Ṅomie Onye Ozizi Ukwu ahụ Mgbe Ị Na-eji Akwụkwọ Bible Na-akụzi Ezi Ihe
1. Olee otú Jizọs si zie ihe?
1 Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs, maara otú e si akọwa ihe n’ụzọ dị mfe nakwa n’ụzọ ga-ekwe nghọta. Mgbe ụfọdụ, iji kpalie ndị na-ege ya ntị iche echiche, ọ na-ajụ ha ihe bụ́ echiche ha. (Mat. 17:24-27) Ọ dọọrọ uche ndị mmadụ gaa n’Okwu Chineke. (Mat. 26:31; Mak 7:6) Ọ naghị akụziri ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe otu mgbe n’ihi na ọ maara na ha ga-eji nke nta nke nta matachaa ihe ndị ahụ. (Jọn 16:12) Jizọs na-enwekwa mmasị ịma ma hà kweere n’ihe ndị ọ kụziiri ha ma ghọtakwa ihe ndị ahụ. (Mat. 13:51) E bipụtara akwụkwọ Bible Na-akụzi iji nyere anyị aka isikwa otú ahụ na-ezi ihe.
2. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi jiri ajụjụ mmalite ndị dị n’isiakwụkwọ nke ọ bụla mee ihe?
2 Ajụjụ Mmalite: Mgbe ị malitere iduzi ọmụmụ Bible n’otu isiakwụkwọ, ọ dị mma ka ị jụọ ajụjụ mmalite ndị ahụ dị n’okpuru isiokwu ahụ. Jụọ ajụjụ ndị ahụ n’ụdị ọ ga-akpali onye ahụ ị na-amụrụ ihe ichewe banyere azịza ha. Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike ịgwa ya ka ọ zatụgodị ha. Ọ baghị uru ikwuwe ọtụtụ okwu banyere ihe ọ zara ma ọ bụ gbaziwe ihe ọ bụla na-adabaghị adaba o kwuru. Nanị ihe i nwere ike ime bụ ikele ya maka echiche ya ma malitezie ịmụ isiokwu ahụ. Otú o si zaa ajụjụ ndị ahụ a jụrụ ná mmalite ga-enyere gị aka ịma ma ọ̀ ga-adị mkpa iwepụta oge kọwaara ya ebe ụfọdụ n’isiokwu ahụ karịa otú ị ga-esi ewepụta oge kọwaa ebe ndị ọzọ.
3. Olee otú anyị pụrụ isi na-eduzi ọmụmụ ihe n’ụzọ ga-adịrị onye anyị na-amụrụ ihe mfe nghọta?
3 Akwụkwọ Nsọ: Ọmụmụ ihe ahụ kwesịrị ịdabere n’Akwụkwọ Nsọ. (Hib. 4:12) Ma, ọ dịghị mkpa ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e zoro aka na ha. Mee ka ndị nke na-akwado ihe ndị anyị kweere na ha pụta ìhè. O nwere ike ọ gaghị adị mkpa ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akọwa ọnọdụ ndị gbara ihe ndị a na-ekwu maka ha gburugburu. Akwụkwọ Bible Na-akụzi na-akụzi eziokwu ahụ n’ụzọ dị mfe nghọta. Jiri ya na-eduzi ọmụmụ ihe otú ọ ga-adị mfe nghọta. Lekwasị anya n’isi ihe ndị dị n’ọmụmụ ihe ahụ, ma zere ikwu ogologo okwu ma ọ bụ iwebata ihe ndị ọzọ na-adịghị mkpa n’ọmụmụ ihe ahụ.
4. Olee ihe ga-ekpebi ma ànyị kwesịrị iso onye anyị na-amụrụ ihe tụlee ihe odide ntụkwasị n’oge anyị na-amụrụ ya ihe?
4 Ihe Odide Ntụkwasị: E nwere ihe odide ntụkwasị 14 bụ́ ndị nyekwuru nkọwa banyere isiakwụkwọ ndị bụ́ isi. Ọ bụghị iwu na a ga-atụle ihe odide ntụkwasị ndị ahụ mgbe ahụ a na-amụ ihe. A bịa n’isiokwu ụfọdụ, i nwere ike ịgwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ gụọ ihe odide ntụkwasị ndị ahụ n’onwe ya, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ ghọtara ihe e kwuru n’isiakwụkwọ ahụ ma nakwere ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe kweere na Jizọs bụ Mezaịa ahụ, o nwere ike ọ gaghị adị mkpa isoro ya tụlewe isiokwu bụ́, “Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa,” mgbe unu na-amụ isi nke 4, nke isiokwu ya bụ, “Ònye Bụ Jizọs Kraịst?” N’oge ọzọ, o nwere ike ịba uru iwepụta oge n’oge unu na-amụ ihe ma soro ya tụlee ihe odide ntụkwasị ahụ ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ.
5. Ọ bụrụ na anyị kpebiri iso onye anyị na-amụrụ ihe tụlee ihe odide ntụkwasị, olee otú anyị pụrụ isi mee ya?
5 Ọ bụrụ na i kpebie na unu ga-amụ ihe odide ntụkwasị, i nwere ike ibu ụzọ kwadebe ajụjụ ị ga-ajụ onye ahụ ị na-amụrụ ihe ma tụlee ihe odide ntụkwasị ahụ na paragraf na paragraf dị nnọọ ka i si eme ya mgbe unu na-amụ isiakwụkwọ ndị bụ́ isi. Ma ọ bụkwanụ, dabere ná mkpa nke onye ị na-amụrụ ihe, i nwere ike ikpebi iji minit ole na ole soro ya tụlee ihe e kwuru n’ihe odide ntụkwasị ahụ. Nke a ga-enyere gị aka ịhụ otú o si ghọta ihe ahụ ọ gụụrụ onwe ya.
6. Olee otú a pụrụ isi jiri igbe ntụleghachi dị ná ngwụsị nke isiakwụkwọ nke ọ bụla mee ihe?
6 Igbe Ntụleghachi: Igbe ahụ dị ná ngwụcha nke isiakwụkwọ ọ bụla na-azakarị ajụjụ mmalite nke isiakwụkwọ ọ dị na ya. I nwere ike iji igbe ntụleghachi tụleghachi isi ihe dị n’isiakwụkwọ ahụ unu mụrụ. Ụfọdụ ndị nkwusa achọpụtala na ọ na-aba uru ma a gụọ nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e dere n’igbe ndị ahụ nakwa, ma eleghị anya, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ dị n’azụ ha. Ha gụsịa ya, ha agwazie onye ahụ ha na-amụrụ ihe ka ọ kọwaa n’ụzọ dị mkpirikpi otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ si kwadoo ihe e dere n’igbe ahụ. Nke a na-enyere onye nkwusa ahụ aka ịmata ma onye ọ na-amụrụ ihe ọ̀ ghọtakwara isi ihe dị n’isiakwụkwọ ahụ nke ọma ma ghọta otú Bible si kwadoo ha, nakwa ma ò kwenyere n’ihe ndị ahụ a mụrụ. Ọ na-azụkwa onye ahụ a na-amụrụ Bible ịma otú e si eji Bible akọwara ndị mmadụ eziokwu ahụ.
7. Olee otú anyị pụrụ isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi na-arụzu ọrụ anyị?
7 Ụzọ kasị mma isi rụzuo ọrụ anyị nke bụ́ ịkụziri ndị mmadụ ihe na ime ndị na-eso ụzọ bụ site n’iṅomi Jizọs n’otú o si ezi ihe. (Mat. 28:19, 20) Akwụkwọ Bible Na-akụzi pụrụ inyere anyị aka ime nke ahụ. Jiri ya kụziere ndị mmadụ ihe n’ụzọ dị mfe, kwe nghọta, ma dị ụtọ.