Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/02 p. 1
  • Mmetụta nke Vidio Ndị Na-agba Àmà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmetụta nke Vidio Ndị Na-agba Àmà
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Vidio Na-akụzi Ihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Na-akụzi Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ngwá Ọrụ Ndị Na-akụzi Ihe, Na-enye Nkwali, Ma Na-ewusi Ike
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Ndịàmà Jehova Nzukọ nke Nwe Aha Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 7/02 p. 1

Mmetụta nke Vidio Ndị Na-agba Àmà

1 “Nwa anyị nwoke anọwo na-ekiri vidio ahụ tupu ọ malite ịga ije. Ọ na-ekiri ya ugboro ugboro. Lee ihe magburu onwe ya ọ bụ na anyị nwere ngwá ọrụ ndị na-akụnye ịhụnanya maka Jehova n’ime ụmụ anyị!” Olee vidio nke nne a bụ́ Onye Kraịst na-ekwu maka ya? Ọ bụ nke ahụ a kpọrọ Noah—He Walked With God. Otu nne na-abụghị Onyeàmà, bụ́ onye nwa ya nwoke kiriri vidio Noah ahụ n’ụlọ onye ọzọ, ziteere alaka ụlọ ọrụ onyinye nke ọnụ ego ya ruru ₦10,458 ma jụọ ma anyị nwere vidio ndị ọzọ maka ụmụaka. Vidio ndị nzukọ Jehova mepụtara na-enwe mmetụta dị ike n’ahụ́ ndị na-eto eto nakwa ndị meworo okenye.

2 N’ime Ezinụlọ: Mgbe otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà kirichara vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault, nne ha kọrọ, sị: “Echere m echiche ụbọchị ahụ dum otú Jehova siworo mee ka ndị mmadụ nkịtị nwee ike idi ihe ndị gabigara ókè! Iche echiche banyere nke ahụ echetaworo m otú nsogbu ndị nke m si dị nnọọ ntakịrị ma e jiri ha tụnyere ndị nke ha. Anyị iso ụmụ anyị kirie vidio a enyeworo ha aka ịhụ n’ụzọ doro anya karị mkpa ọ dị ịdabere n’ebe Jehova nọ. Site n’iso ha kwurịta ya mgbe e mesịrị, anyị enyeworo ụmụ anyị ndị nwanyị aka ịbụ ndị a kwadebere nke ọma karị ịnagide nrụgide na mkpagbu ọ bụla ha pụrụ izute.”

3 N’ụlọ Akwụkwọ: Dị ka ihe so n’otu akụkọ ya, otu Onyeàmà nọ n’afọ iri na ụma gosiri ụmụ klas ya akụkụ ụfọdụ nke vidio bụ́ Stand Firm. Tupu mgbe ahụ, onye nkụzi ha kwuru na ya enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà nọ. Mgbe o kirisịrị vidio ahụ, o kwuru, sị: “Nke a agbanweela nnọọ otú m si ele Ndịàmà Jehova anya kpam kpam. Ana m ekwe nkwa na mgbe ọzọ ha bịara n’ụlọ m, m ga-ege ha ntị ma malite iso ha na-amụ Bible!” Gịnị gbanwere echiche ya banyere anyị? Ọ sịrị na ọ bụ “ezi ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe” anyị.

4 N’ozi: Otu nwanna nwanyị zutere otu nwanyị nke jụrụ ịnara akwụkwọ, ọ bụ ezie na o nwere ajụjụ dị iche iche banyere anyị na nkwenkwe anyị. Nwanna nwanyị ahụ jiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name gaghachi ma kpọọrọ ya nwanyị ahụ na di ya. Ọ masịrị ha abụọ nke ukwuu, ha kwetakwara ịmụ Bible. N’ihi ezi àmà a gbaara ha, ha malitere ime ka ndụ ha kwekọọ n’uche Chineke.

5 Ị̀ na-eji vidio anyị eme ihe n’ụzọ ga-eme ka ha nwee mmetụta kasị mma ha pụrụ inwe?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya