Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/02 p. 3-6
  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?—Òkù Ọzọ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Nọgide Na-akọ Banyere Oké Ọrụ Nile nke Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 2/02 p. 3-6

“Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”

1 Mgbe i nwere ezi ekele maka ịnata ihe ọma, ọ̀ bụ na ị dịghị egosipụta ya site n’àgwà gị? Ee, ị na-eme otú ahụ! Rịba ama otú Pọl onyeozi si meghachi omume n’ịdị mma na ezi ịhụnanya Jehova gosiworo ihe a kpọrọ mmadụ. O kwuru, sị: “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu”! Gịnị ka ‘onyinye ahụ ọ na-enye n’efu’ gụnyere? “Oké obiọma [nile] na-erughịrị mmadụ nke Chineke” gosiworo anyị, nke o gosipụtara karịsịa site n’inye Ọkpara ya ịbụ ihe mgbapụta maka mmehie anyị.—2 Kọr. 9:14, 15; Jọn 3:16.

2 Ngosipụta Pọl gosipụtara ekele ọ̀ bụ nanị n’okwu ọnụ? Ọ dịghị ma ọlị! O gosipụtara ekele ya miri emi n’ọtụtụ ụzọ. O nwere nnọọ nchegbu banyere ọdịmma ime mmụọ nke Ndị Kraịst ibe ya ma chọọ ime ihe ọ bụla o nwere ike ime iji nyere ha aka irite uru zuru ezu site n’ezi ịhụnanya Chineke. Pọl kwuru banyere ndị dị otú ahụ, sị: “N’inwe mmetụta dị nro maka unu, ọ masịrị anyị inye unu, ọ bụghị nanị ozi ọma Chineke, kamakwa mkpụrụ obi anyị onwe anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Tesa. 2:8) Tụkwasị n’inyere ndị dị mbụ bụrụ akụkụ nke ọgbakọ aka inweta nzọpụta, Pọl kwusara ozi ọma ahụ n’enweghị ike ọgwụgwụ, na-eme njem gaa ọtụtụ puku kilomita n’elu ala nakwa n’oké osimiri iji chọta ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ekele miri emi Pọl nwere maka ihe nile Jehova mewooro ya kwaliri ya ‘ikwusa okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu.’—Kọl. 1:25.

3 Ekele anyị nwere maka ihe nile Jehova mewooro anyị ọ́ dịghị akwali anyị inyere ndị enyemaka ime mmụọ dị mkpa n’ọgbakọ anyị aka? (Gal. 6:10) Á dịghịkwa akwali anyị ikere òkè zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ókèala anyị nile?—Mat. 24:14.

4 Ohere E Nwere Iji Gosi Ekele: Kwa afọ, Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst na-enye anyị ohere pụrụ iche iji gosi ekele maka ihe Jehova na Jizọs mewooro anyị. Nke a abụghị nnọọ nzukọ ọzọ ma ọ bụ ememe ncheta nkịtị nke otu ihe mere eme. Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst bụ oge ịtụgharị uche n’ụdị onye Jizọs bụ. Ọ bụ oge ịghọta na ọ dị ndụ ma na-arụ ọrụ taa, na ọ dị ebube ma bụrụ eze bụ́ nke e mere ya n’ihi ụzọ ndụ ikwesị ntụkwasị obi ya na àjà ọ chụrụ. Ememe a bụkwa ohere iji gosipụta na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ịbụisi Kraịst ka ọ na-atụzi ihe omume nile nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Kọl. 1:17-20) Ndị Chineke nile kwesịrị iji nkwanye ùgwù nọrọ ya maka Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. N’afọ a, a ga-eme ya mgbe anyanwụ dasịrị na Thursday, March 28, 2002.

5 N’ihi mgbalị e ji ịdị uchu mee tupu e mee Ememe Ncheta ahụ n’afọ gara aga, anyị nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụrụla nke ndị bịaranụ bụ́ 639,237 na Nigeria. Gịnị ga-abụ ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa n’afọ a? Ọ ga-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’otú anyị si “na-arụsi ọrụ ike ma na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ,” na-enyere ọtụtụ mmadụ aka ruo n’ókè o kwere mee ịga.—1 Tim. 4:10.

6 Tụkwasị n’ịga Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, anyị pụrụ ịmụba ozi ubi anyị. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ puku ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ga-asụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa. Kwa afọ, n’ime afọ ise gara aga, anyị enwewo nkezi nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka dị 13,864 n’oge Ememe Ncheta, March ruo May. Ị̀ pụrụ ịhazi ihe omume gị iji nwee ihe ùgwù nke ịsụ ụzọ inyeaka n’afọ a? Ọ ga-abụ ụzọ magburu onwe ya isi gosi ezi ekele gị maka onyinye ịhụnanya Chineke nyere bụ́ àjà Kraịst. Ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-agọzi gị, dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi.

7 Otu nwanna nwanyị bụ́ onye na-arụ ọrụ ego oge nile dere banyere ahụmahụ o nwere n’ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa March gara aga, sị: “Ozi Alaeze Anyị nke February 2001 gbara onye ọ bụla ọnọdụ ya kwere ya ịsụ ụzọ inyeaka n’oge Ememe Ncheta ume ime otú ahụ. Ebe ọ bụ na March nwere Saturday ise, nke a dabara nnọọ adaba n’usoro ihe omume m. N’ihi ya, ekpebiri m itinye akwụkwọ.” Mgbe ọ malitere n’ọnwa ahụ, o setịpụụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ nke ịgbalị ịmalite otu ọmụmụ Bible ebe obibi. Ò nwere ihe ịga nke ọma? Ee, n’awa nke 52 ya nke ịgba àmà n’ọnwa ahụ! Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Anyị na-enweta ngozi ndị magburu onwe ha mgbe anyị tinyekwuru mgbalị.”

8 Abamuru ndị dị aṅaa ka ezinụlọ na-asụkọ ụzọ ọnụ na-enweta? Otu ezinụlọ mmadụ anọ mejupụtara bụ́ ndị mere otú ahụ n’April gara aga chọpụtara na ọ bụ ọnwa a ga na-echeta mgbe nile. Nne ha kwuru, sị: “Lee nchekwube anyị na-enwe kwa ụbọchị, ebe ọ bụ na anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ozi! Nkwurịta okwu ndị anyị na-enwe banyere ihe omume anyị n’ụbọchị n’ozi mere ka oge nri abalị bụrụ nke na-enye nnọọ ọṅụ.” Nwa ha nwoke kwuru, sị: “Anụrụ m ụtọ iso papa m na-arụ ọrụ n’ozi ubi n’ime izu, bụ́ mgbe ọ na-ejikarị arụ ọrụ ego.” Nna ha gbakwụnyere, sị: “Dị ka onyeisi ezinụlọ, enwere m afọ ojuju n’ịmara na anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ọrụ kasị mkpa n’oge anyị a.” Ezinụlọ unu ọ̀ pụrụ ịsụkọ ụzọ ọnụ? Gịnị ma unu nwee nkwurịta okwu ezinụlọ iji hụ ma ọ̀ pụrụ ikwe mee ka ezinụlọ unu nile sụọ ụzọ inyeaka n’oge Ememe Ncheta a?

9 Ànyị Pụrụ Ime March Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla? Ná mmalite afọ 2000, Ozi Alaeze Anyị jụrụ ajụjụ bụ́: “Ànyị Pụrụ Ime April 2000 Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla?” Olee otú e si meghachi omume? E ruru ọtụtụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu e nwetụrụla. E nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu e nwetụrụla n’otu ọnwa nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka dị 22,714. Tụkwasị na nke a, anyị nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu n’awa, magazin ndị e nyefere, nakwa ná nletaghachi. Ị̀ na-echeta mmasị nke njupụta nke ihe omume ime mmụọ e mere n’ọnwa ahụ pụrụ iche kpaliri n’ọgbakọ gị? Ànyị pụrụ iru ma ọ bụ ọbụna ịgafe nke ahụ n’afọ a? Ọ bụrụ na mmadụ nile etinye mgbalị dị ukwuu, March 2002 pụrụ ịghọ “Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla.” Gịnị mere o ji bụrụ March?

10 E nwere ihe abụọ mere March kwesịrị iji bụrụ ọnwa pụrụ iche maka ihe omume. Nke mbụ, a ga-eme Ememe Ncheta ná ngwụsị March, na-enye anyị ohere dị ukwuu ná mmalite ọnwa ahụ ịkpọ ọtụtụ ndị òkù ruo n’ókè o kwere mee ịbịa. Nke abụọ, n’afọ a, March nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, na-eme ka ọ dịrị ndị na-arụ ọrụ ego ma ọ bụ ndị na-aga akwụkwọ mfe karị ịsụ ụzọ inyeaka. Gịnị ma ị nọdụ ala ugbu a ma mee atụmatụ usoro ihe omume ga-adị irè, na-eji kalenda dị n’ihe ntinye a eme ihe? Ịsụ ọzụ inyeaka pụrụ ịdị mfe karịa otú i chere. Dị ka ihe atụ, site n’ime atụmatụ inweta awa 8 n’ozi ubi na nke ọ bụla n’ime ngwụsị izu ise ndị ahụ, ọ ga-adị gị mkpa ime atụmatụ inweta nanị awa ntụkwasị 10 n’ime ụbọchị ndị ọzọ nke ọnwa ahụ iji rụzuo awa 50 ahụ a chọrọ.

11 Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji nyere mmadụ nile nọ n’ọgbakọ aka ‘ikwusa okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu’? Meenụ ka e nwee ịnụ ọkụ n’obi site n’ihe omume ndị a na-eme ná nzukọ nakwa ná mkparịta ụka onwe onye. Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na ndị na-enyere ha aka pụrụ ibute ụzọ n’iso onye nke ọ bụla nọ n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ha kwurịtaa okwu ma nye aka n’ụzọ onwe onye. Okwu agbamume ole na ole e ji obiọma kwuo ma ọ bụ aro ụfọdụ dị irè pụrụ nnọọ ịbụ ihe a chọrọ. (Ilu 25:11) Ọtụtụ ndị ga-ahụ na ọ bụrụ na ha emee obere mgbanwe ụfọdụ n’usoro ihe omume ha, ha pụrụ inwe ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. N’ọtụtụ ọgbakọ, ọnụ ọg̣ụgụ ka ukwuu nke ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ha nile, na nwunye ha na-esetịpụ ezi ihe nlereanya site n’ịsụkọ ụzọ inyeaka ọnụ n’oge Ememe Ncheta. Nke a agbawo ọtụtụ ndị nkwusa ume isonyere ha. N’ihi ịbụ ndị a kpaara ókè n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ihi ọnọdụ ndị ọzọ, e nwere ike ụfọdụ ndị nkwusa agaghị anọ n’ọnọdụ dị mma ịsụ ụzọ, ma a pụrụ ịgba ha ume igosipụta ekele ha site n’isoro ndị ọzọ n’ọgbakọ na-eme ókè ha nwere ike n’ozi.

12 Inwe ihe ịga nke ọma dabeere n’atụmatụ ndị okenye ji nlezianya mee. E kwesịrị idokwa nzukọ maka ozi ubi n’oge ndị dabara adaba n’ụbọchị nile n’izu. Ya kwe mee, tupu oge eruo, onye nlekọta ije ozi ga-ekenye ụmụnna ruru eru ka ha duzie nzukọ nile maka ozi. Ọ ga-adị mkpa ka e mee ezi nkwadebe iji mee ka nzukọ ndị a ghara ịgafe minit 10 ruo 15, gụnyere ịhazi ìgwè dị iche iche, ikenye ókèala, na ikpe ekpere. (Lee Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2001.) E kwesịrị ịkọwara ọgbakọ n’ụzọ doro anya ndokwa ihe omume e mere maka ọnwa ahụ ma mapawa ya na bọọdụ ịma ọkwa.

13 E kwesịrị inwe ókèala zuru ezu. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ijekwuru nwanna na-ahụ maka ókèala iji mee ndokwa ka a rụọ ọrụ ná ndị a na-adịghị arụzukarị. E kwesịrị ikwusi okwu ike banyere ịrụ ọrụ n’ebe ndị a na-enwetaghị mmadụ n’ụlọ, ịgba àmà n’okporo ámá nakwa site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, na ịgba àmà uhuruchi. N’ebe o kwesịrị ekwesị, a pụrụ inyere ndị nkwusa ụfọdụ aka iji telifon gbaa àmà.

14 Nyere Ha Aka Ije Ozi Ọzọ: Ọ̀ dị ndị na-adịghịzi arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ókèala ọgbakọ gị? Ndị dị otú ahụ ka bụ akụkụ nke ọgbakọ, enyemaka dịkwa ha mkpa. (Ọma 119:176) Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ nke ụwa ochie a dị nnọọ nso, ụwa ọhụrụ ahụ na-abịakwa nnọọ n’ihu, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji tinye mgbalị nile iji nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka. (Rom 13:11, 12) N’ime afọ anọ gara aga, kwa afọ, ihe karịrị mmadụ 2,500 na-anabata enyemaka ma bụrụ ndị e mere ka ha maliteghachi ije ozi. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ọtụtụ ndị ọzọ aka inweghachi ịhụnanya na obi ike ha nwere ná mmalite?—Hib. 3:12-14.

15 Òtù ndị okenye kwesịrị ịtụle otú ha pụrụ isi nyere ndị ghọworo ndị na-adịghị ejekwa ozi n’afọ ole na ole gara aga aka. (Mat. 18:12-14) Odeakwụkwọ kwesịrị inyocha kaadị Ihe Ndekọ Ọgbakọ Maka Onye Nkwusa ma detuo aha ndị nile na-adịghị ejekwa ozi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche site ná ndokwa ime nleta ọzụzụ atụrụ iji nyere ha aka. Onye okenye pụrụ ịchọ ileta otu onye nkwusa n’ihi na ha mabu nke ọma ma na-akpakọrịtabu, ma ọ bụkwanụ a pụrụ ịgwa ndị nkwusa ndị ọzọ ka ha nye aka. Ikekwe ha mụụrụ onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi ihe, ha pụkwara ịnabatakwa ohere nke inyeaka pụrụ iche n’oge a e nwere mkpa. E nwere olileanya na a ga-akwali ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-adịghị ejekwa ozi ịmaliteghachi ikwusa okwu Chineke. Ọ bụrụ na ha eruo eru, ọ dịghị oge ka mma ịmalite karịa oge Ememe Ncheta!—Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 2000.

16 Ndị Ọzọ Hà Ruru Eru Ime Nkwusa? Jehova na-anọgide na-agọzi ndị ya site n’ịkpọbata “ihe a na-achọsi ike nke mba nile.” (Hag. 2:7) Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ na-eru eru dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ole ndị ka ha bụ? Ha bụ ụmụ Ndịàmà Jehova nakwa ndị a na-amụrụ Bible bụ́ ndị na-enwe ọganihu. Olee otú anyị si amata ma hà ruru eru ịbụ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ?

17 Ụmụ Ndịàmà Jehova: Ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ ụmụaka esowo ndị mụrụ ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’agbanyeghị na ha ejewebeghị ozi dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ọnwa March pụrụ ịbụ oge dị mma iji mee ka ha malite. Olee otú ị ga-esi amata ma nwa gị ò ruwo eru? Peeji nke 100 n’akwụkwọ bụ́ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị na-ekwu na ọ bụ “mgbe nwatakịrị bụ ezi ihe nlereanya n’omume ya, nweekwa ike ime nkwupụta onwe onye nke okwukwe ya site n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ozi ọma ahụ, bụrụ onye a kpaliri site n’obi ime otú ahụ.” Ọ bụrụ na i chere na nwa gị ruru eru, gwa otu n’ime ndị okenye so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.

18 Ndị A Na-amụrụ Bible Bụ́ Ndị Ruru Eru: Mgbe onye a na-amụrụ Bible nwetaworo ihe ọmụma ma gaa nzukọ ruo oge ụfọdụ, ọ pụrụ ịchọ ịghọ onye nkwusa Alaeze. Ọ bụrụ na ị na-amụrụ onye dị otú ahụ ihe, tụlee ajụjụ ndị a: Ọ̀ na-enwe ọganihu, nke ya na afọ ndụ na ikike ya kwekọrọ? Ọ̀ malitewo ịgwa ndị ọzọ banyere okwukwe ya n’ebughị ụzọ mee ndokwa ya? Ọ̀ na-eyikwasị “ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ”? (Kọl. 3:10) Ò ruru ihe a chọrọ n’aka ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, bụ́ ndị e depụtara na peeji nke 97 ruo 99 n’akwụkwọ Nhazi? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịgwa Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ka e wee mee ndokwa ka ndị okenye abụọ soro gị na onye ahụ ị na-amụrụ ihe nọkọọ. Ọ bụrụ na o ruru eru, ndị okenye abụọ ahụ ga-agwa ya na ọ pụrụ ịmalite ikere òkè n’ozi ihu ọha.

19 Gịnị Banyere April na May? Ndị a ga-abụkwa ọnwa pụrụ iche maka ịmụba ọrụ n’ozi ubi. Ọtụtụ ndị sụrụ ụzọ inyeaka na March nwere ike ime otú ahụ ọzọ n’April na/ma ọ bụ May. N’April na May, anyị ga-ebute inyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! ụzọ n’ozi. Lee mmetụta bara uru ha nweworo ná ndụ ndị na-agụ ha! Magazin ndị a arụwo ọrụ dị ukwuu n’iweta mmụba dị ukwuu e nweworo n’ụwa nile. A ga-etinye mgbalị pụrụ iche n’April nakwa na May iji nyefee magazin ndị ahụ n’aka ọtụtụ mmadụ ruo n’ókè o kwere mee. Mee atụmatụ ugbu a iji kere òkè zuru ezu.

20 N’ihi atụmatụ e mere ịmụba ọrụ nkwusa, ọ̀ dị gị mkpa ịmụba ọnụ ọgụgụ magazin ị na-enweta n’ọgbakọ? N’afọ ije ozi a nile, anyị ga-eji Ụlọ Nche na Teta! na-eme ihe na Saturday ọ bụla, bụ́ ụbọchị anyị wepụtara ịbụ Ụbọchị Magazin. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ga-ekere òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka, anyị nile ana-enyefekwa magazin ruo ọnwa abụọ zuru ezu, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị mụbaa ọnụ ọgụgụ magazin ị tụrụ ọda ya n’ọgbakọ. Ọ bụrụ otú ahụ, biko gwa ohu na-ahụ maka magazin n’ọgbakọ gị ozugbo. N’otu oge ahụ, ohu na-ahụ maka magazin ga-ejide n’aka na e nwere ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke traktị ndị dị mkpa maka mmadụ nile iji ya jee ozi.

21 Ọtụtụ ndị ekwupụtawo ekele maka akụkụ nke Ozi Alaeze Anyị isiokwu ya bụ́ “Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ.” Ì jiriwo ndokwa a mee ihe bara uru site n’ịmụ ụzọ inyefe magazin ihe atụ ndị ahụ? Gịnị ma i jiri akụkụ ụfọdụ nke oge ọmụmụ Bible ezinụlọ gị kwa izu na-amụgharị ụzọ iche ihe n’ihu ndị a?

22 Jiri Oge Ememe Ncheta A Mee Ihe Bara Uru: Dị ka Pọl onyeozi, ka anyị nye Jehova ekele dị ukwuu maka “onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa” site n’anyị ikere òkè zuru ezu n’ihe omume ime mmụọ ndị e mere atụmatụ ha maka oge Ememe Ncheta a. Ha gụnyere (1) ịga ememe ahụ kasị mkpa n’afọ, bụ́ ememe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị na Thursday, March 28, 2002; (2) inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka inweghachi “ịhụnanya ahụ [ha] nwere na mbụ.” (Mkpu. 2:4; Rom 12:11); (3) inyere ụmụ anyị na ndị ọ bụla a na-amụrụ Bible bụ́ ndị ruru eru ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim aka; nakwa (4) ikere òkè n’ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee, ọbụna ịsụ ụzọ inyeaka na March nakwa n’ọnwa ndị ọzọ.—2 Tim. 4:5.

23 Ọ bụ nnọọ ekpere anyị na anyị nile ga-ekere òkè n’ụzọ zuru ezu n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’oge Ememe Ncheta a, wee si otú a gosipụta ókè anyị nweruru ekele maka ihe nile Jehova mewooro anyị.

Igbe dị na peeji nke 6]

Usoro Ije Ozi Ubi nke Onwe Onye Maka March 2002

Sunday Monday Tuesday Wednesday Thursday Friday Saturday

1 2

Ụbọchị Magazin

3 4 5 6 7 8 9

Ụbọchị Magazin

10 11 12 13 14 15 16

Ụbọchị Magazin

17 18 19 20 21 22 23

Ụbọchị Magazin

24 25 26 27 28 29 30

Ụbọchị Magazin

EMEME NCHETA

MGBE ANYANWỤ DASỊRỊ

31

Ị̀ pụrụ ime ndokwa inweta ngụkọta nke awa 50 iji sụọ ụzọ inyeaka na March?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya