Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ—Ihe Mere O Ji Dị Anyị Mkpa
1. Olee otú ndokwa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si malite?
1 N’afọ 1895, a bịara mara ìgwè ọmụmụ ihe nke Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, dị ka Dawn Circles for Bible Study (Ìgwè Ọmụmụ Bible nke Mmalite Ọchịchị Puku Afọ). A na-amụ mpịakọta dị iche iche nke akwụkwọ bụ́ Millennial Dawn n’ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe e mesịrị, a bịara kpọwa ìgwè ọmụmụ ihe a Berean Circles for Bible Study (Ìgwè Ọmụmụ Bible nke Ndị Biria). (Ọrụ 17:11) Mgbe mgbe, ìgwè dị nta na-ezukọ n’ụlọ mmadụ n’uhuruchi dabara adaba nye ha. Otú a ka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si malite.
2. Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè ‘n’ịgbarịta onwe anyị ume’ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ?
2 Agbamume na Enyemaka: Ebe ọ bụ na a ma ụma mee ka ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-adị obere, ndị na-abịa ya na-enwe ohere ka ukwuu ikwupụta ihe ha kweere. Ihe na-esi na ya pụta bụ ‘ịgbarịta onwe anyị ume, onye nke ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya.’— Rom 1:12.
3, 4. Olee otú ndokwa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si enyere anyị aka ijezu ozi anyị?
3 Ịrịba ụzọ onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ahụ si ezi ihe ama pụrụ inyere anyị aka ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Tim. 2:15) Rịba ama otú o si emesi ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ihe ọmụmụ ahụ ike. Ọ bụrụ na akwụkwọ a na-amụ nyere ohere maka ya, ọ pụrụ iji nanị Bible mee ntụleghachi ná ngwụsị nke ihe ọmụmụ ahụ iji mee ka isi ihe ndị dị na ya pụta ìhè. Ezi ihe nlereanya ya pụrụ inyere anyị aka imeziwanye ụzọ anyị si ezi ihe n’ozi Ndị Kraịst.—1 Kọr. 11:1.
4 Tụkwasị n’iduzi ihe ọmụmụ ahụ kwa izu, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ na-ebute ụzọ n’izisa ozi ọma. N’iso onye nlekọta ije ozi na-arụkọ ọrụ, ọ na-eme ndokwa ndị dị irè maka ozi ubi. Ọ na-enyere ndị nile nọ n’ìgwè ahụ aka ịrụzu ọrụ dịịrị ha dị ka Ndị Kraịst nke bụ́ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ.—Mat. 28:19, 20; 1 Kọr. 9:16.
5. Olee enyemaka anyị na-enweta site n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ?
5 Onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-enwe mmasị n’ọdịmma ime mmụọ nke onye ọ bụla nọ n’ìgwè ahụ. Ọ na-egosipụta mmasị a ná nzukọ ọgbakọ nakwa mgbe ya na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ozi ubi. Mgbe ọ na-eleta ụmụnna n’ebe obibi ha, ọ na-ejikwa oge ahụ agba ha ume n’ụzọ ime mmụọ. Ahụ́ kwesịrị iru mmadụ nile ala ịgakwuru onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ maka enyemaka ime mmụọ mgbe ọ bụla ha nọ ná mkpa.—Aịsa. 32:1, 2.
6. (a) Olee otú izukọ n’ìgwè nta dị iche iche siworo wusie ụmụnna anyị nọ n’ala ụfọdụ ike? (b) Olee otú i siworo rite uru n’onwe gị site ná ndokwa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ?
6 Wusirịtanụ Ibe Unu Ike: N’ala ebe a machibidoro ọrụ ndị Chineke iwu, ụmụnna anyị na-ezukọ mgbe mgbe n’ìgwè ndị ka nta. Otu nwanna nwoke chetara, sị: “Ọ bụ ezie na a machibidoro ọrụ Ndị Kraịst anyị iwu, mgbe ọ bụla o kwere omume, anyị na-enwe nzukọ anyị kwa izu n’ìgwè ndị ọnụ ọgụgụ ha dị malite na mmadụ 10 ruo na mmadụ 15. Anyị na-enweta ume n’ụzọ ime mmụọ site ná nzukọ ndị ahụ, sitekwa n’ọmụmụ Bible anyị na-amụ nakwa ná mkpakọrịta anyị na-enwe mgbe a gbasara ọmụmụ ihe. Anyị na-eji ahụmahụ anyị atụnyere nke ibe anyị, nke a nyekwaara anyị aka ịghọta na anyị nile nwere otu nsogbu ahụ.” (1 Pita 5:9) N’otu aka ahụ, ka anyị na-ewusirịta ibe anyị ike site n’ịkwado ndokwa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’ụzọ zuru ezu.—Efe. 4:16.