Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 22
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 22
Abụ nke 54 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 8 ¶8-16 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 106-109 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 109:1-20 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Mmadụ Hà Nwere Ike Iso Ndị Ikwu Ha Nwụrụ Anwụ Kwurịta Okwu?—td 41CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ṅomie Jehova na Jizọs ma A Bịa n’Ịkpa Ezigbo Àgwà (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Gosi Onye Nwe Ụlọ na I Nwere Mmasị n’Ebe Ọ Nọ. Okwu si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 186-187, paragraf nke 5. Jiri nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ e kwuru na ya.
Nkeji 10: Ahụmahụ Ndị E Nwetara n’Ụbọchị E Ji Amalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Jaa ụmụnna mma maka otú ha si pụta ozi ọma na Satọdee mbụ n’ọnwa a, bụ́ ụbọchị e ji malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere n’ụbọchị ahụ. Ha kọchaa, i nwere ike gwa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ, ndị ihe ha kọrọ tọrọ ụtọ, ka ha mee ihe ngosi otú o si mee.
Nkeji 10: “Na-enye Ya Ndị Mmadụ Mgbe Ọ Bụla Ọ Dabara.” Ajụjụ na azịza. Jiri otu n’ime ihe ndị e kwuru mee ihe ngosi.
Abụ nke 112 na Ekpere