Ị̀ Na-atụnye Ụtụ n’Ime Ka E Nwee Akụkọ Ziri Ezi?
1 Ọtụtụ ihe ndekọ Bible na-agụnye ọnụ ọgụgụ a kapịrị ọnụ, nke na-enye aka ime ka a ghọta ihe merenụ n’ụzọ doro anya. Dị ka ihe atụ, Gidiọn ji nanị ndị ikom 300 merie ọmụma ụlọikwuu ndị Midian. (Ikpe 7:7) Mmụọ ozi Jehova gburu ndị agha Asirịa 185,000. (2 Eze 19:35) Na Pentikọst 33 O.A., e mere ihe dị ka mmadụ 3,000 baptizim, ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịkwara, ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe mụbara ruo ihe dị ka 5,000. (Ọrụ 2:41; 4:4) Site n’ihe ndekọ ndị a, o doro anya na ndị ohu Chineke n’oge ochie tinyere mgbalị buru ibu n’ịchịkọta ihe ndekọ zuru ezu ma zie ezi.
2 Taa, nzukọ Jehova na-agwa anyị ka anyị na-enye akụkọ ozi ubi anyị kwa ọnwa. Anyị iji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ndokwa a na-atụnye ụtụ n’ime ka a na-elekọta ọrụ ime nkwusa ahụ nke ọma. Ihe ndekọ pụrụ igosi na otu akụkụ nke ozi ahụ chọrọ ka e lebara ya anya ma ọ bụ na a chọkwuru ndị ọrụ n’otu akụkụ n’ubi. N’ọgbakọ, akụkọ ozi ubi na-enyere ndị okenye aka ịmata ndị pụrụ ịmụba ozi ha nakwa ndị enyemaka pụrụ ịdị mkpa. Akụkọ banyere ọganihu a na-enwe n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-enyekwa òtù ụmụnna Ndị Kraịst dum agbamume. Ị̀ na-eme òkè gị n’ime ka e nwee akụkọ ziri ezi?
3 Ọrụ Dịịrị Gị: N’etiti ọnwa na ná ngwụsị ọnwa, ọ̀ na-esiri gị ike icheta ihe ndị ị rụzuru n’ozi? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ma i detuo ihe ị rụzuru mgbe ọ bụla i keere òkè n’ozi ubi? Ụfọdụ na-eji kalenda ma ọ bụ akwụkwọ ndetu ihe edetu ya. Ndị ọzọ na-eji mpempe akwụkwọ akụkọ ozi ubi a na-edeghị ihe na ya agagharị. N’etiti ọnwa na ná ngwụsị ọnwa, nye onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ gị akụkọ ozi gị n’egbughị oge. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị chọọ, ị pụrụ itinye akụkọ ozi gị n’ime igbe akụkọ ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na i chefuo inye akụkọ ozi gị, kpọtụrụ onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ gị ozugbo n’egbughị oge kama ichere ka ọ bịa jụọ gị ya. Iji ịdị uchu na-enye akụkọ ozi gị na-egosi nkwanye ùgwù maka ndokwa Jehova na iji ịhụnanya na-echebara ụmụnna ndị e kenyere ọrụ ịchịkọta na ịgbakọ akụkọ ozi ndị ahụ echiche.—Luk 16:10.
4 Ọrụ Onye Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ: Dị ka onye ọzụzụ atụrụ mụ anya na nke na-echebara ndị ọzọ echiche, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ na-egosi mmasị n’ihe ìgwè ahụ na-arụzu n’ọnwa ahụ nile. (Ilu 27:23) Ọ na-ama ma onye nkwusa nke ọ bụla ò ji ọṅụ na-ekerechi òkè gbara ọkpụrụkpụ anya, ọ na-enyekwa aka ngwa ngwa ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-ekerebeghị òkè n’ọnwa ahụ dum. Okwu agbamume, aro dị irè, ma ọ bụ ịkpọ ya ka o sonyere ya n’ozi ubi agwụla ihe na-adị mkpa ọtụtụ mgbe.
5 Ná ngwụsị ọnwa, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ na-ahụ na ndị nile nọ n’ìgwè ahụ arụọla ọrụ dịịrị ha nke bụ́ inye akụkọ ozi ha ka odeakwụkwọ wee nwee ike inye alaka ụlọ ọrụ akụkọ ziri ezi maka ọgbakọ ha ka ọ na-erule n’ụbọchị nke isii nke ọnwa ọzọ. Ka ọ na-eru ná ngwụsị ọnwa, ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye aka ka onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ chetara ìgwè ahụ ka ha nye akụkọ ozi ha, karịsịa ndị na-enyeghị akụkọ ozi etiti ọnwa ha ma mee ka e nwee ike inweta mpempe akwụkwọ akụkọ ozi ubi n’ebe a na-anọ enwe ọmụmụ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ọ dị ndị na-echefu inye akụkọ ozi ha, ọ pụrụ ichetara ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma gbaa ha ume.
6 Inye akụkọ ozi ubi anyị n’egbughị oge na-atụnye ụtụ n’ime ka e nwee akụkọ ziri ezi nke na-egosi ihe a rụzuru n’ubi. Ị̀ ga-eme òkè gị site n’inye akụkọ ihe ị rụzuru n’ọnwa ọ bụla n’egbughị oge?