Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na January na February: Bekee—Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? Efịk na Hausa—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ma ọ bụ True Peace and Security—From What Source? Igbo—Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Isoko—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba—Happiness—How to Find It, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, ma ọ bụ Ndu Nka Ọ̀ Bu Nani Ndu Dinu? (A ga-enyefe akwụkwọ nile dị 192 peji e depụtara n’elu n’ụtụ dị ala bụ́ ₦50 [ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦40]; akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ Efịk, Hausa, Igbo, Isoko, na Yoruba bụ ₦80 [ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦50]. E zigaara òtù ndị okenye nile akwụkwọ ozi banyere nke a na May.) March: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. April: Ụtụ Ụlọ Nche. Maka ókèala a na-arụzu mgbe mgbe, a pụrụ iji broshuọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, mee ihe. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ A ga-enye ndị nkwusa nile e mere baptism nọ ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke January 6 kaadị Advance Medical Directive/Release na Identity Card maka ụmụ ha.
◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 2, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Jiri Agụmakwụkwọ Nye Jehova Otuto.”
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa dị mma maka ime Ememe Ncheta n’afọ a na Sunday, March 23, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu ahụ pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya Ememe Ncheta ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Mee nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ebe ọ bụ na a gaghị enwe nzukọ ọzọ ma e wezụga nke ozi ubi n’ụbọchị ahụ, e kwesịrị ime mgbanwe ndị kwesịrị ekwesị ka e wee duzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’oge ọzọ. Ọ ga-adị ndị nlekọta sekit mkpa ịgbanwe usoro ihe omume ha maka inwe nzukọ n’izu ahụ dị ka ọnọdụ ha si dị. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ iji mee ihe maka uhuruchi ahụ. Ememe Ncheta ahụ ekwesịghị ịmalite mgbe oge gafeworo nke na ọ gaghị adịrị ndị ka na-enwe mmasị ọhụrụ mfe ịbịa. Usoro ihe omume ahụ ekwesịghịkwa ịdị mkpagide nke na e nweghị ohere tupu ma ọ bụ mgbe ememe ahụ gasịrị maka ikele ndị ọbịa, ime ndokwa maka ịnọgide na-enye ndị nwere mmasị enyemaka ime mmụọ, ma ọ bụ iji gbarịta mmadụ nile ume. Mgbe a tụlesịworo ihe nile nke ọma, ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-enyere ndị ga-abịa Ememe Ncheta ahụ aka karịsịa irite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe omume ahụ.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke 1997 na Sunday, April 6. A ga-enye ihe ndepụta. Ọgbakọ ndị onye nlekọta sekit na-eleta, ndị nwere mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-enwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị inwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu April 6.
◼ Òtù ndị okenye kwesịrị ịmara na mgbanwe ndị na-esonụ dị mkpa mgbe ọgbakọ na-aga mgbakọ maka ógbè ha: Mgbe e dokwara usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, ọgbakọ kwesịrị inwe nzukọ nile a na-enwe n’izu, nanị na a kagburu Nzukọ Ihu Ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Mgbe e dokwara ịga mgbakọ sekit, ọgbakọ ga-akagbukwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi; nanị Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ka a ga-enwe n’ọgbakọ n’izu ahụ.
◼ Yearbook Maka Ndị Ọsụ Ụzọ—Onye ọsụ ụzọ ọ bụla nke oge nile na nke pụrụ iche nke e debara aha ya tupu ma ọ bụ na July 1, 1996, ruru eru inweta otu Yearbook n’efu. A pụrụ inweta nke a site n’akwụkwọ a na-ebutere ọgbakọ. Na fọm ịkwụ ụgwọ bụ́ S-20, a ghaghị idepụta nke ọma ọnụ ọgụgụ Yearbook e nyere n’efu maka ndị ọsụ ụzọ ka e wee sepụ ego zuru ezu maka nke ọ bụla. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ inwetakwu Yearbook n’ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ. A ga-eji ndị a mee ihe n’ubi. A ghaghị ime ndejupụta dị iche n’okpuru ego a na-esepụrụ ndị ọsụ ụzọ na fọm ịkwụ ụgwọ bụ́ S-20. Detuo “Yearbook ndị bụ n’ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ.” A gajeghị ịghọtahie nke a na ndị a ga-enye ndị ọsụ ụzọ n’efu. A ga-esepụ ego a na-esepụrụ ndị ọsụ ụzọ maka nke ọ bụla e nyere n’ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ.
◼ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị Maka Ndị Ọsụ Ụzọ—Onye ọsụ ụzọ ọ bụla nke oge nile na nke pụrụ iche nke e debara aha ya tupu ma ọ bụ na July 1, 1996, ruru eru inweta otu n’efu maka iji mee ihe n’onwe ya. Maka nke ọ bụla e nyere, a ga-esepụ ego zuru ezu n’ihe ndekọ ego akwụkwọ unu. E tinyeghị ndị ọsụ ụzọ inyeaka na nke ọ bụla n’ime ndokwa ndị a. Ọzọ, a ghaghị idepụta nke ọma ọnụ ọgụgụ es97 e nyere ndị ọsụ ụzọ n’efu na fọm ịkwụ ụgwọ bụ́ S-20 ka e wee sepụ ego zuru ezu maka nke ọ bụla.