Ngwá Ọrụ Ndị Na-akụzi Ihe, Na-enye Nkwali, Ma Na-ewusi Ike
1 Ha dị irè n’iji ha kụziere ndị mmadụ banyere Bible na Ndịàmà Jehova. Ha akwaliwo ọtụtụ ndị iguzosi ike n’eziokwu ahụ. Ha ewusiwo okwukwe na ekele nke ndị Chineke raara onwe ha nye ike. Gịnị ka ha bụ? Ha bụ vidio dị iche iche nzukọ Jehova mepụtara. Ì kiriwo ha iri? Ole mgbe? Ị̀ na-eji ha eme ihe n’ozi gị? Ị̀ tụọla ọda nke ọ bụla n’ime ha? Olee otú ị pụrụ isi ritekwuo uru site ná ngwá ọrụ ndị a magburu onwe ha?
2 Isiokwu dị n’Ụlọ Nche nke July 1, 1999, bụ́ “Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ,” tụrụ aro “iji ụfọdụ n’ime oge ọmụmụ ihe unu kirie otu akụkụ nke otu n’ime vidio Society bụ́ ndị na-akụzi ihe . . . ma kwurịtazie banyere ya.” N’ikwekọ n’ezi ndụmọdụ ahụ, a ga na-atụle otu vidio ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa abụọ ọ bụla. Anyị na-agba onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ume ikiri vidio ahụ n’ụlọ tupu o ruo mgbe a ga-atụle ya ná Nzukọ Ije Ozi.
3 N’ọnwa a, anyị ga-eji vidio mbụ anyị mepụtara, bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name (Ndịàmà Jehova—Nzukọ nke Nwe Aha Ahụ), wee malite. Tụọ anya ma gee ntị maka azịza nye ajụjụ ndị a:
◼ Gịnị ka a kasị mara Ndịàmà Jehova maka ya?
◼ È jikọtara ihe ọ bụla a na-eme na Betel na akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa?
◼ Gịnị bụ ihe omume Bible ị hụrụ ka a na-emepụta, na-ese foto, ma na-ese n’akwụkwọ maka iji ya mee ihe ná mbipụta dị iche iche?
◼ Gịnị na-amasị gị banyere otú e si na-akwadebe akwụkwọ anyị?
◼ Malite na 1920 ruo 1990, akwụkwọ ole ka Society bipụtara?
◼ Ole ndị karịsịa, n’etiti ndị Chineke, kwesịrị ịgbalị iru eru maka ozi Betel?—Ilu 20:29.
◼ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ezinụlọ Betel si esetịpụrụ Ndịàmà Jehova nile ihe nlereanya magburu onwe ya?
◼ Gịnị na-amasị gị banyere ọrụ a na-arụ na Betel iji jiri ozi ọma ahụ jekwuru ọtụtụ mmadụ ruo n’ókè o kwere mee?
◼ Olee otú e si enweta ego maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ?
◼ Olee ọrụ anyị pụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado, na-ejikwa mmụọ dị aṅaa?—Jọn 4:35; Ọrụ 1:8.
◼ Olee ihe i chere banyere nzukọ nwe aha anyị?
◼ Olee otú ị pụrụ isi jiri vidio a mee ihe n’ozi?
Na December, anyị ga-atụle vidio bụ́ The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy (Bible—Akụkọ Ihe Mere Eme nke Ziri Ezi, Amụma A Pụrụ Ịdabere na Ya).