Nzukọ Ije Ozi Maka June
Izu Na-amalite June 3
Abụ 181 (144)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi kwa ọnwa maka ma mba ma ọgbakọ unu.
15 min: “Ṅomienụ Okwukwe Ha.” Ajụjụ na azịza. Tụleghachi ihe àmà nke okwukwe, ndị a tụlezuru na peji nke 13 n’Ụlọ Nche nke September 15, 1991. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ iji chọpụta ihe nyewooro ha aka ịnọgide na-arụ ọrụ Alaeze ha ruo ọtụtụ afọ.
20 min: “Ịgbasa Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.” (Paragraf nke 1-3) Tụlezuo paragraf 1. (Tinye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996, peji nke 12-13, paragraf nke 11-12.) Kọwaa na e mere nhazi ọhụrụ ahụ dị na peji ikpeazụ nke Ozi Alaeze Anyị iji nyere anyị aka ịkwadebe n’ụzọ ka mma ịgbasochi ọbịbịa ndị mbụ anya. Ebe ọ bụ na ọ na-abụkarị ihe amamihe ime nletaghachi n’ime otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, kama icherekwu, anyị ga-atụle iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha maka ma ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma nletaghachi n’otu Nzukọ Ije Ozi ahụ. Tụlee ná mkpirikpi paragraf nke 2 na 3, na-ejikwa ihe ngosi nke ọ bụla na-esochi. A ga-atụlezu ụfọ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị n’isiokwu ahụ ná Nzukọ Ije Ozi abụọ ndị ga-esochi.
Abụ 143 (192) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 10
Abụ 63 (32)
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
8 min: Inye Ụmụaka Ọzụzụ n’Ozi Ubi. Okwu okenye ga-ekwu. Site na nwata, ụmụ anyị kwesịrị ịdị irè n’ozi dị ka anyị. Ọzụzụ na ahụmahụ ha na-enweta ga-abụ ihe ndabere siri ike maka okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi ha n’afọ ndị dị n’ihu. Ọ dị mkpa ka ha ghọta mkpa ọ dị iwere ozi ahụ dị ka ihe di oké mkpa ma duzie onwe ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ụmụaka aghaghị izere àgwà aghara; oge ozi abụghị oge igwuri egwu. Ọ kasị mma ka ha soro ndị meworo okenye na-arụkọ ọrụ. E kwesịrị inyere ha aka ikere òkè n’iche ihe n’ihu mmadụ dị ka ikike ha si dị. (Lee Ụlọ Nche nke August 1, 1988, peji nke 15, paragraf nke 20.) Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị nne na nna inye nlekọta; ha ekwesịghị iziga ụmụaka ná nzukọ maka ije ozi n’enweghị onye metụworo okenye nke ga-elekọta ha. Jaa ụmụaka mma mgbe ha mere nke ọma.
10 min: “Ịgbasa Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.” (Paragraf nke 4-5) Mgbe okwu mmalite dị mkpirikpi gasịrị, mee ihe ngosi maka ọbịbịa nke mbụ na nletaghachi dị na paragraf nke 4 na 5. Gbaa ndị nkwusa ume isochi ntinye nile nke akwụkwọ Ihe Ọmụma n’egbughị oge.
20 min: “Otú E Si Eji Akwụkwọ Ihe Ọmụma Eme Ndị Na-eso Ụzọ.” Kwuo okwu mmeghe dị mkpirikpi na-adabere na paragraf nke 1-2. Jiri ajụjụ na azịza tụlezuo paragraf nke 3-11. Kọwaa na a ga-atụle ụfọ nke ihe ntinye ahụ ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa July na August. Gbaa mmadụ nile ume ichekwa ya.
Abụ 92 (126) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 17
Abụ 157 (221)
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
12 min: “Mkparịta Ụka Enyi na Enyi Pụrụ Iru n’Obi.” Ajụjụ na azịza. Kpọọ otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ịkọ ahụmahụ na-agba ume na-egosi otú ha siri nweta ezi nzaghachi site n’ụzọ enyi na enyi.
13 min: “Ịgbasa Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.” (Paragraf nke 6-7) Mesie ike ihe mgbaru ọsọ ndị dị n’ime nletaghachi: Zụlite mmasị, malite ọmụmụ ihe, mee ndokwa doro anya ịbịaghachi. Mgbe ị tụlesịrị ná mkpirikpi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 6 na 7, mee ihe ngosi nke ọ bụla, na-egosi otú e si amalite ọmụmụ ihe. Gụpụta paragraf nke 17 na peji nke 13 n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996.
13 min: “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka E Gee M Ntị?” Ajụjụ na azịza. Mee ka ndị nkwusa abụọ kparịta otú ha ga-esi gosipụta ikpo ọkụ ka ukwuu mgbe ha na-ekwu okwu n’ọnụ ụzọ, na-eji ụfọdụ n’ime aro ndị a tụrụ n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 170-171, paragraf nke 10-21.
Abụ 211 (68) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 24
Abụ 6 (126)
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwapụta ndokwa ozi ubi maka ngwụsị izu.
18 min: Mkpa ọgbakọ. (Ma ọ bụ kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ,” na-adabere n’Ụlọ Nche nke January 1, 1996, peji nke 29-31.)
20 min: “Nyere Ha Aka Ije Ozi Ọzọ.” Okwu na ntụle nke okenye ga-eme. Tụọ aro iji isiokwu bụ́ “Laghachikwutenụ M, Mụ Onwe M Ga-alaghachikwutekwa Unu,” n’Ụlọ Nche nke August 1, 1992, iji gbaa ndị na-adịghị ejekwa ozi ume. Kwupụta ụfọdụ n’ime ihe ndị bụ isi.
Abụ 71 (156) na ekpere mmechi.