Nyere Onye Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Gị Aka
1 Onye ọ bụla n’ime anyị na-erite ọtụtụ uru site n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. N’ọnwa gara aga anyị tụlere otú onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si arụ ọrụ ya. Ma, gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ya aka ma si otú a mee ihe ga-abara anyị na ndị ọzọ uru?
2 Na-aga Kwa Izu: N’ihi na a na-eme ka ìgwè ọmụmụ akwụkwọ dị ntakịrị, ọ dị oké mkpa na ị ga-aga. Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịga kwa izu. Ị pụkwara inye aka site n’ịdị na-aga n’oge, ebe nke a na-eme ka onye nlekọta ahụ nwee ike ịmalite nzukọ ahụ n’ụzọ dị n’usoro.—1 Kọr. 14:40.
3 Azịza Ndị Na-ewuli Elu: Ụzọ ọzọ ị pụrụ isi nye aka bụ site n’ịkwadebe nke ọma na ịza ajụjụ n’ụzọ na-ewuli elu. Ikwu okwu nanị n’otu isi ihe na-akakarị mma, nke a na-agbakwa ndị ọzọ ume ịza ajụjụ. Zere ịgbalị ikwucha ihe nile dị n’otu paragraf. Ọ bụrụ na otu isi ihe dị n’ihe ahụ a na-amụ metụrụ gị n’obi, mee ka nkwurịta okwu ahụ dịkwuo ụtọ site n’ikwupụta echiche gị mgbe ị na-aza ajụjụ.—1 Pita 4:10.
4 Ọ bụrụ na i nwere ihe ùgwù nke ịgụpụta paragraf ndị ahụ a na-amụ maka abamuru nke ìgwè ahụ, dị uchu n’ịrụzu ọrụ ahụ. Ịgụ ihe nke ọma na-eso eme ka ọmụmụ ihe ahụ gaa nke ọma.—1 Tim. 4:13.
5 Ịgba Àmà Ìgwè: A na-enwe nzukọ maka ije ozi ubi n’ọtụtụ ebe ndị a na-enwe ọmụmụ akwụkwọ, gị ịkwado ndokwa ndị a na-enyekwara onye nlekọta aka ka ọ na-ebute ụzọ n’ọrụ izisa ozi ọma. Were ndokwa ndị a dị ka ohere iji bịakwuo ụmụnna gị nso na iji gbaa ha ume.
6 Akụkọ Ozi Ubi: Inye akụkọ ozi ubi gị n’oge n’ọgwụgwụ ọnwa nke ọ bụla bụ ụzọ ọzọ isi nyere onye nlekọta ahụ aka. Ị pụrụ inye ya akụkọ ozi gị n’aka ma ọ bụ tinye ya n’ime igbe e wepụtara maka itinye akụkọ ozi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Odeakwụkwọ pụrụ iji igbe ahụ wekọta akụkọ ozi ubi nke ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ nakọtara.
7 A ga-enwe mmasị ná nkwado ị na-enye onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị. Karịsịa, ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ‘ga-adịrị mmụọ ị na-egosi.’—Fil. 4:23.