Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ
1 Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara eziokwu ahụ na iso ná ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma ahụ! Ọ dị ndị na-anọghị n’ime nzukọ Chineke oké mkpa ịnụ ozi ọma Alaeze ahụ. A kọwara eziokwu banyere Alaeze ahụ n’ụzọ dị mfe n’ime broshuọ ndị bụ́ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. Ha na-egosipụta nke ọma ndụ n’elu ụwa n’okpuru Alaeze Chineke, ha na-eduzikwa onye na-agụ ha gaa n’ihe ndị ga-eme n’Alaeze ahụ bụ́ ndị a kọwara n’Okwu Chineke. Otú ọ dị, itinye otu broshuọ n’aka onye nwere mmasị bụ nanị mmalite nke ọrụ anyị. (1 Kọr. 9:23) Ka anyị sochie akwụkwọ nile e tinyere ngwa ngwa, na-eburu n’uche ịmalite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Olee otú anyị pụrụ isi mezuo nke a n’August?
2 A pụrụ iji okwu dị nnọọ nkenke nyefee broshuọ “Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!” Ka ị na-egosi ihu ya, ị pụrụ ịsị:
◼ “M ga-achọ igosi gị otu ihe bu ozi mara mma.” Saghee broshuọ Ndụ n’Elu Ala, gụpụtakwa paragraf mbụ nke okwu mmalite. Mgbe ahụ gaa n’ihu sị: “Ọ na-azakwa ajụjụ a [sapeta isiokwu dị n’elu foto nke 8]: ‘Gịnị mere mmadụ ji anwụ anwụ?’ Ọ ga-amasị gị ịtụle foto na ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị na broshuọ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime nke ahụ, ị pụrụ iwere ya n’ụtụ ₦25.”
3 Gịnị ka ị ga-ekwu mgbe ị na-eme nletaghachi n’ebe e tinyere broshuọ “Ndụ n’Elu Ala”? Ị pụrụ ịnwale ụzọ nke a:
◼ Gosi foto nke 49 na broshuọ Ndụ n’Elu Ala ma jụọ sị, “Nke a ọ́ bụghị foto mara mma? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ dị na broshuọ ahụ m hapụụrụ gị mgbe m bịaburu. M ga-achọ ịjụ gị ajụjụ dị na peji nke na-esonụ.” Sapeta foto nke 50 ma gụpụta ajụjụ bụ́ “‘Ị̀ chọrọ ibi mgbe ebighị-ebi n’ime paradaịs ahụ mara mma?’ [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ọchịchọ gị, rịba ama ihe o kwuru na i kwesịrị ime: ‘Ya mere naga n’iru imụta ihe Chineke nekwu.’ [Gụọ Jọn 17:3.] M ga-enwe obi ụtọ ịmụrụ gị Bible n’efu. Nke ahụ ọ̀ dị gị mma?” Yie agba doro anya maka ịlaghachi.
4 Mgbe ị na-enyefe broshuọ “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” ị pụrụ ịmalite site n’igosi foto dị n’ihu na azụ ya dum wee jụọ, sị:
◼ “Gịnị ka i chere ọ ga-ewe iji mee ka ụwa dum dị otú a?” Nye ohere maka nzaghachi. Kọwaa ihe ụfọdụ dị n’ihe osise ahụ, bụ́ ndị metụtara peji nke 3. Mgbe ahụ kwuo, sị: “Ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ na-eche na ọ gaghị ekwe omume ike ụwa dị otú a. Ma ọ bụghị ihe na-agaghị ekwe omume nye Chineke imezu. [Kerịta isi ihe ndị dị na paragraf nke 43; mgbe ahụ gụọ Aịsaịa 9:6, 7.] Chineke ekwewo nkwa iweta ụwa ọhụrụ ebe ndị sitere ná mba nile ga-anụ ụtọ paradaịs dị ebube. M ga-achọ ka ị gụọ broshuọ a. Ọ ga-egosi ụzọ gị na ezinụlọ gị pụrụ isi nụ ụtọ ọdịnihu magburu onwe ya nke Chineke na-akwadebe.”
5 Ná nletaghachi, ị pụrụ iji broshuọ “Lee!” kọwaa ihe mere e ji nwee mkpa ịmụtakwu ihe banyere Bible. Ma eleghị anya gosi ihu na azụ ya ọzọ ma kwuo, sị:
◼ “Mgbe mbụ m gosiri gị foto a, anyị kwetara na ọ ga-amasị anyị ibi n’ụwa dị ebube otú a. Iji mee ka nke a kwe omume, e nwere ihe ọ dị mkpa ka anyị nile mee.” Sapeta broshuọ “Lee!” na paragraf nke 52; gụpụta paragraf ahụ na akụkụ akwụkwọ nsọ dị na Jọn 17:3. Jikọọ ihe ọmụma ahụ na ihe osise dị na paragraf nke 53 banyere ọzụzụ ziri ezi nke Bible, mgbe ahụ kọwaa na Ndịàmà Jehova na-enye nkụzi dị otú ahụ n’efu n’ebe obibi. Kwuo ka i gosi ụzọ anyị si amụ ihe, na-eji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe.
6 Mgbe ị na-enyefe broshuọ “Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs,” ị pụrụ ịnwale ikwu nke a:
◼ “Anụwo m ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ha ga-achọ ibi n’okpuru ọchịchị pụrụ ịgwọta n’ezie oké nsogbu ndị na-eche anyị ihu taa. [Kpọtụ uche ná nsogbu ndị e nwere n’ógbè unu dị ka enweghị ọrụ, mpụ na-arị elu, ma ọ bụ iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.] Ihe ndị a na-eme nnọọ ka anyị ghara inwe ntụkwasị obi banyere ọdịnihu anyị na nke ndị anyị hụrụ n’anya. Ì chere na ọ dị mgbe a ga-enwe ọchịchị ga-agwọta nsogbu ndị a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ikekwe i kpewo Ekpere Onyenwe Anyị. Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ maara na n’ezie ị na-ekpe ekpere maka ọchịchị ezi omume?” Sapeta peji nke 3 na broshuọ Ọchịchị, gụpụtakwa paragraf abụọ mbụ. Nyefee broshuọ ahụ.
7 Ọ bụrụ na i tinyere broshuọ “Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs,” ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka ná nletaghachi site n’ịsị:
◼ “N’oge mbụ anyị tụlere mkpa e nwere maka ọchịchị ezi omume nke pụrụ ịgwọta nsogbu mmadụ. Broshuọ ahụ m hapụụrụ gị na-atụga aka n’Alaeze Chineke dị ka olileanya anyị nwere nanị ya. Ụfọdụ na-ajụ banyere ihe ọchịchị ahụ pụrụ ime iji mee ka ọnọdụ anyị ná ndụ ka mma. Bible na-egosi na Kraịst anwapụtaworị na ya ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ebe ndị ndú bụ́ mmadụ daworo.” Sapeta broshuọ Ọchịchị na peji nke 29, gụpụtakwa paragraf anọ ndị ikpeazụ. Mgbe ahụ kwuo, sị: “Nke ahụ ọ́ bụghị ọdịnihu dị ebube? Ị̀ ga-achọ ịhụ ya?” Nye ohere maka nzaghachi. Gụọ Jọn 17:3. Gbaa ume ịmụtakwu ihe site n’ọmụmụ Bible ebe obibi.
8 Ọ bụrụ na i ji broshuọ ndị ọzọ eme ihe, ị pụrụ ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke gị, na-eji ndị a tụrụ aro ha n’elu emere ihe atụ. Kwadebe nke ọma ma rịọ ngọzi Jehova ka ị na-akpọsa ozi ọma Alaeze ahụ.