Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
Broshọ nke Ga-enyere Anyị Aka Ịga Nletaghachi na Ịmụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
1. Olee broshọ e wepụtaara anyị ná mgbakọ distrikti anyị gara n’afọ gara aga nke ga-enyere anyị aka ịga nletaghachi na ịmalite ọmụmụ Baịbụl?
1 Mgbe anyị gara mgbakọ distrikti n’afọ gara aga, obi tọrọ anyị ụtọ mgbe e wepụtaara anyị broshọ ga-enyere anyị aka ịga nletaghachi na ịmalite ọmụmụ Baịbụl. Aha ya bụ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Ọ bụ ya ka e ji dochie broshọ Na-achọ. Isiokwu ndị dị na ya dị nkenke otú ahụ ndị nke dị na broshọ Na-achọ dị. Nke a ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe iji ya na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ma, e nwere ihe dị iche na broshọ abụọ a. Na-achọ kwuru ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme. Ihe ndị ahụ nwekwara ike isiri onye anyị na-amụrụ Baịbụl ike ime. Ma, broshọ ọhụrụ ahụ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! kwuru gbasara ozi ọma dị na Baịbụl.—Ọrụ 15:35.
2. Olee ihe mere e ji bipụta broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!?
2 Olee ihe mere e ji bipụta broshọ a? Ọtụtụ ụmụnna anyị kwuru na ha ga-achọ ka e nwee akwụkwọ dị mfe ha ga-eji na-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụta eziokwu, nke ga-emekwa ka ọ dịrị ha mfe isi na ya gafee n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. E nwekwara ndị ịgụ akwụkwọ buru ibu na-atụ ụjọ. Ụdị ndị a na-achọkarị ka e jiri broshọ mụọrọ ha Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na ọ na-adị mfe ịsụgharị broshọ n’ọtụtụ asụsụ.
3. Olee otú broshọ a si dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?
3 Otú E Si Dee Ya: Anyị na-ede ọtụtụ akwụkwọ anyị otú ọ na-abụ ndị mmadụ were ha gụọ, ha aghọta ihe e kwuru, ghara ichewe ka ndị nkwusa bịa kọwaara ha ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka e si dee broshọ a. Anyị dere ya ka ndị nkwusa jiri ya na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ị chọọ inye ya mmadụ, ọ ga-akacha mma ka gị na ya kwurịta otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ. Paragraf nke ọ bụla dị obere. Gị na onye ị na-ezi ozi ọma nwere ike mụọ ya ọ bụrụgodị na o nwechaghị ohere. Anyị na mmadụ kwesịrị ịmalite n’isiokwu nke mbụ mụwa broshọ ahụ, ma, ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị malite n’isiokwu ọ bụla.
4. Olee otú broshọ a si enyere anyị aka iji Baịbụl na-amụrụ ndị mmadụ ihe?
4 N’ọtụtụ akwụkwọ anyị, ọ na-abụ a gụọ paragraf, a hụ azịza ajụjụ a jụrụ. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka e si dee broshọ a. Ọ bụ Baịbụl ka ị ga-agụ hụ azịza ọtụtụ ajụjụ ndị dị na broshọ a. Ọtụtụ ndị chọrọ ka e jiri Baịbụl na-akụziri ha ihe, ọ bụghị akwụkwọ anyị. N’ihi ya, a ga-eji Baịbụl gụpụta ọtụtụ n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị na ya. Nke a ga-eme ka onye a na-amụrụ Baịbụl ghọta na ihe ọ na-amụ bụ Okwu Chineke.—Aịza. 54:13.
5. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji kwadebe nke ọma tupu anyị agawa ịmụrụ mmadụ broshọ a?
5 A kọwaghị amaokwu Baịbụl niile e dere na broshọ a. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ ka o nyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka ịjụ onye na-amụrụ ya ihe ajụjụ. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ na-amụrụ ya ihe mara otú ọ ga-esi nyere ya aka ka ọ ghọta amaokwu Baịbụl ahụ. N’ihi ya, i kwesịrị ịkwadebe nke ọma tupu gị agawa ịmụrụ mmadụ broshọ a. Anyị ekwesịghị ikwu ọtụtụ okwu mgbe anyị na-amụrụ mmadụ broshọ a. A guọ Baịbụl, anyị kwesịrị ịhapụ onye anyị na-amụrụ ihe ka o jiri aka ya kọwaa amaokwu Baịbụl ahụ. Anyị nwekwara ike ịjụ ya ajụjụ ụfọdụ ga-enyere ya aka ịkọwa amaokwu ahụ. Ihe ndị a ga-enyere ya aka icheta ihe ebe ahụ a gụrụ na-ekwu.—Ọrụ 17:2.
