Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 18
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 18
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 8-11
Nke 1: 1 Ihe E Mere 11:1-14
Nke 2: Olee Otú Mmụọ Nsọ na Nwaanyị ahụ A Na-alụ Ọhụrụ Si Na-asị, “Bịa”? (Mkpu. 22:17)
Nke 3: Ndị Kraịst Kwesịrị Ịna-akpọ Aha Chineke (td 20A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Uru Ọ Bara Ile Ndị Ị Na-agwa Okwu Anya Mgbe Ị Na-ezi Ha Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 124, paragraf nke 1, ruo peeji nke 125, paragraf nke 4.
Nkeji 20: “Broshuọ Ọhụrụ A Ga-enyefe!” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 1, kwuo ihe dị na broshuọ ahụ ná nkenke. Unu tụlechaa paragraf nke 2 na nke 3, a ga-eji ụzọ abụọ ahụ e nwere ike isi nyefee ya mee ihe ngosi. A tụlechaa paragraf nke 4, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma a bịa nletaghachi.