Inyocha Akụkụ Dị Iche Iche nke Nkume Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Chineke—Bible!
NA 1867, otu onye South Africa na-arụ ọrụ ugbo aha ya bụ Schalk van Niekerk nọ na-ekiri ụmụntakịrị ji nkume ụfọdụ na-egwurị egwu. Ọ hụtara otu nkume mara nnọọ mma nke na-egbuke egbuke. Nne ụmụntakịrị ahụ kwuru, sị, “Ị pụrụ iwere ya, ma ọ bụrụ na ọ masịrị gị.” Ma, van Niekerk zijeere otu onye ọkà n’ihe banyere nkume ndị dị oké ọnụ ahịa nkume ahụ ka o nyochaa ya. Ụmụaka ahụ amataghị na ihe ha ji na-egwurị egwu bụ nkume diamond buru ibu nke ọnụ ahịa ya ruru £500!
Ọ̀ pụrụ ịbụ na gị onwe gị nwekwara nkume dị oké ọnụ ahịa n’amataghị ya? Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nwere Bible, dịkwa ka ọ bụ akwụkwọ a kasị kesaa mgbe nile, nke e nwere n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị 1,900 asụsụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ agụbeghị Bible, n’ihi nke a kwa, ha amaghị banyere ihe ndị dị n’ime ya.
Bible na-ekwu na ọ bụ “ihe si n’obi Chineke pụta,” n’ihi nke a, ọ bụ Okwu Chineke. (2 Timoti 3:16; tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.) Ọ bụ ihe kasị dịrị oké ọnụ ahịa ihe a kpọrọ mmadụ nwere. Site na ya, anyị na-amụta ụzọ anyị pụrụ isi nweta ihe kachasị mma ná ndụ anyị na-adị ugbu a, nke dịkwa mkpa karị, ụzọ anyị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi! (Jọn 17:3, 17) Ọ̀ dị ihe pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa karịa nke ahụ?
Otú ọ dị, iji mata uru nke nkume nke a dị oké ọnụ ahịa na akụkụ ya nile, mmadụ aghaghi ịmara ya nke ọma. N’ile ya anya na nke mbụ, nke a pụrụ iyi ihe siri nnọọ ike. E kwuwerị, Bible bụ nchịkọta nke 66 akwụkwọ dị iche iche. Gịnị dị n’ime akwụkwọ ndị a? È nwere ihe kpatara ha ji nọrọ n’usoro dị ka e si ahụ ha? Ya bụrụ otú ahụ, olee ụzọ mmadụ pụrụ isi chọta akụkụ ndị pụrụ iche n’ime Bible?
Ịmata Bible nke ọma bụ ihe ịma aka. Ma dị ka ezi nkume dị oké ọnụ ahịa, Bible dị n’ụzọ a haziri ahazi, dịkwa n’usoro. Anyị pụrụ ịhụ nke ahụ ma ọ bụrụ na anyị atụlee ná mkpirikpi ihe ndị dị n’ime ya.
Akwụkwọ Nsọ Hibru —Na-ezo Aka n’Ebe Kraịst Nọ
N’ụzọ bụ isi, e kewara Bible gaa n’akụkụ abụọ bụ “Agba Ochie” na “Agba Ọhụrụ.” Ma, ndị a bụ mkpọhie aha, na-enye echiche nke bụ na “Agba Ochie” ahụ bụ nke oge ya gabigaworo, nke na-abachaghịkwa uru. Aha kwesịrị ekwesị karị maka akụkụ ahụ nke Akwụkwọ nsọ ga-abụ Akwụkwọ nsọ Hibru, ebe ọ bụ na asụsụ mbụ e ji dee akụkụ nke a bụ Hibru n’ụzọ bụ isi. E dere “Agba Ọhụrụ” ahụ n’asụsụ Grik n’ime narị afọ mbụ O.A.; n’ihi ya, a na-akpọ ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị karị, Akwụkwọ nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
Akwụkwọ mbụ nke Bible, bụ́ Jenesis, malitere ịkọ ihe mere n’ogologo oge gara aga mgbe Chineke kere eluigwe na ala, mesịakwa malite ịkwadebe ala maka mmadụ ibi na ya. E kere mmadụ abụọ mbụ ahụ dị ka ndị zuru okè; otú ọ dị, ha họọrọ ụzọ nke mmehie, bụ́ nke rụpụtaara ụmụ ha oké ọdachi. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka nkume dị oké ọnụ ahịa a hụrụ n’ebe ìhè na-adịghị nke ukwuu, Bible na-enye mgbukepụ nke olileanya nye ihe a kpọrọ mmadụ daworo ada: otu “mkpụrụ” nke ga-emesịa mebie mmetụta nile nke mmehie na ọnwụ. (Jenesis 3:15) Ònye ka Mkpụrụ nke a ga-abụ? Jenesis malitere ịgbaso osuso ọmụmụ nke Mkpụrụ nke a na-abịanụ, na-elekwasị anya ná ndụ nke ụfọdụ n’ime ndị nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi nke Mkpụrụ ahụ, ndị dị ka Abraham, Aịsak, na Jekọb.
N’ịga n’ihu, Ọpụpụ kọwara ọmụmụ nke Mosis. N’ụzọ dị iche iche, ndụ Mosis sere onyinyo ndụ nke Mkpụrụ ahụ na-abịanụ. Mgbe ihe otiti iri gasịrị, Israel mere Ọpụpụ dị ebube site n’Ijipt, e wee guzobekwa ha dị ka mba nke Chineke họpụtara n’Ugwu Saịnaị. Levitikọs setịpụrụ ụkpụrụ nile nke Chineke maka usoro ndị nchụaja nke ebo Livaị n’Israel. Ọnụ Ọgụgụ na-akọ banyere oge mgbe a gụrụ ndị Israel ọnụ (site n’ịgụ ha ọnụ n’otu n’otu) nakwa ihe ndị mere n’oge Israel nọ na njem n’ime ọzara. Ugbu a kwa, n’ịdị njikere ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Israel natara ndụmọdụ ikpeazụ nke Mosis. Nke a bụ isiokwu nke Deuterọnọmi. N’izo aka ná Mkpụrụ ahụ nke na-abịanụ, Mosis gbara mba ahụ ume ka ha gee ntị n’olu ‘onye amụma nke Chineke ga-ewelite.’—Deuterọnọmi 18:15.
Akwụkwọ ndị kọrọ akụkọ ihe mere eme sochiri. N’akụkụ ka ukwuu, e doro ndị a n’ọnọdụ ihe ndị a kọrọ n’ime ha ji mee. Joshua kọwara mmeri na nkewasị nke Ala Nkwa ahụ. Ndị Ikpe kọrọ oké ihe omume ndị mere n’afọ ndị ahụ sochirinụ mgbe e nwere usoro ndị ikpe chịrị achị n’Israel. Rut kọrọ banyere otu nwanyị na-atụ egwu Chineke, onye dịrị ndụ n’oge Ndị Ikpe ahụ, onye nwekwara ihe ùgwù nke ịghọ otu n’ime ndị Jisọs Kraịst sitere n’usoro ọmụmụ ha.
Otú ọ dị, oge ọchịchị nke ndị ikpe bịaruru ná njedebe. Samuel Nke Mbụ kọrọ banyere ọchịchị ahụ wetara oké ọdachi nke eze mbụ nke Israel, bụ́ Sọl, dị ka Samuel onye amụma si hụ ya. Samuel Nke Abụọ kọwara ọchịchị gara nke ọma nke Devid, bụ́ onye nọchiri anya Sọl. Ndị Eze Nke Mbụ na Ndị Eze Nke Abụọ duruziri anyị site n’oge ọchịchị dị ebube nke Solomọn garuo ná ndọrọ ahụ dị mwute a dọọrọ mba Israel n’agha laa Babilọn na 607 T.O.A. Ihe Emere Nke Mbụ na Nke Abụọ kọghachiri akụkọ ihe mere eme nke a dị ka e si hụ ya site n’ọnọdụ nke mba ahụ si ná ndọta n’agha lọghachi. N’ikpeazụ, Ezra, Nehemaịa, na Esta kọwara otú e si kpọghachite ndị Israel ahụ n’ala nke aka ha nakwa akụkụ ụfọdụ nke akụkọ ihe mere eme ha ndị sochirinụ.
Ndị sochirinụ bụ akwụkwọ ndị ahụ e dere n’ụdị abụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime abụ ndị kasị maa mma e detụworo mgbe ọ bụla dị n’ime ha. Job na-enye ihe ngosi na-akpali akpali nke ịnọgidesi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ịta ahụhụ ya na nkwụghachi ụgwọ na-esi na ya apụta. Akwụkwọ Abụ Ọma nwere n’ime ya abụ ndị e ji eto Jehova na ekpere dị iche iche maka obi ebere na enyemaka. Ndị a abụworo ọtụtụ ndị ohu Chineke a na-apụghị ịgụta ọnụ ihe nkasi obi. Tụkwasị na nke a, Abụ Ọma nwere ọtụtụ amụma ndị mere ka anyị nwekwuo nghọta banyere Mesaịa ahụ nke na-abịanụ. Ilu na Eklisiastis na-ekpughe akụkụ dị iche iche nke amamihe Chineke site n’okwu dị iche iche dị mkpirikpi, ebe Abụ Nke Abụ bụ abụ ịhụnanya magburu onwe ya nke nwere nghọta dị omimi n’ụzọ amụma.
Akwụkwọ 17 ndị sochirinụ—site n’Aịsaịa ruo Malakaị—bụkarịrị ndị metụtara amụma. Ha nile, e wezụga Abụ Akwa bu aha nke onye dere ha. Ọtụtụ n’ime amụma ndị a enwewo mmezu pụtara ìhè. Ha na-ezokwa aka n’oké ihe omume ndị na-eme n’oge anyị a nakwa ndị ga-eme n’ọdịnihu dị nso.
Otú a, Akwụkwọ nsọ Hibru dị n’ụdị dị iche iche n’ihe banyere otú e si dee ha na ụkpụrụ a gbasoro n’ide ha. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha nile nwere otu isiokwu. Amụma ha nile, ngụkọ usoro ọmụmụ nile, na oké ihe omume ndị ahụ jupụtara n’ezi amamihe na nghọta nke amụma.
Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst —Mkpụrụ ahụ Apụta
Puku afọ anọ agabigawo eri mgbe mmadụ dabara ná mmehie. Na mberede, Mkpụrụ ahụ nke a nọworo na-eche ruo ogologo oge pụtara n’elu ala, bụ́ Mesaịa ahụ, Jisọs! Akwụkwọ nsọ Grik nke Ndị Kraịst dekọrọ akụkọ ije ozi nke onye nke a a ma ama n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ n’akwụkwọ anọ dị iche iche ma bụrụ ndị mezurịtara ibe ha, bụ́ ndị a na-akpọ Oziọma ndị ahụ. Ndị a bụ Matiu, Mak, Luk na Jọn.
Lee nnọọ ka ihe ndekọ Oziọma anọ ndị a si bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa nye ndị Kraịst! Ha na-akọ banyere ọrụ ebube ndị ahụ dị ịtụnanya Jisọs rụrụ, ilu ya ndị nwere ezi ihe mmụta dị n’ime ha, Ozizi Elu Ugwu ya, ihe nlereanya nke obi umeala ya, ọmịiko ya na nrubeisi na-enweghị ntụpọ nye Nna ya, ịhụnanya ọ hụrụ “atụrụ” ya, nakwa n’ikpeazụ ọnwụ ọchụchụ àjà na mbilite n’ọnwụ ya dị ebube. Ọmụmụ ihe n’Oziọma ndị ahụ na-ewulite n’ime anyị ịhụnanya dị omimi maka Ọkpara Chineke ahụ. Karịsịa ihe nile, a na-adọrọ anyị bịa n’ebe onye ahụ nke zitere Kraịst nọ—Jehova Chineke. Ihe ndekọ ndị ahụ kwesịrị ka a gụọ ha ugboro ugboro.
Orụ Ndị Ozi na-amalite n’ebe Oziọma ndị ahụ kwụsịrị. Ọ kọghachiri akụkọ banyere afọ ndị mbụ nke ọgbakọ ndị Kraịst malite n’oge Pentikọst ruo n’oge a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom na 61 O.A. N’ime akwụkwọ nke a, anyị na-agụ banyere Stifen, bụ́ onye Kraịst mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya, ntọghata nke Sọl, onye mesịrị ghọọ Pọl onyeozi, mwebata nke ndị Jentaịl mbụ a tọghatara, nakwa njem nkwusa ozi ọma Pọl ndị na-akpali akpali. Ihe ndekọ ndị a na-akpali akpali, na-ewusikwa okwukwe ike.
Ugbu a, akwụkwọ ozi 21 sochiri. Iri na anọ ndị mbụ bụ Pọl dere ha, a kpọkwasịkwara ha aha ndị Kraịst ma ọ bụ ọgbakọ ndị e degaara ha; a kpọkwasịrị ndị nke ọzọ aha ndị dere ha—Jemes, Pita, Jọn, na Jud. Lee nnọọ ndụmọdụ na agbamume dị ukwuu dị n’ime akwụkwọ ozi ndị a! Ha na-akọwa ihe banyere ozizi na mmezu nke amụma dị iche iche. Ha na-enyere ndị Kraịst aka ịnọgide bụrụ ndị nọpụrụ iche site n’ajọ gburugburu ebe ha na-aghaghị ibi. Ha na-emesi ya ike mkpa ọ dị iwulite ịhụnanya ụmụnna na àgwà ndị ọzọ nke nsọpụrụ Chineke. Ha na-esetịpụ ihe nlereanya maka ịhazi ọgbakọ nke ọma, n’okpuru nduzi nke ndị okenye ime mmụọ.
Dị ka Akwụkwọ nsọ Hibru ji okwu amụma wee mechie, otú ahụkwa ka Akwụkwọ nsọ Grik mere. Mkpughe, nke Jọn onyeozi dere n’ihe dị ka afọ 96 O.A., jikọtara amụma dị iche iche na isiokwu bụ isi nke Bible—ido aha Jehova nsọ site n’Alaeze Mesaịa ya. Usoro nke ọhụụ dị iche iche gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè mbibi nke òtù okpukpe, òtù ndị agha, na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke usoro ihe rụrụ arụ nke Setan. E ji obodo na-achị achị nke Kraịst dochie anya ndị a, bụ́ nke malitere ileba anya ná nlekọta nke ihe ndị metụtara ụwa. N’okpuru ọchịchị Alaeze nke a, Chineke kwere nkwa ‘ihichapụ anya mmiri nile ọ bụla, ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ.’—Mkpughe 21:4.
Ya mere, è nwere ihe ịrụ ụka dị na ya na Bible bụ nkume dị oké ọnụ ahịa nke na-enweghị ntụpọ, na-egosipụta ìhè nke Chineke? Ọ bụrụ na ị gụbeghị ya, gịnị mere ị maliteghị ime otú ahụ ugbu a? Ịdị n’usoro ya ga-adọta mmasị gị, ị ga-enweta nghọta site ná mgbukepụ ya, ịma mma ya ga-akpali gị, ozi dị n’ime ya ga-enyekwa gị ọṅụ. Ọ bụ n’ezie ‘onyinye zuru okè nke sitere n’aka Nna nke ìhè.’—Jemes 1:17.
[Chaatị dị na peeji nke 28, 29]
NDEPỤTA AKWỤKWỌ NDỊ DỊ NA BIBLE
Na-egosi onye dere ya, ebe a nọrọ dee ya, mgbe e dezuru ya, na ogologo oge ihe ndị e dere banyere ha n’akwụkwọ ahụ mere.
E jichaghị n’aka ihe bụ aha ndị dere ụfọdụ n’akwụkwọ ndị ahụ na ebe a nọrọ dee ha. Ọtụtụ n’ime oge ndị ahụ bụ mgbe e chere na ọ bụ, akara ahụ bụ m. pụtara “mgbe ọ gasịrị,” t. pụtara “tupu,” i. pụtakwara “ihe dị ka.”
Akwụkwọ Ndị Dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru (T.O.A.)
Akwụkwọ Onye(Ndị) Ebe E Mgbe E Mgbe E Dere
Dere Ya Dere Ya Dezuru Ya Banyere Ya
Jenesis Mosis Ọzara 1513 “Na mbụ”
ruo 1657
Ọpụpụ Mosis Ọzara 1512 1657-1512
Levitikọs Mosis Ọzara 1512 1 ọnwa (1512)
Ọnụ Ọgụgụ Mosis Ọzara/Ọzara 1473 1512-1473
nke Moab
Deuterọnọmi Mosis Ọzara nke 1473 2 ọnwa
(1473)
Moab
Joshua Joshua Kenean i. 1450 1473-i. 1450
Ndị Ikpe Samuel Israel i. 1100 i. 1450-
i. 1120
Rut Samuel Israel i. 1090 Afọ 11 nke
ọchịchị
ndị ikpe
1 Samuel Samuel; Israel i. 1078 i. 1180-1078
Gad; Netan
2 Samuel Gad; Netan Israel i. 1040 1077-i.
1040
1 Ndị Eze Jeremaịa Jerusalem/ 580 i. 1040-911
Juda
2 Ndị Eze Jeremaịa Jerusalem/ 580 i. 920-580
Ijipt
1 Ihe Emere Ezra Jerusalem (?) i. 460 Mgbe e
desịrị 1 Ihe
Emere 9:44,
1077-1037
2 Ihe Emere Ezra Jerusalem (?) i. 460 1037-537
Ezra Ezra Jerusalem i. 460 537-i. 467
Nehemaịa Nehemaịa Jerusalem m. 443 456-m. 443
Esta Mọdekaị Shushan, Ilam i. 475 493-i. 475
Job Mosis Ọzara i. 1473 Ihe karịrị
140 afọ
n’agbata 1657
na 1473
Abụ Ọma Devid na i. 460
ndị ọzọ
Ilu Solomọn; Jerusalem i. 717
Agua; Lemuel
Eklisiastis Solomọn Jerusalem t. 1000
Abụ nke Abụ Solomọn Jerusalem i. 1020
Aịsaịa Aịsaịa Jerusalem m. 732 i. 778-m. 732
Jeremaịa Jeremaịa Juda/Ijipt 580 647-580
Abụ Akwa Jeremaịa Nso Jerusalem 607
Ezikiel Ezikiel Babilọn i. 591 613-i. 591
Daniel Daniel Babilọn i. 536 618-i. 536
Hosea Hosea Sameria m. 745 t. 804-m. 745
(Gburugburu)
Joel Joel Juda i. 820 (?)
Emọs Emọs Juda i. 804
Obadaịa Obadaịa i. 607
Jona Jona i. 844
Maịka Maịka Juda t. 717 i. 777-717
Nehum Nehum Juda t. 632
Habakuk Habakuk Juda i. 628 (?)
Zefanaịa Zefanaịa Juda t. 648
Hegaị Hegaị Jerusalem 520 112 ụbọchị
(520)
Zekaraịa Zekaraịa Jerusalem 518 520-518
Malakaị Malakaị Jerusalem m. 443
Akwụkwọ Ndị Dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (O.A.)
Akwụkwọ Onye Ebe E Mgbe E Mgbe E Dere
Dere Ya Dere Ya Dezuru Ya Banyere Ya
Matiu Matiu Palestine i. 41 2 T.O.A.
–33 O.A.
Mak Mak Rom i. 60-65 29-33 O.A.
Luk Luk Sizaria i. 56-58 3 T.O.A.
–33 O.A.
Jọn Jọn Onyeozi Efesọs, ma ọ bụ i. 98 Mgbe okwu
n’ebe dị nso mmeghe gasịrị,
29-33 O.A.
Ọrụ Luk Rom i. 61 33-i. 61 O.A.
Ndị Rom Pọl Kọrint i. 56
1 Ndị Kọrint Pọl Efesọs i. 55
2 Ndị Kọrint Pọl Masedonia i. 55
Ndị Galetia Pọl Kọrint ma ọ bụ i. 50-52
Antiọk nke Siria
Ndị Efesọs Pọl Rom i. 60-61
Ndị Filipaị Pọl Rom i. 60-61
Ndị Kọlọsi Pọl Rom i. 60-61
1 Ndị Pọl Kọrint i. 50
Tesalọnaịka
2 Ndị Pọl Kọrint i. 51
Tesalọnaịka
1 Timoti Pọl Masedonia i. 61-64
2 Timoti Pọl Rom i. 65
Taịtọs Pọl Masedonia (?) i. 61-64
Faịlimọn Pọl Rom i. 60-61
Ndị Hibru Pọl Rom i. 61
Jemes Jemes Jerusalem t. 62
(nwanne
Jisọs)
1 Pita Pita Babilọn i. 62-64
2 Pita Pita Babilọn (?) i. 64
1 Jọn Jọn Onyeozi Efesọs, ma ọ i. 98
bụ ebe dị nso
2 Jọn Jọn Onyeozi Efesọs, ma ọ i. 98
bụ ebe dị nso
3 Jọn Jọn Onyeozi Efesọs, ma ọ i. 98
bụ ebe dị nso
Jud Jud (nwanne Palestine (?) i. 65
Jisọs)
Mkpughe Jọn Onyeozi Patmọs i. 96