Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/98 p. 1
  • August Ọ̀ Ga-abụ Ọnwa Pụrụ Iche?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • August Ọ̀ Ga-abụ Ọnwa Pụrụ Iche?
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 215,000!
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Akụkọ Ọchịchị Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ị̀ Bụ Onye Nkwusa Alaeze Oge Nile?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Ọnwa Ọgọst Ga-apụ Iche
    Ozi Alaeze Anyi—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 8/98 p. 1

August Ọ̀ Ga-abụ Ọnwa Pụrụ Iche?

1 N’afọ 1948 ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa gburugburu ụwa gafere 226,000. Ọ bụrụ na ị nọ n’eziokwu mgbe ahụ, ị pụrụ icheta ụdị obi ụtọ anyị nwere n’inwe ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi Alaeze ahụ! Ugbu a, nanị ná mba a e nwere ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa hà otú ahụ. Otú ọ dị, kwa ọnwa, ná nkezi, 20,000 n’ime anyị adịghị enye akụkọ na ha keere òkè ụfọdụ n’ozi.

2 Nakwere Ihe Ịma Aka Ahụ: N’August anyị na-agbalị iru ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụrụla bụ́ ndị nkwusa 215,000 na Nigeria. Ọ bụrụ na mgbalị anyị agaa nke ọma, August ga-abụ ọnwa pụrụ iche n’ezie! Anyị pụrụ ime nke a ma ọ bụrụ na anyị nile emee òkè anyị.

3 Ndị na-eme atụmatụ ịga ezumike pụrụ iji oge ụfọdụ gaa ozi tupu ha agawa. Chịrị traktị, broshuọ, ma ọ bụ magazin ka i wee nwee ike ịgbara ndị ị na-ezute n’ụzọ àmà. Ọzọkwa, ị pụrụ iso ndị nkwusa nọ n’ebe ị na-aga kere òkè n’ozi.

4 Ọ bụrụ na i nwere nkwarụ, ị ka pụkwara ikere òkè n’ozi. Ị pụrụ inwe ike ịgbara ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ma ọ bụ ndị na-eleta gị àmà. Ikekwe ị pụrụ iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ telifon gbaa àmà.

5 Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ ga-enwe ekele inweta enyemaka iji kere òkè n’ozi ubi n’August. Ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, na ndị na-eduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ime ndokwa maka inye enyemaka a. N’ụzọ nile o kwere mee, echezọla inye akụkọ ozi ubi gị ozugbo ọnwa gwụrụ ka e wee gụọ gị dị ka onye nkwusa n’August.

6 Jiri Ihe Ùgwù ahụ Kpọrọ Ihe: Ozi ahụ bụ ‘ihe ọma nke e nyere anyị n’aka idebe.’ (2 Tim. 1:14) Anyị nwere ekele maka ihe ùgwù e nyeworo anyị ikwusa ozi ọma ahụ. (1 Tesa. 2:4) Mgbe anyị tụlere ihe nile Jehova mewooro anyị, anyị kwesịrị ịbụ ndị a kwaliri ịnọgide na-ekere òkè n’ọrụ a kasị mkpa ruo ná ngwụsị afọ. Ọ dịghị ihe e kwesịrị ikwe ka o gbochie anyị ime nkwusa mgbe nile. Ka anyị mee August a ọnwa pụrụ iche n’ozi Jehova ma kpebisie ike ịgba àmà banyere ya kwa ọnwa mgbe ọ gasịrị!—Abụ Ọma 34:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya