Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/07 p. 3-5
  • Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mgbaru Ọsọ Magburu Onwe Ya Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?—Òkù Ọzọ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 2/07 p. 3-5

Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile

1. Olee ihe na-akpali anyị ịkpọsa ịdị mma Jehova n’ebe nile?

1 “Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke Gị.” (1 Ihe 29:11) Olee otú ịhụnanya na ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ si emetụta anyị? Ọ na-akpali anyị ịga ‘kpọsaa n’ebe nile ịdị mma nke onye ahụ kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube.’ (1 Pita 2:9) Anyị apụghị ịkwụsị ịgwa ndị mmadụ banyere Chineke anyị dị ebube! Anyị ga-enwe ohere magburu onwe ya iji kpọsaa ịdị mma Jehova n’ọnwa March, April, na May.

2. Olee mkpọsa a na-eme atụmatụ ya iji mee ka ndị mmadụ mara banyere Ememe Ncheta ahụ, oleekwa ndị nwere ike iru eru iso mee mkpọsa ahụ?

2 Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme Iji Mee Ka Ndị Mmadụ Mara Banyere Ememe Ncheta Ahụ: Na Monday, April 2, anyị ga-eme ka ịdị mma Jehova pụta ìhè site n’ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. A ga-amalite na March 17 ruo April 2 kesawa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka ihe omume a dị mkpa. A na-agba mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu na ya. Nke a ga-abụ oge magburu onwe ya ndị ọhụrụ ga-eji malite ikwusa ozi ọma ma ọ bụrụ na ha eruola ime otú ahụ. Ọ bụrụ na o nwere ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible ma ọ bụ ụmụ gị ndị rurula ikwusa ozi ọma, gakwuru ndị okenye ma mee ka ha mara banyere ya.

3. Olee ihe anyị pụrụ ikwu mgbe anyị na-akpọ ndị mmadụ òkù ịbịa Ememe Ncheta?

3 Mkpọsa a ga-eyi ụdị mkpọsa ahụ e mere banyere Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” A ga-ezitere ọgbakọ ọ bụla akwụkwọ ịkpọ òkù ga-ezuru ha ka onye nkwusa ọ bụla wee nwee ike inweta ya mkpụrụ 50, onye ọsụ ụzọ ọ bụla enwetakwa ya mkpụrụ 150. Ekwula ọtụtụ okwu mgbe ị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Ihe ị ga-ekwu nwere ike ịbụ: “Nke a bụ akwụkwọ ịkpọ òkù nke gị maka otu ihe omume dị mkpa anyị na-eme kwa afọ. Anyị ji obi ụtọ anabata gị. Ị gụọ akwụkwọ ịkpọ òkù a, ị ga-ahụ ihe nile e kwuru banyere ihe omume a.” Ọ bụrụ na onye i nyere ya nwere ajụjụ, hụ na ị zara ajụjụ ya. Ihe e dere n’ihe odide ntụkwasị dị na peeji nke 206 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi pụrụ inyere gị aka ịza ajụjụ ndị metụtara Ememe Ncheta a. Ná ngwụsị izu, anyị ga na-enyefe magazin ndị ọhụrụ nakwa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ pụrụ iche. Chọpụta ndị gosiri mmasị ma gaghachi na nke ha.

4. Olee otú a ga-esi ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka Ememe Ncheta?

4 N’ebe o kwere mee, e kwesịrị inye onye ọ bụla e nwetara n’ụlọ, akwụkwọ ịkpọ òkù a. N’ihi ya, detuo ụlọ ndị ị na-enwetaghị mmadụ na ha, ma gbaa mbọ hụ na ị gaghachiri na ha. Ọgbakọ ndị akwụkwọ ịkpọ òkù ha fọdụrụ nnọọ nnukwu pụrụ ịkpafanyewe ha n’ụlọ ndị a na-enwetaghị mmadụ na ha n’izu ikpeazụ ga-esochi ụbọchị Ememe Ncheta ahụ, ma ọ gaghị abụ tupu izu ikpeazụ ahụ. Hụ na ndị ị na-aga nletaghachi na nke ha, ndị ikwu gị, ndị ọrụ ibe gị, ndị agbata obi gị na ndị ọzọ ị maara nwetara akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ.

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmalite ugbu a mewe ndokwa maka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

5 Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka: Ì nwere ike ịkpọsa ịdị mma Jehova n’ụzọ zuru ezu karị site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa March, April, na May? Iji nwee ike ime nke a, ọ pụrụ ịdị mkpa na ị ga-ahazigharị ihe ụfọdụ ị na-eme kwa ụbọchị. (Efe. 5:15-17) Jide n’aka na ị ga-enweta obi ụtọ na ngọzi Jehova ma ọ bụrụ na ị gbalịa itinyekwu oge n’ozi Jehova. (Ilu 10:22) Ebe ọ bụ na Ememe Ncheta nke afọ a eruwela nso, ugbu a bụ oge i kwesịrị ịmalite mewe ndokwa maka ya.—Ilu 21:5.

6. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ nke otu nwanna nwanyị dị afọ 90, bụ́ onye rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga?

6 Otu nwanna nwanyị dị afọ 90 rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga. O kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ọ na-amasị m ịkụ fụlawa, nakwa na m chọrọ ịmalite ịkụ ya, aghọtara m na m kwesịrị ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ. N’ihi ọchịchọ m nwere ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ, ekpebiri m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na March.” À gọziri ya n’ihi mgbalị ya? O kwuru, sị, “O mere ka m soro ọgbakọ kpachikwuo anya, meekwa ka m bịarukwuo Jehova nso.” Ànyị pụrụ ịtụle ihe ndị anyị weere dị ka ihe ndị ka mkpa ná ndụ anyị ma mee mgbanwe ndị dị mkpa dị ka nwanna nwanyị ahụ mere?

7. Ò siri ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

7 Ịrụzu awa 50 ahụ a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka nwere ike ọ gaghị esiru ike otú i chere. Jiri ekpere tụlee ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị, hazie otú ị ga-esi rụọ ya, ma denyezie ya n’ebe ị na-edenye ihe omume ndị metụtara ofufe Chineke. Ị maara ọnọdụ gị karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na ahụ́ esighị gị ike, nakwa na ị gaghị arụli ya, i nwere ike ịgba mbọ na-aga ozi ọma kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ego, ma ọ bụ na-aga akwụkwọ, i nwere ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka site n’ịdị na-aga ozi ọma n’oge mgbede ma ọ bụ ná ngwụsị izu.

8. Gịnị nyeere otu di na nwunye aka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

8 Ọtụtụ ezinụlọ arụkọọla ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ọnụ. N’afọ ndị gara aga, obi akachaghị otu di na nwunye iwere ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ihi na ha chere na ọnọdụ ha agaghị enye ha ohere ịrụ ya. Gịnị ka ha mere banyere ya? Ha kwuru, sị: “Anyị kpegaara Jehova ekpere ka o nyere anyị aka ime ihe a anyị nọ na-achọ imekọta ọnụ kemgbe.” Mgbe ha bịara hazie oge ha nke ọma, ha bịara nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ha kwukwara, sị: “Ọ dị nnọọ ụtọ. Anyị nwetara ọtụtụ ngọzi. Aro anyị nwere ịtụ bụ, nwalee ya. Ọ bụrụ na anyị meliri ya, gị onwe gị nwekwara ike ime ya.”

9. Olee ihe unu nwere ike ime n’oge ọzọ unu ga-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ iji kwadebe maka ọnwa ndị pụrụ iche na-abịa n’ihu?

9 Gịnị ma ọ bụrụ na unu ewepụta oge n’oge unu na-eji enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ma tụlee otú unu nile nwere ike isi mụbakwuo oge unu ji eje ozi n’ọnwa ndị na-abịa abịa? Ọ bụrụgodị na ọ bụghị mmadụ nile nọ n’ezinụlọ unu ga-enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ikekwe otu n’ime unu nwere ike ịrụ ya site n’enyemaka na nkwado nke ndị ọzọ. Ọ bụrụkwa na nke ahụ agaghị ekwe unu omume, ezinụlọ unu nwere ike isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke itinyekwu ihe n’oge unu ga-eji jee ozi n’ọnwa ndị a pụrụ iche.

10. Gịnị mere o ji dị mma ịkọrọ ndị ọzọ banyere ọchịchọ anyị nwere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’oge Ememe Ncheta a?

10 Na-enyerenụ Ibe Unu Aka: Ịnụ ọkụ n’obi na-efe efe. Na-akọrọ ndị ọzọ banyere ọchịchọ gị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Nke a nwere ike ịgba ndị ọzọ ume itinye akwụkwọ maka ya. Ọzọkwa, ndị rụtụrụla ọrụ ọsụ ụzọ nwere ike ịtụrụ gị aro ndị ga-enyere gị aka ịhazi oge gị iji nwee ike ịrụ ya. (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ọ́ gaghị adị mma ka ị kpọọ onye nkwusa ọzọ, ikekwe onye ọnọdụ ya yiri nke gị, ka o sonyere gị n’ọrụ a tọgburu onwe ya?

11. Olee otú ndị okenye pụrụ isi mee ka ọ dị ụmụnna ọkụ n’obi ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ndị na-abịanụ?

11 Ọtụtụ ndị okenye na-eme ndokwa ndị dị mkpa iji soro rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. (Hib. 13:7) Nke a na-abụrụ nnọọ ọgbakọ ihe agbamume! Ndị okenye na-akpalikwa ndị ọzọ ịnụ ọkụ n’obi site ná mkparịta ụka ha na ha na-enwe. O nwere ike ịbụ nanị okwu ụfọdụ e ji obiọma kwuo ma ọ bụ aro ụfọdụ bara uru ka a chọrọ iji kpalie ụfọdụ ndị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Onye nlekọta ije ozi nwere ike ịhazi ka e nwekwuo nzukọ ije ozi ubi n’oge ndị ọzọ, ka mmadụ nile wee nwee ike isonye n’ozi ọma ìgwè, ọbụna mgbe ha gbasachara ọrụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ. E kwesịrị ịhụ na a na-ama ya n’ọkwa mgbe nile. O kwesịkwara ịhụ na mmadụ nile nwetachara ókèala na akwụkwọ ga-ezuru ha.

12. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị gaghị arụli ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

12 Ọ bụrụgodị na ọnọdụ gị agaghị enye gị ohere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ị pụrụ ịgba ndị na-arụ ya ume, ị pụkwara itinye ha n’ekpere. (Ilu 25:11; Kọl. 4:12) Ikekwe, i nwere ike ime ndokwa iso ha jee ozi n’ụbọchị ọzọ na-abụghị ụbọchị ị na-ejikarị eje ozi n’ime izu ma ọ bụkwanụ nọfee oge ị na-anọkarị n’ozi.

13. Olee ihe mgbaru ọsọ e setịpụrụ na Nigeria, oleekwa otú ọgbakọ unu ga-esi nye aka hụ na e ruru ya?

13 A Chọrọ Iri Puku Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka Atọ n’April: Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka e nwetụrụla n’ókèala alaka ụlọ ọrụ Nigeria na-elekọta bụ puku iri abụọ na atọ na mmadụ abụọ, ọ bụkwa n’April 2003 ka e nwetara ya. N’ihi ya, anyị chọrọ iru iri puku ndị ọsụ ụzọ inyeaka atọ n’ọnwa April na-abịa abịa. Anyị ga-eru ọnụ ọgụgụ a ma ọ bụrụ na n’ọgbakọ ọ bụla, otu onye n’ime ndị nkwusa itoolu ọ bụla arụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ọgbakọ ụfọdụ ga-enwedị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa karịrị nke ahụ, bụ́ ndị ọnọdụ ha ga-enye ha ohere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ ga-adịrị ọtụtụ ọgbakọ mfe iru ihe mgbaru ọsọ ahụ. Leenụ ụdị obi ụtọ nke a ga-ewetara ọgbakọ unu nakwa mmetụta ọ ga-enwe n’ebe ozi a dị n’ókèala unu!

14. Olee ihe mere ọnwa April ji bụrụ ọnwa magburu onwe ya iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

14 Gịnị mere ọnwa April ji bụrụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Ọ bụ n’ihi na a ga-eme Ememe Ncheta ná mmalite ọnwa ahụ, nke a ga-enyekwa anyị ohere buru ibu iji gaa leta ndị bịaranụ. Anyị ga-enyefe magazin, burukwa n’obi inyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe anyị gara nletaghachi, nakwa iji ya malite ọmụmụ Bible. N’ihi ya, ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April ga-eme ka anyị nwee ọtụtụ ohere iji malite iduzi ọmụmụ Bible. Ọzọkwa, ọnwa April nwere Sunday ise na oge ezumike, nke a ga-eme ka ọ dịrị ndị ọrụ Bekee na ụmụ akwụkwọ mfe iwere ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

15. Gịnị mere anyị ji kwesị ile ozi anyị anya dị ka ihe ọ dị mkpa ka anyị jee ngwa ngwa ka Ememe Ncheta nke afọ a na-eru nso?

15 Oge Ememe Ncheta ọ bụla gaferenụ na-eme ka anyị jiri otu afọ bịarukwuo ngwụsị nke usoro ihe a nso? Oge fọdụụrụ anyị iji gwa ndị mmadụ banyere Chineke anyị dị ebube dị ntakịrị. (1 Kọr. 7:29) Oge Ememe Ncheta nke afọ a gafehaala, mara na ohere pụrụ iche o nyere anyị iji too Nna anyị nke eluigwe agaala kpamkpam. Ka anyị kwadebe ugbu a ma hụ na anyị mere ihe nile anyị nwere ike ime n’ọnwa March, April, na May iji kpọsaa ịdị mma Jehova n’ebe nile!

Igbe dị na peeji nke 4]

Ànyị Nwere Ike Inweta Iri Puku Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka Atọ n’Ọnwa April?

◼ Tụlee ihe ndị i weere dị ka ihe ndị ka mkpa ná ndụ gị

◼ Kwurịtanụ ihe mgbaru ọsọ unu dị ka ezinụlọ

◼ Kọọrọ ndị ọzọ atụmatụ gị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya