Otú Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Si Enyere Anyị Aka
1. Olee otú nzukọ ise anyị na-enwe kwa izu si enyere anyị aka?
1 Otú e si eduzi nke ọ bụla ná nzukọ ise anyị na-enwe kwa izu dị iche n’ibe ya. Nzube e ji enwe nke ọ bụla dịkwa iche n’ibe ya. Ma, ha nile na-enyere anyị aka ‘ichebara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Hib. 10:24, 25) Olee ihe ụfọdụ mere Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ji pụọ iche ma baa uru?
2. Olee uru ndị a na-erite n’ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ bụ́ nke obere ìgwè mmadụ na-abịa?
2 Ọ Na-eme Ka Anyị Na-enwe Ọganihu n’Ọgbakọ: Ndị na-abịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-adịkarị nnọọ obere karịa ndị na-abịa nzukọ ọgbakọ ndị ọzọ. Nke a na-eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe inwe ndị enyi ndị ga-enyere anyị aka ime nke ọma n’ọgbakọ. (Ilu 18:24) Ị̀ gbaala mbọ ka ị matachaa ndị nile gị na ha nọ n’otu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, ma eleghị anya, rịọ onye nke ọ bụla ka gị na ya rụọ n’ozi? Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-emekwa ka ọ dịrị onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ mfe ịmara kpọmkwem ọnọdụ onye nke ọ bụla nọ n’ìgwè ya, dịkwara ya mfe inye onye nke ọ bụla agbamume.—Ilu 27:23.
3. Olee otú Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si eme ka ọ dịrị ndị anyị na-amụrụ Bible mfe ịbịa nzukọ na ịza ajụjụ?
3 Ị̀ gwala onye ị na-amụrụ Bible ka o soro gị gaa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ? Ndị ọhụrụ obi na-akaghị ịbịa nzukọ anyị ndị ọtụtụ mmadụ na-abịa nwere ike ịkata obi bịa nzukọ mmadụ ole na ole na-abịa, karịsịa, ma ọ bụrụ n’ụlọ mmadụ ka a na-enwe ya. Mmekọrịta chiri anya a na-enwe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-eme ka ọ dịkwuoro ndị na-eto eto na ndị ọhụrụ mfe ịza ajụjụ. Ebe ọ bụ na ndị na-abịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-adị obere, anyị na-enwekwu ohere ịza ajụjụ na ito Jehova.—Ọma 111:1.
4. Olee ihe mere ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ji adịrị anyị mfe?
4 A na-enwekarị Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’ebe ndị kasị dịrị ndị nkwusa nso n’ókèala ha. Ọ bụ ezie na ọ gaghị ekwe omume ikenye mmadụ nile ebe kacha dịrị ha nso, ebe e kenyere anyị ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nwere ike ịdịrị anyị nso karịa ịga ebe anyị na-aga nzukọ ọgbakọ ndị ọzọ. Ebe anyị na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nwekwara ike ịbụ ebe dị mma izukọ maka ozi ubi.
5. Olee ihe anyị ga-eme ka onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anyị nyere anyị aka n’ozi?
5 Ọ Na-enyere Anyị Aka n’Ozi Anyị: Onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-enwe mmasị inyere onye ọ bụla nọ n’ìgwè ya aka iji ọṅụ na-agachi ozi ọma anya, na-arụpụtakwa ihe na ya. Ya mere, ọ na-agbalị ka ya na onye ọ bụla nọ n’ìgwè ya rụkọọ n’ozi ọma, na-enyere onye nke ọ bụla aka n’akụkụ dị iche iche nke ozi anyị. Ọ bụrụ na e nwere ebe na-esiri gị ike n’ozi anyị, dị ka ime nletaghachi, mee ka onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị mara. Ma eleghị anya, o nwere ike mee ndokwa ka gị na onye nkwusa bụ́ aka ochie nọ n’ìgwè unu rụkọọ n’ozi. Otú i si akụziri ndị ị na-amụrụ Bible ihe ga-akakwu mma ma ọ bụrụ na ị na-ege onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị ntị nke ọma iji mụta ụzọ ndị dị mma o si akụzi ihe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ unu.—1 Kọr. 4:17.
6. Gịnị mere anyị ga-eji hụ na anyị na-erite uru zuru ezu n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ?
6 N’eziokwu, Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ bụ ndokwa magburu onwe ya. Ndokwa a Jehova ji ịhụnanya mee na-enyere anyị aka ịnọgidesi ike n’eziokwu n’oge a siri ike nke anyị bi na ya.—Ọma 26:12.