215,000!
Nke ahụ bụ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa anyị ga-achọ ka ha nye akụkọ ozi na Nigeria maka August 1998. Ànyị nwere ikike iru ya? Ee, anyị nwere! Ngụkọta nke ọgbakọ e nwere ugbu a na Nigeria na-egosi ngụkọta nke ndị nkwusa 226,185. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ kasị elu nyetụrụla akụkọ ozi n’otu ọnwa ọ bụla bụ 207,193, n’April 1998. Olee otú anyị pụrụ isi gafee ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ iche? A pụrụ ime ya ma ọ bụrụ na onye nkwusa ọ bụla nọ n’ọgbakọ emee ndokwa doro anya ikere òkè n’ozi n’August na inye akụkọ ozi ahụ ozugbo. August nwere ngwụsị izu ise. Gbalịa ịmalite n’oge n’ọnwa ahụ ma si otú a zere ịghara iji oge ụfọdụ mee ihe n’ọrụ ịgba àmà n’August. Site n’ịgbakọ aka ọnụ, anyị kwesịrị ịhụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu e nwetụrụla gafere 215,000 nke mbụ ya na Nigeria. Lee ụdị iti mkpu otuto nke ahụ ga-abụ nye Jehova!—Abụ Ọma 47:1.