Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka E Gee M Ntị?
1 N’obodo Filipaị, “otu nwanyị [gere ntị, NW], aha ya bụ Lidia, onye na-ere ihe e ji esiji ákwà odo odo, . . . Onyenwe anyị wee meghee obi ya, ịṅa ntị n’ihe nile Pọl na-ekwu.” (Ọrụ 16:14) Gịnị ka ihe ndekọ a na-akụziri anyị? Ige ntị bụ ihe na-emepere mmadụ ụzọ ịmụta eziokwu ahụ. Ihe ịga nke ọma anyị n’ikerịta ozi Alaeze ahụ na-adabere n’ụzọ bụ isi n’ịdị njikere nke onye nwe ụlọ ige ntị. Ozugbo e gere anyị ntị, ọ na-adịkarị mfe izi ozi anyị. Ma ime ka mmadụ gee ntị pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Gịnị ka anyị pụrụ ime?
2 Tupu anyị amalite ikere òkè n’ozi, anyị kwesịrị ichebara ọdịdị onwe anyị na ngwá ọrụ anyị gaje iji mee ihe echiche. N’ihi gịnị? Ndị mmadụ na-achọkarị ige onye nwere ọdịdị dị ùgwù ntị. Ànyị jiri ejiji n’ụzọ mara mma ma dị mma n’anya? Ọ bụ ezie na ịdị nkịrịka pụrụ ịbụ ihe na-ewu ewu n’ụwa, anyị na-ezere ejighị nlezianya eme ihe dị otú ahụ n’ihi na anyị bụ ndị ozi na-anọchite anya Alaeze Chineke. Ọdịdị ịdị ọcha anyị na-atụkwasị ihe àmà n’ozi Alaeze anyị na-ekwusa.
3 Nwee Omume Enyi, Na-akwanyekwara Mmadụ Ùgwù: N’agbanyeghị àgwà ndị na-agbanwe agbanwe nke taa, ọtụtụ ndị ka nwere nsọpụrụ n’ebe Bible dị, ha ga-azaghachikwa n’ụzọ dị mma nye mkparịta ụka enyi na enyi e ji nkwanye ùgwù enwe banyere ihe dị n’ime Bible. Ezi ịmụmụ ọnụ ọchị na-ekpo ọkụ pụrụ ime ka ahụ ruo onye nwe ụlọ ala ma nye ohere maka nkwurịta okwu dị mma. Obi eziokwu na ezi àgwà anyị kwesịkwara ịpụta ìhè n’okwu na n’omume anyị, bụ́ ndị na-agụnye anyị iji nkwanye ùgwù gee ntị n’echiche onye nwe ụlọ.
4 Nzube anyị bụ isoro ndị ọzọ kerịta olileanya Bible. N’iburu nke a n’uche, anyị kwesịrị ijide n’aka na mkparịta ụka anyị dị ụtọ, ọ bụghị iyi nke onye iro ma ọ bụ nke na-ama aka. Ọ dịghị mkpa igbu oge na-esoro onye o doro anya na ọ na-emegide emegide na-arụ ụka. (2 Tim. 2:23-25) Anyị pụrụ ịhọrọ site n’ụdị dị iche iche nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a na-enye anyị n’Ozi Alaeze Anyị na n’akwụkwọ Reasoning. Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ịkwadebe ndị a nke ọma ka anyị wee nwee ike ikwu okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ, nke na-eme ka mmadụ kwenye.—1 Pita 3:15.
5 Mgbe nleta anyị gasịrị, ndị nwe ụlọ ole na ole na-enwe ike icheta kpọmkwem ihe anyị kwuru. Otú ọ dị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile pụrụ icheta ụzọ e si kwuo ya. Anyị ekwesịghị ileda ikike nke ịdị mma na obi ọma anya. N’ezie e nwere ọtụtụ ndị yiri atụrụ n’ókèala anyị, bụ́ ndị ga-ege eziokwu ahụ ntị dị nnọọ ka Lidia mere na narị afọ mbụ ahụ. Iji nlezianya chebara ọdịdị anyị na ụzọ anyị si ekwu okwu echiche pụrụ ịgba ndị nwere obi eziokwu ume ige Okwu Chineke ntị ma nakwere ya n’ụzọ dị mma.—Mak 4:20.