ISI NKE 5
Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
N’OGE Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, o mere ihe ndị gosiri na ọ bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma.” (Jọn 10:11) Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ na-eso ya, “o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Pita na ndịozi ndị ọzọ mụtara ihe n’ihe a Jizọs mere. Ha ghọtara na Jizọs dị nnọọ iche ná ndị ọzụzụ atụrụ Izrel obi tara mmiri. Ndị ọzụzụ atụrụ a hapụrụ atụrụ Chineke, ha ana-akpagharị n’enweghị onye na-akụziri ha okwu Chineke. (Ezik. 34:7, 8) Otú Jizọs si kụziere atụrụ Chineke ihe ma lekọta ha, nwụọkwa maka ha, kụziiri ndịozi ya otú ha ga-esi nyere ndị nwere okwukwe aka ka ha laghachikwuru Jehova, bụ́ “onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi” ha.—1 Pita 2:25.
2 N’otu oge Jizọs na-agwa Pita okwu, ọ gwara ya ka ọ na-azụ atụrụ Chineke ma na-elekọta ha nke ọma. (Jọn 21:15-17) O doro anya na ihe a ọ gwara Pita ruru Pita n’obi nke na o mechara gwa ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha, kama ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.” (1 Pita 5:1-3) Ndị okenye e nwere n’ọgbakọ taa na-eme ihe a Pita kwuru. Ha na-eṅomi Jizọs, na-eji obi ha niile ejere Jehova ozi. Ha si otú ahụ na-egosi atụrụ Chineke ihe ha kwesịrị ịna-eme n’ozi Jehova.—Hib. 13:7.
Dị ka Jizọs, ndị okenye na-eji obi ha niile ejere Jehova ozi, si otú ahụ na-egosi atụrụ Chineke ihe ha kwesịrị ịna-eme n’ozi Jehova
3 Obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ na Chineke ji mmụọ nsọ ya họpụta ndị okenye na-elekọta ọgbakọ. Otú ha si elekọta anyị na-abara anyị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, ndị okenye na-agba anyị ume ma na-elekọta onye nke ọ bụla n’ime anyị. N’izu ọ bụla, ha na-akụziri anyị ihe nke ọma n’ọmụmụ ihe. Ihe a ha na-akụziri anyị na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Rom 12:8) Mbọ ha na-agba ka ndị nduhie ghara imebi okwukwe anyị na-eme ka obi na-eru anyị ala. (Aịza. 32:2; Taị. 1:9-11) Otú ha si agachi ozi ọma anya na-emekwa ka anyị na-agachi ozi ọma anya. (Hib. 13:15-17) Jehova na-eji ndị okenye eme ka okwukwe ndị niile nọ n’ọgbakọ na-esikwu ike. Baịbụl kpọrọ ndị okenye a “onyinye n’ụdị mmadụ.”—Efe. 4:8, 11, 12.
IHE A CHỌRỌ N’AKA NDỊ GA-ABỤ OKENYE
4 Ka e nwee ike ilekọta ọgbakọ nke ọma, ndị a ga-ahọpụta ka ha bụrụ ndị okenye kwesịrị iru eru otú Okwu Chineke kwuru. Ọ bụ naanị mgbe ha ruru ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ka e nwere ike ịsị na e ji mmụọ nsọ họpụta ha. (Ọrụ 20:28) Ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru a ga-elekwasị anya na ha họpụta ụmụnna nwoke ka ha bụrụ ndị okenye abụghị obere ihe n’ihi na ndị okenye nwere ọrụ ndị dị mkpa ha na-arụ. Ma, ọ bụrụ na nwanna nwoke hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu ma chọọ ka Jehova jiri ya rụọ ọrụ n’ọgbakọ, ọ ga-emeli ihe ndị ahụ. Ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị ọ ga-abụ a hụ otú ha si ebi ndụ, a mara na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru.
Ka e nwee ike ilekọta ọgbakọ nke ọma, ndị a ga-ahọpụta ka ha bụrụ ndị okenye kwesịrị iru eru otú Okwu Chineke kwuru
5 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara Timoti nakwa n’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, o kwuru ihe nwanna nwoke ga-eme tupu a họpụta ya ịbụ okenye. Baịbụl kwuru na 1 Timoti 3:1-7, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya. Ya mere, onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ, di nke otu nwunye, onye na-emeru ihe n’ókè, onye uche ya zuru okè, onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa, onye ruru eru izi ihe, ọ bụghị onye aṅụrụma nke na-ese okwu, ọ bụghị onye na-eti mmadụ ihe, kama onye nwere ezi uche, ọ bụghị onye nwere mmụọ ịlụ ọgụ, ọ bụghị onye hụrụ ego n’anya, o kwesịrị ịbụ onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya, ndị na-eji ihe akpọrọ ihe; (n’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla amaghị otú ọ ga-esi lekọta ezinụlọ nke ya, olee otú ọ ga-esi lekọta ọgbakọ Chineke?) ọ bụghị onye chegharịrị ọhụrụ, ka o wee ghara ịbụ onye nganga ga-afụli elu, o wee daba n’ikpe a mara Ekwensu. O kwesịkwara ịbụ onye ndị nọ n’èzí na-agbara akaebe dị mma, ka o wee ghara ịdaba ná nkọcha na n’ọnyà Ekwensu.”
6 Pọl gwara Taịtọs, sị: “Ihe mere m ji hapụ gị na Krit bụ ka i nwee ike idozi ihe gahiere agahie, ka i nweekwa ike ịhọpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche, dị ka m nyere gị n’iwu; ọ bụrụ na e nwere nwoke ọ bụla a na-adịghị ebo ebubo, di nke otu nwunye, onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-adịghị ebo ebubo na ha na-ebi ndụ ịla n’iyi, ndị na-adịghịkwa isi ike. N’ihi na onye nlekọta, dị ka onye na-elekọta ezinụlọ Chineke, aghaghị ịbụ onye a na-adịghị ebo ebubo, onye na-adịghị ekwesi olu ike, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ bụghị onye aṅụrụma nke na-ese okwu, ọ bụghị onye na-eti mmadụ ihe, ọ bụghị onye ji anyaukwu achọ inweta uru aghụghọ, kama ọ bụ onye na-ele ọbịa, onye hụrụ ezi ihe n’anya, onye uche ya zuru okè, onye ezi omume, onye na-eguzosi ike n’ihe, onye nwere njide onwe onye, onye jidesiri okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi ike n’ihe banyere otú o si eji nkà ezi ihe, ka o wee nwee ike iji ozizi na-enye ezi ndụ na-adụsi ndị mmadụ ọdụ ike, na-adọkwa ndị na-ekwu okwu nke na-emegide okwu ahụ na-enye ezi ndụ aka ná ntị.”—Taịtọs 1:5-9.
7 N’agbanyeghị na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ụmụnna nwoke ga na-eme tupu a họpụta ha ịbụ okenye abụghị obere ihe, o kwesịghị ime ka ha ghara ịgba mbọ ruo eruo. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-akpa àgwà otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka ndị okenye na-akpa, ọ ga-enyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ aka, ha ana-akpa àgwà ndị ahụ. Pọl kwuru na ihe mere e ji họpụta ndị okenye ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” bụ “iji na-agbazi ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst elu, ruo mgbe anyị niile ga-adị n’otu n’okwukwe nakwa n’ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke, ruo mgbe anyị ghọrọ dimkpa, ruo mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru.”—Efe. 4:8, 12, 13.
8 Ndị okenye ekwesịghị ịbụ ụmụaka ma ọ bụ ndị chegharịrị ọhụrụ. Kama, ha kwesịrị ịbụ ndị ferela Jehova nke ọma ruo ọtụtụ afọ, ndị ma ihe Baịbụl na-ekwu, ndị nwere ike ịkọwa ya nke ọma, nakwa ndị hụrụ ọgbakọ n’anya. Ha ga-abụ ndị nwere ike ịkata obi gwa nwanna kpara àgwà ọjọọ okwu, gbaziekwa ya ka ọ ghara imebi ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. (Aịza. 32:2) Ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ma na ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na ndị ihe gbasara ìgwè atụrụ Chineke na-emetụ n’obi.
9 Onye a ga-ahọpụta ka ọ bụrụ okenye kwesịrị ịbụ onye na-akpa àgwà mgbe ọ bụla ka onye ma ihe. Ọ bụrụ na ọ lụọla nwaanyị, o kwesịrị ịbụ di nke otu nwunye nakwa onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma. Ọ bụrụ na o nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya, ndị na-eji ihe akpọrọ ihe, ndị a na-adịghị ebo ebubo na ha na-ebi ndụ ịla n’iyi, ndị na-adịghịkwa isi ike, obi ga-esi ụmụnna ike ịbịakwute ya ka ọ gwa ha ihe ga-enyere ha aka ịna-ebi nke ọma n’ezinụlọ ha na ịna-akpa àgwà ọma. Okenye kwesịkwara ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ, onye a na-adịghị ebo ebubo, na onye ndị nọ n’èzí na-agbara akaebe dị mma. O kwesịghị ịbụ onye a ga-ebo ebubo na o mere ihe ọjọọ, e mechaa chọpụta na ọ bụ eziokwu. Onye dị otú ahụ ga-emebi aha ọgbakọ. O kwesịghịkwa ịbụ onye a dọrọ aka ná ntị n’oge na-adịbeghị anya n’ihi àgwà ọjọọ ọ kpara. O kwesịrị ịbụ onye ndị nọ n’ọgbakọ ga-eṅomi, obi esiekwa ha ike na ọ ga-enyere ha aka ka ha na-efe Chineke nke ọma.—1 Kọr. 11:1; 16:15, 16.
10 Ndị okenye dị otú ahụ na-ejere ụmụnna ha ụdị ozi ndị okenye Izrel jere bụ́ ndị Baịbụl kwuru na ha bụ ndị “maara ihe na ndị nwere uche ma nwee ahụmahụ.” (Diut. 1:13) Ndị okenye ezughị okè. Ma, ọgbakọ ha na ndị obodo ha maara ha ka ndị na-akpa àgwà ọma na ndị na-atụ egwu Chineke n’ihi na otú ha si ebi ndụ gosiri na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ebe ọ bụ na e nweghị ihe a ga-eji taa ha ụta, ihere anaghị eme ha ikwu okwu n’ọgbakọ.—Rom 3:23.
11 Ụmụnna nwoke ndị na-agba mbọ ka ha ruo eruo ịbụ ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị na-emeru ihe n’ókè ma a bịa n’otú ha si akpa àgwà na otú ha si emeso ndị ọzọ ihe. Ha ekwesịghị ịbụ ndị na-emefe ihe ókè. Ha kwesịrị ịbụ ndị nwere njide onwe onye. Ha ga na-emeru ihe n’ókè ma a bịa n’ihe ndị dị ka iri ihe, ịṅụ ihe, egwuregwu, na ntụrụndụ. Ha na-akpachara anya n’otú ha si aṅụ mmanya ka a ghara ibo ha ebubo na ha na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ na ha bụ ndị aṅụrụma. Onye mmanya ririla ahụ́ anaghị ejideli onwe ya, ọ gaghịkwa enwe ike ilekọta ọgbakọ nke ọma.
12 Onye na-elekọta ọgbakọ kwesịrị ịbụ onye na-eme ihe n’usoro. Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga na-ejike nke ọma, na-edozi ụlọ ya edozi, na-ahazikwa ihe ndị ọ na-eme kwa ụbọchị ahazi. Ọ naghị egbu oge eme ihe ndị o kwesịrị ime. Ọ na-ama ihe e kwesịrị ime ma hazie otú a ga-esi eme ha. Ọ na-eme ihe otú Chineke kwuru.
13 Okenye kwesịrị ịbụ onye nwere ezi uche. O kwesịrị ịbụ onye ya na ndị okenye ndị ọzọ ga na-arụkọ ọrụ n’udo na onye ga na-akwado mkpebi ndị okenye mere. O kwesịrị ịbụ onye ma ihe ọ ga-emeli na ihe ọ na-agaghị emeli. O kwesịghị ịbụ onye na-achọ ka ndị ọzọ mee ihe ha na-agaghị emeli. O kwesịghịkwa ịbụ onye na-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ ya, onye na-ewere na ihe o kwuru ka nke ndị okenye ibe ya mma. O kwesịrị ịbụ onye ma na e nwere ebe ndị okenye ibe ya ka ya mma. Ihe ọzọ na-egosi na okenye nwere ezi uche bụ ma ọ na-agbakwasị ụkwụ n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru kwuo ihe ọ chọrọ ikwu, si otú ahụ na-eme ka Jizọs Kraịst. (Fil. 2:2-8) Okenye ekwesịghị ịbụ onye nwere mmụọ ịlụ ọgụ ma ọ bụ onye na-eti mmadụ ihe, kama, o kwesịrị ịbụ onye na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma were ya na ha ka ya mma. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ekwesi olu ike, ya bụ, onye na-anaghị esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe o kwuru. O kwesịrị ịbụ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ. O kwesịkwara ịbụ onye na-agba mbọ ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo.
14 Ihe ọzọ bụ na onye na-achọ ka o ruo eruo ịbụ okenye kwesịrị ịbụ onye uche ya zuru okè. Nke a pụtara na ọ ga-abụ onye isi jụrụ oyi, ya bụ, onye na-anaghị eme mkpebi ọkụ ọkụ. Ọ ga-abụkwa onye ma ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme, marakwa otú e nwere ike isi na-eme ha. Onye uche ya zuru okè na-anabata ndụmọdụ ma na-eme ihe a gwara ya. Ọ bụghị onye ihu abụọ.
15 Pọl gwara Taịtọs na okenye kwesịrị ịbụ onye hụrụ ezi ihe n’anya. O kwesịkwara ịbụ onye ezi omume na onye na-eguzosi ike n’ihe. Ndị ọzọ ga-ama na o nwere àgwà ndị a ma ha hụ otú o si emeso ndị ọzọ ihe nakwa otú o si akwụsi ike n’ihe ziri ezi ma ọ bụ n’ihe dị mma. Ọ na-eji ofufe Chineke akpọrọ ihe, na-emekwa ihe Jehova chọrọ mgbe niile. Ọ ga-abụ onye na-anaghị akọrọ ndị ọzọ ihe a na-achọghị ka ha mara. Ọ ga-abụkwa onye na-ele ọbịa, ya bụ, onye na-eji obi ya niile enyere ndị mmadụ aka ma na-enye ha ihe ndị o nwere.—Ọrụ 20:33-35.
16 Onye ga-abụ okenye kwesịrị ịbụ onye ruru eru izi ihe. Pọl gwara Taịtọs na okenye kwesịrị ịbụ “onye jidesiri okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi ike n’ihe banyere otú o si eji nkà ezi ihe, ka o wee nwee ike iji ozizi na-enye ezi ndụ na-adụsi ndị mmadụ ọdụ ike, na-adọkwa ndị na-ekwu okwu nke na-emegide okwu ahụ na-enye ezi ndụ aka ná ntị.” (Taị. 1:9) Okenye kwesịrị ịbụ onye ọ ga-abụ, ya na-ezi ihe, ndị ọ na-ezi ihe ana-echebara ihe ọ na-ekwu echiche, kwetakwa na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ọ ga-abụkwa onye na-akọwa Akwụkwọ Nsọ otú ọ ga-edo ndị ọ na-ezi ihe anya, okwukwe ha esikwuo ike. Ọ ga na-ezi ihe nke ọma ma n’oge ihe dị mma ma n’oge nsogbu. (2 Tim. 4:2) Ọ ga-abụ onye na-enwe ndidi. Ọ bụ ya ga-eme ka o nwee ike imeda obi dọọ onye mejọrọ ihe aka ná ntị, ma ọ bụ mee ka onye na-arụ ụka kweta n’ihe a na-agwa ya ma nwee ike iji obi ya niile na-eme ihe ndị bara uru. Ọ bụrụ na nwanna nwoke na-ezi ihe nke ọma n’ihu ọha ma ọ bụ mgbe ọ na-akụziri mmadụ ihe, ọ pụtara na o ruru eru izi ihe.
17 Ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị ji ozi ọma kpọrọ ihe. O kwesịrị iso n’ihe a ga-eji mara na ha na-eme ka Jizọs, bụ́ onye ji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma. (Mak 1:38; Luk 8:1) Ọ bụrụ na ndị okenye ana-agachi ozi ọma anya n’agbanyeghị ọtụtụ ọrụ ha na-arụ, ọ ga-eme ka ụmụnna na-agachikwa ozi ọma anya. Ọ bụrụkwa na ndị okenye na ndị ezinụlọ ha nakwa ụmụnna ndị ọzọ arụkọọ n’ozi ọma, ha ‘ga-agbarịta ibe ha ume.’—Rom 1:11, 12.
18 Mmadụ nwere ike iche na ihe a chọrọ ka nwanna nwoke mee tupu a họpụta ya ịbụ okenye karịrị akarị. Ebe ọ bụ na o nweghị onye zuru okè, o doro anya na ọ dịghị okenye ga-emetacha ihe niile ahụ Baịbụl kwuru otú Jehova chọrọ ya. Ma, e kwesịghị inwe okenye a ga-asị na ọ natụdịghị eme otu n’ime ihe ndị a a chọrọ ka ndị okenye na-eme. Ụfọdụ ndị okenye nwere ebe ndị ha na-eme nke ọma karịa ibe ha, ibe ha enweekwa ebe ndị ha na-eme nke ọma karịa ha. Ma ọ bụrụ na ha niile agbakọọ aka, ha ga-elekọta ọgbakọ Chineke nke ọma.
19 Ndị okenye kwesịrị iburu otu ihe Pọl kwuru n’obi mgbe ha na-atụ aro ndị a ga-ahọpụta ka ha bụrụ ndị okenye. Pọl kwuru, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche; kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè, onye ọ bụla dị ka okwukwe Chineke nyere ya si dị.” (Rom 12:3) Okenye ọ bụla kwesịrị iwere na ndị ọzọ ka ya. Mgbe ha na-akparịta ka ha mara ma nwanna ò ruru eru, ọ dịghị onye n’ime ha kwesịrị ịbụ “onye ezi omume gabiga ókè.” (Ekli. 7:16) Ebe ọ bụ na ndị okenye ma ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru e ji ama ma nwanna ò ruru eru ka a họpụta ya ịbụ okenye, ha kwesịrị ịchọpụta ma nwanna nwoke ha na-achọ ịtụ aro ka a họpụta ò ruru eru otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụkwa na ndị okenye aghọta na o nweghị onye zuru okè, gharakwa ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ ghara ịdị ihu abụọ, ndị ha ga-atụ aro ka a họpụta ga-abụ ndị ruru eru otú Akwụkwọ Nsọ kwuru nakwa ndị ga-abara ọgbakọ uru. Tupu ha amalite ịtụle ma nwanna ọ bụla ha chọrọ ịtụ aro ka a họpụta ò ruru eru, ha kwesịrị ikpe ekpere ka mmụọ nsọ Chineke duzie ha. Nke a bụ otu n’ime ọrụ ndị kacha taa akpụ ndị okenye na-arụ. N’ihi ya, ha ekwesịghị ‘ibikwasị onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa’ dị ka Pọl kwuru.—1 Tim. 5:21, 22.
MKPỤRỤ NKE MMỤỌ NSỌ
20 Ndị okenye jí ife Chineke kpọrọ ihe na-akpa àgwà ndị na-egosi na mmụọ nsọ na-edu ha. Pọl kwuru ihe itoolu so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ha bụ, “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye.” (Gal. 5:22, 23) Ndị okenye dị otú ahụ na-eme ka ahụ́ ruo ụmụnna ha ala, na-emekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu ma na-ejere Chineke ozi nke ọma. Àgwà ọma ha na-akpa na uru ọrụ ndị ha na-arụ na-abara ọgbakọ na-egosi na e ji mmụọ nsọ họpụta ha.—Ọrụ 20:28.
NDỊ OKENYE NA-EME KA ỌGBAKỌ DỊRỊ N’OTU
21 Ndị okenye kwesịrị ịna-agbakọ mbọ ọnụ eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Okenye ọ bụla nwere àgwà nke ya, ma ndị okenye niile na-agbalị eme ka ha dịrị n’otu. Otú ha si eme ya bụ ige ibe ha ntị nke ọma, ọ bụ eziokwu na ọ bụghị n’ihe niile ha na-akparịta ka ha ga-enwe otu olu na ya. Ọ bụrụhaala na ọ dịghị ihe ọ bụla Baịbụl kwuru e mebiri, onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịhapụ ihe o chere ma kwado mkpebi ndị okenye gbakọtara aka mee. Ọ bụrụ na okenye akwado mkpebi ndị okenye ibe ya mere, ọ na-egosi na “amamihe nke si n’elu” na-edu ya n’ihi na amamihe a ‘na-eme udo, nweekwa ezi uche.’ (Jems 3:17, 18) Ọ dịghị okenye kwesịrị iche na ya ka ndị ọzọ ma ọ bụ na-eme ka à ga-asị na ndị ọzọ nọ n’okpuru ya. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-enwe otu olu ná mkpebi ndị ha na-eme, ọ na-egosi na ha na Jehova na-arụkọ ọrụ, ọ ga-abakwara ọgbakọ uru.—1 Kọr., isi nke 12; Kọl. 2:19.
MMADỤ ỊGBA MBỌ KA O RUO ERU
22 Agụụ ịbụ okenye kwesịrị ịna-agụ ụmụnna nwoke ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. (1 Tim. 3:1) Okenye kwesịrị ịbụ onye na-arụsi ọrụ ike ma na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga na-ewepụta onwe ya ejere ụmụnna ya ozi ma na-enyere ha aka ife Chineke nke ọma. Onye chọrọ ka a họpụta ya ịbụ okenye kwesịrị ịna-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru e ji ama na mmadụ eruola ịbụ okenye.
OTÚ IHE SI DỊRỊ MMADỤ TAA NWERE IKE ỊGBANWE ECHI
23 Okenye jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ nwere ike ịda ọrịa ma ọ bụ ihe ọzọ emee ka ọ ghara ịna-eje ozi otú o sibu eje. Nká nwekwara ike ime ka ọ ghara ịna-arụ ọrụ ndị ọ na-arụbu n’ọgbakọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka bụ okenye, e kwesịkwara ịna-akwanyere ya ùgwù. O kwesịghị iji maka na o nweghịzi ike ịrụ ọrụ ya n’ọgbakọ sị na ya achọghịzi ịbụ okenye. E kwesịrị ịna-asọpụrụ ya otú ahụ e si asọpụrụ ndị okenye niile na-arụsi ọrụ ike n’ịzụ ìgwè atụrụ Chineke.
24 Ma ọ bụrụ na nwanna nwoke echee na ọ kaara ya mma ịkwụsị ịbụ okenye n’ihi na otú ihe si dịrị ya anaghịzi ekwe ya rụọ ọrụ ya n’ọgbakọ, o nwere ike ikwu na ya achọghịzi ịbụ okenye. (1 Pita 5:2) Onye ọ bụla kwesịrị ịna-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghịzi okenye ma ọ bụ na ọ naghịzi arụ ọrụ ndị okenye na-arụ, ọ ka baara ọgbakọ uru.
ỌRỤ DỊ ICHE ICHE NDỊ OKENYE NA-ARỤ N’ỌGBAKỌ
25 Ndị okenye na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. E nwere onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ, odeakwụkwọ ọgbakọ, onye nlekọta ije ozi, onye na-eduzi Ụlọ Nche, nakwa onye nlekọta ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. N’ọgbakọ ụfọdụ, ọtụtụ ndị okenye bụ ndị nlekọta ìgwè. E nweghị oge a kpọrọ aha ndị okenye ga-arụru ọrụ ndị a a gbanwee ha. Ma, ọ bụrụ na nwanna nke na-arụ otu n’ime ọrụ ndị a agafee n’ọgbakọ ọzọ, ma ọ bụ na o nweghịzi ike ịrụ ya n’ihi ọrịa, ma ọ bụkwanụ na ọ bụghịzi okenye n’ihi na ọ naghị eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ndị okenye kwesịrị ịna-eme, a ga-ahọrọ okenye ọzọ ka ọ rụwa ọrụ ya. N’ọgbakọ e nwere ndị okenye ole na ole, otu okenye nwere ike ịna-arụ ihe karịrị otu ọrụ ruo mgbe e nwekwuru ndị okenye ga na-arụ ọrụ ndị ahụ.
26 Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ na-abụ onyeisi oche ná nzukọ dị iche iche ndị okenye na-enwe. Ma, o kwesịrị ịdị umeala n’obi ka ya na ndị okenye ibe ya nwee ike ịna-elekọta ìgwè atụrụ Chineke nke ọma. (Rom 12:10; 1 Pita 5:2, 3) O kwesịrị ịbụ onye na-ahazi ihe nke ọma ma na-eduzi nzukọ ndị okenye otú kwesịrị ekwesị.—Rom 12:8.
27 Odeakwụkwọ ọgbakọ na-ahụ maka ihe niile a na-edekọ edekọ n’ọgbakọ, na-akọkwara ndị okenye banyere ozi dị mkpa e zitere. E nwekwara ike ikenye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ka ọ na-enyere ya aka.
28 Ọ bụ onye nlekọta ije ozi na-ahụ maka ihe niile gbasara ozi ọma n’ọgbakọ. Ọ na-ahazi otú ọ ga-esi na-eleta ìgwè ozi ubi dị iche iche e nwere n’ọgbakọ. N’ọnwa ọ bụla, ọ na-eji otu ngwụcha izu aga eleta otu ìgwè ozi ubi. N’ọgbakọ ndị nwere ìgwè ozi ubi ole na ole, o nwere ike ileta otu ìgwè ozi ubi ugboro abụọ n’afọ. Ọ gaa ileta ìgwè nke ọ bụla, ọ bụ ya ga-eduzi nzukọ ozi ubi, soro ha gaa ozi ọma ma nyere ndị nkwusa aka ime nletaghachi na iduzi ọmụmụ Baịbụl nke ọma.
NDỊ NLEKỌTA ÌGWÈ
29 Otu n’ime ọrụ ndị pụrụ iche ndị okenye na-arụ bụ ilekọta ìgwè ozi ubi. Ihe a na-akpọ onye na-arụ ọrụ a bụ onye nlekọta ìgwè. Onye nlekọta ìgwè na-arụ ọrụ dị iche iche. Nke mbụ bụ na ọ na-enyere onye nkwusa ọ bụla nọ n’ìgwè ya aka ka ọ na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Nke abụọ, ọ na-enyere onye nke ọ bụla aka ijechi ozi ọma anya, izi ozi ọma nke ọma, na ịna-enwe obi ụtọ n’ozi ya. Nke atọ abụrụ na ọ na-enyere ndị ohu na-eje ozi nọ n’ìgwè ya aka ka ha nwee ike iru eru ịrụ ọrụ ndị ọzọ n’ọgbakọ. Ọ bụ ndị okenye niile na-ekpebi ndị kacha ruo eruo ịbụ ndị nlekọta ìgwè.
30 N’ihi ụdị ọrụ onye nlekọta ìgwè na-arụ, onye ga-arụ ya kwesịrị ịbụ okenye. Ma ọ bụrụ na e nweghị okenye ga-arụ ya, e nwere ike ikenye ya ohu na-eje ozi ruru eru ruo mgbe e nwere okenye ga-arụ ya. Ihe a na-akpọ ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ a bụ ohu na-ahụ maka ìgwè n’ihi na ọ bụghị okenye. Ọ bụ ndị okenye ga-agwa ya ihe ọ ga na-arụ.
31 Otu n’ime ọrụ ndị dị mkpa onye nlekọta ìgwè na-arụ bụ na ọ na-ebute ụzọ n’ozi ọma. Otú o si ejechi ozi ọma anya na otú o si jiri ya kpọrọ ihe ga-eme ka ndị nọ n’ìgwè ya jirikwa ozi ọma kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na ọ na-atọ ndị nkwusa ụtọ ịrụkọ n’ozi ọma ma na-agbarịta ibe ha ume, ọ ga-adị mma ma onye nlekọta ìgwè hazie oge ga-akacha adị ọtụtụ ndị nkwusa nọ n’ìgwè ya mma ịna-eje ozi ọma. (Luk 10:1-16) O kwesịrị ịhụ na ndị nọ n’ìgwè ya nwere ókèala ga-ezuru ha izi ozi ọma mgbe ọ bụla ha bịara ozi ọma. Ọ bụ ya ga-eduzi nzukọ ozi ubi ma kenye onye nkwusa ọ bụla onye ya na ya ga-arụ. Ọ bụrụ na ọ gaghị anọ ya, o kwesịrị ịgwa okenye ọzọ ma ọ bụ ohu na-eje ozi ma ọ bụkwanụ onye nkwusa ọzọ ruru eru ka o duzie ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
32 Onye nlekọta ìgwè mata mgbe onye nlekọta ije ozi chọrọ ileta ìgwè ya, o kwesịrị ijikewe maka ya. Tupu oge ahụ eruo, o kwesịrị ịgwa ndị nọ n’ìgwè ya banyere ya ma mee ka ha tụsiwe anya ya ike. Ọ bụrụ na ndị niile nọ n’ìgwè ahụ amata mgbe onye nlekọta ije ozi ga-eleta ha, ha ga-eji obi ha niile kwado ya.
33 Ìgwè ozi ubi ọ bụla na-adị obere. Ọ na-eme ka onye nlekọta ìgwè ahụ mara ndị niile nọ n’ìgwè ya nke ọma. Onye nlekọta ìgwè kwesịrị ịma ihe bụ́ mkpa onye ọ bụla nọ n’ìgwè ya ma na-elekọta ha nke ọma. Ọ na-enyere onye ọ bụla nọ n’ìgwè ya aka ka ọ na-eje ozi ọma ma na-abịa ọmụmụ ihe. Ọ na-emekwa ihe ọ bụla o nwere ike ime ka okwukwe onye ọ bụla nọ n’ìgwè ya na-esi ike. Ọ na-eleta ndị na-arịa ọrịa na ndị dara mbà n’obi ma gbaa ha ume. Ọ na-agba ndị nọ n’ìgwè ya ume ma na-agwa ha ihe ndị ga-eme ka ụfọdụ n’ime ha ruo eruo ijekwu ozi n’ọgbakọ. Ndị ọ ga-akacha enyere aka bụ ndị ha na ya nọ n’otu ìgwè. Ma ebe ọ bụ okenye, bụrụkwa onye na-azụ atụrụ Chineke, ọ ga-enyere ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka, gbatakwara ha ọsọ enyemaka mgbe ọ bụla ha nwere mkpa.—Ọrụ 20:17, 28.
34 Otu n’ime ọrụ onye nlekọta ìgwè na-arụ bụ ịnata ndị nkwusa nọ n’ìgwè ya akụkọ ozi ha ma ọnwa gwụ. Ya natachaa ha ya, ya enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ ha. Ụmụnna nọ n’ìgwè ọ bụla ga-enyere onye nlekọta ìgwè ha aka ma ọ bụrụ na ha ana-enye ya akụkọ ozi ha ozugbo ọnwa gwụrụ. Ha nwere ike inye ya n’aka ma ọ bụ tinye ya n’igbe a na-etinye akụkọ ozi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
KỌMITII IJE OZI ỌGBAKỌ
35 Ndị so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ bụ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ, odeakwụkwọ ọgbakọ, na onye nlekọta ije ozi. E nwere ọrụ dị iche iche kọmitii a na-arụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ha na-enye ikike ka a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ ma ọ bụ kwuo okwu olili ozu. Ha na-ekenyekwa ndị nkwusa ìgwè ozi ubi ha ga-anọ na ya. Kọmitii a na-ahọpụta ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ inyeaka, na-abịanyekwa aka na fọm ụmụnna dejupụtara maka isi n’ụzọ ndị ọzọ jekwuoro Jehova ozi. Kọmitii Ije Ozi na-eme ihe ndị okenye ndị ọzọ gwara ha.
36 Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ekwu ihe bụ́ ọrụ kọmitii ije ozi ọgbakọ, ọrụ onye na-eduzi Ụlọ Nche, ọrụ onye nlekọta ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, nakwa ọrụ ndị okenye ndị ọzọ.
37 Ndị okenye ọgbakọ ọ bụla na-enwe nzukọ si n’oge ruo n’oge iji kwurịta otú ihe ga-esi na-aga nke ọma n’ọgbakọ. Ha na onye nlekọta sekit na-enwe nzukọ mgbe ọ bịara ileta ọgbakọ. Ha na-enwekwa nzukọ mgbe ihe dị ka ọnwa atọ gachara onye nlekọta sekit letara ọgbakọ ha. Ma, ndị okenye nwekwara ike inwe nzukọ mgbe ọ bụla e nwere okwu dị mkpa e kwesịrị ilebara anya.
NA-ANỌ N’OKPURU NDỊ OKENYE
38 Ndị okenye ezughị okè. Ma, a gwara ndị niile nọ n’ọgbakọ ka ha na-anọ n’okpuru ha n’ihi na ọ bụ otú Jehova si chọọ ya. Ndị okenye ga-aza ya ajụjụ maka otú ha si rụọ ọrụ ha. Ha na-anọchi anya Jehova na ọchịchị ya. Ndị Hibru 13:17 sịrị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.” Otú ahụ Jehova si eji mmụọ nsọ ya ahọpụta mmadụ ka ọ bụrụ okenye, ka ọ ga-esikwa jiri mmụọ nsọ ya wepụ okenye ma ọ kwụsị ịkpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ nakwa ma ọ kwụsị ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru okenye kwesịrị ịna-eme.
39 Anyị kwesịrị iji ndị okenye kpọrọ ihe n’ihi na ha na-arụsi ọrụ ike ma na-akpa àgwà ndị anyị kwesịrị iṅomi. Pọl gwara ọgbakọ dị na Tesalonaịka, sị: “Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-elekọta unu n’ime Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ; jirinụ ịhụnanya na-asọpụrụ ha nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche n’ihi ọrụ ha.” (1 Tesa. 5:12, 13) Ọtụtụ ọrụ ndị okenye na-arụ na-eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe ịna-ejere Chineke ozi, ozi anyị ana-atọkwu anyị ụtọ. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara Timoti, ọ gwara ya otú ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị isi na-akpaso ndị okenye àgwà. Ọ sịrị: “Ka a gụọ ndị okenye bụ́ ndị na-arụ ọrụ nlekọta n’ụzọ dị mma ná ndị ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ, karịsịa, ndị na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.”—1 Tim. 5:17.
ỌRỤ NDỊ ỌZỌ NDỊ OKENYE NA-ARỤ NÁ NZUKỌ JEHOVA
40 Mgbe ụfọdụ, a na-ahọpụta ụfọdụ ndị okenye ka ha na-aga eleta ụmụnna n’ụlọ ọgwụ. A na-akpọ ha Ndị Na-aga Eleta Ndị Ọrịa. A na-ahọpụtakwa ụfọdụ ndị okenye ka ha soro na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. Ha na-aga n’ụlọ ọgwụ dị iche iche agwa ndị ụlọ ọgwụ na ndị dọkịta otú ha ga-esi na-agwọ Ndịàmà Jehova n’amịnyeghị ha ọbara. E nwekwara ndị okenye na-enye aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, na-arụzikwa ihe ndị mebiri na ha, nweekwa ndị nke na-eso na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mgbakọ. Anyị niile nọ ná nzukọ a ji ndị okenye a kpọrọ ihe n’ihi otú ha si arụsi ọrụ ike na otú ha si eji obi ha niile enyere anyị aka. N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ịna-akwanyere ndị dị otú a ùgwù.’—Fil. 2:29.
ONYE NLEKỌTA SEKIT
41 Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị okenye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nlekọta sekit. Alaka ụlọ ọrụ na-ekenye ndị nlekọta sekit sekit ha ga na-elekọta. Ha na-eletakarị ọgbakọ ndị dị na sekit ha ugboro abụọ n’afọ. Mgbe ụfọdụ, ha na-aga eleta ndị ọsụ ụzọ na-eje ozi n’ebe ndị a na-enweghị ọgbakọ. Ha na-ahazi mgbe ha ga-eleta ọgbakọ nke ọ bụla. Ha hazichaa, ha agwa ha n’oge ka ọbịbịa ha nwee ike ịbara ọgbakọ ezigbo uru.
42 Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ na-ahụ na a haziri ihe niile nke ọma ka ọbịbịa onye nlekọta sekit nwee ike ime ka okwukwe onye ọ bụla sikwuo ike. (Rom 1:11, 12) Ozugbo onye nlekọta sekit gwara ọgbakọ mgbe ọ ga-abịa ileta ha nakwa ihe ndị ọ chọrọ, onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ na ụmụnna ndị ọzọ ga-agbalị chọta ebe ọ ga-ebi ma nweta ihe ndị ga-adị ya na nwunye ya mkpa ma ọ bụrụ na ọ lụọla nwaanyị. Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ga-emekwa ka onye nlekọta sekit na ọgbakọ mara gbasara ihe ndị ha haziri.
43 Onye nlekọta sekit ga-ajụ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ oge na ụbọchị ha ga-amụ ihe nakwa oge na ebe a ga-enwe nzukọ ozi ubi n’izu ahụ. E kwesịrị iji aro onye nlekọta sekit tụrụ nakwa ntụziaka alaka ụlọ ọrụ nyere kpebie oge na ebe a ga-enwe nzukọ ndị ahụ. E kwesịkwara ịgwa ọgbakọ oge na ebe a ga-anọ enwe ọmụmụ ihe, oge na ebe onye nlekọta sekit na ndị ọsụ ụzọ ga-anọ enwe nnọkọ, nakwa oge na ebe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na onye nlekọta sekit ga-anọ enwe nnọkọ. A ga-agwakwa ọgbakọ oge na ebe a ga-anọ enwe nzukọ ozi ubi.
44 N’izu onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ, ọ na-eji ehihie Tuzdee ele Kaadị Onye Nkwusa ọ bụla, kaadị a na-edekọ mmadụ ole bịara ọmụmụ ihe, akwụkwọ ndị gbasara ókèala ọgbakọ, na akwụkwọ ndị gbasara ihe ndekọ ego ọgbakọ. Ihe a ga-enyere ya aka ịma ebe ọgbakọ na-anaghị emecha nke ọma nakwa otú o nwere ike isi nyere ndị na-edekọ ihe ndị ahụ aka. Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ kwesịrị ịhazi otú kaadị na akwụkwọ ndị ahụ ga-esi ruo onye nlekọta sekit aka ozugbo ọ bịara.
45 N’izu ahụ onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ, ọ na-ewepụta oge ka ya na ụmụnna dị iche iche kwurịta okwu n’ọmụmụ ihe, n’ozi ọma, mgbe ha na-eri nri, ma ọ bụkwanụ mgbe ọ bụla ọzọ. Ya na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-enwekwa nnọkọ. Ná nnọkọ ahụ, ọ na-agba ha ume, tụọrọ ha aro ga-enyere ha aka ma jiri Akwụkwọ Nsọ mee ka ha ghọtakwuo otú ha ga-esi na-elekọta atụrụ Chineke nke ọma. (Ilu 27:23; Ọrụ 20:26-32; 1 Tim. 4:11-16) Ya na ndị ọsụ ụzọ na-enwekwa nnọkọ. Ọ na-agwa ha otú ha ga-esi na-eje ozi ha nke ọma. E nwee onye ọ bụla n’ime ha nwere ihe ya na ya na-alụ, nke na-anaghị ekwe ya ije ozi ya nke ọma, ọ ga-enyere ya aka ịma otú ọ ga-esi mewe nke ọma n’ozi ya.
46 E nwee ihe ndị ọzọ e kwesịrị ilebara anya, onye nlekọta sekit ga-elebara ha anya otú o nwere ike n’izu ahụ. Ọ bụrụ na o nweghị ike ilebacha ha anya n’izu ahụ, o nwere ike ịgwa ndị okenye ma ọ bụ ndị okwu ahụ gbasara ka ha mee nchọnchọ iji mata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ya. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit na ndị okenye chọrọ ka alaka ụlọ ọrụ nye aka n’okwu ahụ, ha ga-edegara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi ma kọọrọ ha ihe niile gbasara ya.
47 N’izu ahụ onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ, ọ ga-eso ha mụọ ihe. E nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ọmụmụ ihe n’izu ahụ. A na-agbakwasị ụkwụ ná ntụziaka alaka ụlọ ọrụ nyere mee mgbanwe ndị a. Onye nlekọta sekit ga-ekwu okwu n’ọmụmụ ihe ndị ahụ. Ọ ga-eji okwu ndị ahụ gbaa ọgbakọ ume, kụziere ha ihe, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike. Ọ ga-emekwa ka ọgbakọ hụkwuo Jehova na Jizọs Kraịst n’anya ma jiri nzukọ Jehova kpọrọ ihe.
48 Otu n’ime ihe ndị mere onye nlekọta sekit ji eleta ọgbakọ bụ ka ọ gbaa ụmụnna ume iji ozi ọma kpọrọ ihe ma tụọrọ ha aro otú ha ga-esi na-eme nke ọma n’ozi ọma. Ọtụtụ ụmụnna nwere ike ịhazigharị ihe ndị ha na-eme ka ha nwee ike ije ozi ọma nke ọma n’izu ahụ. Ha nwedịrị ike ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ. Onye ọ bụla chọrọ ka ya na onye nlekọta sekit ma ọ bụ nwunye ya rụọ n’ozi ọma nwere ike ikwu ya n’oge. Ọ bụrụ na nwanna akpọrọ onye nlekọta sekit ma ọ bụ nwunye ya gaa nletaghachi ma ọ bụ gaa duzie ọmụmụ Baịbụl, ọ ga-abara ha abụọ uru. Ọ ga-adị mma ma ị gbalịa pụta ozi ọma n’izu onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ unu.—Ilu 27:17.
49 N’afọ ọ bụla, sekit ọ bụla na-enwe mgbakọ sekit abụọ. Ọ bụ onye nlekọta sekit na-ahụ maka ihe ndị a na-eme na ha. Ọ bụkwa ya ga-ahọpụta onye nlekọta mgbakọ na onye na-enyere ya aka. Ha na onye nlekọta sekit ga-arụkọ ọrụ iji hụ na ihe gara nke ọma ná mgbakọ sekit ọ bụla. Aka a ha na-enyere onye nlekọta sekit ga-eme ka o nwee ike ilekwasị anya n’ihe omume ndị a ga-eme ná mgbakọ ahụ. Onye nlekọta sekit na-ahọpụtakwa ụmụnna ndị ọzọ ga na-ahụ maka ngalaba dị iche iche e nwere ná mgbakọ. Mgbe ọ bụla e nwechara mgbakọ sekit, ọ na-ahọpụta ụmụnna ndị ga-enyocha ihe ndekọ ego sekit. Alaka ụlọ ọrụ na-ezite onye na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ ka ọ bịa kwuo okwu n’otu n’ime mgbakọ sekit ndị ahụ. Mgbe ụfọdụ, a na-ekebi otu sekit ụzọ abụọ ka ha gaa mgbakọ sekit iche iche ma ọ bụrụ na ebe a ga-anọ enwe ya agaghị aba mmadụ niile nọ na sekit ahụ ma ọ bụkwanụ na ebe ahụ dị ọgbakọ ụfọdụ anya.
50 Onye nlekọta sekit na-ezigara alaka ụlọ ọrụ akụkọ ozi ya kwa ọnwa. Ọ bụrụ na ọgbakọ o letara enweghị ike ịkwụghachi ya ego ndị o mefuru, ya bụ, ego ụgbọ, ego nri, ego ụlọ, nakwa ego o ji zụọ ihe ndị o ji rụọ ọrụ ya, o nwere ike idepụta ihe ndị ahụ na ego ole o mefuru na ha ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ ka ha kwụghachi ya ego ndị ahụ. Obi siri ndị nlekọta sekit ike na ọ bụrụ na ha eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, Jehova ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa otú ahụ Jizọs kwuru. (Luk 12:31) Ọgbakọ ọ bụla kwesịrị ile onye nlekọta sekit ha ọbịa nke ọma mgbe ọ bụla o letara ha.—3 Jọn 5-8.
KỌMITII ALAKA
51 N’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova, a na-ahọpụta ụmụnna atọ ma ọ bụ karịa ka ha na-elekọta ya. A na-akpọ ha Kọmitii Alaka. Ụmụnna ndị a ji ife Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụ ha na-ahazi ozi ọma a na-ekwusa ná mba ọ bụla ha na-elekọta. Otu n’ime ha na-abụ onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ.
52 Ndị so na Kọmitii Alaka na-eleba anya n’okwu ọ bụla gbasara ọgbakọ niile dị n’ebe ha na-elekọta. Ha na-elekọta ozi ọma a na-ekwusa n’ebe niile ha na-elekọta. Ha na-ahụkwa na e hiwere ọgbakọ nakwa sekit dị iche iche ka e nwee ike ikwusa ozi ọma nke ọma n’ebe niile ha na-elekọta. Kọmitii Alaka na-ahụkwa maka ozi ọma ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ọsụ ụzọ oge niile, na nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka na-ekwusa. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu, na-ekenyekwa ụmụnna okwu ha ga-ekwu ná mgbakọ ukwu ka e nwee ike ime “ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”—1 Kọr. 14:40.
53 Ná mba ụfọdụ, a na-ahọpụta Kọmitii Na-elekọta Mba, ma, ha na-anọ n’okpuru Kọmitii Alaka nọ ná mba ọzọ. Ndị so na Kọmitii Na-elekọta Mba na-ahụ maka ozi ọma a na-ekwusa na ọrụ ndị ọzọ ọgbakọ dị iche iche na-arụ ná mba ha. Ha na-ahụkwa maka ọrụ ndị a na-arụ na Betel, na-ahụ maka akwụkwọ ozi dị iche iche na akụkọ ozi nke ọgbakọ niile ha na-elekọta nakwa ihe ndị ọzọ. Kọmitii Na-elekọta Mba na Kọmitii Alaka na-arụkọ ọrụ ọnụ ka ihe ndị gbasara Alaeze Chineke na-aga aga.
54 Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị na-eso na Kọmitii Alaka na Kọmitii Na-elekọta Mba.
NDỊ NA-ANỌCHITE ANYA ISI ỤLỌ ỌRỤ ANYỊ
55 Ọ na-abụ Òtù Na-achị Isi nọtụ, ha ezipụ ụmụnna ndị ga-aga eleta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụwa niile. A na-akpọ nwanna na-arụ ọrụ a onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị. Ihe kacha mkpa mere e ji ezipụ ya bụ ịgba ndị na-eje ozi na Betel ume na inyere ndị so na Kọmitii Alaka aka n’ihe ụfọdụ na-esiri ha ike n’ọrụ ha nakwa ịza ajụjụ ụfọdụ ha nwere ike ịjụ banyere ikwusa ozi ọma. Nwanna a na ndị nlekọta sekit ụfọdụ na-enwe nnọkọ, ya na ndị ozi ala ọzọ na-enwekwa nnọkọ site n’oge ruo n’oge. Ya na ha na-ekwurịta nsogbu ndị ha na-enwe na ihe ndị bụ́ mkpa ha. Ọ na-agbakwa ha ume n’ozi kacha mkpa ha na-eje, ya bụ, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na inyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.
56 Onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị na-elebakwa anya n’otú ozi ọma si aga ná mba ahụ ọ gara ileta nakwa n’ọrụ ndị ọzọ ụmụnna na-arụ n’ọgbakọ dị iche iche. O nwekwara ike ịga leta ụmụnna ndị na-arụ ọrụ n’ọfis ndị nsụgharị. Ya bịa ileta alaka ụlọ ọrụ, ọ na-eso ụmụnna aga ozi ọma otú o nwere ike.
Ọ bụrụ na anyị ana-edo onwe anyị n’okpuru ndị okenye, bụ́ ndị Chineke gwara ka ha na-elekọta ìgwè atụrụ ya, anyị na Kraịst Jizọs, bụ́ Onyeisi nke ọgbakọ, ga-adị n’otu
NDỊ NA-ELEKỌTA ANYỊ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA
57 Ọrụ ndị okenye na-arụ na otú ha si eji obiọma elekọta anyị na-abara anyị ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị ana-edo onwe anyị n’okpuru ndị okenye, bụ́ ndị Chineke gwara ka ha na-elekọta ìgwè atụrụ ya, anyị na Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeisi nke ọgbakọ, ga-adị n’otu. (1 Kọr. 16:15-18; Efe. 1:22, 23) Anyị na Kraịst dịrị n’otu, mmụọ nsọ Chineke ga na-edu ọgbakọ Ndị Kraịst niile, Okwu Chineke ana-eduzikwa ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile.—Ọma 119:105.