Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
1. Olee otú e si dee broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!?
1 N’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Julaị afọ a, e kwuru na broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! so n’otu n’ime akwụkwọ ndị anyị na-ejikarị akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Na paragraf nke ọ bụla, e nwere amaokwu Baịbụl ndị a na-edeghị ihe ha kwuru. Ihe mere o ji dị otú a bụ ka e nwee ike ịsaghe Baịbụl gụọ ihe dị n’amaokwu ndị ahụ, onye a na-amụrụ ihe ejirikwa anya ya hụ ihe Baịbụl na-ekwu. Otú e si dee ọtụtụ akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl bụ otú mmadụ nwere ike ịmụ ha n’onwe ya ma ghọta ha. Ma, e dere broshọ a otú a ga-amụrụ ya mmadụ tupu ya aghọta ya. N’ihi ya, anyị nye ya mmadụ, anyị kwesịrị igosi onye ahụ otú anyị si eji ya amụrụ mmadụ Baịbụl ka ọ ghọta na ịmụ Baịbụl ga-abara ya uru.—Mat. 13:44.
2. Olee otú anyị ga-esi jiri broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! zie mmadụ ozi ọma mgbe mbụ anyị hụrụ ya?
2 Mgbe Mbụ Ị Hụrụ Mmadụ n’Ozi Ọma: Anyị hụ mmadụ, anyị nwere ike ịgwa ya, sị: “Ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-eme ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha maka ọdịnihu. Ì chere na ihe ga-emecha dị mma? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru ihe ndị ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe ga-emecha dị mma. Legodị ajụjụ ụfọdụ Baịbụl zara.” Nyezie ya broshọ a, gị agwa ya ka ọ họrọ otu n’ime ajụjụ ndị dị n’azụ ya, gị na ya amụọkwa paragraf nke mbụ n’isiokwu ọ bụla ọ họọrọ. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịjụ ya otu ajụjụ dị n’azụ broshọ a, gị ejirizie broshọ a gosi ya otú Baịbụl si zaa ajụjụ ahụ. Ndị nkwusa ụfọdụ na-emepe jw.org ma kpọnyere onye ahụ ha bịara na nke ya vidio gbasara ihe ahụ ha na-amụ.
3. Olee otú anyị ga-esi mụọrọ mmadụ broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!?
3 Otú Anyị Ga-esi Jiri Ya Na-amụrụ Ndị Mmadụ Ihe: (1) Buru ụzọ jụọ ajụjụ paragraf unu chọrọ ịtụle ka onye ahụ buru ya n’uche. (2) Gụzienụ paragraf ahụ. (3) Gụọnụ amaokwu Baịbụl e kwuru ka a gụọ, gị ajụọ ya ajụjụ ụfọdụ ga-eme ka o jiri ihe amaokwu ahụ kwuru zaa ajụjụ paragraf ahụ. (4) Ọ bụrụ na paragraf dị́ n’okpuru ajụjụ ahụ karịrị otu, meekwanụ ihe a e kwuru na nke abụọ na nke atọ. Ọ bụrụ na e nwere vidio gbasara ihe ahụ unu na-amụ, kpọnyere ya onye ahụ. (5) Jụghachi ya ajụjụ paragraf ahụ ka ị mata ma ọ̀ ghọtakwara ihe paragraf ahụ na-ekwu.
4. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike jiri broshọ a kụziere mmadụ Baịbụl, ya eruo ya n’obi?
4 Gbaa mbọ mụta otú e si eji akwụkwọ a akụziri ndị mmadụ ihe. Jirikwa ya na-ezi ozi ọma mgbe niile. Tupu gị amụwara mmadụ ihe, buru ụzọ chee echiche otú ị ga-esi jiri amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu unu chọrọ ịmụ kụziere onye ahụ ihe, ya eruo ya n’obi. (Ilu 15:28; Ọrụ 17:2, 3) Ọ bụrụ na ị na-eji broshọ a amụrụ ndị mmadụ ihe mgbe niile, ọ ga-amara gị ahụ́.