6. Olee otú anyị ga-esi jiri broshọ a: (a) zie ndị na-ekweghị na Chineke nakwa n’Okwu ya ozi ọma? (b) gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ? (ch) malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl? (d) kụziere mmadụ Baịbụl ma anyị gaa nletaghachi?
6 Ị manụ na anyị nwere ike inye mmadụ akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’agbanyeghị akwụkwọ a na-enye n’ọnwa ahụ. Anyị nwekwara ike inye mmadụ broshọ a mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Ndị nkwusa chọọ ịmalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl, ọ ga-adịrị ọtụtụ n’ime ha mfe ịjụ onye ahụ otu ajụjụ dị na broshọ a, ha na ya ekwurịta ya. Ihe ọzọ bụ na broshọ a na-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe ịma ihe ọ ga-eme ma ọ gaa nletaghachi.—Gụọ igbe ndị dị na peeji nke 5 ruo 7.
7. Olee otú i nwere ike isi jiri broshọ a mụọrọ mmadụ Baịbụl?
7 Otú Ị Ga-esi Jiri Ya Na-amụrụ Mmadụ Baịbụl: I nwere ike ịjụ onye ị gara na nke ya ajụjụ ndị ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo. Ị jụchaa ajụjụ ahụ, unu agụọ paragraf dị ya n’okpuru na amaokwu Baịbụl ndị e dere ná ngwụcha paragraf ahụ. Unu gụọ Baịbụl, jụọ ya ajụjụ ụfọdụ ga-enyere ya aka ịghọta ihe amaokwu Baịbụl ndị ahụ na-ekwu. Ya kwuchaa, gị ajụghachi ya ajụjụ ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo. Nke a ga-enyere gị aka ịma ma ọ̀ ghọtakwara ihe unu mụrụ na paragraf ahụ. Unu bido ịmụ ihe ọhụrụ, unu nwere ike ịna-atụle otu ajụjụ otu ajụjụ. Ma, ka oge na-aga, unu nwere ike ịna-amụcha otu isiokwu.
8. Olee ihe i kwesịrị ikwu ma unu chọọ ịgụ Baịbụl? Oleekwa ihe mere i kwesịrị iji kwuo ya?
8 Ọ bụ n’amaokwu Baịbụl ọ bụla e dere “gụọ” ka azịza ajụjụ ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo na-adịkarị. Ị chọọ ikwu amaokwu Baịbụl unu ga-agụ, asịla: “Pọl onyeozi dere, sị” ma ọ bụ, “Lee ihe Jeremaya buru n’amụma.” I mee otú ahụ, onye ị na-amụrụ Baịbụl nwere ike iche na ihe ị na-agụrụ ya bụ okwu mmadụ. Unu chọọ ịgụ Baịbụl, ọ ga-aka mma ka i kwuo, sị, “Okwu Chineke kwuru, sị” ma ọ bụkwanụ, “Lee ihe Baịbụl kwuru.”
9. Anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, ànyị kwesịrị ịgụ amaokwu Baịbụl niile e dere na paragraf anyị na-amụ?
9 Ànyị kwesịrị ịgụ amaokwu Baịbụl niile dị na paragraf ka ọ̀ bụ naanị ndị nke ahụ e dere “gụọ”? Ọ bụ otú ihe si dịrị onye anyị gara na nke ya ka anyị ga-eji mara ma ànyị ga-agụ ha niile. Amaokwu Baịbụl ọ bụla dị na paragraf nwere ihe mere e ji dee ya. Nke ọ bụla nwere ihe a ga-amụta na ya. Ma, mgbe ụfọdụ, onye anyị na-amụrụ Baịbụl agaghị enwe ohere. O nwekwara ike ịbụ na o nwechaghị mmasị. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ machaghị agụ ihe. Anyị hụ ụdị onye a, anyị nwere ike ịgụ naanị amaokwu Baịbụl ndị ahụ e dere “gụọ.”
10. Olee mgbe anyị na onye anyị na-amụrụ broshọ ahụ nwere ike ịgafe n’akwụkwọ Bible Na-akụzi?
10 Mgbe Anyị Kwesịrị Ịgafe n’Akwụkwọ Bible Na-akụzi: Ọ bụrụ na anyị na mmadụ amụọla broshọ a ọtụtụ ugboro, ya bụrụkwa na anyị na ya na-amụchi ya anya, anyị nweziri ike iji akwụkwọ Bible Na-akụzi mụwara ya ihe. Anyị chọọkwa, anyị nwere ike ibu ụzọ mụchaara ya broshọ ahụ tupu anyị agafee n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Otú onye ahụ si aghọta ihe a na-akụziri ya ga-enyere onye nkwusa aka ịma mgbe ọ ga-agafe n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Anyị gafee n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, ọ̀ bụ iwu na anyị ga-ebido n’isi nke mbụ? Mba. Ọ bụ otú onye anyị na-amụrụ ihe si aghọta ihe a na-amụrụ ya ka anyị ga-eji ama ebe anyị ga-ebido. Ị manụ na akwụkwọ Bible Na-akụzi kọwara isiokwu ndị dị na ya nke ọma. N’ihi ya, ọ ga-aka abara ọtụtụ n’ime ndị anyị na-amụrụ ihe uru ma ọ bụrụ na ha amụọ isiokwu ahụ ọzọ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi.
11. Gịnị mere anyị ga-eji gbaa mbọ jiri broshọ ọhụrụ a na-enyere ndị mmadụ aka?
11 Ihe juru n’ụwa taa bụ akụkọ ọjọọ. Ma, Jehova enyela anyị ọrụ izi ndị mmadụ ozi ọma. Ozi ọma ahụ bụ na Alaeze Chineke amalitela ịchị nakwa na ọ gaghị adị anya ya eweta ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi na ya. (Mat. 24:14; 2 Pita 3:13) Anyị ma na ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma a ga-ekweta na ihe a Chineke kwuru n’Aịzaya 52:7 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Lee ka o si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo, onye na-eweta ozi ọma nke ihe ka mma, onye na-ekwusa nzọpụta, onye na-asị Zayọn: ‘Chineke gị aghọọla eze!’” Ka anyị gbalịa jiri broshọ a na-ezi ndị akpịrị na-akpọ nkụ n’ókèala anyị ozi ọma si n’aka Chineke.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ebe Ndị Mmadụ Na-ekweghị ma na Chineke ma na Baịbụl:
● N’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwe ka e zie ha ozi ọma ma ha nụhaala “Chineke” na “Baịbụl.” Ya bụrụ ebe ndị mmadụ na-eme otú ahụ, ọ ga-aka mma ka i jiri ihe ha na-ekwukarị gbasara ya zie ha ozi ọma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ha ihe mere ọchịchị ọma ji dị anyị mkpa, ihe ga-enyere ezinụlọ aka ịdị n’udo, na otú ihe ga-esi dị mma n’ọdịnihu. I nwere ike hapụgodi iji broshọ a mụwara ha ihe. Buru ụzọ mee ka ha ghọta ihe mere anyị ji kwere na Chineke dị nakwa ihe mere anyị ji kwere na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ bụ mgbe i mere ka ha ghọta ihe ndị a ka ị ga-ejizi broshọ a mụwara ha ihe.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Mgbe Anyị Nọ n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ:
● I nwere ike ikwu, sị: “M bịara ka mụ na gị kwurịta ihe Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ò nwetụla mgbe i chere ma Chineke ọ̀ ga-akwụsị ahụhụ anyị na-ata taa? [Chere ka ọ zaa. Kwuzie, sị:] Broshọ a kwuru ebe ị ga-aga na Baịbụl hụ azịza ajụjụ a m jụrụ gị. [Nye ya broshọ ahụ, gụọnụ isiokwu nke mbụ, paragaf nke mbụ. Unu gụchaa, unu agụọ Jeremaya 29:11.] Ì chere na ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma? [Chere ka ọ zaa. Nye ya akwụkwọ ahụ ma kwuo, sị:] M bịa ọzọ, anyị ga-atụle paragraf nke abụọ. Na paragraf ahụ, anyị ga-aza ajụjụ a: ‘Olee otú Chineke ga-esi kwụsị ahụhụ niile anyị na-ata taa?’” Ma, ọ bụrụ na onye ị gara na nke ya nwere ohere, unu nwere ike gụọ paragraf nke abụọ na amaokwu Baịbụl atọ ahụ e dere “gụọ.” Gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịa zaa ajụjụ nke abụọ dị n’isiokwu ahụ.
