Nọgide Na-akọ Banyere Oké Ọrụ Nile nke Jehova
1. Olee ụfọdụ n’ime oké ọrụ Jehova ndị kasị amasị gị?
1 Ọ dịghị onye a pụrụ iji tụnyere Chineke ukwu anyị bụ́ Jehova! Devid dere, sị: “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ: a pụghị idoro Gị ha n’usoro.” (Ọma 40:5) Oké ọrụ nile nke Jehova na-agụnye eluigwe na ala, alaeze Mezaịa ahụ, ịhụnanya o nwere n’ebe ndị ya nọ, na ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. (Ọma 17:7, 8; 139:14; Dan. 2:44; Mat. 24:14) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ekele anyị nwere maka ihe nile o meworo na-akwali anyị ịgwa ndị ọzọ banyere ya. (Ọma 145:5-7) Na March, April, nakwa May, anyị ga-enwe ohere ime nke a n’ụzọ ka zuo ezuo.
2. Olee otú anyị si erite uru n’onwe anyị site n’ịsụ ụzọ inyeaka?
2 Dị Ka Onye Ọsụ Ụzọ Inyeaka: Ị̀ pụrụ ịhazi ihe omume gị iji tinye awa 50 n’ozi n’otu ọnwa ma ọ bụ karịa n’ime ọnwa ndị a a ga-eji jee ozi pụrụ iche? N’ezie, mgbanwe ọ bụla ị ga-eme n’usoro ihe omume gị agaghị ala n’iyi. (Efe. 5:16) Ọtụtụ achọpụtawo na ịsụ ụzọ inyeaka na-enyere ha aka ime ka ozi ha ka mma. Ha na-enwekwu ahụ́ iru ala n’ụlọ ndị mmadụ ma na-eji Bible eme ihe karị. Itinyekwu oge n’ozi na-eme ka ọ dịkwuoro ha mfe isochi mmasị ọ bụla ha chọtara, ụfọdụ ndị na-adịbughị eduzi ọmụmụ Bible amalitewokwa iduzi ọmụmụ Bible mgbe ha na-asụ ụzọ inyeaka. Ebe ọ bụ na ịsụ ụzọ inyeaka na-agụnye iwepụta oge iji nyere ndị ọzọ aka, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.
3. Olee otú ụfọdụ siworo nwee ike ịsụ ụzọ inyeaka ọbụna n’ọnọdụ ndị siri oké ike?
3 Adịla ngwa ikpebi na ọnọdụ gị adịghị enye gị ohere ikere òkè. Otu okenye nke sụrụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga nwere ụmụ abụọ ma na-arụ ọrụ oge nile. Olee otú nwanna a na-ejikarị ọrụ n’aka si mee ya? Ebe ọ bụ na ọ na-arụ ọrụ n’ime izu, o mere ndokwa ịnọ ogologo oge n’ozi ná ngwụsị izu, na-amalite site n’ịgba àmà okporo ámá n’elekere 7:00 nke ụtụtụ ụbọchị Saturday ọ bụla. Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ, bụ́ ndị nọkwa n’ọnọdụ dị otú ahụ sụkwara ụzọ, ha kwadokwara ma gbaa ibe ha ume. N’ọgbakọ ọzọ, otu nwanna nwanyị dị afọ 99 kpebiri ịsụ ụzọ na May mgbe nwa ya nwanyị gwasịrị ya ka o sonyere ya. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nyeere nwanna nwanyị a meworo agadi aka ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ nakwa iduzi ọmụmụ Bible site n’ịdị na-akwagharị ya n’oche nkwagharị ya. Ọ gbakwara àmà telifon na àmà okporo ámá, ma dee akwụkwọ ozi iji gbaa àmà. O kwetara na o mere nke a, ọ bụghị n’ike onwe ya, kama nanị site n’enyemaka Jehova.—Aịsa. 40:29-31.
4. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịtụle mgbe anyị na-eme atụmatụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?
4 Gbalịa idepụta usoro ihe omume ga-akasị kwekọọ n’ọnọdụ gị. Usoro ihe omume ihe atụ ndị dị ná mbipụta a pụrụ inyere gị aka. Ị̀ na-arụ ọrụ oge nile ka ị̀ na-aga akwụkwọ? Usoro ihe omume nke dabara ná ngwụsị izu karịsịa pụrụ ịbara gị uru nke ukwuu. Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ahụ́ ike, i nweghịkwa ike ije ozi ruo ọtụtụ ụbọchị, usoro ihe omume nke ije ozi kwa ụbọchị ruo nwa oge pụrụ ịkara gị mma. Soro ndị ọzọ kwurịta banyere ọchịchọ gị ịsụ ụzọ inyeaka. Eleghị anya, ha pụkwara ime ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ ha.
5. Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa ka ndị ntorobịa pụrụ isetịpụ maka ọnwa March, April, na May?
5 Otú Ndị Ntorobịa Pụrụ Isi Kere Òkè: Obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe ndị na-eto eto na-akọ banyere oké ọrụ ya dị iche iche. (Ọma 71:17; Mat. 21:16) Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto nke e meworo baptizim, ikekwe ị pụrụ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa dabara n’oge ezumike ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ị pụghị ịsụ ụzọ inyeaka, ị̀ pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ a kapịrị ọnụ iji mụbaa òkè ị na-ekere n’ozi ma mee ka ozi gị ka mma n’ọnwa ndị a? Ọ bụrụ na gị na ndị mụrụ gị anọwo na-ejekọ ozi ma ị ghọbeghị onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ugbu a ga-abụ oge dị mma ime mgbalị iji ruo eru. Ọ dịghị gị mkpa iche na ị ga-abụrịrị ọkà n’ịza ajụjụ Bible ma ọ bụ na ị ga-amarịrị ihe dị ka onye toworo eto nke e meworo baptizim. Ị̀ ghọtara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible? Ị̀ na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible? Ị̀ chọrọ ka a mara gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ya bụrụ otú ahụ, soro ndị mụrụ gị kwurịta ya. Ha pụrụ ime ndokwa ka gị na ha gakwuru ndị okenye iji hụ ma ì ruru eru.—Lee akwụkwọ bụ́ Ozi Anyị, peeji nke 98-99.
6. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị a na-amụrụ Bible aka ịghọ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ?
6 Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Nkwusa: Ndị a na-amụrụ Bible bụ́ ndị na-eme nke ọma pụrụ iru eru isonyere anyị dị ka ndị nkwusa n’ọnwa ndị a pụrụ iche na-abịanụ a ga-eji jee ozi. Ọ bụrụ na i nwere onye ị na-amụrụ Bible nke na-eme nke ọma, chọọ enyemaka nke onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ gị ma ọ bụ onye nlekọta ije ozi. Otu n’ime ha pụrụ isoro gị n’ọmụmụ ihe ahụ iji chọpụta ọganihu nke onye ahụ ị na-amụrụ ihe. Ọ bụrụ na onye ahụ ị na-amụrụ ihe ruru eru ma nwee ọchịchọ nke ịghọ onye nkwusa, onyeisi oche ndị nlekọta pụrụ ime ndokwa ka ndị okenye abụọ soro gị na onye ahụ ị na-amụrụ ihe zukọọ. (Lee Ụlọ Nche, November 15, 1988, peeji nke 17.) Ọ bụrụ na a kwadoo ka onye ahụ ị na-amụrụ ihe ghọọ onye nkwusa, malite ozugbo ịzụ ya n’ozi ubi.
7. Olee otú a pụrụ isi nyere ndị nkwusa na-adịghị ejechi ozi anya na ndị nkwusa na-adịghị ejekwa ozi aka?
7 Ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ilebara onye ọ bụla na-adịghị ejekwa ozi ma ọ bụ nke na-adịghị ejechi ozi anya nke so n’ìgwè ha anya n’ụzọ pụrụ iche. Kpọọ ha ka gị na ha rụkọọ ọrụ n’ozi. Ọ bụrụ na ha adịghị ejekwa ozi ruo ogologo oge, ọ ga-adị mma ka ndị okenye abụọ buru ụzọ soro ha kwurịta okwu iji hụ ma hà ruru eru. (Lee Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 2000.) Ịnụ ọkụ n’obi ọgbakọ ga-egosipụta n’ọnwa ndị a pụrụ iche a ga-eji jee ozi pụrụ ịkpali ha ịmaliteghachi ikerechi òkè anya n’ozi.
8, 9. Olee ihe ndị okenye pụrụ ime iji wulite ịnụ ọkụ n’obi maka ozi a pụrụ iche?
8 Kwadebe Ugbu A Maka Ịmụba Ozi Gị: Ndị okenye, malitenụ ugbu a na-ewulite ịnụ ọkụ n’obi maka ịsụ ụzọ inyeaka n’ọgbakọ. Unu pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu site n’okwu agbamume nakwa n’ezi ihe nlereanya unu. (1 Pita 5:3) Gịnị bụ ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka unu nweburu n’ọgbakọ unu? À pụrụ ịgafe ya n’afọ a? Ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ na ndị na-enyere ha aka kwesịrị ịchọ ụzọ isi gbaa mmadụ nile so n’ìgwè ha ume ịmụba ozi ha. Ndị nlekọta ije ozi pụrụ ime nhazi maka nzukọ ije ozi ubi ndị ọzọ. Mee ka ọgbakọ mara n’ezi oge banyere nhazi ndị e mere. Hụnụ na e kenyere ndị nkwusa ruru eru iduzi ozi nakwa na nzukọ ije ozi ubi malitere ma kwụsị n’oge. (Lee Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2001.) Onye nlekọta ije ozi kwesịkwara ịhụ na e nwere ókèala, magazin, na akwụkwọ ndị ga-ezunụ.
9 N’afọ gara aga, ndị okenye nke otu ọgbakọ malitere n’ụzọ na-ekpo ọkụ nakwa n’ezi oge ịgba ndị nkwusa ume ịsụ ụzọ inyeaka, ọtụtụ n’ime ndị okenye ahụ dejupụtakwara fọm ịsụ ụzọ inyeaka. Ha haziri nzukọ ije ozi ndị ọzọ—otu malitere n’elekere 5:30 nke ụtụtụ maka ịgba àmà okporo ámá, nke ọzọ amalite n’elekere 3:00 nke ehihie maka ndị si ụlọ akwụkwọ lọta, nke atọ amalitekwa n’elekere 6:00 nke uhuruchi maka ndị sị ọrụ lọta. Tụkwasị na nke ahụ, a haziri nzukọ ije ozi ubi atọ n’ụbọchị Saturday nile. Mmadụ 66 sụrụ ụzọ inyeaka n’ọgbakọ ahụ n’ọnwa April!
10. Olee otú ezinụlọ dị iche iche pụrụ isi kwadebe maka ịmụba ozi ha?
10 Gịnị ma unu wepụta oge mgbe unu ga-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ na-abịanụ iji setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru eru n’ọnwa ndị na-abịanụ? Site n’ezi nkwado nakwa ná nhazi dị mma, ụfọdụ ma ọ bụ mmadụ nile nọ n’ezinụlọ pụrụ inwe ike ịsụ ụzọ inyeaka. Ọ bụrụ na nke ahụ agaghị ekwe omume, setịpụnụ ihe mgbaru ọsọ nke ịmụbawanye ozi unu site ịgbatịkwu oge unu na-ejibu eje ozi ma ọ bụ site n’ijekwu ozi n’oge ndị ọzọ. Kpegaranụ Jehova ekpere maka nke a dị ka ezinụlọ. Unu pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-agọzi mgbalị unu.—1 Jọn 3:22.
11. (a) Olee ihe ndị dị ebube àjà mgbapụta Kraịst rụzuru? (b) Olee oge na ebe a ga-anọ mee Ememe Ncheta n’ógbè unu?
11 Ọrụ Kasị Dị Ebube nke Chineke: Ngosipụta kasị ukwuu nke ịhụnanya Jehova bụ onyinye nke o nyere Ọkpara ya dị ka ihe mgbapụta maka anyị. (1 Jọn 4:9, 10) Àjà mgbapụta ahụ bụ ihe ndabere iwu kwadoro maka ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie na ọnwụ. (Rom 3:23, 24) Ọbara Jizọs a wụsịrị mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè, na-eme ka o kwee omume Chineke ikuchi ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ́ ndị nwere olileanya nke ịchị achị n’Alaeze eluigwe. (Jer. 31:31-34; Mak 14:24) Nke kasị mkpa bụ na nrubeisi zuru okè nke Jizọs doro aha Jehova nsọ. (Deut. 32:4; Ilu 27:11) Na Sunday, April 4, mgbe anyanwụ dasịrị, a ga-eme Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’ụwa nile.
12. Olee otú ịbịa ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị pụrụ isi baara ndị nwere mmasị uru?
12 Ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-eme ka oké ọrụ nile nke Jehova pụtakwuo ìhè. Okwu ememe Nri Anyasị ahụ na-eme ka nghọta na ekele anyị nwere maka ihe Jehova mere n’inye ihe mgbapụta ahụ buwanye ibu. Ndị nwere mmasị bụ́ ndị bịara ememe ahụ ga-ahụ oké ọrụ ndị ọzọ nke Chineke. Ha ga-ahụ ịdị n’otu na ezi ịhụnanya nke Jehova kụziiri ndị ya ka ha na-egosipụta. (Efe. 4:16, 22-24; Jems 3:17, 18) Ọnụ ọgụgụ nke ndị ga-abịa ememe a dị oké mkpa pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’uche mmadụ, n’ihi ya anyị chọrọ ka ọtụtụ mmadụ dị ka ọ pụrụ ikwe mee bịa.—2 Kọr. 5:14, 15.
13, 14. Olee ndị anyị kwesịrị ịkpọ òkù ịbịa Ememe Ncheta, ọ̀ bụkwa n’ụzọ ndị dị aṅaa?
13 Ịkpọ Ndị Ọzọ Òkù Ịbịa: Malite ịkwadebe ozugbo site n’idepụta aha ndị ị ga-akpọ òkù. Ndị ị ga-ede aha ha kwesịrị ịgụnye ndị òtù ezinụlọ gị na-ekweghị ekwe, ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ị mụụrụ Bible n’oge gara aga na ndị ị na-amụrụ Bible ugbu a, na ndị nile ị na-aga nletaghachi na nke ha. Ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị idenye aha ndị na-adịghị ejekwa ozi n’ihe ndepụta ha.
14 Jiri akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ememe Ncheta nke e biri ebi mee ihe ma jiri aka ma ọ bụ ígwè typewriter dee ebe na oge a ga-eme Ememe Ncheta ahụ n’ụzọ dị mma n’anya. Ma ọ bụ ị pụrụ ịchọ iji ọkpụkpọ òkù dị n’azụ Ụlọ Nche nke March 15, 2004 ma ọ bụ Teta! nke March 8, mee ihe. Ka April 4 na-eru nso, chetara ndị i depụtara aha ha ịbịa ememe ahụ, site n’ịgakwuru ha n’onwe gị ma ọ bụ site n’ịkpọtụrụ ha na telifon.
15. Olee otú anyị pụrụ isi nabata ndị mmadụ nke ọma n’anyasị nke Ememe Ncheta ahụ?
15 N’Ememe Ncheta Ahụ: Gbalịa ịbịarute n’oge n’anyasị nke Ememe Ncheta ahụ. Nabata ndị ọhụrụ nke ọma site n’iji ihu ọchị kelee ha. (Rom 12:13) I nwere ibu ọrụ pụrụ iche n’ebe ndị ọbịa ị kpọrọ òkù nọ. Mee ka ahụ́ ruo ha ala, ma mee ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ mata ndị ha bụ. Ikekwe, ị pụrụ inye aka chọtara ha oche n’akụkụ gị. Ọ bụrụkwa na o nwere nke na-enweghị Bible ma ọ bụ akwụkwọ abụ, mee ndokwa ka ọ na-ele anya na nke gị ma ọ bụ na nke onye ọzọ. Mgbe ememe ahụ gasịrị, nọrọ nso ịza ajụjụ ọ bụla ha pụrụ ịjụ. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ nke mbụ ụfọdụ na-abịa, jụọ ha ma hà ga-achọ ịmụtakwu banyere Okwu Chineke na nzube ya. Kwuo ka i duziere ha ọmụmụ Bible.
16. Gịnị ka a pụrụ ime iji nyere ndị bịaranụ aka inwe ọganihu ime mmụọ?
16 Nọgide Na-enyere Ndị Bịaranụ Aka: N’izu ndị na-esochi Ememe Ncheta ahụ, ndị bịaranụ pụrụ ịchọkwu enyemaka. Ndị a na-agụnye ndị na-abịachibu nzukọ anya ma ha adịghịzi eso ọgbakọ akpachi anya. Ndị okenye ga-amụrụ anya iji hụ na e legharaghị ndị dị otú ahụ anya, na-agbalị ịchọpụta ihe mere ha ji kwụsị inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Kụnye n’obi ha ịdị ngwa nke oge ndị a. (1 Pita 4:7) Nyere mmadụ nile aka ịhụ uru ọ bara irube isi na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ iso ndị Chineke na-ezukọ mgbe nile.—Hib. 10:24, 25.
17. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-akọ banyere oké ọrụ nile nke Jehova?
17 Ọrụ ndị Jehova na-arụ dị ebube nke ukwuu nke na anyị agaghị aghọtacha ha ọbụna ma anyị dịrị ndụ ebighị ebi. (Job 42:2, 3; Ekli. 3:11) N’ihi ya, ọ dịghị mgbe anyị na-agaghị enwe ihe mere anyị ga-eji too ya. N’oge Ememe Ncheta a, anyị pụrụ igosipụta ekele anyị nwere maka oké ọrụ nile nke Jehova site n’ime mgbalị dị ukwuu ịmụba ozi anyị.
[Chaatị dị na peeji nke 5]
Ị̀ Pụrụ Ịsụ Ụzọ Inye Aka Na-eji Otu n’Ime Usoro Ihe Omume A Eme Ihe?
March Su M* Tu* W* Th F Sa Ngụkọta Kwa Ọnwa
Kwa Ụbọchị 2 1 1 1 1 1 5 51
Ụbọchị Abụọ 0 5 0 5 0 0 0 50
Nanị ná Ngwụsị Izu 5 0 0 0 0 0 8 52
Ngwụsị Izu Nile na
Ụbọchị Abụọ n’Ime Izu 2 0 0 2 0 2 6 50
April Su M Tu W Th* F* Sa Ngụkọta Kwa Ọnwa
Kwa Ụbọchị 2 1 1 1 1 1 5 50
Ụbọchị Abụọ 0 0 0 0 5 5 0 50
Nanị ná Ngwụsị Izu 5 0 0 0 0 0 8 52
Ngwụsị Izu Nile na
Ụbọchị Abụọ n’Ime Izu 2 0 0 2 0 2 6 50
May Su* M* Tu W Th F Sa* Ngụkọta Kwa Ọnwa
Kwa Ụbọchị 2 1 1 1 1 1 4 51
Ụbọchị Abụọ 0 5 0 0 0 0 5 50
Nanị ná Ngwụsị Izu 3 0 0 0 0 0 7 50
Ngwụsị Izu Nile na
Ụbọchị Abụọ n’Ime Izu 2 0 0 2 0 2 5 51
* Ise n’ọnwa