Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/03 p. 7
  • Ị̀ Pụrụ Imeghe Ụlọ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Pụrụ Imeghe Ụlọ Gị?
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ—Ihe Mere O Ji Dị Anyị Mkpa
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Otú Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Si Enyere Anyị Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 7/03 p. 7

Ị̀ Pụrụ Imeghe Ụlọ Gị?

1 Na narị afọ mbụ, ọtụtụ Ndị Kraịst wepụtara ụlọ ha maka nzukọ ọgbakọ. (1 Kọr. 16:19; Kọl. 4:15; Fil. 1, 2) N’ọgbakọ ụfọdụ taa, e nweghị ebe zuru ezu maka ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nakwa maka nzukọ ozi ubi. Nke a pụrụ ime ka ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ ụfọdụ na-enwe mmadụ 30 ma ọ bụ karịa na-aga ha, bụ́ nke karịrị nnọọ ọnụ ọgụgụ a chọrọ bụ́ ihe dị ka mmadụ 15.

2 Ihe Ùgwù Magburu Onwe Ya: Ì chewo echiche imeghe ụlọ gị maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ? Ime ụlọ buru ibu otú o kwesịrị, bụ́ nke dị ọcha, nke nwere ìhè nke ọma, ma nwee ebe ndị ikuku si abata na ya nke ọma, ga-adị mma maka nzube a. Ebe ọ bụ na ọmụmụ akwụkwọ bụ nzukọ ọgbakọ ma sorokwa ná ndokwa Jehova mere izi ndị ya ihe, inwe ọmụmụ akwụkwọ n’ụlọ gị bụ ihe ùgwù magburu onwe ya. Ọtụtụ ndị na-akọ na ha eritewo uru n’ụzọ ime mmụọ site n’imeghe ụlọ ha n’ụzọ dị otú a.

3 Ọ bụrụ na i chee na ụlọ gị kwesịrị ekwesị, biko mee ka ndị okenye mara banyere ya. Ọ pụrụ ịbụ na ha na-achọ inwetakwu ebe ndị a ga-anọ na-enwe ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe omume inwe ọmụmụ akwụkwọ n’ụlọ gị, à pụrụ inwe nzukọ maka ozi ubi na ya? Ọ bụrụgodị na e nweghị mkpa maka ya ugbu a, ndị okenye ga-enwe ekele ịmata na a pụrụ iji ụlọ gị mee ihe. Ị pụrụ inwe ihe ùgwù ahụ n’ọdịnihu.

4 Ịkpa Ezi Àgwà: Mgbe a na-ezukọ n’ụlọ mmadụ, ọ ga-adị mkpa ka ndị nile bịaranụ na-egosi nkwanye ùgwù maka ihe onwunwe nke onye nwe ụlọ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ijide n’aka na ụmụ ha na-anọ nanị n’ebe e wepụtara maka ọmụmụ ihe ahụ, ọ bụghị ịdị na-abanye n’ebe ụfọdụ n’ụlọ ahụ bụ́ ndị dịịrị nanị onye nwe ụlọ. E kwesịkwara ichebara ndị agbata obi echiche, na-akpachara anya izere inye ha nsogbu.—2 Kọr. 6:3, 4; 1 Pita 2:12.

5 Ndị Hibru 13:16 na-agba anyị ume ka anyị ghara ichefu “ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” Imeghe ụlọ gị maka nzukọ ọgbakọ bụ ụzọ magburu onwe ya isi soro ndị ọzọ kerịta ihe ọma na isi “sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị.”—Ilu 3:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya