Ànyị Pụrụ Ime April 2000 Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla?
1 Uhuruchi Wednesday, April 19, ga-abụ ụbọchị dị oké mkpa n’afọ ije ozi anyị. N’ụbọchị ahụ, ka anyanwụ nọ na-ada n’ụwa nile, ọgbakọ na ìgwè Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ga-eme Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. N’ebe ọ bụla anyị bi, ime ememe ncheta nke àjà Jisọs Kraịst ga-abụ ihe omume kasị mkpa n’afọ a. E mere ka ụbọchị Ememe Ncheta ahụ pụta ìhè n’ọnwa April na 2000 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
2 Ọnwa April dum bụụrụ anyị ohere magburu onwe ya iji gosi site n’obi anyị dum ekele anyị nwere maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova bụ́ nke e gosipụtara site n’àjà nke Ọkpara ya. N’ụzọ dị aṅaa? Pọl onyeozi dere, sị: “Ịhụnanya Kraịst [na-arụgide] anyị; ebe anyị na-atụle nke a, na otu Onye nwụrụ n’ọnọdụ mmadụ nile, ya mere mmadụ nile nwụrụ; Ọ nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.” (2 Kọr. 5:14, 15) Ee, n’April anyị pụrụ igosipụta na anyị adịghị adịrị onwe anyị ndụ kama na anyị na-adịrị onye ahụ nke nwụrụ maka anyị ndụ, na-eme ọnwa a ọnwa kasị mma anyị nwetụrụla dị ka ndị ozi nke Alaeze ahụ!
3 Tinye Akwụkwọ Maka Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’April: Pọl onyeozi setịpụụrụ anyị ihe nlereanya na-akpali akpali mgbe ọ sịrị: “Akpọghị m ndụ m ihe, dị ka ihe oké ọnụ ahịa n’ebe mụ onwe m nọ, ka m wee gbazuo ọsọ m, jezuokwa ozi nke m natara n’aka Onyenwe anyị Jisọs, ikwusi ozi ọma ahụ ike, bụ́ nke amara nke Chineke.” (Ọrụ 20:24) Anyị nwere otu ihe ùgwù ahụ nke ịgba àmà zuru ezu banyere Jehova Chineke. Iji mezuo nke ahụ, anyị ga-achọ ime ka April bụrụ ọnwa kasị mma anyi nwetụrụla n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka!
4 Ebe o nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, April 2000 ga-abụ ọnwa magburu onwe ya nye ọtụtụ ndị maka iwere ọrụ ọsụ ụzọ. Laa azụ na March 1997, mgbe anyị ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka anyị nwetụrụla, mmadụ 19,218 keere òkè bụ pasent 10 nke ndị nkwusa nile. Afọ abụọ ka ọ gasịrị, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nyere akụkọ ozi n’April 1999 ejiriwo ihe karịrị pasent 7 mụbaa. Nke a pụtara na anyị nwere ohere dị ukwuu nke ịgafe ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka anyị nwere mbụ. Ọzọkwa, e gbubilataworị ọnụ ọgụgụ awa a chọrọ, na-eme ka o kwe ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ omume ikere òkè n’akụkụ a nke ije ozi. Onye nkwusa ọ bụla e mere baptism kwesịrị iji ekpere tụlee ma ọ̀ ga-enwe ike ịsụ ụzọ inyeaka n’April a.
5 Site n’iji ọnwa April dị na 2000 Calendar mee ihe, hazie usoro ihe omume gị maka ọnwa ọzọ. Kpebie ụbọchị ndị ị ga-enwe ike ikere òkè n’ozi ubi, ma gụkọta awa nile i chere na ị ga-enwe ike itinye n’ọrụ nkwusa n’ọnwa ahụ. Gbakọnye oge ị pụrụ iji gbaara ndị ọzọ àmà ma na mberede ma dị ka anyị na-emekarị. Ngụkọta ya ọ̀ fọrọ nke nta ka o ruo awa 50 ahụ a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka? Ọ bụrụ na o rughị awa ole a chọrọ, ị̀ pụrụ ihazigharị ihe ọ bụla ọzọ n’usoro ihe omume gị iji zụchapụta oge iji sụọ ụzọ inyeaka? Ọ ga-adị gị mkpa inwe nkezi nke otu awa na minit 40 kwa ụbọchị iji rụtazuo awa 50 n’ọnwa ahụ.
6 Ugbu a e gbubilatawokwara awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile, ị̀ nọwo na-eche echiche ịbanye n’ozi oge nile? April ga-abụ ọnwa mara mma ịmalite! Ọ bụrụ na i jighi n’aka ma ị ga-arụtali awa 70 ahụ a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile, gịnị ma ị sụọ ụzọ inyeaka n’April ma mee awa 70 ihe mgbaru ọsọ gị? Ozugbo ị hụrụ na ị ga-emeli ya, ị pụrụ inwe ọchịchọ ka ukwuu itinye akwụkwọ iji sonye n’ìgwè ndị ọsụ ụzọ ngwa ngwa o kwere mee.—Lee Ozi Anyị, peji nke 113-114.
7 Kere Òkè Zuru Ezu Dị Ka Onye Nkwusa nke Ozi Ọma Ahụ: Nye anyị nile, ma ndị nkwusa ma ndị ọsụ ụzọ, ezi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na n’ebe ndị agbata obi anyị nọ na-akpali anyị iji obi anyị nile na-eme ihe nile anyi nwere ike ime n’ozi Jehova dị ka ọnọdụ anyị n’otu n’otu si dị. (Luk 10:27) N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosi na “anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike, n’ihi na anyị elewo anya Chineke dị ndụ, Onye bụ́ Onye nzọpụta mmadụ nile, ma nke kachasịnụ Onye nzọpụta nke ndị kwere ekwe.” (1 Tim. 4:10) Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji tụọ anya na mmadụ nile ga-ekere òkè n’April, ka onye ọ bụla na-ekere òkè zuru ezu n’ọrụ Alaeze ahụ.
8 Ka anyị ghara ichefu agbamume Jisọs: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” Ozugbo o kwusịrị nke ahụ, Jisọs kpọrọ ndị ozi 12 ya wee zipụ ha ije kwusaa ozi ọma. (Mat. 9:37, 38; 10:1, 5, 7) Ihe dị ka otu afọ ka e mesịrị, mgbe ọ zụsịworo mmadụ 12 ahụ nke ọma n’ọrụ nkwusa, Jisọs “gụpụtara [mmadụ iri asaa ọzọ] wee zipụ ha,” nyekwa ha otu ntụziaka ahụ: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, . . . ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Luk 10:1, 2) Akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ otú Jehova si zaa ekpere ndị ahụ. Ka ọ na-erule Pentikọst 33 O.A., ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ amụbaala ruo ihe dị ka 120. Ná nsochi, e ruziri ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ ndị na-eso ụzọ 3,000 na 5,000. (Ọrụ 1:15; 2:41; 4:4) Mgbe nke ahụ gasịrị, “ọnụ ọgugụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba.” (Ọrụ 6:7) N’otu aka ahụ, n’oge a, anyị aghaghị ịnọgide na-arịọ Onye nwe ahụ maka iwetakwu ndị nkwusa Alaeze! N’ikwekọ n’ekpere anyị, onye nkwusa ọ bụla nọ n’ọgbakọ kwesịrị ime ndokwa doro anya iji na-ekere òkè n’ozi kwa ọnwa.
9 Biko leruo ọnwa April anya nke ọma na 2000 Calendar. Ebe ọ bụ na ụbọchị abụọ mbụ n’ọnwa ahụ bụ Saturday na Sunday, ị̀ pụrụ ime atụmatụ ikere òkè n’ozi ná ngwụsị izu ahụ, na-amalite n’oge n’ọnwa ahụ? Ị̀ pụrụ ịkwado “Ụbọchị Magazin” ọ bụla n’ọnwa ahụ gị na ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị? Olee banyere itinyekwu otu awa ma ọ bụ karịa n’ozi na Sunday ọ bụla? Ị̀ pụrụ ime ndokwa ikere òkè mgbe ụfọdụ n’ịgba àmà uhuruchi? Echefukwala iji ohere nile i nwere iji gbaa àmà mberede n’ụlọ ọrụ gị, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe ị na-eme ihe ndị ọzọ a na-eme kwa ụbọchị, mee ihe. Kanye akara n’ụbọchị ndị ị pụrụ ije ozi, jirikwa kalenda ahụ na-agbakọ oge ị na-etinye n’ozi n’ọnwa ahụ.
10 April ga-abụrụ ndị nile ruru eru, ndị ndị okenye nwapụtawokwara, oge magburu onwe ya ịmalite ije ozi dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Ọ bụrụ na ị na-eduziri mmadụ ọmụmụ Bible, onye ahụ ò nwewo ọganihu ruo n’ókè nke ịgakwuru onyeisi oche ndị nlekọta iji rịọ ka a tụlee ya ịbụ onye nkwusa nke ozi ọma ahụ? Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka a na-emebeghị baptism, gị na ndị okenye ùnu ekwurịtawo banyere ọganihu ime mmụọ ha? Nke a ọ́ gaghị abụ oge dị mma ka ha malite ime nkwusa?—Lee Ozi Anyị, peji nke 97-100.
11 Ná mgbalị anyị ime ka April 2000 bụrụ ọnwa kasị mma anyị nwetụrụla, ọ dị anyị nile mkpa ikere òkè n’ozi na inye akụkọ ozi ubi anyị mgbe ọnwa gwụrụ. (Tụlee Mak 6:30.) E kwesịrị ịgba ndị nkwusa ọhụrụ a na-emebeghị baptism ume bụ́ ndị na-ekere òkè nke mbụ ha n’ozi ubi inye akụkọ ozi ha n’egbughị oge. Site n’ime òkè anyị, anyị pụrụ ịtụnye ụtụ dị mma n’akụkọ ozi April na n’oké iti mkpu otuto ahụ a ga-enye Jehova site ná mgbalị ndị anyị na-eme n’ịgba àmà.
12 Kpọrọ Ndị Ọzọ Gaa Ememe Ncheta: Ọ̀ bụ na ọ gaghị abụrụ anyị ihe obi ụtọ inwe ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu ná ndị ga-abịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke afọ 2000? Ee! Ọ ga-apụta na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ e nwetụrụla ezukọtawo iji gosipụta ekele ha nwere maka ịhụnanya kasị ukwuu nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst gosipụtaworo n’ihi anyị! (Jọn 3:16; 15:13) Mee ndokwa ọ bụla dị mkpa ka ihe ọ bụla ghara igbochi gị na ezinụlọ gị ịga Ememe Ncheta ahụ.
13 Ugbu a bụkwa oge ịmalite kpọwa ndị mmadụ òkù maka Ememe Ncheta ahụ. Depụta aha onye ọ bụla ị ga-achọ ịhụ na ọ bịara. Gụnye onye ọ bụla e duziiri ọmụmụ Bible n’oge gara aga, ndị na-amụ ihe ugbu a, na ndị nletaghachi gị nile. Gbakọnye n’ihe ndepụta gị ndị nile ị maara n’ụlọ ọrụ gị, n’ụlọ akwụkwọ, n’ógbè unu, nakwa onye ọ bụla gị na ya na-achụkọ nta ego. Echefukwala ịgụnye ndị ọzọ ị maara na ndị ikwu gị. Mgbe i depụtasịrị aha ha, malite ịkpọ onye ọ bụla òkù n’otu n’otu, site n’obi gị. Kọwaa n’ụzọ doro anya mgbe na ebe a ga-anọ mee Ememe Ncheta ahụ. Mgbe April 19 na-akpụdewe, chetaghachiri ndị aha ha dị n’ihe ndepụta gị n’otu n’otu. Gwa ha na ha ga-eso gị gaa Ememe Ncheta n’anyasị ahụ.
14 N’ikwekọ ná ntụziaka mbụ Society nyere, òtù ndị okenye ga-eme mgbalị pụrụ iche ịgba ndị nkwusa nile na-adịghị ejekwa ozi bụ́ ndị nọ n’ókèala ha ume ịga Ememe Ncheta ahụ. (Mat. 18:12-14) Ndị okenye kwesịrị ịtụleghachi akwụkwọ ozi Society nke February 2, 1999. Odeakwụkwọ ọgbakọ ga-edepụta aha ndị nkwusa nile na-adịghị ejekwa ozi, onye nlekọta ije ozi ga-ekenyekwa ndị okenye ga-eje kpọtụrụ ha ma kpọọ ha òkù ịbịa Ememe Ncheta. Ma eleghị anya site n’inweta nleta ọzụzụ atụrụ na-agba ume ngwa ngwa o kwere mee, a pụrụ inyere ndị a na-adịghị ejekwa ozi aka ịghọ ndị na-ejesi ozi ike ọzọ, ọbụna n’April. Ọ ga-abụrụ ha ihe na-ewuli elu ịbụ ndị a kpọrọ isoro onye nkwusa nwere ahụmahụ kere òkè n’ozi ubi.
15 Gbaa Ume Ka A Kwadoo April nke Ọma! Ọ ga-achọ ezi nhazi n’aka ndị okenye nile, ndị ohu na-eje ozi, na ndị isi ezinụlọ iji mee April 2000 ọnwa kasị mma anyị nwetụrụla. Ndị okenye ga-agba mbọ ịhụ na a haziri ihe nile nke ọma nakwa ibute ụzọ. (Hib. 13:7) Ọ dị mkpa ka e mee ndokwa ndị dị irè banyere nzukọ maka ije ozi ubi n’ime izu na ná ngwụsị izu. A pụrụ ime ndokwa ka e nweekwuo nzukọ maka ije ozi ndị ọzọ ná ngwụsị ehihie na ná mmalite mgbede. E kwesịrị ịmapawa ndepụta nke usoro ihe omume nile e mere atụmatụ ya maka April na bọọdụ ịma ọkwa. Ọ ga-adị mkpa inwe onye e kenyere iduzi nzukọ maka ije ozi nke ọ bụla e mere ndokwa ya. E kwesịrị iwepụta ókèala ga-ezunụ maka ìgwè nke ọ bụla.
16 N’ọnwa April, a ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! Ná mgbalị iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi, a ga-enyefe ndị nile gosiri mmasị broshuọ Na-achọ. N’ihi ya, ọ ga-adị mkpa inwe magazin na broshuọ zuru ezu.
17 Mgbe ọnwa ahụ gwụrụ, ọ ga-adị mkpa ka ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ nile na ndị na-enyere ha aka gbaa onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha ume inye akụkọ ozi ozugbo ọnwa gwụrụ. Ma eleghị anya a pụrụ ọbụna ime nke a na Sunday, April 30. Mgbe ahụ, mgbe odeakwụkwọ chịkọtasịrị akụkọ ozi ndị ahụ, ọ bụrụ na ọ chọpụta na ndị nkwusa ụfọdụ enyebeghị nke ha, ọ pụrụ iji obiọma chetara ha ka ha mee otú ahụ tupu May 6, bụ́ mgbe ọ na-aghaghị izitere Society akụkọ ozi ọgbakọ. Ọ pụrụ ịgwa ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ ka ha nyere ya aka n’ịkpọtụrụ ndị nkwusa n’otu n’otu.
18 Oge Ememe Ncheta bụ oge kasị mkpa n’afọ nye ndị Chineke. O kwesịrị ịbụ oge iji ọrụ n’aka nke ukwuu nye anyị nile bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi. Ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ekere òkè zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee dị ka onye nkwusa nke ozi ọma ahụ, ma ọ bụrụ na ndị pụrụ itinye akwụkwọ maka ọsụ ụzọ inyeaka emee otú ahụ, ma ọ bụrụkwa na anyị dị uchu n’ịkpọrọ ndị ọzọ gaa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Ka anyị kpesie ekpere ike maka ngọzi bara ụba nke Jehova ka anyị na-agbalịsi ike ime April 2000 ọnwa kasị mma anyị nwetụrụla, na-ewetara Chineke otuto na ebube!—Hib. 13:15.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka
Ọnụ Ọgụgụ Kasị Elu Anyị Nwetụrụla: 19,218
(March 1997)
Igbe dị na peeji nke 4]
Ngụkọta Ndị Nkwusa
Ọnụ Ọgụgụ Kasị Elu Anyị Nwetụrụla: 226,539
(September 1999)
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ọnụ Ọgụgụ Ndị Bịara Ememe Ncheta
Ọnụ Ọgụgụ Kasị Elu Anyị Nwetụrụla: 598,717
(1997)