Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ
1 Jehova bụ ihe atụ kasị ukwuu nke onye na-egosipụta ezi nchegbu maka ndị ọzọ. Dị ka Eze Eluigwe na Ala, mkpa nke ụmụ mmadụ o kere eke na-emetụ ya n’obi. (1 Pita 5:7) Jisọs gbara ụmụazụ ya ume igosipụta àgwà Nna ya, bụ́ onye na-eme ka anyanwụ waa, na ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Mat. 5:45) Ị pụrụ iṅomi Jehova site n’igosi ezi nchegbu maka ndị ọzọ—ịdị njikere isoro onye ọ bụla i zutere kerịta ozi Alaeze ahụ. Site n’ịmara broshuọ a ga-eji eme ihe n’ozi na July nke ọma, ị ga-anọ n’ọnọdụ dị mma inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. Aro ndị na-esonụ na-enye echiche ụfọdụ nke otú ị pụrụ isi kwadebe maka ọbịbịa nke mbụ na otú ị pụrụ isi jiri nletaghachi e mere n’oge ya sochie mmasị ọ bụla.
2 Mgbe ị na-enyefe broshuọ bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?” ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ị̀ jụtụwo ihe mere Chineke ji kwere ka ụmụ mmadụ na-ahụju anya ma ọ bụrụ na ọ na-eche banyere ha n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ bụghị nanị na broshuọ a na-enye azịza na-eju afọ nye ajụjụ a, kama ọ na-egosikwa na Chineke ekwewo nkwa idozi mbibi nile mmadụ wetawooro onwe ya na ebe obibi ya bụ́ ụwa.” Gụpụta paragraf nke 23 na peji nke 27. Gosi ihe osise dị n’okpuru ya, gụpụtakwa Abụ Ọma 145:16 site na paragraf nke 22. Nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Ọ bụrụ na a naara ya, jụọ otu ajụjụ a pụrụ ịza n’ọbịbịa na-esonụ, dị ka: “Ị̀ ga-achọ ịma otú Chineke ga-esi mezuo nzube ya nke iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi na ime ka ụwa ghọọ paradaịs?”
3 Mgbe ị na-alaghachi na nke ndị i nyere broshuọ bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?” ị pụrụ ịmalite nkwurịta okwu ọzọ n’ụzọ dị otú a:
◼ “Mgbe m bịara n’oge gara aga, anyị tụlere na Chineke na-eche banyere anyị n’ezie nakwa na ọ bụ nzube ya idozi mbibi nile mmadụ wetawooro onwe ya na ebe obibi ya bụ́ ụwa.” Sapeta broshuọ ahụ n’ihe osise dị na peji nke 2-3 ma kwuo, sị: “Anyị kwụsịrị mkparịta ụka anyị site n’ajụjụ bụ́, Olee otú Chineke ga-esi mezuo nzube ya nke iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi na ime ka ụwa ghọọ paradaịs? Gịnị ka i chere?” Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta peji nke 17, ma gụọ paragraf nke 2 na Daniel 2:44. Mgbe nke ahụ gasịrị, gụpụta paragraf nke 12 dị na peji nke 18. Jụọ onye nwe ụlọ ma ọ ga-achọ isoro gị tụlee akụkụ nke 9 nke broshuọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ ga-achọ, soro ya mụọ ya.
4 Nke a bụ ụzọ a pụrụ isi nyefee broshuọ bụ́ “Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ.” Gosi ihu ya ma kwuo, sị:
◼ “Taa anyị na-ekesa broshuọ a wetawooro ọtụtụ nde ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo nkasi obi na olileanya. Ị̀ jụtụwo ihe bụ olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-esetịpụ nkwa Chineke nke mbilite n’ọnwụ n’ụzọ doro anya.” Gụọ Jọn 5:28, 29. Sapeta broshuọ ahụ ma kwuo okwu n’isi ihe ndị e kwuru na paragraf ikpeazụ na peji nke 28, na paragraf mbụ na peji nke 31. Gosi ihe osise ndị so ya. Nyefee broshuọ ahụ. Ị pụrụ ịkwadebe ụzọ maka nletaghachi site n’ịjụ sị, “Olee otú anyị pụrụ iji jide n’aka na a ga-emesị wepụ ọnwụ kpam kpam?”
5 N’ebe i tinyere broshuọ bụ́ “Mgbe Onye Ị Hụru n’Anya Nwụrụ,” ị pụrụ ịchọ iji ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke a mee ihe ná nletaghachi:
◼ “Mgbe anyị kwuru okwu n’oge gara aga, anyị tụlere olileanya dị ebube nke mbilite n’ọnwụ. Broshuọ ahụ m hapụụrụ gị na-akọwa ihe mere anyị pụrụ isi jide n’aka na a ga-emesi wepụ ọnwụ kpam kpam. Ị́ hụghị nkwa Chineke dị ka ihe na-akasi obi na ihe na-emesi obi ike?” Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ sapeta peji nke 31 na broshuọ ahụ, gụpụtakwa paragraf nke abụọ na nke atọ, ha na Mkpughe 21:1-4. Mee ka atụmanya anyị nwere ịnụ ụtọ ndụ n’anwụghị anwụ mgbe ọ bụla pụta ìhè. N’ịdabere ná mmasị e gosiri na ọnọdụ dị na mgbe ahụ, ị pụrụ ikwu ka a malite ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma jụọ ajụjụ ọzọ iji mepee ụzọ maka nletaghachi ọzọ.
6 Ị pụrụ ikwu ihe na-esonụ mgbe ị na-enyefe broshuọ bụ́ “Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?”:
◼ “Ọtụtụ ndị ajụwo ihe bụ nzube nke ndụ. Ha ajụwo onwe ha, sị: ‘Gịnị mere m ji nọrọ n’ebe a? Olee ebe m na-aga? Gịnị ka ọdịnihu ga-ewetara m?’ Olee ebe i chere na anyị pụrụ ịchọta azịza ha? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe Bible na-ekwu. [Gụọ Abụ Ọma 36:9.] Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị n’ime ya ikwubi na Onye Okike mmadụ nọ n’ọnọdụ kasị mma ịkọwa ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Broshuọ a na-egosi nzube dị ebube nke Chineke na-akwadebere anyị.” Sapeta peji nke 20-21, gụpụta isiokwu ya, kwuokwa okwu n’ihe osise ya; mgbe ahụ nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Ọ bụrụ na a naara ya, jụọ, sị: “Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ọ ka bụ nzube Chineke ka ụmụ mmadụ dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala?”
7 Ọ bụrụ na i tinyere broshuọ bụ́ “Gịnị Bụ Nzube Nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?,” ị pụrụ ikwu ihe yiri nke a mgbe ị laghachiri:
◼ “N’ọbịbịa m gara aga, enwere m nnọọ obi ụtọ isoro gị tụlee echiche Bible ahụ bụ na ndụ ụmụ mmadụ nwere nzube n’ezie.” Gosi ihe osise dị na peji nke 31 ma jụọ sị, “Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ọ ka bụ uche Chineke na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala?” Gụpụta paragraf nke 3 na peji nke 20. Tụlee isi ihe ndị dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ọ Ka Bụkwa Nzube Chineke,” na peji nke 21. Gaa n’azụ broshuọ ahụ, ma gụpụta banyere ọmụmụ Bible ebe obibi a na-eduzi n’efu. Webata akwụkwọ Ihe Ọmụma, kwuokwa ka i gosi otú e si eji ya eme ihe dị ka ihe enyemaka iji mụọ Bible.
8 Ozi anyị kwesịrị igosipụta ezi mmasị anyị nwere n’inyere ndị nwere obi eziokwu aka ‘ịbịaru mmazu nke eziokwu.’ (1 Tim. 2:4) Ya mere, wepụta oge n’usoro ihe omume ije ozi gị iji kpọtụghachiri onye ọ bụla i tinyere broshuọ n’aka ya. Gị igosipụta ezi nchegbu banyere ha pụrụ ịrụpụta inyere ndị na-eze ume, ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile a na-eme n’okpukpe ụgha aka ịbụ ndị a kara akara maka nlanarị. (Ezik. 9:4, 6) Ị ga-enwekwa ọṅụ na afọ ojuju nke na-abịa site n’ịmara na ị na-eṅomi Jehova site n’inwe ezi nchegbu maka ndị ọzọ.—Tụlee Ndị Filipaị 2:20.