Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/02 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite November 11
  • Izu Na-amalite November 18
  • Izu Na-amalite November 25
  • Izu Na-amalite December 2
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 11/02 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite November 11

Abụ nke 183

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi otú a pụrụ isi nyefee Ụlọ Nche nke November 15. N’ihe ngosi ahụ, kọwaa otú e si enweta ego maka ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ.—Lee Ụlọ Nche, peeji nke 2, ma ọ bụ Teta!, peeji nke 5.

15 min: Ndị Na-akwado Ezi Ofufe—N’oge ahụ na n’Oge A. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke November 1, 2002, peeji nke 26-30.

20 min: “Nyere Onye Nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Gị Aka.”a Ọ bụ okenye nke bụ onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ga-eme ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, webata ihe e kwuru n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 70. Jaa ọgbakọ mma maka ụzọ ndị doro anya ha si na-akwado ndokwa ọmụmụ akwụkwọ, jirikwa obiọma dọrọ uche ha gaa n’ebe ndị ọ dị mkpa ka e meziwanye ihe.

Abụ nke 114 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 18

Abụ nke 78

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee igbe bụ́ “Ihe Ndị Dị Nnọọ Mma Ọgụgụ!”

10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu.

25 min: “Ndị Isi Ezinụlọ—Nọgidenụ Na-enwe Usoro Ihe Omume Ime Mmụọ Dị Mma.” Mgbe e kwusịrị okwu mmeghe dị mkpirikpi nke dabeere na paragraf nke 1-3, duzie paragraf nke 4-13 n’ụdị okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Dị ka oge si dị, gụọ paragraf nke 7, 8, 11, na 12. Gbaa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ bụ nne ma ọ bụ nna ajụjụ ọnụ. Gịnị nyewooro ezinụlọ ha aka inwe usoro a haziri ahazi maka ihe omume ime mmụọ? Olee mgbalị e tinyeworo na nke a? Olee otú ha siworo rite uru? Mechie site n’ikwu okwu dị nkenke nke dabeere na paragraf nke 14.

Abụ nke 31 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 25

Abụ nke 16

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Di na nwunye na-ejekọ ozi ubi ọnụ emee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi jiri aro a tụrụ na peeji nke 8 nyefee magazin nke December 1 na December 8. Di enyefee Ụlọ Nche, nwunye ya enyefeekwa Teta!

15 min: “Mee Ka A Mata Eziokwu Banyere Jizọs.”b Gụnye ihe e kwuru n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 278. Gbaa mmadụ nile ume iji akwụkwọ ahụ bịa Nzukọ Ije Ozi na-esonụ maka ihe omume bụ́ “Ụlọ Akwụkwọ nke Na-akwadebe Anyị Maka Ihe Ndị Kasị Mkpa.”

20 min: “Gosi Mmasị Ịhụnanya n’Ebe ‘Ụmụ Mgbei’ Nọ.” Malite site n’ikwu okwu ga-ewe minit atọ banyere otú Jehova si ele ụmụ mgbei anya, dabere na paragraf nke 1 n’akwụkwọ Insight, mpịakọta nke 1, peeji nke 816. Site n’ajụjụ na azịza, tụlee akụkụ fọdụrụ n’isiokwu ahụ. Kọwapụta ụzọ ndị dị irè ndị ọzọ pụrụ isi nye aka ma nye agbamume. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3-4, kwuo okwu dị mkpirikpi site na Teta! nke October 8, 1995, peeji nke 8-9.

Abụ nke 142 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 2

Abụ nke 213

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọnwa November. Tụleghachi n’ụzọ dị mkpirikpi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a pụrụ iji mee ihe mgbe a na-enyefe akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke December 1995, peeji nke 8.

12 min: Ihe Ịma Aka Na-eche Ndị Nne na Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ Ihu. Otu okenye agbaa otu nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ ma ọ bụ abụọ (ma ọ bụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Ndịàmà) ajụjụ ọnụ iji mata otú ha si na-emeri nsogbu ndị metụtara inye ụmụ ha ọzụzụ, ịdọ ha aka ná ntị, na inye ha nduzi ime mmụọ. Olee ụzọ ha si na-ebu ibu ọrụ ezinụlọ ha ma na-agakwa nzukọ dị iche iche nakwa ozi ubi mgbe nile? Mee ka aro ụfọdụ a tụrụ n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 104-110, pụta ìhè. Dị ka a kọwara na peeji nke 113-115, kwuo ụzọ ndị dị irè ndị ọzọ pụrụ isi nye aka.

25 min: “Ụlọ Akwụkwọ nke Na-akwadebe Anyị Maka Ihe Ndị Kasị Mkpa.” Okwu ndị na-ege ntị ga-eso tụlee nke ọ bụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eme. Mee ka e nwee oké mmasị n’usoro ihe omume ọhụrụ nke ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ nke ga-amalite na January. Dọrọ uche gaa n’akụkụ dị iche iche nke “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2003” nke dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October 2002. Kwuo ihe ndị a chọrọ iji sonye n’ụlọ akwụkwọ ahụ, dị ka a kọwara n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 282, gbaakwa ndị na-edenyebeghị aha ha ume ka ha denye aha ha ma ọ bụrụ na ha ruru eru.

Abụ nke 127 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya