Ezi Àgwà—Ihe E Ji Mara Ndị Na-asọpụrụ Chineke
1 Ezi àgwà dị ụkọ taa. N’ihi gịnị? Ọ na-adị ndị mmadụ ngwa ngwa nke na ha nwere ike ha adịghị echekebe echiche banyere okwu nkwanye ùgwù ndị bụ́ isi, dị ka “Biko,” “I meela,” ma ọ bụ “Ewela iwe.” Okwu Chineke buru amụma banyere ịdịwanye njọ nke àgwà na mgbe ikpeazụ mgbe o kwuru na ndị mmadụ ga-abụ ‘ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị na-enweghị ekele, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị isi ike.’ (2 Tim. 3:1-4) Omume nile dị otú ahụ na-arụpụta àgwà ọjọọ. Dị ka ndị na-asọpụrụ Chineke, ndị Kraịst aghaghị ịnọ na nche ka ha ghara iṅomi akwanyereghị ndị ọzọ ùgwù nke ụwa a.
2 Gịnị Bụ Àgwà? A pụrụ ịkọwa ezi àgwà dị ka ịmata mmetụta nke ndị ọzọ nke ọma, ikike nke iso ndị ọzọ na-ebi n’udo. Akụkụ ụfọdụ nke ezi àgwà bụ ichebara ndị ọzọ echiche, nkwanye ùgwù, obiọma, olu ọma, ịdị akọ, na ezi uche. Omume ndị a na-esite n’ịhụnanya n’ebe Chineke na ndị agbata obi nọ. (Luk 10:27) Ha adịghị efu ihe ọ bụla, ma ha bara uru nke ukwuu n’ime ka mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ka mma.
3 Jisọs Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè. O jiri Ụkpụrụ Ọma ahụ mee ihe mgbe nile: “Dị ka unu na-achọkwa ka mmadụ meere unu, unu onwe unu na-emekwa ha otú ahụ.” (Luk 6:31) Ọ̀ bụ na iji ezi uche eme ihe na àgwà ịhụnanya Jisọs ná mmeso o mesoro ndị na-eso ụzọ ya adịghị eju anyị anya? (Mat. 11:28-30) Ezi àgwà ya esiteghị n’ụkpụrụ nduzi ndị e dere n’akwụkwọ maka akparamàgwà. Ha sitere n’obi eziokwu na nke mmesapụ aka. Anyị aghaghị ịgbalị iṅomi ezi ihe nlereanya ya.
4 Olee mgbe ezi àgwà dị ndị Kraịst mkpa? Ọ̀ bụ nanị n’oge ndị pụrụ iche, mgbe anyị na-echegbu onwe anyị maka imere onwe anyị ezi aha? Hà dị mkpa nanị mgbe a na-achọ ime ka ndị ọzọ mee ihe anyị chọrọ? Ee e! Anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta ezi àgwà mgbe nile. N’ụzọ ndị dị aṅaa karịsịa ka anyị kwesịrị isi nwee nchegbu banyere nke a ná mkpakọrịta anyị na ibe anyị n’ime ọgbakọ?
5 N’ụlọ Nzukọ Alaeze: Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe anyị na-anọ efe ofufe. Anyị na-aga ebe ahụ n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke kpọrọ anyị. N’echiche ahụ, anyị bụ ndị ọbịa. (Ọma 15:1) Ànyị na-abụ ndị ọbịa bụ́ ezi ihe nlereanya mgbe anyị bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ànyị na-elezi anya nke ọma n’uwe na ejiji anyị? N’ezie, anyị kwesịrị izere ihe ịchọ mma na-adịchaghị mma n’anya ma ọ bụ ndị gabigara ókè. Ma ànyị na-aga mgbakọ ma ọ bụ nzukọ ọgbakọ anyị kwa izu, a ma ndị Jehova ama maka ezi ọdịdị ha nke kwesịrị ndị na-ekwu na ha na-atụ egwu Chineke. (1 Tim. 2:9, 10) N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosi nchebara echiche na nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ma Onye Kpọrọ anyị òkù nke bi n’eluigwe ma ndị ọbịa ndị ọzọ a kpọrọ òkù.
6 Ụzọ ọzọ anyị si egosipụta ezi àgwà ná nzukọ bụ site n’ịbịa n’oge. N’eziokwu, nke a anaghị adịcha mfe mgbe nile. Ụfọdụ pụrụ ibi n’ebe dịtụ nnọọ anya ma ọ bụ ha pụrụ inwe ezinụlọ buru ibu ha ga-ejikere. Otú ọ dị, a chọpụtawo n’ọgbakọ ụfọdụ na ihe ruru pasent 25 nke ndị nkwusa na-abịakarị mgbe a bụsịworo abụ ma kpesịa ekpere mmeghe. Okwu a kwesịrị ka e chebara ya echiche. Ọ dị mma icheta na e jikọtara àgwà na anyị ịmata ihe bụ́ mmetụta nke ndị ọzọ. Jehova, bụ́ Onye Kpọrọ anyị òkù nke na-eme amara, edokwawo oriri ime mmụọ ndị a maka abamuru anyị. Anyị na-egosi ekele na nchegbu anyị maka mmetụta ya site n’ịbịa n’oge. Tụkwasị na nke a, ịbịa nzukọ n’azụ oge na-adọpụ uche ma na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ndị bịaworonụ.
7 Mgbe anyị gbakọrọ ọnụ, ànyị na-achọpụta ndị ọhụrụ bịaranụ? Ịnabata ha bụ otu akụkụ nke igosi ezi àgwà. (Mat. 5:47; Rom 15:7) Ekele e ji ihu ọchị kelee, ikwe aka na-ekpo ọkụ, mmụmụ ọnụ ọchị obiọma—ha nile bụcha ụmụ obere ihe, ma ha na-atụnye ụtụ n’ihe ndị na-eme ka a mata anyị dị ka ezi ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Mgbe ọ bịasịrị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na nke mbụ ya, otu nwoke kwuru, sị: “Ahụrụ m n’otu ụbọchị, ndị na-ahụ n’anya n’ezie, ndị m na-amabughị ma ọlị, karịa otú m hụtụworo na chọọchị m nọ na ya too. O doro anya na achọtawo m eziokwu ahụ.” N’ihi ya, ọ gbanwere ụzọ ndụ ya, ọnwa asaa ka ọ gasịkwara, e mere ya baptism. Ee, ezi àgwà pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu!
8 Ọ bụrụ na anyị na-akpaso ndị anyị na-amabughị anyị zutere ezi àgwà, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otú ahụ “karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ”? (Gal. 6:10) Ụkpụrụ bụ́: “Sọpụrụkwa ihu okenye,” dabakwara n’ihe a na-ekwu. (Lev. 19:32) E kwesịghị ileghara ndị dị otú ahụ anya mgbe ọ bụla ná nnọkọ anyị.
9 Ịṅa Ntị nke Ọma: Ná nzukọ ọgbakọ, ndị ozi Chineke bụ́ ndị Kraịst na-ekwu okwu iji nye anyị onyinye ime mmụọ ụfọdụ maka iwuli anyị elu. (Rom 1:11) N’ezie ọ ga-abụ nnọọ àgwà ọjọọ anyị ihi ụra, ịta chịngọm n’ụzọ na-eme mkpọtụ, ịtakwunyere onye nọ anyị nso ihe ugboro ugboro, ịga ụlọ mposi n’ihi ihe ndị na-enweghị isi, ịgụ akwụkwọ ndị na-emetụtaghị ihe a na-amụ, ma ọ bụ ime ihe ndị ọzọ mgbe nzukọ na-aga n’ihu. Ndị okenye kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya na nke a. Ezi àgwà ndị Kraịst ga-akpali anyị ịkwanyere ọkà okwu na ozi ya dabeere na Bible ùgwù n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ịṅa ya ntị nke ọma.
10 Tụkwasị na nke a, n’ihi ịkwanyere ma ọkà okwu ma ndị na-ege ntị ùgwù, anyị ekwesịghị ikwe ka telifon cellular anyị kpaghasịa nzukọ anyị .
