Ị̀ Bụ Onye Nkwusa Alaeze Oge Nile?
1 Anyị nile ṅụrịrị ọṅụ mgbe anyị nụrụ na Nigeria ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụrụla nke ndị nkwusa 226,539 na September 1999. N’ezie ọ bụ mgbalị a gbakọrọ aka ma jiri mkpebi siri ike mee! Ihe àmà na-egosi na n’ọnwa ndị sochirinụ, ụfọdụ n’ime ndị nkwusa ndị a nwere ihe isi ike nke ịbụ ndị nkwusa Alaeze oge nile, n’ihi na nkezi kwa ọnwa kemgbe ahụ abụwo ihe dị ka 220,497. Nke a na-egosi na 1 onye n’ime ndị nkwusa 36 enyebeghị akụkọ ozi nke na-egosi na o keere òkè n’ozi kwa ọnwa. Anyị nwere obi ike na agbamume na-esonụ pụrụ inye aka n’ịgwọta nsogbu ahụ.
2 Nwee Obi Ekele Maka Ihe Ùgwù Ahụ: Anyị kwesịrị inwe ekele dị ukwuu maka ihe ùgwù anyị nwere iso ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma Alaeze ahụ. Ọrụ a na-eme ka obi Jehova ṅụrịa ma na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmụta ụzọ nke na-eduba ná ndụ. (Ilu 27:11; 1 Tim. 4:16) Ịgba àmà mgbe nile na-eme ka anyị na-enwekwu ahụmahụ n’ozi ma na-enwe ọṅụ na afọ ojuju.
3 Nye Akụkọ Ozi: Ụfọdụ ndị keere òkè n’ozi ubi na-eleghara inye akụkọ ozi ha n’oge anya. Ka anyị ghara iche na mgbalị anyị tinyere erughị inye n’akụkọ ozi. (Tụlee Mak 12:41–44.) Ee, anyị kwesịrị inye akụkọ ozi nke ozi anyị jeworo! Inwe usoro maka idekọ oge e ji jee ozi n’ụlọ dị ka iji kalenda eme ihe ga-abụ ihe ncheta mgbe nile iji nye akụkọ ozi ziri ezi n’egbughị oge ná ngwụsị nke ọnwa ọ bụla.
4 Nye Enyemaka Dị Mkpa: A pụrụ imeziwanye ndokwa ndị ọgbakọ mere inyere ndị chọrọ enyemaka aka iji na-ekere òkè mgbe nile n’ozi. Odeakwụkwọ ọgbakọ na ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ndokwa ka ndị nkwusa nwere ahụmahụ nye aka. Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka ma ọ bụ ndị ọzọ ị na-amụrụ Bible bụ́ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, zụọ ha inye akụkọ ozi ha kwa ọnwa.
5 Cheta akụkọ ndụ ahụ isiokwu ya bụ́, “Ekele Maka Ogologo Ndụ n’Ozi Jehova,” nke dị n’Ụlọ Nche October 1, 1997. Nwanna nwanyị Ottilie Mydland bụ́ onye Norway ghọrọ onye nkwusa oge nile nke ozi ọma ahụ tupu e mee ya baptism na 1921. Ka afọ 76 gasịrị, mgbe ọ dị afọ 99, o kwuru sị: “Obi dị m ụtọ na ọ ka kwere m mee ịbụ onye nkwusa na-ejechi ozi anya.” Lee àgwà magburu onwe ya ọ bụ maka ndị ohu Jehova nile iṅomi!