● “Ọtụtụ ndị taa na-ekpekarị ekpere ma ha nwee nsogbu. Gịnwakwanụ? Ị̀ na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ? [Chere ka ọ zaa.] Ì chere na Chineke na-anụ ekpere niile, ka ò nwere ndị nke ọ na-anaghị anụ? [Chere ka ọ zaa.] Akwụkwọ m ji ebe a zara ajụjụ ndị a. [Nye ya broshọ ahụ, gị na ya mụọkwa isi nke iri na abụọ, paragraf nke mbụ. Gụọkwanụ amaokwu Baịbụl ndị ahụ e dere “gụọ.”] Ị̀ hụrụ na Chineke na-anụ ekpere anyị? Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ na-aza ekpere anyị, anyị kwesịrị ịma onye ọ bụ nke ọma. [Sapeta isi nke abụọ, gosikwa ya isiokwu nta ndị dị na ya.] M ga-ahapụrụ gị akwụkwọ a. M bịa mgbe ọzọ, anyị ga-ahụ otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a.”
● “Ụjọ na-atụ ndị mmadụ n’ihi na ha amaghị ihe chi ga-abọta. Ma, ì chere na ihe ga-emecha dị mma? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị amaghị na Baịbụl kwuru ihe ndị nwere ike ime ka obi sie anyị ike na ihe ga-emecha dị mma. Ka m gosi gị ụfọdụ ajụjụ ndị Baịbụl zara.” Nye ya broshọ ahụ, ma gosi ya ajụjụ ndị ahụ dị n’azụ ya. Jụọ ya nke kacha masị ya. Gazie n’isiokwu a zara ajụjụ ahụ, gị na ya mụọkwa otu paragraf ma ọ́ dịghị ihe ọzọ. I mechaa, gị na ya yie mgbe ọzọ ị ga-abịa zaa ajụjụ ọzọ dị n’isiokwu ahụ.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Gwa Onye ahụ Ka Gị na Ya Mụwa Baịbụl:
● “M bịara igosi gị akwụkwọ ọhụrụ anyị na ndị mmadụ ji amụ Baịbụl. Aha ya bụ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! O nwere isiokwu iri na ise. Nke ọ bụla kwuru ebe i nwere ike ịga na Baịbụl hụ azịza ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị. [Gosi ya ihu broshọ ahụ na azụ ya.] Ò nwetụla mgbe ị gụrụ Baịbụl ma ị ghọtaghị ihe ị gụrụ? [Chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị otú anyị si amụ akwụkwọ a. Ọ raghị ahụ́. [Sapeta isi nke atọ. Gị na ya tụleekwa ajụjụ nke atọ, paragraf nke mbụ. Gụọkwanụ Mkpughe 21:4, 5. Ị chọọ, unu nwekwara ike ịtụle paragraf nke ọzọ na-eso ya na amaokwu Baịbụl ndị e dere “gụọ” na paragraf ahụ.] M ga-ahapụrụ gị akwụkwọ a. Ị chọọ, mụ abịa n’ụbọchị ọzọ ka anyị mụọ ya. Ọ bụrụ na ọ dị gị mma, anyị amụrụ gawa. M bịa mgbe ọzọ, anyị ga-atụle isiokwu nke mbụ. I lee anya, ị ga-ahụ na ọ bụ naanị otu peeji.”
[Igbe dị na peeji nke 7]
Jiri Ya Malite Ọmụmụ Baịbụl ma Ị Gaa Nletaghachi:
● Ị gaa nletaghachi, i nwere ike ikwu, sị: “Obi dị m ụtọ ịhụ gị ọzọ. M weteere gị akwụkwọ a. Ọ zara ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị taa. [Nye ya broshọ ahụ, gwakwa ya ka o lee anya n’azụ ya.] N’isiokwu a niile dị ebe a, olee nke kacha masị gị? [Chere ka ọ zaa. Sapetezie isiokwu nke ọ họọrọ.] Ka m gosi gị otú e nwere ike isi jiri akwụkwọ a mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ a.” Gị na ya tụlee otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ. Gụọkwanụ amaokwu Baịbul ndị ahụ e dere “gụọ.” Ị́ hụghị na unu amalitela ịmụ Baịbụl? Hapụrụ ya broshọ ahụ, gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịa. Gị na ya mụchaa isiokwu ahụ, unu nwere ike ịgafe n’isiokwu ọzọ ọ chọrọ ka unu mụọ ma ọ bụkwanụ unu ebido n’isi nke mbụ.