11 Àgwà na Ụmụaka: Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịmụrụ anya mgbe nile banyere àgwà ụmụ ha. Ọ bụrụ na nwatakịrị amalite ibe ákwá ma ọ bụ nwee ahụ erughị ala ka nzukọ na-aga n’ihu, nke a ana-adọpụkwa uche ndị ọzọ, ọ dị mma ịkpọpụ nwatakịrị ahụ n’ụlọ mgbakọ ahụ ngwa ngwa o kwere mee iji mee ka o mechie ọnụ. Nke a pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ, ma cheta, nke a na-egosi na ị maara mmetụta nke ndị ọzọ. Ndị nne na nna nwere ụmụaka ndị o yiri ka ha ga-enwe ahụ erughị ala na-ekpebikarị ịnọdụ ala n’ebe azụ nke ụlọ mgbakọ iji dọpụ uche nanị mmadụ ole na ole ruo n’ókè o kwere mee ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ha ga-apụ èzí n’oge nzukọ ahụ. N’ezie, ndị ọzọ bịaranụ pụrụ igosi ezi nchebara echiche maka ezinụlọ dị iche iche site n’ịhapụ oche ndị dị n’azụ ka ha nọdụ, ma ha chọọ.
12 Ndị mụrụ ụmụ aghaghịkwa ịmata àgwà ụmụ ha tupu nakwa mgbe e mechisịrị nzukọ. Ụmụaka ekwesịghị ịdị na-agbagharị n’ime ụlọ ahụ, ebe nke a pụrụ ịkpata ihe ọghọm. Ịgbagharị n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze pụkwara ịdị ize ndụ, karịsịa ná mgbede mgbe a na-adịghị ahụchakwa ụzọ nke ọma. Ịnọ n’èzí na-akpa nkata n’olu dara ụda pụrụ ịbụ inye ndị agbata obi nsogbu, ọ pụkwara inye echiche na-ezighị ezi banyere ofufe anyị. Ndị nne na nna, bụ́ ndị na-eme mgbalị siri ike ilekọta ụmụ ha ma n’ime ma n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ka a jaa ha mma n’ihi na nke a na-eme ka ibikọ n’otu anyị na-atọkwu ụtọ.—Ọma 133:1.
13 N’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ: Anyị na-enwe ekele maka afọ ọma nke ụmụnna anyị bụ́ ndị wepụtara ụlọ ha maka nzukọ ọgbakọ. Mgbe anyị na-aga, ọ dị mkpa ka anyị gosi nkwanye ùgwù na nchebara echiche maka ngwongwo ha. Tupu anyị ana-abanye, anyị kwesịrị iji nlezianya hichasịa akpụkpọ ụkwụ anyị nke ọma iji zere imetọsị ala ụlọ ma ọ bụ kapet. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ilekọta ụmụ ha, na-ejide n’aka na ha nọ n’akụkụ ụlọ ahụ ebe e wepụtara maka ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ìgwè ahụ pụrụ ịdị ntakịrị, ọnọdụ dị ebe ahụ adịtụkwa ntụsara ahụ, anyị ekwesịghị ime otú masịrị anyị n’ụlọ ndị ọzọ. Nne ma ọ bụ nna nwere obere nwa kwesịrị isoro ya mgbe ọ na-aga n’ụlọ mposi. Ọzọkwa, ebe ọmụmụ akwụkwọ bụ nzukọ ọgbakọ, anyị kwesịrị iji ejiji otú anyị na-eme mgbe anyị na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
14 Ezi Àgwà Dị Oké Mkpa: Ịkpa ezi àgwà nke ndị Kraịst abụghị nanị na ọ na-enye echiche dị mma banyere ozi anyị, kamakwa ọ na-eme ka anyị na ndị ọzọ na-enwe ezi mmekọrịta. (2 Kọr. 6:3, 4, 6) Dị ka ndị na-efe Chineke nke obi ụtọ ofufe, o kwesịrị ịdịrị anyị mfe ịmụmụ ọnụ ọchị, ịbụ ndị na-ekwenye ekwenye, na ọbụnadị ime ụmụ obere ihe ọma ndị pụrụ iwetara ndị ọzọ ọṅụ. Ezi àgwà ndị a ga-eme ka ndụ anyị maa mma dị ka ndị na-asọpụrụ Chineke.