Nweta Obi Aṅụrị n’Ịmụ Akwụkwọ Bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
1 Otu ihe na-akpali akpali banyere Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” bụ mwepụta e wepụtara akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? N’oge na-adịghị anya, anyị ga-eji akwụkwọ a na-eme ihe mgbe nile n’ozi ubi, karịsịa n’oge anyị na-eduzi ọmụmụ Bible. N’ihi nke a, anyị kwesịrị ịma ihe dị n’ime akwụkwọ ọhụrụ a nke ọma. Nke a ga-ekwe omume n’ihi na anyị ga-amụ ya n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ malite n’izu nke April 17, 2006.
2 Onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ga-agụpụta ajụjụ ndị e dere ná mmalite nke isiakwụkwọ nke ọ bụla. A ga-ejizi ajụjụ ndị dị n’ala ala peeji duzie ihe ọmụmụ ahụ. A ga-agụ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi. A ga-eji igbe bụ́ “Ihe Ndị Bible Na-akụzi,” bụ́ ndị dị ná ngwụsị isiakwụkwọ nke ọ bụla, tụleghachi ihe ndị a mụrụ n’isiakwụkwọ ahụ n’ihi na ihe ndị dị n’igbe ahụ bụ azịza ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nye ajụjụ ndị dị ná mmalite nke isiakwụkwọ ahụ. Ọ ga na-atọ gị ụtọ ịza ajụjụ n’ihi na akwụkwọ a kọwara isiokwu dị iche iche n’ụzọ doro anya, dị mfe, ma na-adọrọ mmasị.
3 Ihe odide ntụkwasị nke dị n’akwụkwọ a na-akọwa isiokwu dị iche iche n’ụzọ zuru ezu. Anyị ga-eji ihe odide ntụkwasị a mee ihe mgbe onye anyị na-amụrụ Bible chọrọ inwetakwu ihe ọmụma banyere isiokwu ụfọdụ. Mgbe ụfọdụ, a ga-atụle akụkụ ụfọdụ nke ihe odide ntụkwasị ahụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Onye e kenyere ịgụ ihe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ga-agụpụta ihe odide ntụkwasị nile metụtara isiokwu ahụ, a pụkwara ịtụle akụkụ ndị totụrụ ogologo ná nkebi ná nkebi. E nweghị ebe e depụtara ajụjụ maka ihe odide ntụkwasị ahụ. Ma, onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ pụrụ ịjụ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị ga-eme ka isi ihe ndị dị na ya pụta ìhè.
4 N’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, a ga-amụchapụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ngwa ngwa. A dịghị atụ anya na anyị ga-amụchapụkwa ya ngwa ngwa otú ahụ mgbe anyị ji ya eduziri ndị ọzọ ọmụmụ ihe, karịsịa ma ọ bụrụ na ha amachaghị Bible ma ọ bụ na ha amatụghịdị ya ama. (Ọrụ 26:28, 29) Mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, ọ ga-adị mkpa ka anyị kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’akwụkwọ a nke ọma, kọwaakwa ihe atụ ndị dị na ya nke ọma, na ihe ndị ọzọ. Ya mere, mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwa izu ma kere òkè zuru ezu mgbe anyị na-amụ akwụkwọ a bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?