Akwụkwọ Bible Na-akụzi—Akwụkwọ Bụ́ Isi Anyị Ga-eji Na-eduzi Ọmụmụ Bible
1 Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ mwepụta e wepụtara akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ná Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi”! Obi dị ndị bịara mgbakọ ahụ ụtọ inweta akwụkwọ ahụ mgbe e mechisịrị usoro ihe omume nke ụbọchị Saturday. Olee otú a ga-esi na-eji akwụkwọ ọhụrụ a eme ihe? E mere ya ka ọ bụrụ akwụkwọ bụ́ isi anyị ga-eji na-eduzi ọmụmụ Bible. Ọ bụ ezie na a ga-ebu ụzọ jiri ya jee ozi n’ọnwa March, a na-agba ndị nkwusa ume ịmalite ozugbo iji ya amalite ma na-eduzi ọmụmụ Bible.
2 Ọmụmụ Bible Ndị A Na-eduzi Ugbu A: Ndị nkwusa bụ́ ndị ji akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ eduzi ọmụmụ Bible kwesịrị iji echiche ha mee ihe mgbe ha na-ekpebi otú ha ga-esi malite iji akwụkwọ ọhụrụ a duziwe ọmụmụ Bible nakwa mgbe ha ga-amalite ya. Ọ bụrụ na o tebeghị aka ị malitere iji akwụkwọ Ihe Ọmụma na-eduziri mmadụ ọmụmụ Bible, ị pụrụ ịmalite ọmụmụ ihe ahụ n’isi site n’iji akwụkwọ ọhụrụ a mee ihe. Ọ bụrụ na unu amụmiela akwụkwọ Ihe Ọmụma, unu nwere ike ịbanye n’akwụkwọ Bible Na-akụzi site n’ịmalite n’isiokwu kwekọrọ n’isiokwu unu kwesịrị ibido ma a sị na ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma ka unu ka ga na-amụ. Ọ bụrụ na ọ fọrọ nnọọ obere ka unu mụchaa akwụkwọ Ihe Ọmụma, unu pụrụ ikpebi ịmụchapụ akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ.
3 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị nile maara ọtụtụ ndị ga-erite uru site n’ịmụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ọ́ gaghị adị mma ịgwa onye nke ọ bụla n’ime ha ka i jiri akwụkwọ a ji nwayọọ nwayọọ akọwa Bible, duziwere ha ọmụmụ Bible? Dị ka ihe atụ, ndị mụrụla broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ya abụrụ na ha emebeghị nraranye na baptizim, pụrụ ịchọ ka e jiri akwụkwọ ọhụrụ a maliteghachi iduziri ha ọmụmụ ihe. Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ikpebi iji akwụkwọ ọhụrụ a na-eme ihe mgbe ha na-akụnye ezi ihe ọmụma nke uche Chineke n’ime obi ụmụ ha.—Kọl. 1:9, 10.
4 Ịmụ Akwụkwọ nke Abụọ: Onye a na-eduziri ọmụmụ Bible ọ̀ pụrụ ịmụ akwụkwọ ọzọ ma ọ mụsịa Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ee. Ọ bụrụ na o doro anya na onye a na-eduziri ọmụmụ Bible na-enwe ọganihu, ọ bụ ezie na o ji nwayọọ nwayọọ na-enwe ya, ya abụrụkwa na ihe ndị ọ na-amụta na-atọ ya ụtọ, a pụrụ iji akwụkwọ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe gaa n’ihu n’ihe ọmụmụ ahụ. Obi siri anyị ike na akwụkwọ Bible Na-akụzi ga-abụ ngwá ọrụ bụ́ ọkpọka anyị ga-eji na-arụ ọrụ e nyere anyị nke bụ́ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Mat. 28:19, 20.