Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/02 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite May 13
  • Izu Na-amalite May 20
  • Izu Na-amalite May 27
  • Izu Na-amalite June 3
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 5/02 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite May 13

Abụ nke 37

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi dị iche iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 15 na Teta! nke June 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke June 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. Na nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi merie ihe na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Eji m ọrụ n’aka.”—Lee Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11.

15 min: “Gịnị Ka Anyị Ga-amụta Site na Ha?”a Nyere mmadụ nile aka ịghọta mkpa ọ dị ịtụkwasị Jehova obi n’oge ihe isi ike.

15 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi’ nke Ndịàmà Jehova nke 2002.”b Ntụle nke paragraf nke 1-9 bụ́ nke odeakwụkwọ ga-eme. Mgbe ị na-atụle paragraf nke 3, kwuo obodo e kenyere ọgbakọ unu ịga mgbakọ na oge ọ ga-abụ.

Abụ nke 219 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 20

Abụ nke 13

9 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

18 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi’ nke Ndịàmà Jehova nke 2002.”c Ntụle nke paragraf nke 10-19 bụ́ nke okenye ga-eme. Nyere onye ọ bụla aka ịghọta ihe mere o ji dị mkpa ịkpachara anya banyere àgwà anyị na-akpa n’ihu ọha.

18 min: “Ị̀ Bụ Onye Kraịst ‘Tozuru Okè’”? Okwu okenye ga-ekwu bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke August 15, 2000, peeji nke 26-29.

Abụ nke 169 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 27

Abụ nke 208

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka May. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ka onye nkwusa meworo okenye mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke June 1, meekwa ka onye nkwusa na-eto eto gosi ụzọ isi chee ihe n’ihu mmadụ na-eji ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ sitere na Teta! nke June 8. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, kwuo otú a pụrụ isi webata akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ihe ngosi ahụ n’ụzọ dị mfe.

15 min: “Ọgbakọ Unu Ò Nwere Ókèala Buru Ibu?” Mkparịta ụka na okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee bụ́ nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. (Ọgbakọ ndị na-enweghị ókèala buru ibu pụrụ ịtụleghachi isiokwu bụ́ “Jiri Oge Gị Mee Ihe n’Ụzọ Bara Uru,” bụ́ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke June 1999.) Kọwapụta otú ókèala ọgbakọ unu haruru na ókè a rụruru ọrụ na ya n’afọ gara aga. Kọwaa otú a pụrụ isi tinye aro ndị a tụrụ n’ọrụ n’ọgbakọ. Tụleghachi atụmatụ ndị a na-eme iji rụzuo ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya n’ọdịnihu dị nso.

18 min: “Ị̀ Na-eji Broshuọ Na-achọ Amalitere Mmadụ Ọmụmụ Ihe?” (Mmadụ nile kwesịrị ijide ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002 maka ntụle a.) Malite site n’ime ka onye nkwusa kwadebere nke ọma gosi ụzọ isi malite ọmụmụ ihe, na-eji ihe atụ dị na paragraf nke 3. Mgbe nke ahụ gasịrị, kwuo isi ihe ndị dị na broshuọ ahụ, kọwaakwa otú e si hazie ya nke ọma maka ịmalite ọmụmụ ihe. Gosi abamuru nke ịtụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a tụrụ aro ha n’ihe ntinye nke January 2002. Jụọ ndị na-ege ntị aro ndị gawooro ha nke ọma. Mechie site n’imeghachi ihe ngosi ahụ dị n’elu.

Abụ nke 93 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 3

Abụ nke 178

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Mee ndokwa ka ndị nkwusa kọọ ngọzi ndị ha nwetara n’ihi ikere òkè n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge nile na March, April, ma ọ bụ May. Tụlee Igbe Ajụjụ.

15 min: Otú Mbipụta Dị Iche Iche nke Society Si Eji Nsụgharị Bible Ndị Ọzọ Eme Ihe. Okwu dị nkenke nke mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ ga-esochi. Bible bụụrụ anyị o kwusịa o bie. Ọ bụ Okwu Chineke, e kwesịkwara iji ya na-eme ihe ọtụtụ ugboro n’ozi anyị. Ruo akụkụ ka ukwuu nke otu narị afọ, anyị jiri nsụgharị King James Version, nsụgharị Douay Version nke ndị Roman Katọlik, ma ọ bụ nsụgharị ọ bụla anyị pụrụ inweta mee ihe n’ụzọ bụ́ isi, iji mụta eziokwu banyere Jehova na nzube ya nile. Ọzọkwa, anyị jiri nsụgharị ndị a meworo ochie karị mee ihe n’ịkpọsa eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Ọkpara ya, nakwa ihe mere o ji bụrụ nanị ìgwè atụrụ nta ga-eje eluigwe. Ndị maara nke a na-akọ matakwara na anyị na-anọgide na-eji ọtụtụ nsụgharị Bible eme ihe n’ọrụ mgbasa ozi ọma anyị zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, ị ga-ahụ ka e zoro aka n’aha ndebiri nsụgharị Bible ndị ọzọ dị ka AS, AT, By, ED, Int, KJ, Kx, JB, JP, NE, Ro, TEV, Yg, ná mbipụta anyị dị iche iche. Otú ọ dị, kemgbe 1961, anyị enwetakwuwo ọṅụ n’iji nsụgharị New World Translation, bụ́ nke nwere nsụgharị e mere ka ọ dị ọhụrụ, zie ezie, dịkwa mfe ọgụgụ, eme ihe. Tụlee ịdọ aka ná ntị e kwuru okwu ya ná mbipụta Ụlọ Nche nke October 1, 1997, peeji nke 16, paragraf nke 2, na peeji nke 20, paragraf nke 15. N’iji aka e zoro ná nsụgharị ndị ọzọ na peeji nke 39-43 nke akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe, kpọọ ndị na-ege ntị ka ha mee ihe atụ nke otú iji otu nsụgharị tụnyere ọzọ pụrụ isi nye aka n’ikpughe ụgha nke ozizi Atọ n’Ime Otu nakwa n’izi eziokwu banyere aha Chineke.

15 min: “Okwukwe Anyị Na-akpali Anyị Ịrụ Ezi Ọrụ.”d Mgbe ị na-atụle paragraf nke 2, gbaa Onyeàmà na-anụ ọkụ n’obi ajụjụ ọnụ dị nkenke. Mee ka onye nkwusa ahụ kwuo otú ịgbara ndị ọzọ àmà si egosipụta ma na-ewusikwu okwukwe ya ike.

Abụ nke 56 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya