mmetụta nke ọṅụ mgbe anyị nụrụ banyere ihe ọma ndị a na-arụzu n’ikwusa ozi Alaeze ahụ. (Lee Ilu 25:25.) Ọrụ 2:41 na-akọ na mgbe okwu na-akpali akpali Pita kwuru n’ụbọchị Pentikọst gasịrị, ‘a tụkwasịrị ihe hà ka puku mmadụ atọ.’ Nwa mkpirikpi oge ka e mesịrị, ọnụ ọgụgụ ahụ arịwo elu ruo “ihe hà ka [puku ise].” (Ọrụ 4:4) Lee ka akụkọ ndị ahụ na-aghaghị isiwo tọọ ndị Kraịst narị afọ mbụ ụtọ nke ukwuu! Anyị na-emeghachi omume n’otu aka ahụ n’ebe akụkọ ndị na-agba ume taa dị. Ọ na-akpali anyị ịnụ banyere ihe ịga nke ọma ụmụnna anyị na-enwe n’ikwusa ozi ọma ahụ gburugburu ụwa.

Ebe ịchịkọta akụkọ dịgasị otú ahụ na-ewe oge na mgbalị dị ukwuu, nkwado nke onye nkwusa Alaeze ọ bụla dị mkpa. Ị̀ dị uchu n’inyefe akụkọ ozi gị n’oge ugbo abụọ kwa ọnwa?

Akụkọ mmụba na-ewetara anyị oké ọṅụ. Tụkwasịkwa, akụkọ ozi na-enyere Society aka ịhụ maka ọganihu nke ọrụ ụwa nile. A ghaghị ime mkpebi banyere ebe enyemaka pụrụ ịdịkwu mkpa ma ọ bụ ụdị na ọnụ ọgụgụ akwụkwọ a ga-ebipụta. Ndị okenye n’ọgbakọ ọ bụla na-eji akụkọ ije ozi ubi ekpebi ebe a pụrụ inwe ọganihu. Akụkọ ọma na-ewuli elu, na-akpali anyị nile inyocha ozi nke aka anyị maka ọganihu ndị a pụrụ inwe.

Ọ dị ndị nkwusa nile mkpa ịghọta ibu ọrụ ha n’otu n’otu inyefe akụkọ ije ozi ubi n’oge ugbo abụọ kwa ọnwa. Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nọ n’ọnọdụ dị mma ichetara ndị nkwusa ibu ọrụ a, ebe ha mụkwa anya inye enyemaka onwe onye nye ndị nwere ihe isi ike ụfọdụ ikerechi òkè anya kwa ọnwa n’ije ozi ubi. A pụrụ inye ihe ncheta a n’ọmụmụ akwụkwọ ikpeazụ n’ọnwa ma ọ bụ n’oge ọzọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ohere adịghị inyefe akụkọ ije ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ pụrụ ịnata ha ma hụ na e nyere ha odeakwụkwọ n’oge iji tinye ha n’akụkọ ozi ọgbakọ a na-enye Society kwa ọnwa ọ bụla.

Ịdị uchu anyị n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-enyefe akụkọ ije ozi ubi anyị n’oge na-eme ka ibu ahụ ka mfe nye ndị ọ bụ ọrụ ha ilekọta ọdịmma ime mmụọ anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya