Ihe Anyị Mụtara na Vidio Bụ́ Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News
Ọ karịala otu narị afọ Ndịàmà Jehova bidoro kwusawa ozi ọma. Anyị na-eji ọtụtụ narị asụsụ ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ. N’eziokwu, o nwetụbeghị mgbe ekwusarala ozi ọma otú a n’ụwa. (Mat. 24:14) Olee ihe mere ọrụ ikwusa ozi ọma a ji dị mkpa otú a? Olee otú e si na-ekwusa ya n’ụwa niile? Ị ga-ama azịza ajụjụ ndị a ma i lee vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News. Na vidio a, ị ga-ahụ otú dị iche iche anyị si na-arụ ọrụ anyị n’ụwa niile. I lechaa ya, gbalịa zaa ajụjụ ndị a na-esonụ.
Olee otú vidio a sirila mee ka ị ghọtakwuo (1) mbọ ọgbakọ Jehova na-agba ịhụ na e kwusara ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile? (2 Tim. 4:2) (2) ọrụ ezinụlọ Betel na-arụ n’ebe dị iche iche n’ụwa? (3) ụdị ọzụzụ a na-enye ndị ozi ala ọzọ na ndị okenye? (2 Tim. 2:2) (4) uru ọ bara ịna-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ ọ bụla na ịna-amụ ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe kwa izu tupu ị gawa ọmụmụ ihe? (Ọrụ 17:11) (5) uru ọ bara ịgachi ọmụmụ ihe na mgbakọ anyị dị iche iche anya? (Hib. 10:24, 25) (6) ngọzi ndị ị ga-enweta mgbe Chineke ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs? (Aịza. 11:9) (7) otú ọrụ owuwe ihe ubi a i so na-arụ si bụrụ ihe ùgwù e nyere gị?—Jọn 4:35.
Ọtụtụ ndị ejirila vidio a mee ka ndị nwere mmasị ghọta ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa niile. (8) Olee mgbe anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, ndị ikwu anyị, nakwa ndị ọzọ kwesịrị ile vidio a? (9) Mgbe gị na ndị mmadụ lere vidio a, gịnị ka ha mere iji gosi na ihe ha hụrụ masịrị ha?
Ọ bụrụ na anyị ana-echebara ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ n’oge a echiche, anyị ga-ekwu ụdị ihe otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị; ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.” (Ọma 40:5) Ka anyị niile gbaa mbọ jiri vidio a nyere ndị mmadụ aka ịmara Jehova na ịma otú ọgbakọ ya si na-arụ ọrụ.