Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/96 p. 1
  • Na-ejegharị n’Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ejegharị n’Okwukwe
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nyekwuo Anyị Okwukwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • ‘Guzosie Ike n’Okwukwe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 9/96 p. 1

Na-ejegharị n’Okwukwe

1 Ọtụtụ nde mmadụ na-atụkwasị ndụ ha n’ihe onwunwe ha, jiri nzuzu na-atụkwasị obi n’ike aghụghọ nke akụ̀. (Mat. 13:22) Ha na-amụta ihe n’ụzọ siri ike mgbe akụ̀ ha furu ma ọ bụ bụrụ nke e zuuru ma ọ bụ ghọọ ihe nwere abamuru dị nta. A na-agba anyị ume ịgbaso ụzọ amamihe dị na ya karị, ịchụso akụ̀ ime mmụọ. (Mat. 6:19, 20) Nke a na-agụnye ‘ijegharị n’okwukwe.’—2 Kọr. 5:7.

2 A sụgharịrị okwu ahụ bụ “okwukwe” site n’okwu Grik nke na-enye echiche nke obi ike, ntụkwasị obi, nkweta siri ike. Ijegharị n’okwukwe pụtara iji obi ike n’ebe Chineke nọ na-eche ọnọdụ ndị siri ike ihu, na-atụkwasị obi n’ikike ya iduzi ijeụkwụ anyị na n’ịdị njikere ya ilekọta mkpa anyị. Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè; ọ tụkwasịrị uche n’ihe ndị dị mkpa n’ezie. (Hib. 12:2) N’otu aka ahụ, ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị uche anyị n’ihe a na-adịghị ahụ anya, ihe ime mmụọ. (2 Kọr. 4:18) Anyị aghaghị iburu ejighị n’aka nke ndụ anyị dị ugbu a n’uche mgbe nile, na-anakwerekwa ndabere anyị kpam kpam n’ebe Jehova nọ.

3 Anyị aghaghịkwa ikwetasi ike na Jehova na-eduzi anyị site ná nzukọ ya a na-ahụ anya n’okpuru nduzi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Mat. 24:45-47) Anyị na-egosipụta okwukwe anyị mgbe anyị “na-erubere ndị na-edu ndú isi” n’ọgbakọ. (Hib. 13:17, NW) Iji obi umeala soro ndokwa ọchịchị Chineke na-arụkọ ọrụ na-egosipụta ntụkwasị obi anyị na Jehova. (1 Pita 5:6) E kwesịrị ịkpali anyị iji obi anyị nile kwadoo ọrụ e nyeworo nzukọ a ịrụ. Nke a ga-adọta anyị nso karị n’ebe ụmụnna anyị nọ n’ihe nkekọ siri ike nke ịhụnanya na ịdị n’otu.—1 Kọr. 1:10.

4 Otú E Si Ewusiwanye Okwukwe Ike: Anyị agaghị ekwe ka okwukwe anyị kwụrụ otu ebe. Ọ dị anyị mkpa ime mgbalị siri ike iji mụbaa ya. Ịmụchi ihe anya, ekpere, na ịga nzukọ ga-enyere anyị aka iwusiwanye okwukwe anyị ike nke na, site n’enyemaka Jehova, ọ pụrụ ịnagide ule ọ bụla. (Efe. 6:16) Ì guzobewo usoro ime ihe dị mma maka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị na ịkwadebe maka nzukọ? Ị̀ na-atụgharị uche mgbe mgbe n’ihe ị na-amụta, ị̀ na-agakwurukwa Jehova n’ekpere? Ọ̀ bụ omenala gị ịga nzukọ nile na ikere òkè na ha dị ka ohere kwere mee?—Hib. 10:23-25.

5 A na-anwapụta okwukwe siri ike site n’ezi ọrụ. (Jes. 2:26) Otu n’ime ụzọ kasị mma isi gosipụta okwukwe anyị bụ site n’ịkpọsara ndị ọzọ olileanya anyị. Ị̀ na-achọ ohere iji kerịta ozi ọma ahụ? Ị̀ pụrụ idozigharị ọnọdụ gị iji nwee ohere ime ihe karị n’ozi ahụ? Ị̀ na-etinye aro ndị anyị na-anata n’ọrụ iji meziwanye ọdịdị na ịdị irè nke ozi anyị? Ị̀ na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ onwe onye, na-ejisikwa ike irute ha?

6 Jisọs dọrọ aka ná ntị megide itinyebiga onwe anyị ókè n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ, na-ekwekwa ka nchụso ihe onwunwe ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye mee ka echiche ime mmụọ anyị gbaa ọchịchịrị. (Luk 21:34-36) Anyị aghaghị ilezi anya otú anyị si na-ejegharị iji zere okwukwe anyị ikpu dị ka ụgbọ. (Efe. 5:15; 1 Tim. 1:19) Anyị nile nwere olileanya na n’ikpeazụ, anyị ga-enwe ike ikwupụta na anyị ‘agbasịwo mgba ọma ahụ, gbasịa ọsọ ahụ, debesịakwa okwukwe ahụ.’—2 Tim. 4:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya