Ịmalite Ọmụmụ Ihe na Broshuọ Na-achọ
1 Akụkọ ndị e si gburugburu ụwa nweta na-egosi na broshuọ ahụ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? bụ ngwá ọrụ dị ike iji kụziere ndị mmadụ eziokwu ahụ. A na-amalite ọtụtụ puku ọmụmụ Bible kwa izu na broshuọ a. Ì nwewo ihe ịga nke ọma n’ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible na broshuọ Na-achọ?
2 Ọ bụ ezie na ọ na-adịrị ihe ka ọtụtụ mfe itinye broshuọ ahụ, ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịma ihe ha ga-ekwu iji malite ọmụmụ ihe. Olee ụzọ ndị ọzọ chọpụtaworo dị irè n’iji broshuọ Na-achọ malite ọmụmụ Bible? Aro ndị na-esonụ kwesịrị inye aka.
3 Tụọ Aro Igosi Otú E Si Eduzi Ọmụmụ Ihe Ahụ: Mgbe ị na-eme nleta nke mbụ ma ọ bụ nletaghachi, kama nanị ịtụrụ onye nwe ụlọ aro maka ọmụmụ Bible, anyị pụrụ igosi ya otú a ga-esi duzie ọmụmụ Bible ahụ. Nke a yiri ka ọ ga-ewepụ ihe omimi na nchegbu na-esochi ya nke ọtụtụ ndị nwe ụlọ na-enwe mgbe ha nụrụ okwu ahụ bụ́ “ọmụmụ ihe.” Ozugbo anyị mụtara igosi otú e si amụ ya, anyị ga-achọpụta na anyị pụrụ ịmalite ọmụmụ ihe ahụ kpọmkwem site n’ikwu okwu mmalite dị mfe.
4 Nkwadebe Bụ Isi Ihe Dị na Ya: E jikọtara ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere ịmalite ọmụmụ Bible kpọmkwem na otú anyị kwadoruru nke ọma. Ibu ụzọ mee nkwadebe ga-enyere anyị aka imeri ịla azụ ọ bụla anyị pụrụ ịdị na-enwe n’ikere òkè n’ọrụ ọmụmụ Bible. Site n’ịmụgharị ụzọ anyị si eche ihe n’ihu mmadụ ọtụtụ ugboro, anyị ga na-ekwu okwu n’ụzọ mkparịta ụka karị, nwee ike ikwu okwu otú anyị si ekwu okwu, nakwa n’okwu nke aka anyị. Ọ bụghị nanị na nke a ga-eme ka anyị tụsara ahụ kamakwa ọ ga-eme ka onye nwe ụlọ nwee ahụ iru ala.
5 Mgbe ị na-amụgharị ihe, ọ ga-enyere gị aka ịmara oge ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ahụ ga-ewe gị ka i wee nwee ike ịgwa onye nwe ụlọ oge ha aṅaa ọ ga-ewe gị igosi otú e si eduzi ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe ọ kọwasịrị onwe ya, otu nwanna nwoke na-ekwu, sị: “Abịara m igosi gị usoro ọmụmụ Bible anyị na-eduzi n’efu. Ọ na-ewe ihe dị ka minit ise iji gosi otú e si eduzi ya. Ị̀ ga-ewepụtali minit ise?” A pụrụ iji ihe dị ka minit ise gosi otú a ga-esi mụọ Ihe Ọmụmụ nke 1 nke broshuọ Na-achọ. Otú ọ dị, nanị akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a họtara ahọta ka a pụrụ ịgụ ná ntakịrị oge a, ma site n’ịmụcha ihe ọmụmụ nke mbụ ahụ na minit ole na ole, onye nwe ulọ ga-enwe ike nwee ọmụmụ ihe ya nke mbụ. Mgbe ahụ mee ka ọ mara na mgbe ị ga-abịaghachi ịmụ Ihe Ọmụmụ nke 2, na ị ga-eji nanị minit 15 duzie ya.
6 Ụzọ iche ihe n’ihu a na-esonụ abụrụwo nke dị irè:
◼ “Ọ ga-amasị m iji broshuọ a bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? gosi gị otú e si eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị nnọọ mfe, ma na-aga ngwa ngwa. Ọtụtụ ndị achọpụtawo na ná ntakịrị oge dị ka minit 15 kwa izu maka izu 16, ha pụrụ ịchọta azịza ndị na-eju afọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nye ajụjụ ndị a dị mkpa dị na Bible.” Gosi ya ihe ndị dị n’ime ya n’ụzọ dị nkenke. N’ịsapeta Ihe Ọmụmụ nke 1, kwuo, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-enye anyị ihe dị ka minit ise, ọ ga-adị anyị mma igosi gị otú e si eme nke a. A kpọrọ Ihe Ọmụmụ nke 1 ‘Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọpụta Ihe Chineke Na-achọ.’” Gaa n’ihu site n’ịgụpụta ajụjụ atọ ahụ, kọwaakwa nọmba ndị ahụ dị n’akara ngebichi. Gụọ paragraf 1, gosikwa onye nwe ụlọ otú e si achọta azịza. A pụrụ ịgwa onye nwe ụlọ ka ọ gụọ paragraf nke 2. Mgbe ahụ kwuo, sị: “Dabere n’ihe a a gụrụ, olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ a? [Gụpụta ajụjụ ahụ ọzọ ma nye onye nwe ụlọ ohere ikwu okwu.] Ị ga-arịba ama na e nwere akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị na paragraf nke ọ bụla. Ha na-adọrọ uche anyị gaa n’azịza Bible nye ajụjụ ndị a. Dị ka ihe atụ, ka anyị gụọ 2 Timoti 3:16, 17 ma hụ ma ọ̀ kwadoro ihe ị zara banyere onye chepụtara Bible.” Mgbe a gụsịrị paragraf nke 3, tụlesịa ajụjụ ya, gụsịakwa Jọn 17:3, dọrọ uche onye nwe ụlọ gaa n’ihe ọ mụtaworo site n’ịtụleghachi Ihe Ọmụmụ nke 1. Ugbu a ị pụrụ ịsapeta Ihe Ọmụmụ nke 2 ma gụọ ajụjụ nke ikpeazụ ya, “Olee ụzọ abụọ anyị pụrụ isi mụta banyere Chineke?” Mgbe ahụ jụọ, sị: “Olee mgbe ị ga-enwe ihe dị ka minit 15 ka anyị wee tụlee Ihe Ọmụmụ nke 2 ma chọpụta azịza ya?”
7 Ọ dị mkpa ime ka nkwurịta okwu ahụ dị mfe, jaakwa onye nwe ụlọ mma mgbe ọ bụla o kwere mee. Mgbe ị na-eme ndokwa maka nleta ọzọ, kama ịjụ ya ma ọ̀ chọrọ ịga n’ihụ, gbaa ya nnọọ ume ka ọ gbasoo otu usoro ahụ maka ihe ọmụmụ na-esonụ. Mee ka ọ mara na ị na-atụsi anya ike ịlaghachi. Ị pụkwara ịgba onye ahụ ị na-amụrụ ihe ume ka o debe broshuọ ahụ n’ebe ọ na-enweghị ihe ga-eme ya, ebe aka ga-eru ya ngwa ngwa ka o wee dịrị nso n’oge ọzọ ị ga-eleta.
8 Mee Mkpebi Siri Ike: Ọ bụ ezie na isi ihe na-akpata ihe ịga nke ọma bụ nkwadebe, anyị aghaghị ikpebisi ike ịdị na-agaghachi. Iji minit ole na ole akụzi ihe pụrụ ịbụ ihe ịma aka, ya mere kpebisie ike ịmụgharị ụzọ iche ihe n’ihu ahụ ọtụtụ ugboro dị ka ọ dị mkpa iji wee mee ka ọ na-agara gị were were mgbe ị na-egosi otú e si eduzi ọmụmụ ihe ahụ. Gbalịa igosi onye ọ bụla i zutere n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’oge ị na-agba àmà mberede otú e si eduzi ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịmalite ọmụmụ Bible, enwela nkụda mmụọ. Inwe ihe ịga nke ọma n’ịmalite ọmụmụ Bible chọrọ mkpebi siri ike na ọchịchọ sitere n’ezi obi ime ka ndị ọzọ mara eziokwu ahụ.—Gal. 6:9.
9 Site n’itinye aro ndị a n’ọrụ, gị onwe gị kwa pụrụ inwe ihe ùgwù nke inyere mmadụ aka ịbata n’ụzọ na-eduje ná ndụ, site n’ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible na broshuọ Na-achọ.—Mat. 7:14.