Akụkụ nke 1: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Gịnị Bụ Ọmụmụ Bible?
1 N’ụwa nile, ndị Chineke na-eduzi ihe dị ka nde ọmụmụ Bible isii kwa ọnwa. Site n’iji ụzọ izi ihe ndị dị mma eme ihe, anyị pụrụ inyere ndị a a na-amụrụ Bible aka inwe ọganihu ruo n’ókè nke ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim, ha abụrụkwa ‘ndị ruru eru nke ọma ịkụziri ndị ọzọ ihe.’ (2 Tim. 2:2) Ị̀ ga-achọ inyere onye ị na-amụrụ ihe aka inwe ọganihu dị otú ahụ? Malite ná mbipụta nke a, Ozi Alaeze Anyị ga na-ebu usoro isiokwu dị iche iche, bụ́ ndị ga-akọwa akụkụ ndị bụ́ isi nke iduzi ọmụmụ Bible na-aga n’ihu.
2 Mgbe E Kwesịrị Ịgụrụ Ọmụmụ Bible: Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-eji Bible na otu n’ime akwụkwọ ndị a tụrụ aro ha na-enwechi nkwurịta okwu Bible anya n’ụzọ dị n’usoro, a sịgodị na ọ bụ ná mkpirikpi oge, ị na-eduzi ọmụmụ Bible. Otú a ka ọ dị ọbụna ma a sị na a na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ n’ọnụ ụzọ mmadụ ma ọ bụ na telifon. A pụrụ ịgụrụ ọmụmụ ihe ahụ mgbe e duziworo ya ugboro abụọ malite na nke mbụ e ji gosi otú e si amụ ihe, nakwa ma ọ bụrụ na o yie ka ọmụmụ ihe ahụ ọ̀ ga-aga n’ihu.
3 Broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma bụ akwụkwọ ndị a na-eji eduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible. Mgbe a mụsịrị ha, ọ bụrụ na o doro anya na onye ahụ na-enwe ọganihu, a sịgodị na ọganihu ya adịghị ngwa, nakwa na ọ na-enwe ekele maka ihe ọ na-amụta, a pụziri iji akwụkwọ bụ́ Fee Chineke Ofufe gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ. A pụrụ iji broshuọ bụ́ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! duziere ndị na-amachaghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-amachaghị agụ akwụkwọ ọmụmụ ihe.
4 Ọrụ iduzi ọmụmụ Bible abawo uru n’inyere ọtụtụ nde mmadụ aka ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. (Mat. 28:19, 20) Site n’itinye aro ndị a ga-atụ n’isiokwu ndị na-abịanụ n’usoro isiokwu a n’ọrụ, ị pụrụ iduzi ọmụmụ Bible na-aga n’ihu.