Otú Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị Si Eje Ozi Dị Ka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi Na-achị Ezinụlọ
“Dị ka unu nile n’otu n’otu natara onyinye amara, werenụ ihe ahụ na-ejerịtara onwe unu ozi, dị ka ndị na-achị ezinụlọ nke ọma n’amara Chineke nke dị n’ụzọ dị iche iche.”—1 PITA 4:10.
1, 2. (a) Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa okwu bụ́ “onye na-achị ezinụlọ”? (b) Olee ndị so ná ndị na-achị ezinụlọ bụ́ ndị Chineke ji eme ihe?
JEHOVA na-eji ndị Kraịst nile kwesịrị ntụkwasị obi eme ihe dị ka ndị na-achị ezinụlọ. Onye na-achị ezinụlọ na-abụkarị odibo nke na-elekọta ezinụlọ. Ọ pụkwara ilekọta ihe ndị metụtara azụmahịa nke nna ya ukwu. (Luk 16:1-3; Ndị Galetia 4:1, 2) Jisọs kpọrọ òtù ya nke ndị e tere mmanụ na-eguzosi ike n’ihe nọ n’ụwa “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.” Ọ bụ onye a na-achị ezinụlọ ka o nyefere “ihe nile o nwere,” gụnyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.—Luk 12:42-44; Matiu 24:14, 45.
2 Pita onyeozi kwuru na ndị Kraịst nile bụcha ndị na-achị ezinụlọ n’amara Chineke nke dị n’ụzọ dị iche iche. Onye Kraịst ọ bụla nwere ọnọdụ ebe ọ pụrụ ịnọ rụọ ọrụ ịchị ezinụlọ n’ikwesị ntụkwasị obi. (1 Pita 4:10) Ndị okenye a họpụtara ahọpụta bụ́ ndị Kraịst bụ ndị na-achị ezinụlọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị sokwa n’ime ha. (Taịtọs 1:7) Olee otú a ga-esi na-ele ndị okenye a na-ejegharị ejegharị anya? Àgwà na ebumnobi dịgasị aṅaa ka ha kwesịrị inwe? Oleekwa otú ha pụrụ isi rụpụta ihe kasị mma?
Ekele Maka Ozi Ha
3. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị “ndị na-achị ezinụlọ nke ọma”?
3 Ka ha na-edegara otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ya akwụkwọ ozi, otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst kwuru, sị: “Anyị ga-enwe mmasị ikwupụta ekele anyị maka oge nile na ịhụnanya unu nyeworo anyị. Dị ka ezinụlọ, anyị eritewo uru nke ukwuu site n’agbamume na okwu ndụmọdụ nile unu. Anyị maara na anyị aghaghị ịnọgide na-eto n’ụzọ ime mmụọ, ma site n’enyemaka Jehova tinyere ụmụnna nwoke na nwanyị dị ka unu, a na-eme ka ihe nrụgide ndị na-arịwanye elu dị mfe karị.” A na-anụkarị ụdị okwu ndị a n’ihi na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-enwe mmasị onwe onye n’ahụ ndị kwere ekwe ibe ha, dị nnọọ ka ezi onye na-achị ezinụlọ na-elekọta mkpa ezinụlọ nke ọma. Ụfọdụ bụ ezigbo ndị ọkà okwu. Ụfọdụ kasị eme nke ọma n’ọrụ ime nkwusa, ebe a maara ndị ọzọ maka ikpo ọkụ na ọmịiko ha. Site n’ịzụlite na iji onyinye ndị dị otú ahụ eme ihe n’ijere ndị ọzọ ozi, a pụrụ ịkpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ụzọ ziri ezi “ndị na-achị ezinụlọ nke ọma.”
4. Olee ajụjụ a ga-atụle ugbu a?
4 “Ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-achị ezinụlọ bụ, ka a hụ onye ọ bụla na o kwesịrị ntụkwasị obi,” ka Pọl onyeozi dere. (1 Ndị Kọrint 4:2) Ijere ndị Kraịst ibe ha ozi kwa izu n’ọgbakọ dị iche bụ ihe ùgwù pụrụ iche ma na-enye ọṅụ. Ka o sina dị, ọ bụkwa ibu ọrụ dị arọ. Mgbe ahụ, olee otú ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị pụrụ isi rụọ ọrụ ha nke ịchị ezinụlọ n’ikwesị ntụkwasị obi na n’ụzọ na-aga nke ọma?
Ịrụ Ọrụ Ha nke Ịchị Ezinụlọ n’Ụzọ Na-aga nke Ọma
5, 6. N’ihi gịnị ka iji ekpere dabere n’ebe Jehova nọ ji dị oké mkpa ná ndụ nke onye nlekọta na-ejegharị ejegharị?
5 Iji ekpere dabere n’ebe Jehova nọ dị mkpa ma ọ bụrụ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ga-abụ ndị na-achị ezinụlọ n’ụzọ gara nke ọma. N’ihi usoro ihe omume na ọtụtụ ibu ọrụ ha, ha pụrụ mgbe ụfọdụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị ọ nyịdara. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 5:4.) Ya mere ọ dị ha mkpa ime ihe kwekọrọ n’abụ Devid onye ọbụ abụ: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Okwu Devid na-akasikwa obi: “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu.”—Abụ Ọma 68:19.
6 Ebee ka Pọl si nweta ume iji lekọta ibu ọrụ ime mmụọ ya nile? “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike,” ka o dere. (Ndị Filipaị 4:13) Ee, Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ume Pọl. N’otu aka ahụ, Pita dụrụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eje ozi, ya jee dị ka o sitere n’ike ahụ Chineke na-enyezu: ka e wee nye Chineke otuto n’ihe nile site n’aka Jisọs Kraịst.” (1 Pita 4:11) Otu nwanna nke bụrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ruo ọtụtụ afọ mesiri mkpa nke ịdabere na Chineke ike, na-ekwu, sị: “Na-elegara Jehova anya mgbe nile n’idozi nsogbu, chọọkwa enyemaka nke nzukọ ya.”
7. Olee otú nguzozi si ekere òkè n’ọrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị?
7 Nguzozi dị onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere ihe ịga nke ọma mkpa. Dị ka ndị Kraịst ndị ọzọ, ọ na-agbalị “ijide n’aka ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10, NW)a Mgbe ndị okenye nọ n’ọgbakọ nwere ajụjụ banyere otu okwu, ọ bụ ihe amamihe nye ha iso onye nlekọta sekit bịara ileta ha kwurịta ya. (Ilu 11:14; 15:22) Ikekwe, okwu na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ya ndị guzoziri eguzozi ga-enye nnọọ aka ka ndị okenye nọgidere na-elebara okwu ahụ anya mgbe ọ hapụsịworo ọgbakọ ahụ. N’echiche yiri nke ahụ, Pọl gwara Timoti, sị: “Ihe nile ị nụkwara n’ọnụ m site n’etiti ọtụtụ ndị àmà, nye ihe ndị a n’aka mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi idebe, bụ mmadụ ndị ọ ga-ekwekwa izi mmadụ ibe ha ihe ndị a.”—2 Timoti 2:2.
8. N’ihi gịnị ka ọmụmụ Bible, ime nnyocha, na ntụgharị uche ji dị mkpa?
8 Ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ, ime nnyocha, na ntụgharị uche dịcha mkpa maka inye ndụmọdụ dị mma. (Ilu 15:28) Otu onye nlekọta distrikti kwuru, sị: “Mgbe e so ndị okenye na-enwe nzukọ, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ikweta na anyị amaghị azịza nye otu ajụjụ.” Itinye mgbalị iji nweta “uche nke Kraịst” n’otu okwu na-eme ka o kwe mee inye ndụmọdụ dabeere na Bible nke ga-enyere ndị ọzọ aka ime ihe kwekọrọ n’uche Chineke. (1 Ndị Kọrint 2:16) Mgbe ụfọdụ ọ na-adị onye nlekọta na-ejegharị ejegharị mkpa idegara Watch Tower Society akwụkwọ maka nduzi. Ka o sina dị, okwukwe n’ebe Jehova nọ na ịhụnanya maka eziokwu ahụ dị mkpa karịa otú e si ele anyị anya ma ọ bụ nkà ikwu okwu. Kama ịbịa “n’ọkà okwu ma ọ bụ n’ọkà amamihe,” Pọl malitere ozi ya na Kọrint “n’adịghị ike, na n’egwu, na n’oké ịma jijiji.” Nke a ò mere ka ọ ghara ịdị irè? N’ụzọ dị iche, o nyeere ndị Kọrint aka inwe okwukwe, ọ bụghị “n’amamihe mmadụ, kama n’ike nke Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:1-5.
Àgwà Ndị Ọzọ Ndị Dị Mkpa
9. N’ihi gịnị ka mmetụta ọmịiko ji dị ndị okenye na-ejegharị ejegharị mkpa?
9 Mmetụta ọmịiko na-enyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị aka ịrụpụta ihe ndị dị mma. Pita gbara ndị Kraịst nile ume ‘iwere obi sorịta onwe ha hụkọọ ahụhụ,’ ma ọ bụ ịdị “na-eme ebere.” (1 Pita 3:8, nkọwa ala ala peji NW) Otu onye nlekọta sekit na-ahụ mkpa ọ dị ‘inwe mmasị n’onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ma na-aṅa ntị n’ezie.’ Na mmụọ yiri nke ahụ, Pọl dere, sị: “Na-esonụ ndị na-aṅụrị n’ịṅụrị ọṅụ; na-esonụ ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá.” (Ndị Rom 12:15) Omume dị otú ahụ na-akpali ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ime ezi mgbalị ịghọta nsogbu na ọnọdụ nke ndị kwere ekwe ibe ha. Mgbe ahụ ha pụrụ inye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ na-ewuli elu nke pụrụ ịrụpụta ihe dị mma n’ezie ma e tinye ya n’ọrụ. Otu onye nlekọta sekit nke kasị eme nke ọma n’igosi mmetụta ọmịiko natara akwụkwọ ozi a site n’otu ọgbakọ dịdewere Turin, Itali: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka e nwee mmasị ebe ị nọ, nwee mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ; ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe gị na-atọ ndị ọzọ ụtọ, ka ihe ndị ọzọ na-atọ gị ụtọ; ọ bụrụ na ị chọrọ ka a hụ gị n’anya, bụrụ onye a pụrụ ịhụ n’anya; ọ bụrụ na ị chọrọ ka e nyere gị aka, dị njikere inye aka. Nke a bụ ihe anyị mụtaworo site n’aka gị!”
10. Gịnị ka ndị nlekọta sekit na distrikti kwuworo banyere ịdị umeala n’obi, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’akụkụ a?
10 Ịdị umeala n’obi na ịbụ onye a pụrụ ịbịakwute na-enyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị aka ịrụpụta ihe ọma dị ukwuu. Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “Ọ kasị mkpa ịnọgide na-enwe àgwà ịdị umeala n’obi.” Ọ ga-adọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ọhụrụ aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka ụmụnna ndị ka baa ọgaranya nwee mmetụta na-ekwesịghị ekwesị n’ahụ unu n’ihi ihe ha pụrụ imere unu, ma ọ bụ kpaara ọbụbụenyi unu ókè nanị n’ebe ụdị ndị ahụ nọ, kama gbalịa mgbe nile imeso ndị ọzọ ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu.” (2 Ihe Emere 19:6, 7) Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke dịkwa umeala n’obi n’ezie agaghị enwe echiche gabigara ókè banyere ịdị mkpa nke onwe ya dị ka onye nnọchiteanya Society. Otu onye nlekọta distrikti kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Dị umeala n’obi ma dị njikere ige ụmụnna ntị. Bụrụ onye a pụrụ ịbịakwute mgbe nile.” Dị ka nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, Jisọs Kraịst pụrụ imeworị ka ndị mmadụ ghara inwe ahụ iru ala, ma ọ dị umeala n’obi ma bụrụ onye a pụrụ ịbịakwute nke na ọbụna ụmụaka nwere ahụ iru ala mgbe ha na ya nọ. (Matiu 18:5; Mak 10:13-16) Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị chọrọ ka ụmụaka, ndị nọ n’afọ iri na ụma, ndị agadi—n’ezie onye ọ bụla na mmadụ nile nọ n’ọgbakọ—nwere onwe ha ịbịakwute ha.
