Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/96 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka September

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka September
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 2
  • Izu Na-amalite September 9
  • Izu Na-amalite September 16
  • Izu Na-amalite September 23
  • Izu Na-amalite September 30
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 9/96 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka September

RỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-edokwa Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ nile pụrụ idozigharị ihe otú ha chọrọ iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” na maka ntụleghachi minit 30 nke isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ahụ ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ. E kwesịrị ibu ụzọ kenye ụmụnna abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru ntụleghachi nke ụbọchị dị iche iche nke usoro ihe omume mgbakọ distrikti ahụ, bụ́ ndị ga-enwe ike ilekwasị anya n’isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ntụleghachi nke a a kwadebere nke ọma ga-enyere ọgbakọ aka icheta isi ihe ndị e kwuru maka iji ha mee ihe n’onwe ha nakwa iji ha mee ihe n’ubi. Azịza ndị na-ege ntị ga-aza na ahụmahụ ndị a ga-akọ kwesịrị ịdị mkpirikpi ma gaakwa n’isi ihe kpọmkwem.

Izu Na-amalite September 2

Abụ 98 (91)

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Na-ejegharị n’Okwukwe.” Ajụjụ na azịza.

18 min: “Iji Àgwà Ziri Ezi Na-eche Ozi Ọma ahụ n’Ihu Mmadụ.” Kwuo okwu mmeghe na-adabere na paragraf 1. Mgbe ahụ tụlezuo nanị paragraf nke 2-5 nke isiokwu ahụ. Mee ihe ngosi a kwadebere nke ọma nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ, nke na-egosi ụzọ isi nyefee akwụkwọ Ezi Udo, mee nletaghachi, malitekwa ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.

Abụ 48 (28) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 9

Abụ 18 (5)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

12 min: “Ilekọta Mkpa Ime Mmụọ nke Ndị Ntị Chiri.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye òtù ọgbakọ bụ́ onye ntị chiri, lekwasị anya n’elegharaghị ndị ntị chiri nọ n’ókèala anya. Zoo aka n’ọkwa a mara banyere ndị nsụgharị (ndị na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri) dị ka ihe ncheta.

13 min: Tụleghachi Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi 1996 nke Ọgbakọ. Okwu na-ekpo ọkụ, na-ewuli elu nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. (Lee akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 100-102.) Rụtụ aka ebe ọgbakọ mere nke ọma, jaakwa ọgbakọ mma. Gosi otú ọrụ ndị ọsụ ụzọ oge nile na nke inyeaka siworo nye aka dị ukwuu iji were ọrụ ahụ gaa n’ihu n’ógbè unu. Kwuo ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ, na-emesi ike mkpa ọ dị ịbịachi anya. Kwupụta ihe mgbaru ọsọ bara uru ọgbakọ pụrụ ịgbalị iru n’afọ na-abịanụ.

15 min: “Iji Àgwà Ziri Ezi Na-eche Ozi Ọma ahụ n’Ihu Mmadụ.” Tụlee paragraf nke 6-8 nanị, meekwa ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa maka ma ọbịbịa nke mbụ ma nletaghachi. Gbaa mmadụ nile ume ime nletaghachi ha n’egbughị oge.

Abụ 123 (63) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 16

Abụ 10 (80)

13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

17 min: “Bụrụ Ihe Atụ n’Okwu na n’Ibi Obi.” Ajụjụ na azịza.

15 min: Àgwà Ndị Kraịst n’Ụlọ Akwụkwọ. Nna agwa nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị okwu iji rụtụ aka n’ihe ize ndụ ndị siri ike a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ; ọ na-emesi ike mkpa ọ dị ilezi anya maka mkpakọrịta na izere ihe omume ndị a na-enyo enyo. Ọ na-atụleghachi igbe dị na peji nke 24 na broshuọ bụ́ Education, na-akọwakwa mkpa ọ dị isetịpụ ihe nlereanya dị mma dị ka Onyeàmà. Nna akpọtụ ọnwụnwa ụfọdụ na-ebilitenụ ndị metụtara iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, iyi oge mkpapụ, ịga nnọkọ oriri, ma ọ bụ ikere òkè n’egwuregwu; ha ekwurịta otú a pụrụ isi zere nsogbu. Nna agbaa onye ntorobịa ume ka ọ ghara ịla azụ n’ịkọrọ ya ihe nzuzo ya mgbe ọ nọ n’ihe isi ike—ọ na-achọ ịmara na inye aka.

Abụ 32 (10) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 23

Abụ 21 (1)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo ezi ihe ndị si n’iji vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name eme ihe iji duru ndị nwere mmasị gaa ná nzukọ. Kọọ ná mkpirikpi otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ sitere n’Ụlọ Nche nke February 15, 1993, peji nke 30-31.

15 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ okwu dabeere n’isiokwu bụ “Lee Anya Gabiga Ihe Ndị Ị Na-ahụ!” n’Ụlọ Nche nke February 15, 1996, peji nke 27-29.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Ozi nke Udo Chineke’ nke 1996.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf 1-18. Gụpụta paragraf nke 10-11, 15.

Abụ 193 (103) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 30

Abụ 28 (5)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Ozi nke Udo Chineke’ nke 1996.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 19-25. Tụleghachi “Ihe Ncheta Maka Mgbakọ Distrikti,” gụpụtakwa paragraf na-ekwu banyere “Baptism.”

15 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe n’October. Anyị ga-enyefe ụtụ Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! Tụlee isi ihe dị iche iche, ndị dị ka: (1) Nzube e ji ebipụta magazin ndị ahụ, dị ka a kọwara ya na peji ndị mbụ. (2) A na-ebipụta ha n’ọtụtụ asụsụ, na-eme ka e nwee ihe ọmụma Bible n’ụwa nile. (3) A haziri Ụlọ Nche maka ọmụmụ ihe onwe onye, nke ezinụlọ, na nke ìgwè. (4) Ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche na-agụ ha. (5) Anyị ga-eji aka anyị wegara onye ọ bụla ji obi eziokwu na-achọ ịgụ ha mbipụta ndị kasị ọhụrụ. (6) A haziri ha karịsịa maka ndị ji ọrụ n’aka. (7) A nọgidewo na-ebipụta Ụlọ Nche kemgbe 1879; Teta! kemgbe 1919. Mechie site n’ịkọ ihe otu onye nwere ekele nke na-agụ ha kwuru.—Lee Ụlọ Nche nke March 15, 1987, peji nke 32.

Abụ 3 (16) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya