Otú E Si Eji Akwụkwọ Ihe Ọmụma Eme Ndị Na-eso Ụzọ
1 Ihe mgbaru ọsọ ndị Kraịst nile na-achọsi ike bụ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu na ime ka “ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi” bụrụ ndị na-eso ụzọ. (Ọrụ 13:48; Mat. 28:19, 20) Nzukọ Jehova enyewo anyị ngwá ọrụ dị ịtụnanya nke anyị ga-eji arụzu nke a—akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Isiokwu ya na-eme ka mkpa dị ukwuu nke ọmụmụ Bible ebe obibi pụta ìhè, n’ihi na ndụ ebighị ebi na-adabere n’ịnara ihe ọmụma Jehova, onye nanị ya bụ ezi Chineke, na nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Jọn 17:3.
2 Akwụkwọ Ihe Ọmụma bụ ugbu a akwụkwọ bụ isi nke Society maka iji mee ihe n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. N’iji ya eme ihe, anyị pụrụ ịkụzi eziokwu ahụ n’ụzọ dị mfe, doo anya, dịkwa nkenke. Nke a ga-enye aka irute n’obi nke ndị a na-akụziri ihe. (Luk 24:32) N’eziokwu, ọ dị mkpa ka onye nduzi ahụ jiri ụzọ nkà izi ihe ndị dị mma mee ihe. Iji mezuo nke ahụ, a kwadebewo ihe ntinye a iwepụta aro na ihe ncheta ụfọdụ banyere ụzọ izi ihe ndị dịworo irè. N’iji nghọta eme ihe, na dị ka ọnọdụ mmadụ n’otu n’otu si dị, ị ga-enwe ike iji nke nta nke nta tinye ụfọdụ ma ọ bụ ihe nile e wepụtara n’ebe a n’ọrụ. Chekwaa ihe ntinye a, na-atụlekwa ya mgbe mgbe. Isi ihe dị iche iche dị n’ime ya pụrụ inyere gị aka ịdị irè karị n’iji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ndị na-eso ụzọ.
3 Duzie Ọmụmụ Bible Ebe Obibi nke Na-aga n’Ihu: Nwee ezi mmasị onwe onye n’ebe onye mmụta ahụ nọ dị ka onye pụrụ ịghọ onye Kraịst na-eso ụzọ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ime mmụọ. Na-ekpo ọkụ, nwee omume enyi, na-anụkwa ọkụ n’obi. Site n’ịbụ onye na-ege ntị nke ọma, ị pụrụ ịmata onye nke ọzọ—nzụlite na ọnọdụ ya ná ndụ—nke ga-enyere gị aka ịmata ụzọ kasị mma isi nyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. Dị njikere inye onwe gị n’ihi onye mmụta ahụ.—1 Tesa. 2:8.
4 Ozugbo e guzobeworo ọmụmụ ihe, ọ ka mma ka a mụọ isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma n’usoro e si depụta ha. Nke a ga-eme ka onye mmụta ahụ nweta nghọta na-aga n’ihu nke eziokwu ahụ, ebe ọ bụ na akwụkwọ ahụ na-ewulite isiokwu Bible n’usoro kasị nwee njikọ. Mee ka ọmụmụ ihe ahụ dị mfe ma dị ụtọ ka o wee na-ekpo ọkụ ma na-aga n’ihu. (Rom 12:11) Na-adabere n’ọnọdụ na ikike ịmụta ihe nke onye mmụta ahụ, ọ pụrụ ikwe gị omume ịtụlezu ihe ka ọtụtụ n’isiakwụkwọ ndị ahụ n’otu nnọkọ nke otu hour ma ọ bụ ihe yiri ya, n’achụghị ọmụmụ ihe ahụ n’ọkụ n’ọkụ. Ndị mmụta ga-enwe ọganihu ka mma mgbe ma onye nkụzi ma onye mmụta na-edebe agba ha yiri ịmụ ihe kwa izu. N’ihi ya, nye ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, ọ pụrụ ikwe omume ịmụcha 19 isiakwụkwọ nke akwụkwọ ahụ n’ihe dị ka ọnwa isii ma ọ bụ ihe yiri ya.
5 Jiri okwu dị mkpirikpi nke ga-akpali mmasị n’ihe ọmụmụ malite ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Ị ga-achọpụta na aha nke isiakwụkwọ nke ọ bụla bụ isiokwu ya, nke ọ dị mkpa ka e mee ka ọ pụta ìhè. Isiokwu nta nke ọ bụla na-ewepụta ihe ndị bụ isi, na-enyere gị aka ịtụkwasị uche n’isiokwu nke isiakwụkwọ ahụ. Kpachara anya ka ị ghara ikwubiga okwu ókè. Kama nke ahụ, gbalịa ime ka onye mmụta ahụ kwuo okwu. Ịjụ onye mmụta ahụ ajụjụ nchepụta ndị gara n’ihe a chọrọ, na-adabere n’ihe ndị ọ mawooro, ga-enyere ya aka iche echiche na iru ná nkwubi okwu ndị ziri ezi. (Mat. 17:24-26; Luk 10:25-37; lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 59, paragraf nke 10.) Gbasochie ihe ọmụma ndị e depụtara n’akwụkwọ Ihe Ọmụma anya. Iwebata ihe ndị ọzọ pụrụ iwepụ ihe ma ọ bụ mee ka ihe ndị bụ isi ghara ido anya, meekwa ka ọmụmụ ihe ahụ dịtee anya. (Jọn 16:12) Ọ bụrụ na e welite ajụjụ na-agbasaghị isiokwu a na-amụ, n’ọnọdụ ka ukwuu, ị pụrụ ịza ya ná ngwụsị nke ọmụmụ ihe ahụ. Nke a ga-eme ka ị tụlezuo ihe ọmụmụ nke izu ahụ n’abụghị onye a dọpụrụ uche. Kọwaara onye mmụta ahụ na a ga-emesị zaa ihe ka ọtụtụ n’ajụjụ onwe onye ya ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu.—Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 110, paragraf nke 14.
6 Ọ bụrụ na onye mmụta ahụ kwenyesiri ike n’Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, ma ọ bụ ozizi ụgha ndị ọzọ dị otú ahụ, ọ bụrụkwa na ihe e kwuru n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ ejughị ya afọ, ị pụrụ inye ya akwụkwọ Reasoning ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ nke tụlere isiokwu ahụ. Gwa ya na ị ga-esoro ya tụlee isiokwu ahụ mgbe o chesịrị echiche n’ihe ọ na-agụ.
7 Iji ekpere maka nduzi na ngọzi Jehova na-emeghe ma na-emechikwa ọmụmụ ihe ahụ na-eme ka ọmụmụ ihe ahụ bụrụ ihe ùgwù, na-etinye mmadụ n’ọnọdụ uche dị nsọpụrụ, na-edurukwa uche gaa n’ebe Jehova nọ dị ka onye ọ bụ ya bụ Onye Nkụzi n’ezie. (Jọn 6:45) Ọ bụrụ na onye mmụta ahụ ka bụ onye na-eji ụtaba eme ihe, ọ pụrụ imesị dị mkpa ka ị gwa ya ka o zere ya n’oge ọmụmụ ihe.—Ọrụ 24:16; Jes. 4:3.
8 Jiri Akwụkwọ Nsọ, Ihe Osise, na Ajụjụ Ntụleghachi Zie Ihe n’Ụzọ Dị Irè: N’agbanyeghị ugboro ole o buworo ụzọ mụọ ihe ọmụmụ ahụ, onye nwere nkà izi ihe ga-eburu otu onye mmụta n’obi kpọmkwem na-atụleghachi ihe mmụta nke ọ bụla. Nke a na-enye aka ịtụ anya ajụjụ ụfọdụ onye mmụta ga-ajụ. Iji zie ihe n’ụzọ dị irè, ghọta ihe ndị bụ isi n’isiakwụkwọ ahụ n’ụzọ doro anya. Lee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị na ya iji hụ otú ha si kwekọọ n’ihe ọmụmụ ahụ, kpebiekwa ndị a ga-agụ n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Chee echiche banyere otú ị pụrụ isi jiri ihe osise na ajụjụ ntụleghachi ndị dị ná ngwụsị isiakwụkwọ zie ihe.
9 Site n’iji akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ nsọ eme ihe n’ụzọ dị irè, ị ga-enyere onye mmụta ahụ aka ịghọta na ọ na-amụ Bible n’ezie. (Ọrụ 17:11) N’iji igbe bụ́ “Jiri Bible Gị Na-eme Ihe nke Ọma,” nke dị na peji nke 14 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe, kụziere ya otú e si achọta akụkụ akwụkwọ nsọ. Gosi ya otú e si amata amaokwu ndị e hotara ehota n’ihe ọmụmụ ahụ. Dị ka oge nyere ohere ya, sapeta ma gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kpọtụrụ uche, na-abụghị ndị e hotara ehota. Mee ka onye mmụta kwuo otú ha si akwado ma ọ bụ na-eme ka ihe e kwuru na paragraf ahụ doo anya. Mesie ike akụkụ ndị bụ isi n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ ka o wee ghọta ihe mere e ji nwee ihe ndị ahụ bụ isi n’ihe ọmụmụ ahụ. (Neh. 8:8) N’ozuzu ya, ọ dịghị mkpa ka onye nkụzi webata ihe ndị ọzọ ná nkwurịta okwu ahụ karịa ndị e nwere n’akwụkwọ ahụ. Kwuo okwu n’uru nke ịmara aha na usoro akwụkwọ Bible. Ọ pụrụ inyere onye mmụta ahụ aka ịgụ peji nke 27-30 nke Ụlọ Nche June 15, 1991. Mgbe o kwesịrị ekwesị, gbaa ume ka e jiri New World Translation na-eme ihe. Ị pụrụ iji nke nta nke nta gosipụta otú e si eji akụkụ ya dị iche iche eme ihe, ndị dị ka ntụaka etiti na ndepụta ntụaka nke okwu Bible.
10 Ihe ọmụmụ nke 34 n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke na-akọwa na ihe atụ na-akpali usoro iche echiche mmadụ, na-emekwa ka ọ dị mfe ịghọta echiche ndị ọhụrụ. Ha na-ejikọta ikike ọgụgụ isi na mmetụta uche, nke na-eme ka e zie ozi ahụ n’ike nke na-adịghị ekwe omume ma ọ bụrụ na e jiri okwu ndị dị mfe ma zie ezi mee ihe. (Mat. 13:34) Akwụkwọ Ihe Ọmụma nwere ọtụtụ ihe atụ e ji ezi ihe, bụ́ ndị dị mfe ma dị ike. Dị ka ihe atụ, ihe atụ e ji mee ihe n’isi nke 17 na-ewulite ekele maka otú Jehova si esite n’aka ọgbakọ ndị Kraịst na-enye nri, uwe, na ebe obibi n’ụzọ ime mmụọ. A pụrụ iji ihe osise ndị mara mma nke akwụkwọ Ihe Ọmụma mee ihe n’ụzọ dị irè iji kpalite mmetụta uche. N’okpuru isiokwu nta bụ “Mbilite n’Ọnwụ ahụ Na-enye Ọṅụ,” nke dị na peji nke 185, a ga-emesiwanye mmetụta nke paragraf nke 18 ike site n’ime ka onye mmụta ahụ leghachi anya n’ihe osise dị na peji nke 86. Nke a pụrụ ịkpali ya iche echiche banyere mbilite n’ọnwụ dị ka ihe ga-eme eme n’okpuru Alaeze Chineke.
11 Ọ dị ndị mmụta Bible mkpa inwe ọganihu ime mmụọ n’ihe mmụta nke ọ bụla. N’ihi nke a, ahapụla ịjụ ajụjụ ntụleghachi ndị dị n’igbe bụ́ “Nwalee Ihe Ọmụma Gị,” nke dị ná ngwụsị nke isiakwụkwọ nke ọ bụla. Gee ntị maka ihe karịrị nkọwa ọgụgụ isi nke ihe a mụrụ. E dokwara ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị a iji dọpụta nzaghachi onwe onye sitere n’obi. Dị ka ihe atụ, lee peji nke 31, bụ́ ebe a jụrụ onye mmụta, sị: “Olee àgwà Jehova Chineke ndị na-amasị gị karịsịa?”—2 Kọr. 13:5.
12 Zụlite Ndị Mmụta Ịkwadebe Maka Ọmụmụ Ihe Ahụ: Onye mmụta nke na-agụ ihe ọmụmụ ahụ tupu oge eruo, na-akanye azịza akara, na-echekwa echiche otú ọ ga-esi ekwu ha n’okwu nke aka ya, ga-enwe ọganihu ime mmụọ ka ngwa. Site n’ihe nlereanya na agbamume gị, ị pụrụ ịzụlite ya ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. Gosi ya akwụkwọ nke gị, nke ị kanyeworo okwu na ahịrị okwu ndị bụ isi akara na ya. Kọwaa otú e si achọta azịza ndị gara n’ihe kpọmkwem nye ajụjụ ndị e bipụtara ebipụta. Ịkwadebekọ otu isiakwụkwọ ọnụ pụrụ inyere onye mmụta ahụ aka. Gbaa ya ume ka ọ na-aza ajụjụ n’okwu nke aka ya. Nanị mgbe ahụ ka ọ ga-edo anya ma ọ̀ na-aghọta ihe ọmụmụ ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-agụpụta azịza ya site n’akwụkwọ ahụ, ị pụrụ ịkpalite iche echiche ya site n’ịjụ ya otú ọ ga-esi akọwara onye ọzọ isi ihe ahụ n’okwu nke aka ya.
13 Gbaa onye mmụta ahụ ume ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ a na-ehotaghị ehota dị ka akụkụ nke nkwadebe kwa izu ya, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịbụ na oge agaghị adị ịgụ ha nile n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Jaa ya mma maka mgbalị ọ na-etinye n’ihe ọmụmụ ya. (2 Pita 1:5; lee Ụlọ Nche nke August 15, 1993, peji nke 13-14, maka aro ndị ọzọ banyere ihe ma onye mmụta ma onye nkụzi pụrụ ime iji mụbawanye ịmụta ihe n’ọmụmụ Bible.) N’ụzọ dị otú a, a na-akwadebe onye mmụta ahụ ịkwado maka na ịza ajụjụ ndị ezi uche dị na ha ná nzukọ ọgbakọ. Ọ ga na-amụta otú e si azụlite àgwà ọmụmụ ihe onwe onye dị mma nke ga-akwadebe ya ịnọgide na-enwe ọganihu n’eziokwu ahụ mgbe ọ mụzuru ọmụmụ Bible onwe onye ya n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.—1 Tim. 4:15; 1 Pita 2:2.
14 Duru Ndị Mmụta Gaa ná Nzukọ Jehova: Ọ bụ ibu ọrụ onye na-eme ndị na-eso ụzọ ịdọrọ mmasị onye mmụta gaa ná nzukọ Jehova. Onye mmụta ahụ ga-enwe ọganihu n’ụzọ ka ngwa iru ná ntozu okè ime mmụọ ma ọ bụrụ na ọ mata ma ghọta nzukọ ahụ, na-aghọtakwa mkpa ọ dị ịghọ akụkụ ya. Anyị chọrọ ka o nwee obi ụtọ n’isoro ndị Chineke na-akpakọrịta, na ịtụ anya isoro anyị nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe ọ pụrụ inweta nkwado ime mmụọ na nke mmetụta uche nke ọgbakọ ndị Kraịst na-enye.—1 Tim. 3:15.
15 E wepụtawo broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile iji mee ka ndị mmadụ mata nanị nzukọ ahụ Jehova ji na-eme ihe taa iji mezuo uche ya. Ozugbo e guzobeworo ọmụmụ ihe, gịnị ma i tinye otu n’aka onye mmụta ahụ? Site nnọọ ná mmalite, nọgide na-akpọ onye mmụta ahụ òkù ịbịa nzukọ. Kọwaa otú e si eduzi ha. Ị pụrụ ịgwa ya isiokwu nke okwu ihu ọha nke na-abịanụ ma ọ bụ gosi ya isiokwu a ga-atụle n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ikekwe ị pụrụ ịkpọrọ ya gaa ka ọ hụ Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe a na-enweghị nzukọ na-aga n’ihu, ka e wee belata nchegbu ọ bụla ọ pụrụ inwe banyere ịga ebe ọhụrụ na nke mbụ ya. Ị pụrụ ịkwụrụ ya ụgwọ iji gaa nzukọ. Mgbe ọ bịara, nabata ya nke ọma, meekwa ka o nwee ahụ iru ala. (Mat. 7:12) Kọwaara Ndịàmà ndị ọzọ onye ọ bụ, tinyere ndị okenye. Ma eleghị anya, ọ ga-amalite ile ọgbakọ anya dị ka ezinụlọ ime mmụọ ya. (Mat. 12:49, 50; Mak 10:29, 30) Ị pụrụ iguzobere ya ihe mgbaru ọsọ, dị ka ịbịa otu nzukọ kwa izu, jirikwa nke nta nke nta mụbawanye ihe mgbaru ọsọ ahụ.—Hib. 10:24, 25.
16 Ka ọmụmụ Bible ebe obibi ahụ na-aga n’ihu site n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ, kwusie okwu ike n’akụkụ ndị na-eme ka ịdị mkpa nke isoro ọgbakọ na-akpakọrịta mgbe nile ná nzukọ pụta ìhè. Rịba ama karịsịa peji nke 52, 115, 137-139, 159, tinyekwara isi nke 17. Kwupụta mmetụta ekele nke gị dị omimi maka nzukọ Jehova. (Mat. 24:45-47) Kwuo okwu n’ụzọ dị mma banyere ọgbakọ gị na ihe ị na-amụta ná nzukọ. (Abụ Ọma 84:10; 133:1-3) Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na onye mmụta ahụ pụrụ ikiri nke ọ bụla n’ime vidio Society, na-amalite na Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Maka echiche ndị ọzọ banyere otú a pụrụ isi dọrọ mmasị gaa ná nzukọ ahụ, lee Ụlọ Nche nke May 15, 1985, peji nke 14-18, na ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke July 1993.
17 Gbaa Ndị Mmụta Ume Ịgba Àmà Nye Ndị Ọzọ: Nzube anyị n’isoro ndị mmadụ na-amụ ihe bụ ime ndị na-eso ụzọ na-agbara Jehova àmà. (Aisa. 43:10-12) Nke ahụ pụtara na onye nkụzi kwesịrị ịgba onye mmụta ume ka ọ na-agwa ndị ọzọ okwu banyere ihe ọ na-amụta site na Bible. A pụrụ ime nke a n’ụzọ dị nnọọ mfe dị ka ịjụ, sị: “Olee otú ị ga-esi kọwaara ndị ezinụlọ gị eziokwu a?” ma ọ bụ “Olee akụkụ akwụkwọ nsọ ị ga-eji nwapụtara enyi gị nke a?” Kwusie okwu ike n’ebe ndị bụ isi a gbara ume ịgba àmà n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, dị ka peji nke 22, 93-95, 105-106, tinyekwara isi nke 18. Mgbe o kwesịrị ekwesị, a pụrụ inye onye mmụta ahụ traktị ụfọdụ ọ ga-eji gbaa àmà mberede nye ndị ọzọ. Tụọ aro ka ọ kpọọ ndị òtù ezinụlọ ya ka ha nọrọ n’oge ọmụmụ ihe ya. Ò nwere ndị enyi ga-achọkwa ịmụ ihe? Gwa ya ka ọ gwa gị ndị nwere mmasị.
18 Site n’ịbịa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi, onye ahụ gaje ịghọ onye na-eso ụzọ pụrụ inwetakwu ọzụzụ na ihe mkpali nke pụrụ inyere ya aka ịghọ onye nkwusa nke ozi ọma ahụ. Mgbe o kwupụtara mmasị n’idebanye aha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, a ga-etinye ụkpụrụ ndị e depụtara na peji nke 98 na 99 nke akwụkwọ Ozi Anyị n’ọrụ. Ọ bụrụ na ọ dị akụkụ ndụ ya nke na-eme ka ọ ghara iru eru, ị pụrụ ịchọ ihe ọmụmụ ndị metụtara okwu ahụ n’akwụkwọ Society ma soro ya kerịta ya. Dị ka ihe atụ, onye mmụta pụrụ ịdị na-enwe ihe isi ike imeri iri ahụ nke ụtaba ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ. Akwụkwọ Reasoning na-arụtụ aka n’ihe ndị siri ike sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere ndị Kraịst ji ezere àgwà ndị ahụ na-emerụ ahụ, na peji nke 112 kwa, ọ na-egosipụta otu ụzọ nweworo ihe ịga nke ọma n’inyere ndị ọzọ aka inwere onwe ha. Soro ya kpee ekpere banyere okwu ahụ, na-akụziri ya iwulite ndabere ya n’ebe Jehova nọ maka enyemaka.—Jes. 4:8.
19 E depụtara ụkpụrụ a ga-agbaso iji kpebie ma mmadụ ò ruru eru ikere òkè n’ozi ihu ọha n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996, peji nke 16, paragraf nke 6. Mgbe onye mmụta ahụ ruru eru, ọ ga-enye aka inwe oge mmụgharị ihe iji kwadebe ya maka ụbọchị nke mbụ n’ozi ubi. N’ụzọ dị mma, tụlee mmeghachi omume na enweghị mmasị ndị mmadụ, bụ ndị a na-ahụkarị n’ókèala unu. Ọ bụrụ na o kwe omume, malite ya n’ozi ụlọ n’ụlọ, jirikwa nke nta nke nta zụlite ya n’akụkụ ndị ọzọ nke ozi ahụ. Ọ bụrụ na i mee ka okwu gị dị mkpirikpi ma dị mfe, ọ ga-adịrị ya mfe iṅomi. Na-ewuli elu ma na-agba ume, na-egbukepụ ọṅụ n’ọrụ ahụ, ka o wee ṅomie mmụọ ọṅụ gị, na-egosipụtakwa ya. (Ọrụ 18:25) Ihe mgbaru ọsọ nke onye ọhụrụ na-eso ụzọ kwesịrị ịbụ ịghọ onye nkwusa nke ozi ọma ahụ na-ejechi ozi anya, na-anụ ọkụ n’obi. Ikekwe ị pụrụ inyere ya aka imepụta usoro ihe omume dị irè maka ozi. Ka o wee nwee ọganihu n’ikike ya ịgba àmà nye ndị ọzọ, ị pụrụ ịtụ aro ka ọ gụọ mbipụta Ụlọ Nche nke August 15, 1985, peji nke 15-25; July 15, 1988, peji nke 9-20; January 15, 1991, peji nke 15-20; na January 1, 1994, peji nke 20-25.
20 Kpalie Ndị Mmụta Ime Nraranye na Baptism: O kwesịrị ikwe onye mmụta nwere obi eziokwu omume ịmụta ihe zuru ezu site n’ọmụmụ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ iji rara onwe ya nye Chineke ma ruo eru maka baptism. (Tụlee Ọrụ 8:27-39; 16:25-34.) Otú ọ dị, tupu a kpalie mmadụ ime nraranye, ọ dị ya mkpa ịzụlite nsọpụrụ ofufe nye Jehova. (Abụ Ọma 73:25-28) N’oge ọmụmụ ihe ahụ nile, chọọ ohere iji wulite ekele maka àgwà dị iche iche nke Jehova. Kwupụta mmetụta dị omimi nke gị nye Chineke. Nyere onye mmụta ahụ aka iche echiche banyere iwulite mmekọrịta onwe onye na-ekpo ọkụ n’ebe Jehova nọ. Ọ bụrụ na ọ mata ma hụ Chineke n’anya n’ezie, mgbe ahụ ọ ga-efe Ya ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi, n’ihi na nsọpụrụ Chineke na-agụnye otú anyị si ele Jehova anya dị ka onye.—1 Tim. 4:7, 8; lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 89, paragraf nke 11.
21 Gbalịa iru n’obi onye mmụta ahụ. (Abụ Ọma 119:11; Ọrụ 16:14; Rom 10:10) Ọ dị ya mkpa ịhụ otú eziokwu ahụ si emetụta ya n’onwe ya na ikpebi ihe o kwesịrị iji ihe ọ mụtaworo mee. (Rom 12:2) Ọ̀ na-ekweta n’ezie eziokwu ndị a na-akụziri ya site n’izu ruo n’izu? (1 Tesa. 2:13) Iji mezuo nke ahụ, ị pụrụ ime ka onye mmụta kwupụta echiche ya site n’ịjụ ajụjụ njụpụta uche, ndị dị ka: Gịnị ka i chere banyere nke a? Olee otú ị pụrụ isi tinye nke a n’ọrụ ná ndụ gị? Site n’azịza ya ị pụrụ ịmata ebe enyemaka dị mkpa iji ruo n’obi ya. (Luk 8:15; lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 60, paragraf nke 11.) Okwu nkọwa ihe osise ndị dị na peji nke 172 na 174 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma na-ajụ, sị: “Ì mewo nraranye nye Chineke n’ekpere?” na “Gịnị na-egbochi gị ịbụ onye e mere baptism?” Ndị a pụrụ ịkpali onye mmụta ahụ n’ụzọ dị irè ime ihe.
22 E depụtara ụkpụrụ a ga-agbaso mgbe onye nkwusa a na-emebeghị baptism nwere ọchịchọ ịbụ onye e mere baptism n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996, peji nke 17, paragraf nke 9. Nzube e ji dee akwụkwọ Ihe Ọmụma bụ iji kwadebe onye ahụ ịza “Ajụjụ Maka Ndị Na-achọ Ime Baptism,” bụ ndị a na-achọta n’ihe ntụkwasị nke akwụkwọ Ozi Anyị, nke ndị okenye ga-esoro ya tụlee. Ọ bụrụ na i kwusiwo okwu ike n’ajụjụ ndị e bipụtara ebipụta n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, onye mmụta ahụ kwesịrị ịbụ onye a kwadebeworo maka ihe omume ajụjụ ahụ ndị okenye na-eduzi ná nkwadebe maka baptism ya.
