Bụrụ Ihe Atụ n’Okwu na n’Ibi Obi
1 Pọl onyeozi gbara Timoti ume ka ọ bụrụ ihe atụ n’okwu na n’ibi obi. (1 Tim. 4:12) Anyị kwesịkwara igosipụta ihe nlereanya n’okwu na n’àgwà, karịsịa mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi, n’ihi na ime otú ahụ ga-ekpebi ma anyị ga-eru n’obi ndị anyị zutere ma ọ bụ na anyị agaghị eru.
2 Anyị kwesịrị igosipụta akụkụ nile nke àgwà ọma, gụnyere inwe nsọpụrụ, nchebara echiche, obiọma, omume ọma, na akọ. Site n’igosipụta àgwà ndị a, anyị na-egosi na anyị maara otú omume anyị si emetụta mmetụta ndị ọzọ. A pụrụ iji àgwà ọma n’ozi tụnyere ihe e ji eme ka nri dị ụtọ, bụ́ ndị e ji eme ka nri dịwanye ụtọ. E wezụga ha, nri dị mma agaghị enwe ụtọ, gharakwa ịdị na-akpali agụụ. Ịghara igosipụta àgwà ọma ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ pụrụ inwe otu ụdị mmetụta ahụ.—Kọl. 4:6.
3 Bụrụ Ihe Atụ n’Okwu: Mmụmụ ọnụ ọchị enyi na ekele na-ekpo ọkụ bụ ihe ndị dị mkpa n’anyị iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ. Mgbe anyị ji ikpo ọkụ na obi eziokwu mee ka okwu mmalite anyị dị ụtọ, anyị na-eme ka onye nwe ụlọ mata na anyị nwere ezi mmasị n’ebe ọ nọ. Mgbe ọ na-ekwu okwu, gee ntị nke ọma ma gosi ezi nkwanye ùgwù maka echiche ya. Mgbe ị na-ekwu okwu, jiri akọ na amara mee nke ahụ.—Tụlee Ọrụ 6:8.
4 Site na mgbe ruo na mgbe anyị na-ezute onye pụrụ inwe omume na-abụghị nke enyi, ọbụna na-alụ ọgụ. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume? Pita na-agba anyị ume ikwu okwu n’ụzọ na-egosipụta “obi dị nwayọọ na nsọpụrụ dị omimi.” (1 Pita 3:15, NW; Rom 12:17, 18) Jisọs sịrị na ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ejiri enweghị nsọpụrụ jụ ozi Alaeze ahụ, anyị kwesịrị nanị ‘itichapụ ájá ụkwụ anyị.’ (Mat. 10:14) Anyị igosipụta àgwà ihe nlereanya n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ imesị mee ka obi nke ndị mmegide dajụọ.
5 Bụrụ Ihe Atụ n’Ibi Obi: Ikwusa ozi ọma n’okporo ámá na-ekwo ekwo na n’ebe dị iche iche nke ọha mmadụ na-achọ ka anyị na-echebara ndị ọzọ echiche, n’etighị mkpu ma ọ bụ na-esi ọnwụ, na ka anyị gharakwa ịnọchiri ndị na-agafe agafe ụzọ. Mgbe anyị nọ n’ebe obibi nke ndị nwere mmasị, anyị kwesịrị iji ejiji kwesịrị ekwesị, kpaakwa àgwà dị ka ezi ndị ọbịa, na-egosipụta ekele maka ezi nnabata ha. Ụmụntakịrị ọ bụla so anyị aghaghị ịkwanyere onye nwe ụlọ na arịa ụlọ ya ùgwù, ha kwesịkwara ịkpa àgwà ọma ma gee ntị mgbe anyị na-ekwurịta okwu. Ọ bụrụ na ụmụntakịrị na-akpa aghara, nke a ga-akụnye echiche na-adịghị mma.—Ilu 29:15.
6 Ọdịdị onwe onye anyị kwesịrị ime ka o doo ndị ọzọ anya na anyị bụ ndị ozi nke Okwu Chineke. N’uwe na ejiji anyị, anyị ekwesịghị iru unyi ma dị nkịkara n’anya ma ọ bụ na-egbukepụ egbukepụ, jibigakwa ejiji ókè. Ọdịdị anyị kwesịrị mgbe nile ikwesị ozi ọma ahụ. (Tụlee Ndị Filipaị 1:27.) Site n’iji nlezianya chebara ọdịdị na ngwá ọrụ anyị echiche, anyị agaghị akpatara ndị ọzọ ihe mkpọbi ụkwụ ma ọ bụ mee ihe a ga-eji taa ozi anyị ụta. (2 Kọr. 6:3, 4) Okwu na àgwà ihe nlereanya anyị na-etinye ọdịdị ndị na-adọrọ adọrọ n’ozi Alaeze ahụ, na-ewetara Jehova nsọpụrụ.—1 Pita 2:12.