Ndịàmà Jehova Nzukọ nke Nwe Aha Ahụ
N’OCTOBER 6, 1990, ìgwè mmadụ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 5,000 zukọrọ n’Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị na Jersey City, New Jersey, U.S.A., n’ihi na nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society gaje inweta ihe ijuanya. Onye isi oche ahụ, bụ́ John E. Barr, gwara ndị ahụ na-ege ntị banyere mwepụta nke otu vidio na-ewe 55 minit nke a kpọrọ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Nke a bụ vidio mbụ Society mepụtaworo mgbe ọ bụla, ma n’ezie, ọ gaghị abụ nke ikpeazụ.
Vidio ahụ na-egosi ụzọ e si ahazi ndị Jehova iji gbaa àmà nye aha Chineke ma kpọsaa ‘ozi ọma nke alaeze ahụ.’ (Matiu 24:14) E sepụtara isi ụlọ ọrụ ahụ dị na Brooklyn, New York, nakwa ngwá ọrụ ndị dị na Watchtower Farms. E mepụtawo ihe karịrị 500,000 n’asụsụ Bekee, ọ dịkwa ugbu a (ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya ọ ga-adị) na 26 asụsụ ndị ọzọ.a
Olee Ụzọ E Siworo Meghachi Omume?
Olee ụzọ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova siworo meghachi omume maka vidio ahụ? Otu nwoke ji ego achụ ego dere, sị:
“Achọpụtara m na e mere tepu ahụ n’ụzọ dị mma nke ukwuu. Enwere m mmasị karịsịa site n’ịpụta ìhè na nkà nsepụta nke onyinyo ndị ahụ. Enwere m ọchịchọ nke ichezọ na ọ bụ tepu wee chee na ọ bụ sinima. Tepu nke a kwesịrị ịba uru pụrụ iche n’ịkọwa nzube nke isi ụlọ ọrụ unu dị na New York. Ana m aja unu mma maka ihe nke a pụrụ iche.”—J. J.
Ndị na-eso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible eritewo uru site n’ikiri vidio ahụ. Ihe a na-esonụ na-akọwa ihe mere nke ahụ:
“Mụ na otu nwa okorobịa dị 20 afọ na-amụ Bible, bụ́ onye na-agakwa ụlọ akwụkwọ mahadum dị n’ebe a. Ọ nọwo na-enwe nchegbu banyere ọnọdụ ụwa nke na-akawanye njọ. Ma mgbe o kirisịrị tepu ahụ wee hụ ụmụnna Betel ndị ahụ na-eto eto ahụ dị mma, bụ́ ndị nwere ezi nzube ná ndụ, àgwà ya dum agbanwewo. Ọ bịara n’Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche anyị wee rịọ ka a na-amụrụ ya Bible ugboro abụọ n’izu. Onye ọzọ na-amụ Bible, bụ́ onye nkụzi nke ụlọ akwụkwọ dị elu, gbaziiri vidio ahụ igosi ndị ikwu ya. Ha chere na Ndịàmà Jehova bụ obere nzukọ nke na-adịghị ike, nke a na-amaghị ama. O juru ha anya ịhụ ọdịdị zuru ụwa ọnụ nke ọrụ anyị na ọganihu nke anyị na-enwe, site n’enyemaka Jehova.”—J. B.
“Apụghị m ịkọwa ọṅụ m nwere mgbe otu nwanyị mụ na ya na-amụ Bible bepụtara anya mmiri nke ọṅụ na obi ekele mgbe o kirisịrị vidio nke a. O ji anya mmiri kwuo, sị: ‘Olee otú mmadụ ga-esi ghara ịhụ na nke a bụ nzukọ nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova? Ọ dịghị mgbe m maara na ndị dị otú ahụ dị.’ Mgbe ahụ, o kwukwara, sị: ‘Achọrọ m ka e mee m baptism.’”—C. D.
“Anyị enwewo ọtụtụ ihe ịga nke ọma n’iji vidio ahụ na-eme ihe n’ebe ndị na-amụ Bible nọ. N’abalị ụnyahụ di nke otu onye ya na nwunye m na-amụ Bible bịara na nke anyị. Ọ nọwo na-emegide anyị. O kiriri vidio ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ jụrụ ajụjụ dị iche iche wee jiri otu Bible na akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala hapụ ebe a. Na mbụ o suwo akwụkwọ nile e ji amụ Bible nke nwunye ya nwere ọkụ!”—D. H.
Ndị na-eto eto ahụwokwa na vidio ahụ na-adọrọ uche, dị ka okwu ndị a na-esonụ na-egosi:
“Adị m afọ isii na ọkara. Enwere m mmasị n’akụkụ bụ banyere Bible nakwa mgbe igbe ndị ahụ na-aga ngwa ngwa.”—K. W.
“Ụmụntakịrị anyị sịrị ọ dị mma karịa ihe omume ọ bụla ha kiriworo na TV.”—R. C.
“Mgbe o kirisịrị vidio ahụ nke ugbo abụọ, nwa anyị nwoke dị afọ ise, bụ́ onye tụkwasịrị uche ya nke ọma n’ihe ahụ nile, jụrụ, sị, ‘Ànyị pụrụ ikiri nke a ụbọchị ọ bụla?’ Nwa anyị nwanyị dị afọ atọ napụrụ anyị okwu n’ọnụ site n’ịsị, ‘achọrọ m ịga Betel, na-emepụtakwa akwụkwọ!’”—M. E.
“Ụmụ m, bụ́ Robin na Shannan, ndị dị afọ 12 na 9, nọgidere na-akpọ tepu nke a mgbe mgbe. Nwa m nwanyị kasị nta, mgbe o kirisịrị tepu ahụ, kwupụtara, sị, ‘Ahụrụ m ije ozi ubi n’anya. Ọ na-enye oké obi ụtọ.’ Anyị na-eche na vidio nke a enwewo mmetụta kpọmkwem ná ndụ ezinụlọ anyị. Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ịgbanye ihe omume telivishọn nke i chere na ọ dị mma ikiri!”—N. B.
“Adị m 131/2 afọ. Vidio ọhụrụ ahụ mere ka m ghọta ókè m nweworo ndokwa nile dị ebube sitere n’aka Jehova n’efu. Ọ bụ ihe ùgwù ịbụ otu n’ime ndị Chineke.”—K. W.
“Adị m afọ 16, vidio nke a enyewokwa aka imesi ike n’ime obi m na nke a bụ ọrụ a na-arụ n’ụwa nile.”—A. M.
“Ụmụ anyị kwupụtara na ihe omume ndị a na-eme na TV adịghịkwa ihe ọ bụ n’anya ha n’ihi ikiri ihe ezi ntụrụndụ ọchịchị Chineke pụrụ ịdị ka ya. O mesiwokwa ike ọchịchọ ha ịbanye n’ozi oge nile.”—L. M.
Ọbụna ndị bụworo Ndịàmà Jehova ruo ọtụtụ afọ abụwo ndị a kpaliri site n’ihe ha hụrụ.
“Ọ bụrụ na vidio ahụ nwere mmetụta dị otú ahụ n’ahụ anyị dị ka ndị Jehova, olee ụzọ ọ ga-esi metụta ndị ọzọ karị? Mgbe usoro ihe nke a siri ike nke ukwuu ịnagide, ana m ewepụta otu hour n’ime oge m wee gaa Betel ná ntụsara ahụ nke palọ m!”—K. B.
“Mgbe m hụworo nlezianya na ịdị uchu nke e ji arụ ọrụ nke ọ bụla, ana m enwe mmetụta nke ịbanye n’ime ụlọ ma makụọ akwụkwọ ndị m ji amụ Bible!”—L. P.
Anyị na-agbakwa gị ume iwepụta oge iji kirie vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Ọ ga-eme ka i nwee echiche dị iche ná ndụ ma nyere gị aka inwe obi ike n’ọdịnihu e ji n’aka.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Asụsụ ndị America dara ogbi, Arabic, Basque, Cantonese, Catalan, Croatian, Czech (Bohemian), Danish, Dutch, Finnish, French, German, Greek, Hungarian, Italian, Japanese, Korean, Mandarin, Norwegian, Polish, Portuguese (Brazil), Portuguese (Europe), Romanian, Slovak, Spanish, Swedish.