11. Mgbe ọ dị mkpa, gịnị pụrụ ịbụ mmetụta nke ịrịọ mgbaghara?
11 N’ezie, “anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe,” ọ dịghịkwa onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke na-apụghị ihie ụzọ. (Jemes 3:2) Mgbe ha hiere ụzọ, arịrịọ si n’ezi obi na-enye ndị okenye ndị ọzọ ihe nlereanya nke ịdị umeala n’obi. Dị ka Ilu 22:4 si kwuo, “ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu [nsọpụrụ] Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.” Ọ̀ bụkwa na ọ dịghị ndị ohu Chineke nile mkpa ‘iji obi umeala soro Chineke ha na-eje ije’? (Maịka 6:8) Mgbe a jụrụ ya okwu ndụmọdụ ọ ga-enye onye okenye ọhụrụ na-ejegharị ejegharị, otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “Nwee nkwanye ùgwù na nsọpụrụ dị ukwuu maka ụmụnna nile, werekwa ha dị ka ndị ka gị mma. Ị ga-amụta ihe dị ukwuu site n’aka ụmụnna ahụ. Nọgide na-adị umeala n’obi. Emela ngosi. Ebulila onwe gị elu.”—Ndị Filipaị 2:3.
12. N’ihi gịnị ka ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ndị Kraịst ji dị oké mkpa?
12 Ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ndị Kraịst na-eme ka okwu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị dịkwuo arọ. N’ezie, mgbe ya na nwunye ya setịpụrụ ihe nlereanya ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ izisa ozi ọma, a na-agba ndị okenye, ndị nwunye ha, na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ume igosipụta ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ha. “Na-anụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ,” ka otu onye nlekọta sekit gbara ume ya. O kwukwasịrị: “Achọpụtawo m na, n’ozuzu ya, ka ọgbakọ na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi ahụ, otú a ka nsogbu ha na-enwe na-adịwanye ole na ole.” Onye nlekọta sekit ọzọ kwuru, sị: “Ekwetara m na ọ bụrụ na ndị okenye esoro ụmụnna nwoke na nwanyị rụkọọ ọrụ n’ubi ma nyere ha aka ịnụ ụtọ nke ozi ahụ, nke a ga-arụpụta udo nke uche na afọ ojuju kasị ukwuu n’ijere Jehova ozi.” Pọl onyeozi ‘kwuwara okwu ịgwa ndị Tesalọnaịka ozi ọma Chineke n’oké mgba.’ Ka a sịkwa ihe mere ha ji jiri mmasị na-echeta nleta na ọrụ ime nkwusa ya ma na-enwe agụụ ịhụkwa ya ọzọ!—1 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2; 3:6.
13. Gịnị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eburu n’uche mgbe o so ndị Kraịst ibe ya na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi?
13 Mgbe ya na ndị Kraịst ibe ya na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eburu ọnọdụ ha na adịghị ike ha n’uche. Ọ bụ ezie na aro ya pụrụ inye aka, ọ maara na ụfọdụ pụrụ ịdị na-atụ ụjọ mgbe ha so onye okenye nwere ahụmahụ na-eme nkwusa. Ya mere, n’ọnọdụ ụfọdụ, agbamume pụrụ ịba uru karịa ndụmọdụ. Mgbe o so ndị nkwusa ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ gaa iduzi ọmụmụ Bible, ha pụrụ inwe mmasị karị ka o duzie ya. Nke a ma eleghị anya bụ iji mee ka ha mata ụzọ ụfọdụ isi meziwanye ụzọ izi ihe ha.
14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-anụ ọkụ n’obi na-akpasu ịnụ ọkụ n’obi n’ahụ ndị ọzọ?
14 Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-anụ ọkụ n’obi na-akpasu ịnụ ọkụ n’obi n’ahụ ndị ọzọ. Otu onye nlekọta sekit na Uganda gara ije n’ime oké ọhịa ruo otu hour iji sonyere otu nwanna nwoke n’ọmụmụ Bible nke na-enwe ntakịrị ọganihu. N’oge ha nọ na-aga nnukwu mmiri zoro nke na mmiri matọrọ ha mgbe ha bịarutere. Mgbe ezinụlọ ahụ dị mmadụ isii nụrụ na onye ọbịa ha bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ọ masịrị ha nke ukwuu. Ha maara na ndị ụkọchukwu chọọchị ha agaghị egosi ụdị mmasị ahụ ma ọlị n’ìgwè atụrụ ahụ. Na Sunday na-esonụ, ha bịara nzukọ mbụ ha ma kwupụta ọchịchọ ịghọ Ndịàmà Jehova.
15. Ahụmahụ ọma dị aṅaa ka otu onye nlekọta sekit na-anụ ọkụ n’obi na Mexico nwere?
15 N’obodo Mexico bụ́ Oaxaca, otu onye nlekọta sekit mere mgbalị a na-atụghị anya n’ezie na ọ ga-eme. O mere ndokwa ịnọ n’ụlọ nga ruo abalị anọ iji leta otu ìgwè nke ndị nga asaa bụ́ ndị ghọworo ndị nkwusa Alaeze. Ruo ọtụtụ ụbọchị o sonyeere ndị nga a ka ha na-agba àmà site n’otu ọnụ ụlọ nga gaa n’ọnụ ụlọ nga ọzọ ma duzie ọmụmụ Bible. N’ihi mmasị e gosiri, ụfọdụ n’ime ọmụmụ ihe ndị a dịịrị bamie n’ime abalị. “Ka nleta ahụ gwụsịrị, mụ na ndị nga ahụ jupụtara n’ọṅụ n’ihi agbamume anyị nile nwetara,” ka onye nlekọta sekit a na-anụ ọkụ n’obi na-ede.
16. N’ihi gịnị ka o ji baa oké uru mgbe ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha nyere agbamume?
16 Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-agbalị ịdị na-agba ume. Mgbe Pọl letara ọgbakọ ndị dị na Masedọnia, o ‘weere ọtụtụ okwu kasie ha obi.’ (Ọrụ 20:1, 2) Okwu agbamume pụrụ ịdị na-enye nnọọ aka n’iduzi ma ụmụaka ma ndị agadi gaa n’ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. N’otu alaka ụlọ ọrụ buru ibu nke Watch Tower Society, nnyocha nkịtị e mere kpughere na ndị nlekọta sekit agbawo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 20 pasent nke ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ume iwere ozi oge nile. Site n’ezi ihe nlereanya ya dị ka onye nkwusa Alaeze oge nile, nwunye onye nlekọta sekit na-abụkwa oké isi iyi nke agbamume.
17. Gịnị ka otu onye nlekọta sekit meworo agadi na-eche banyere ihe ùgwù ya nke inyere ndị ọzọ aka?
17 Agbamume dị ndị meworo okenye karị na ndị dara mbà n’obi mkpa karịsịa. Otu onye nlekọta sekit meworo agadi na-ede, sị: “Akụkụ ọrụ m nke na-akpasu ọṅụ ime obi a na-apụghị ịkọ akọ bụ ihe ùgwù nke inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi na ndị na-adịghị ike n’etiti ìgwè atụrụ Chineke aka. Okwu Ndị Rom 1:11, 12 nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara nye m, ebe m na-enweta oké agbamume na ume mgbe m ‘na-eme ka ndị dị otú ahụ keta onyinye amara ụfọdụ nke mmụọ nsọ, ka e wee mee ka ha guzosie ike.’”
Nkwụghachi Ụgwọ nke Ọrụ Ọṅụ Ha
18. Ebumnobi dịgasị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere?
18 Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị bu ọdịmma kasị mma nke ndị kwere ekwe ibe ha n’obi. Ha chọrọ iwusi ọgbakọ dị iche iche ike, wuliekwa ha elu n’ụzọ ime mmụọ. (Ọrụ 15:41) Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-arụsi ọrụ ike “inye agbamume, inye ume ọhụrụ, na ịkwalite ọchịchọ ijezu ozi ahụ na ịnọgide na-adị ndụ dị ka eziokwu ahụ si dị.” (3 Jọn 3) Onye ọzọ na-achọ ime ka ndị ibe ya kwere ekwe kwụsie ike n’okwukwe. (Ndị Kọlọsi 2:6, 7) Cheta na onye nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ ‘onye e kekọtaworo gị na ya n’ezie n’ọrụ,’ ọ bụghị onye nwe okwukwe ndị ọzọ. (Ndị Filipaị 4:3; 2 Ndị Kọrint 1:24) Nleta ya bụ oge agbamume na ịrụkwu ọrụ, nakwa ohere nye òtù ndị okenye ịtụleghachi ọganihu ndị e nwere na ịtụle ihe mgbaru ọsọ ọdịnihu. Site n’okwu na ihe nlereanya ya, ndị nkwusa ọgbakọ, ndị ọsụ ụzọ, ndị ohu na-eje ozi, na ndị okenye pụrụ ịtụ anya ịbụ ndị e wuliri elu ma kpalie maka ọrụ dị n’ihu. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:11.) Ya mere, jiri obi gị dum na-akwado nleta nile nke onye nlekọta sekit ma jiri ozi onye nlekọta distrikti na-eje na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu.
19, 20. Olee otú e siworo kwụghachi ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ụgwọ maka ozi ikwesị ntụkwasị obi ha?
19 A na-akwụghachi ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ụgwọ n’ụba maka ozi ikwesị ntụkwasị obi ha, ha pụkwara inwe obi ike na Jehova ga-agọzi ha maka ihe ọma ha na-eme. (Ilu 19:17; Ndị Efesọs 6:8) Georg na Magdalena bụ di na nwunye meworo agadi ndị jere ozi ruo ọtụtụ afọ n’ọrụ njegharị. N’otu mgbakọ na Luxembourg, otu onye nke Magdalena gbawooro àmà ihe karịrị afọ 20 tupu mgbe ahụ bịakwutere ya. Ihe kpasuru mmasị nwanyị a bụ́ onye Juu n’eziokwu bụ akwụkwọ e ji amụ Bible Magdalena hapụụrụ ya, ka oge na-agakwa e mere ya baptism. Otu nwanna nwanyị ime mmụọ, bụ́ onye chetara nleta ya n’ebe obibi ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40 gara aga, bịakwutere Georg. Ochiche o ji ịnụ ọkụ n’obi chee ozi ọma ahụ n’ihu mesịrị duje na ma ya ma di ya ịnakwere eziokwu ahụ. Ọ dịghị mkpa ikwuwe ya, ma Georg ma Magdalena nwere oké ọnụ.
20 Ozi Pọl nke mịpụtara mkpụrụ n’Efesọs wetaara ya ọṅụ, nweekwa ike ịkpaliworị ya ihota okwu Jisọs bụ́: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ebe ọrụ njegharị na-agụnye inye ihe mgbe nile, ndị na-ekere òkè na ya na-enwe obi ụtọ, karịsịa mgbe ha matara ihe ọma ndị si ná ndọgbu n’ọrụ ha pụta. A gwara otu onye nlekọta sekit nke nyeere otu okenye nwere nkụda mmụọ aka n’akwụkwọ ozi, sị: “Ị bụwo oké ‘enyemaka na-ewusi ike’ ná ndụ ime mmụọ m—karịa otú ị maara. . . . Ọ dịghị mgbe ị ga-amatazu ókè i nyeruwooro Esaf nke oge a aka bụ́ onye ‘ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ ya abụọ wezụga onwe ha.’”—Ndị Kọlọsi 4:11; Abụ Ọma 73:2.
21. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na 1 Ndị Kọrint 15:58 metụtara ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị?
21 Otu onye Kraịst meworo agadi nke rụrụ ọrụ sekit ruo ọtụtụ afọ na-enwe mmasị icheta 1 Ndị Kọrint 15:58, bụ́ ebe Pọl gbara ume, sị: “Guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.” N’ezie ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè. Leekwa ka anyị si nwee ekele na ha ji oké ọṅụ na-eje ozi dị ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na-achị ezinụlọ n’amara Jehova!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ị̀ Pụrụ Inwe Obi Ụtọ Mgbe I Nwere Ọtụtụ Ihe Ị Ga-eme?” n’Ụlọ Nche, May 15, 1991, peji nke 28-31.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji lee ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị anya dị ka “ndị na-achị ezinụlọ nke ọma”?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ isi ihe na-enyere ndị nlekọta sekit na distrikti aka ịrụzu ihe ọma dị ukwuu?
◻ N’ihi gịnị ka ịdị umeala n’obi na ịnụ ọkụ n’obi ji dị oké mkpa nye ndị na-ekere òkè n’ọrụ njegharị?
◻ Ebumnobi ọma dịgasị aṅaa ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-achọ ịgba ndị kwere ekwe ibe ha ume
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ma ụmụaka ma ndị agadi pụrụ irite uru site n’iso ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha na-akpakọrịta
[Foto dị na peeji nke 18]
Ozi ịnụ ọkụ n’obi nke onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-akpali ndị ọzọ