Broshuọ Ọhụrụ A Ga-enyefe!
1. Olee akwụkwọ anyị ga-enyefe na Nọvemba, oleekwa ihe mere e ji dee akwụkwọ ahụ?
1 Ná Mgbakọ Distrikti “Na-echenụ Nche!” anyị gara n’afọ 2009/2010, e wepụtara broshuọ ọhụrụ bụ́ Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? N’ọnwa Nọvemba, ọgbakọ niile dị n’ụwa ga-ebido inyefe ya. Olee otú akwụkwọ a ga-esi baara ndị bi n’ókèala anyị uru? Ọtụtụ ndị, karịchaa ndị na-abụghị ndị Krisendọm, amachaghị ihe Baịbụl na-ekwu. N’ihi ya, na peeji nke atọ na broshuọ ahụ, e kwuru na ihe mere e ji dee akwụkwọ ahụ bụ ka o nyere ndị mmadụ aka “ịmụta isi ihe ndị dị na Baịbụl.”
2. Olee otú anyị nwere ike isi nyefee broshuọ a?
2 Otú Ị Ga-esi Enyefe Ya: Ihe anyị nwere ike ikwu bụ: “Anyị chọrọ ịma ihe i chere banyere ihe a e dere ebe a. [Gụọ 2 Timoti 3:16.] Ọtụtụ n’ime ndị anyị na ha kparịtarala kweere n’ihe a e dere ebe a; ndị ọzọ weere na Baịbụl bụ naanị akwụkwọ nkịtị dị mma ọgụgụ. Olee otú gịnwa si were Baịbụl? [Chere ka ọ zaa.] Okpukpe ọ sọkwara anyị na-ekpe, ọ dị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị mụọ Baịbụl. [Gụọrọ ya okwu mmeghe dị na peeji nke 3 na broshuọ ahụ.] Mgbe ị na-agụ otú e si chịkọta ihe Baịbụl na-ekwu n’ụzọ dị mfe ọgụgụ na broshuọ a, ị ga-achọpụta otu ihe ga-amasị gị, nke bụ́ na Baịbụl nwere naanị otu isiokwu, ọ bụkwa otu isi ihe ka ọ na-ekwu.”
3. Olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi nyefee broshuọ ahụ, karịchaa n’ókèala ọtụtụ ndị bi na ya na-abụghị ndị Krisendọm?
3 Lekwa ụzọ ọzọ e nwere ike isi nyefee ya, karịchaa n’ókèala ọtụtụ ndị bi na ya na-abụghị ndị Krisendọm: “Anyị chọrọ ịma ihe i chere banyere ihe a e kwuru n’akwụkwọ a dị nsọ. [Gụọ Abụ Ọma 37:11.] Olee otú i chere ụwa a ga-adị mgbe amụma a ga-emezu? [Chere ka ọ zaa.] Nke a bụ otu n’ime ihe ndị na-egosi na Baịbụl nwere ike ime ka ndị si ná mba dị iche iche na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche nwee olileanya na nkasi obi. Gụọrọ ya ihe e dere ná mmalite peeji nke 3 ma nyefee ya broshuọ ahụ.
4. Olee otú anyị nwere ike isi jiri broshuọ ahụ malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl?
4 Malitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl: Anyị bịa nletaghachi, anyị nwere ike ichetara onye nwe ụlọ ihe anyị na ya kwurịtara na mbụ. Anyị nwere ike ịhọrọ otu nkebi na broshuọ ahụ ma jiri ajụjụ ndị dị ná ngwụcha nkebi ahụ tụlee otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ kọwakwuru ihe ahụ anyị na ya kwurịtara n’oge gara aga. Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere onye anyị nyefere broshuọ ahụ ọmụmụ Baịbụl ozugbo anyị bịaara ya nletaghachi, otú anyị nwere ike isi mee ya bụ ịgụrụ ya ihe e dere n’azụ broshuọ ahụ, nye ya akwụkwọ Bible Na-akụzi ma jụọ ya isiokwu ọ ga-achọ ka anyị na ya tụlee. Gị na ya tụlezie otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ dị n’isiokwu ọ họrọ. Ka anyị niile gbalịsie ike inyefe broshuọ a n’ọnwa Nọvemba!