Ị̀ Na-eji Broshuọ Na-achọ Amalitere Mmadụ Ọmụmụ Ihe?
1 Ị̀ maara na ọ bụrụ na i soro onye nwere mmasị na-atụlechi Bible anya n’ụzọ dị n’usoro, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ na-adị nkenke, ma na-atụle ihe dị n’otu n’ime mbipụta ndị a tụrụ aro ha, ị na-eduzi ọmụmụ Bible? Ee, nke ahụ bụ eziokwu ọbụna ma ọ bụrụ na a na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ na telifon. Gịnị ma i tinye mgbalị pụrụ iche na May na June iji malite ọmụmụ ihe dị otú ahụ na-eji broshuọ Na-achọ?
2 Kwadebe Iji Nwee Ihe Ịga nke Ọma: Mgbe ị na-enyefe broshuọ Na-achọ, buru nnọọ ihe ị chọrọ ịtụle n’uche. Ọ bụrụ na ị na-eme nletaghachi, chee banyere mkparịta ụka unu nwere mgbe mbụ ị kpọtụụrụ onye ahụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee paragraf ndị dị na broshuọ ahụ m pụrụ ilebara anya n’ụzọ pụrụ iche iji mee ka nkwurịta okwu ahụ gakwuo n’ihu ma duga n’ọmụmụ Bible?’ Ọ bụrụ na ị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, tụlee isiokwu ndị ga-amasị onye nọ n’afọ iri na ụma, onye meworo okenye karị, nwoke, ma ọ bụ nwanyị. Tụlee isiokwu ndị bụ́ isi dị na broshuọ ahụ, ma họrọ otu isiokwu na-adọrọ mmasị. Mgbe i kpebisịrị ụzọ ị ga-esi jiri ya mee ihe, mụgharịa ya ọtụtụ ugboro. Nke a bụ otu n’ime isi ihe ndị na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma.
3 Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002 nwere “Aro [asatọ] Dị Iche Iche Maka Iche Broshuọ Na-achọ n’Ihu Mmadụ.” Igbe bụ́ “Ịkpọ Okwu Aha” na-egosi ụzọ isi jiri broshuọ ahụ malite ọmụmụ ihe. Ị pụrụ ikwu aro nke mbụ ahụ otú a:
◼ “Ị̀ maara na ị pụrụ inweta azịza nye otu ajụjụ dị mkpa sitere na Bible nanị n’ime minit ole na ole? Dị ka ihe atụ, n’ihi gịnị ka e ji nwee nnọọ ọtụtụ okpukpe ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst? Ì chetụwo echiche banyere nke ahụ?” Mgbe onye ahụ zaghachisịrị, sapeta ihe ọmụmụ nke 13 ma tụlee paragraf abụọ mbụ ndị ahụ. Ruo ókè oge nyere ohere ya, gụọ ma tụlee otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ. Mgbe ahụ gụọ ajụjụ nke ikpeazụ dị n’elu peeji ahụ, kwuokwa, sị: “Akụkụ ndị ọzọ nke ihe ọmụmụ a na-eme ka ihe ise e ji amata ezi okpukpe pụta ìhè. Obi ga-adị m ụtọ ịbịaghachi ma soro gị tụlee ya.”
4 Nọgidesie Ike: Jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji gosi otú e si eji broshuọ Na-achọ eduzi ọmụmụ Bible. Rịọ maka ngọzi Jehova. (Mat. 21:22) Site n’ịnọgidesi ike na-etinye mgbalị, ị pụrụ inweta ọṅụ na-abịa site n’inyere mmadụ aka ịnabata ozi ọma ahụ!