Igbe Ajụjụ
◼ Olee mgbe ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị iguzobe ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ọzọ?
E kwesịrị ichebara iguzobe ìgwè ọhụrụ echiche mgbe ọ dị mkpa iji hụ na a nọgidere na-enwe ihe dị ka mmadụ 15 ma ọ bụ ihe dị ala karị n’ebe ọ bụla a na-enwe ọmụmụ akwụkwọ, tinyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi gịnị ka e ji na-atụ aro nke a?
Mgbe e mere ka ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ dị obere, onye nduzi na-enwe ike ilebara onye ọ bụla na-abịanụ anya karị. Ọzọkwa, mmadụ nile na-enwe ohere buru ibu ịza ajụjụ n’ọnọdụ dị mma ịnọ mee nkwupụta ihu ọha nke okwukwe ha. (Hib. 10:23; 13:15) Inwe ìgwè ndị dị nta karị n’ebe dị iche iche n’ókèala ọgbakọ na-eme ka ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na nzukọ maka ije ozi ubi dị mfe karị. Ọgbakọ ndị mụbaworo ọnụ ọgụgụ ebe a na-anọ enwe ya achọpụtawo na ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ndị na-abịa ọmụmụ akwụkwọ amụbawokwa.
A pụrụ inwe ọnọdụ ndị pụrụ iche ga-eme ka ọ bụrụ ihe amamihe dị na ya iguzobe ìgwè ọzọ, ọ bụrụgodị na ọ ga-adị ntakịrị. Nke a pụrụ ịbụ eziokwu n’ógbè dịpụrụ adịpụ ma ọ bụ n’ebe a na-ejubiga ókè n’ebe ndị a na-anọ enwe ya ugbu a ma ọ bụ n’ebe a na-enweghị oche zuru ezu. Mgbe ọ dị mkpa, a pụrụ iguzobe ìgwè nke na-ezukọ n’ehihie maka ọdịmma ndị agadi, ndị na-eje ọrụ abalị, ma ọ bụ ụmụnna nwanyị ndị di ha na-abụghị Ndịàmà.
Ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọ bụla kwesịrị inwe ọtụtụ ndị nkwusa e kenyere na ya, bụ́ ndị siri ike n’ụzọ ime mmụọ ma na-arụsi ọrụ ike, tinyekwara onye nduzi nakwa onye ngụpụta ihe nke ruru eru. Ụmụnna kwesịrị ịchọ iru eru iji gboo mkpa ndị a n’ọgbakọ.
Ndị okenye pụrụ ịkwalite ọganihu nke ọgbakọ site n’ijide n’aka na ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ dị iche iche ebubigaghị ibu ókè ma bụrụ ndị a na-elekọta nke ọma n’ụzọ ime mmụọ nakwa na ha na-ezukọ n’ebe ndị dị nso. Mgbe ọ bụla o kwere mee, e kwesịrị iguzobe ìgwè ndị ọhụrụ ka mmadụ nile wee nwee ike irite uru zuru ezu ná ndokwa ime mmụọ a pụrụ iche. Ị̀ pụrụ iwepụta ebe obibi gị dị ka ebe a ga-anọ na-enwe ọmụmụ akwụkwọ? Ọtụtụ ndị meworo otú ahụ enwetawo ngọzi ime mmụọ.