23 Nyere Ndị Nwezuru Ọmụmụ Bible Ebe Obibi Aka: E kwesịrị ịtụ anya na ka mmadụ na-amụzula akwụkwọ Ihe Ọmụma, ezi nzube obi na ókè mmasị o nwere n’ife Chineke ga-apụtaworị ìhè. (Mat. 13:23) Ọ bụ ya mere isiokwu nta ikpeazụ nke akwụkwọ ahụ ji na-ajụ, sị “Gịnị Ka Ị Ga-eme?” Paragraf ikpeazụ na-agba onye mmụta ahụ ume ka ọ tụkwasị uche ná mmekọrịta o kwesịworo ịzụlite n’ebe Chineke nọ, mkpa ọ dị itinye ihe ọmụma ọ mụtaworo n’ọrụ, na mkpa ọ dị ime ihe ngwa ngwa iji gosipụta ịhụnanya ya maka Jehova. E nweghị ndokwa maka isoro ndị mụchaworo akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ mụọ akwụkwọ ọzọ. Jiri obi ọma na ụzọ doro anya kọwaara onye mmụta na-adịghị azaghachi n’ihe ọmụma Chineke ihe ọ na-aghaghị ime iji nwee ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Ị pụrụ ịdị na-akpọtụrụ ya site na mgbe ruo na mgbe, na-eme ka ụzọ ghere oghe nye ya iwere nzọụkwụ ndị na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Ekli. 12:13.
24 Onye ọhụrụ na-eso ụzọ nke natara eziokwu ahụ ma bụrụ onye e mere baptism ga-eto uto ka ukwuu n’ihe ọmụma na nghọta ya ka o wee nwee ike ịkwụsi ike n’eziokwu ahụ. (Kọl. 2:6, 7) Kama ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ebe obibi ya mgbe unu mụchara akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ, ị pụrụ iwepụta onwe gị inye ya enyemaka onwe onye ọ bụla pụrụ ịdị ya mkpa iji wee tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ. (Gal. 6:10; Hib. 6:1) N’akụkụ nke ya, ọ pụrụ ime ka nghọta ya zuo ezu site n’ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịmụ Ụlọ Nche na mbipụta ndị ọzọ nke ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi’ n’onwe ya, ịkwadebe maka nzukọ na ịbịa, na isoro ndị kwere ekwe ibe ya na-atụlekọ eziokwu ahụ. (Mat. 24:45-47; Abụ Ọma 1:2; Ọrụ 2:41, 42; Kọl. 1:9, 10) Ya ịgụ akwụkwọ Ozi Anyị na itinye ihe ndị dị na ya n’ọrụ ga-ekere òkè dị mkpa na ya ịghọ onye a haziworo n’ụzọ ọchịchị Chineke ijezu ozi ya.—2 Tim. 2:2; 4:5.
25 Zụlite Nkà Izi Ihe: E nyewo anyị ọrụ ‘ime ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ihe.’ (Mat. 28:19, 20) Ebe ọ bụ na e jikọtara nkà nke izi ihe na ime ndị na-eso ụzọ n’ụzọ siri ike, ọ dị anyị mkpa inwewanye ọganihu dị ka ndị nkụzi. (1 Tim. 4:16; 2 Tim. 4:2) Maka aro ndị ọzọ banyere otú e si azụlite nkà izi ihe, ị pụrụ ịchọ ịgụ: “Izulite Ọkà nke Izi-ihe” na “Irute Obi nke Ndi Nege Gi Nti” n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, ihe ọmụmụ nke 10 na nke 15; “Teacher, Teaching” (Onye Nkụzi, Izi Ihe) n’Insight, Mpịakọta nke 2; na isiokwu Ụlọ Nche ndị bụ́ “Iji Ihe Ndị Na-apụghị Ire Ọkụ Wee Na-ewu” na “Mgbe Ị Na-ezi Ihe, Na-eru n’Obi,” February 1, 1985; “Ị̀ Na-atụgharị Uche n’Akwụkwọ Nsọ n’Ụzọ Dị Irè?,” September 1, 1986; na “Otú E Si Achọta Ọṅụ n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ,” February 15, 1996.
26 Ka ị na-agbalị ime ndị na-eso ụzọ, n’iji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe, na-ekpe ekpere mgbe nile ka Jehova, onye “na-eme ka ọ na-aba ụba,” gọzie mgbalị gị n’iji ozi ọma nke Alaeze ahụ rute obi ndị mmadụ. (1 Kọr. 3:5-7) Ka ọṅụ nke ịkụziri ndị ọzọ ịghọta, inwe ekele, na ime ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi bụrụ nke gị!